Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ

“MGBE ndị ezi omume na-aba ụba karị, ndị ala ha na-aṅụrị: ma mgbe onye na-emebi iwu na-achị achị, ndị ala ya na-eze ume.” (Ilu 29:2) Akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Eze nke Mbụ na-egosipụta n’ụzọ doro anya otú ilu a si bụrụ eziokwu. Ọ kọrọ banyere ndụ Solomọn, bụ́ onye n’oge ọchịchị ya, Izrel oge ochie nọ na nchebe ma nwee ihe ịga nke ọma dị ukwuu. Ndị Eze nke Mbụ kọkwara banyere nkewa nke mba ahụ mgbe Solomọn nwụsịrị na banyere ndị eze 14 sochiri ya, ụfọdụ chịrị n’Izrel, ụfọdụ chịkwara na Juda. Ọ bụ nanị ndị eze abụọ n’ime ha bụ ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova. Ọzọkwa, akwụkwọ ahụ kọrọ banyere ọrụ ndị amụma isii rụrụ, gụnyere Ịlaịja.

Akụkọ ahụ Jeremaịa onye amụma nọ na Jeruselem na Juda dee were ihe dị ka otu narị na iri afọ abụọ na itoolu—malite n’afọ 1040 T.O.A. ruo afọ 911 T.O.A. Ihe àmà na-egosi na Jeremaịa ji ihe ndekọ ochie ndị dị ka “akwụkwọ okwu Solomọn” mee ihe mgbe ọ na-ede akwụkwọ ahụ. Ihe ndekọ ndị ahụ adịghịzi.—1 Ndị Eze 11:41; 14:19; 15:7.

EZE MAARA IHE AKWALITE UDO NA ỌGANIHU

(1 Ndị Eze 1:1–11:43)

Ndị Eze nke Mbụ ji akụkọ na-akpali mmasị banyere mgbalị nwa Eze Devid bụ́ Adonaịja mere iji weghara ọchịchị nna ya malite. Ihe onye amụma bụ́ Netan mere n’egbughị oge emee ka atụmatụ ahụ kụọ afọ n’ala, e chie nwa Devid bụ́ Solomọn eze. Jehova enwee mmasị n’arịrịọ eze ọhụrụ ahụ nọkwasịrị n’ọchịchị rịọrọ ma nye ya “obi maara ihe na nke na-aghọta ihe” tinyere “akụ̀ na nsọpụrụ.” (1 Ndị Eze 3:12, 13) Amamihe nke eze ahụ aghọọ nke na-enweghị oyiri, akụ̀ na ụba ya abụrụkwa nke na-enweghị atụ. Ndị Izrel enwee udo na ihe ịga nke ọma.

Ụlọ nsọ Jehova na ụlọ dị iche iche nke gọọmenti so n’ihe owuwu ndị Solomọn wuru. Jehova emesie Solomọn obi ike, sị: “M ga-eme ka ocheeze alaeze gị n’isi Izrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi,” ma ọ bụrụhaala na eze ahụ anọgide na-erubere ya isi. (1 Ndị Eze 9:4, 5) Ezi Chineke ahụ adọọkwa ya aka ná ntị banyere ihe ga-eme ya ma o nupụrụ ya isi. Otú ọ dị, Solomọn alụọ ọtụtụ nwunye ndị ala ọzọ. Ha emee ka ọ malite ife ofufe ụgha n’oge agadi ya. Jehova ebuo amụma na a ga-ekewa alaeze ya. Solomọn anwụọ n’afọ 997 T.O.A., na-eweta ọchịchị ya were afọ 40 ná njedebe. Nwa ya nwoke bụ́ Rehoboam aghọọ eze.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:5—Gịnị mere Adonaịja ji nwaa iweghara ọchịchị mgbe Devid ka dị ndụ? Bible ekwughị. Otú ọ dị, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na ebe ọ bụ na ụmụnne Adonaịja ndị nwoke tọrọ ya bụ́ Amnọn na Absalọm, ma eleghịkwa anya nwa Devid bụ́ Kileab, anwụwo, Adonaịja chere na ọ bụzi ya ka o ruru n’aka ịnọkwasị n’ocheeze dị ka onye tọchara ụmụ Devid ndị fọdụrụnụ. (2 Samuel 3:2-4; 13:28, 29; 18:14-17) N’ihi na Adonaịja nwetara nkwado onyeisi ndị agha dị ike bụ́ Joab na nke onyeisi nchụàjà a ma ama bụ́ Abaịata, o yiri ka ò nwere obi ike na mgbalị ya ga-aga nke ọma. Bible ekwughị ma ọ̀ maara na Devid bu n’obi ka Solomọn nọchie ya dị ka eze. Otú ọ dị, Adonaịja akpọghị Solomọn na ndị ọzọ na-eguzosi ike n’ihe nye Devid maka ‘àjà’ ọ chụrụ. (1 Ndị Eze 1:9, 10) Nke a na-egosi na o lere Solomọn anya dị ka onye ya na ya na-azọ eze.

1:49-53; 2:13-25—Gịnị mere Solomọn ji gbuo Adonaịja mgbe ọ gbagharasịịrị ya? Ọ bụ ezie na Bat-sheba aghọtaghị ebumnobi Adonaịja ji rịọ ya ka ọ gwa eze ka o nye ya Abishag dị ka nwunye, Solomọn ghọtara ya. Ọ bụ ezie na Devid esoghị ya nwee mmekọahụ, e weere Abishag mara mma dị ka iko Devid. N’ikwekọ n’omenala e nwere n’oge ahụ, ọ bụ onye o ruuru ịnọchi Devid ga-alụ ya. Ọ pụrụ ịbụ na Adonaịja chere na site n’ịlụ Abishag, na ya ga-amaliteghachi ịzọ ocheeze ahụ. N’ihi na Solomọn lere arịrịọ Adonaịja anya dị ka ihe na-egosi na anya ya ka dị n’ịghọ eze, ọ kagburu mgbaghara ọ gbaghabuuru ya.

6:37–8:2—Olee mgbe a raara ụlọ nsọ ahụ nye? E wuchara ụlọ nsọ ahụ n’ọnwa nke asatọ nke afọ 1027 T.O.A., n’afọ nke 11 nke ọchịchị Solomọn. O yiri ka ịkwabasị arịa na ime nkwadebe ndị ọzọ hà were ọnwa 11. Nraranye ahụ aghaghị iwerewo ọnọdụ n’ọnwa nke asaa nke afọ 1026 T.O.A. Akụkọ ahụ kwuru banyere ihe owuwu ndị ọzọ e wuru mgbe e wuchara ụlọ nsọ ahụ tupu ya ekwuo banyere nraranye ya, ma eleghị anya, nke a bụ iji nye nkọwa zuru ezu banyere ihe ndị e wuru n’oge ahụ.—2 Ihe E Mere 5:1-3.

9:10-13—Obodo 20 dị na Galili Solomọn nyere Eze Haịram nke Taịa ò kwekọrọ n’Iwu Mozis? A pụrụ iwere ya na Iwu ahụ e dekọrọ na Levitikọs 25:23, 24 metụtara nanị ebe ndị Izrel bi. Ọ pụrụ ịbụ ndị na-abụghị ndị Izrel bijupụtara obodo ndị ahụ Solomọn nyere Haịram, n’agbanyeghị na ha dị n’Ala Nkwa ahụ. (Ọpụpụ 23:31) Ọ pụkwara ịbụ na ihe Solomọn mere gosiri na o rubechaghị isi n’Iwu ahụ, dị ka mgbe o ‘mere ka ịnyịnya baara ya ụba’ ma lụọ ọtụtụ nwunye. (Deuterọnọmi 17:16, 17) Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, onyinye ahụ ejughị Haịram afọ. Ikekwe ndị na-ekpere arụsị bi n’obodo ndị ahụ adịghị elekọta ha anya nke ọma, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ebe ha dị adịghị mma.

11:4—Ọ̀ bụ nká mere ka Solomọn gharazie ikwesị ntụkwasị obi n’oge agadi ya? Nke a eyighị ka ọ̀ bụ ihe kpatara ya. Solomọn ka bụ nnọọ nwa okorobịa mgbe ọ malitere ịchị, ọ bụkwa ezie na ọ chịrị ruo afọ 40, ọ kachaghị nká. Ọzọkwa, ọ kwụsịghị ife Jehova kpamkpam. O yiri ka ọ̀ nwara itinye aka ná ngwakọta ofufe.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

2:26, 27, 35. Ihe Jehova buru n’amụma na-emezurịrị. Mwepụ e wepụrụ Abaịata, onye si n’agbụrụ Ilaị, mezuru “okwu Jehova, bụ́ nke O kwuru banyere ụlọ Ilaị.” Iji Zedọk sitere n’eriri Fineas dochie anya Abaịata bụ mmezu nke Ọnụ Ọgụgụ 25:10-13.—Ọpụpụ 6:25; 1 Samuel 2:31; 3:12; 1 Ihe E Mere 24:3.

2:37, 41-46. Lee ihe ize ndụ ọ bụ iche na mmadụ pụrụ imebi iwu Chineke ma ghara inweta ntaramahụhụ! Ndị leziri anya hapụ iso ‘ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ,’ ga-ata ahụhụ ihe ndị ga-esi ná mkpebi ahụ amamihe na-adịghị na ya ha mere pụta.—Matiu 7:14.

3:9, 12-14. Jehova na-aza ekpere ndị sitere n’obi ndị ohu ya na-ekpe maka amamihe, nghọta na nduzi iji jeere ya ozi.—Jems 1:5.

8:22-53. Lee ekele sitere n’obi Solomọn gosipụtara maka Jehova—Chineke nwere obiọma sitere n’ịhụnanya, Onye na-emezu nkwa ndị o kwere, na Onye na-anụ ekpere! Ịtụgharị uche n’okwu ndị dị n’ekpere nraranye Solomọn kpere ga-eme ka anyị nwekwuo ekele maka àgwà ndị a na àgwà ndị ọzọ nke Chineke.

11:9-14, 23, 26. Mgbe Solomọn ghọrọ onye nnupụisi mgbe ọ kara nká, Jehova mere ka o nwee ndị nguzogide. Pita onyeozi kwuru, sị: “Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala obiọma na-erughịrị mmadụ.”—1 Pita 5:5.

11:30-40. Eze Solomọn chọsiri ike igbu Jeroboam n’ihi ihe Ahaịja buru n’amụma banyere Jeroboam. Lee otú ihe eze ahụ mere si dị iche site n’ihe o mere ihe dị ka afọ 40 tupu mgbe ahụ, bụ́ mgbe ọ jụrụ ịbọ ọ́bọ̀ n’ahụ́ Adonaịja na ndị ọzọ na-agba izu megide ya! (1 Ndị Eze 1:50-53) Mgbanwe àgwà a bụ ihe iwezụga onwe ya n’ebe Jehova nọ kpataara ya.

E KEWAA ALAEZE DỊ N’OTU

(1 Ndị Eze 12:1–22:53)

Jeroboam na ndị Izrel abịakwute Eze Rehoboam ma gwa ya ka o mee ka ibu arọ nna ya bụ́ Solomọn boro ha dịtụ mfe. Kama imere ha ihe ha rịọrọ, Rehoboam agwa ha na ya ga-ebo ha ibu kadị nke ahụ arọ. Ebo iri enupụ isi ma mee Jeroboam eze ha. E kewaa alaeze ahụ. Rehoboam achịwa alaeze ebe ndịda, bụ́ nke ebo Juda na Benjamin mejupụtara, Jeroboam achịwakwa alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu.

Iji mee ka ndị ahụ kwụsị ịga Jeruselem iji fee ofufe, Jeroboam akpụọ nwa ehi abụọ—otu na Dan nke ọzọ na Betel. Ndị eze chịrị n’Izrel mgbe Jeroboam chisịrị gụnyere Nedab, Beasha, Ila, Zimri, Tibni, Ọmri, Ehab, na Ehazaịa. Ndị chịrị na Juda mgbe Rehoboam nwụsịrị bụ Abaịjam, Esa, Jehoshafat, Jehoram. Ndị amụma jere ozi n’oge ndị eze ndị a gụnyere Ahaịja, Shemaịa, na onye nke Chineke a na-akpọghị aha, nakwa Jihu, Ịlaịja, na Maịkaịa.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

18:21—Gịnị mere ndị Izrel ji gba nkịtị mgbe Ịlaịja gwara ha ka ha sowe Jehova ma ọ bụ Bel? Ọ pụrụ ịbụ na obi ha na-ama ha ikpe n’ihi na ha ghọtara na ha anọghị na-enye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa bụ́ nke ruuru ya. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na akọ na uche ha nwụrụ nnọọ anwụ nke na ha ahụghị ihe dị njọ n’ife Bel ma ka na-azọrọ na ha na-efe Jehova. Ọ bụ nanị mgbe Jehova gosipụtara ike ya ka ha kwuru, sị: “Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke; Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke.”—1 Ndị Eze 18:39.

20:34—Mgbe Jehova mesịrị ka Ehab merie ndị Siria, gịnị mere Ehab ji ghara igbu eze ha, bụ́ Ben-hedad? Kama igbu Ben-hedad, Ehab sooro ya gbaa ndụ bụ́ nke ga-eme ka e nye Ehab okporo ámá ụfọdụ n’isi obodo Siria, bụ́ Damaskọs, ma eleghị anya, ka o wuo ụlọ ahịa na ha. Tupu mgbe ahụ, nna Ben-hedad mere ihe yiri nke ahụ site n’iwere okporo ámá ụfọdụ na Sameria maka azụmahịa. Ya mere, Ehab tọhapụrụ Ben-hedad iji guzobe azụmahịa na Damaskọs.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

12:13, 14. Mgbe anyị na-eme mkpebi ndị dị oké mkpa ná ndụ, anyị kwesịrị ịchọ ndụmọdụ nke ndị maara ihe na ndị tozuru okè bụ́ ndị nwere ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ ma nwee nkwanye ùgwù miri emi maka ụkpụrụ Chineke.

13:11-24. E kwesịrị iji ezi nduzi sitere n’Okwu Chineke nyochaa ndụmọdụ ma ọ bụ aro na-eme mmadụ obi abụọ, ọ bụrụgodị na o sitere n’aka onye kwere ekwe ibe anyị nke nwere ezi obi.—1 Jọn 4:1.

14:13. Jehova na-enyocha anyị iji chọpụta ezi ihe dị n’ime anyị. N’agbanyeghị otú ezi ihe ahụ dịruru ntakịrị, ọ pụrụ ime ka o too etoo ka anyị na-eme ike anyị nile ife ya.

15:10-13. Anyị aghaghị iji obi ike jụ ndapụ n’ezi ofufe, kama nke ahụ, na-akwalite ezi ofufe.

17:10-16. Nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ maara na Ịlaịja bụ onye amụma ma nabata ya dị ka onye amụma, Jehova gọzikwara ọrụ nwanyị ahụ ji okwukwe rụọ. Taa, Jehova na-ahụkwa ọrụ ndị anyị ji okwukwe arụ, ọ na-akwụghachi ndị na-akwado ọrụ Alaeze ahụ n’ụzọ dị iche iche ụgwọ.—Matiu 6:33; 10:41, 42; Ndị Hibru 6:10.

19:1-8. Mgbe a na-emegide anyị n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-akwado anyị.—2 Ndị Kọrint 4:7-9.

19:10, 14, 18. Ndị na-efe ezi ofufe adịghị mgbe ha nọ nanị ha. Jehova na òtù ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ na-akwado ha.

19:11-13. Jehova abụghị ikike nkịtị.

20:11. Mgbe Ben-hedad turu ọnụ na ya ga-ebibi Sameria, eze Izrel zara ya, sị: “Ka onye na-eke ekike agha ya ghara ito onwe ya dị ka onye na-ekepụ” ekike agha ya mgbe o merisịrị n’agha. Mgbe anyị nwetara ọrụ ọhụrụ, anyị kwesịrị izere iji obi ike gabigara ókè na-etu ọnụ.—Ilu 27:1; Jems 4:13-16.

Ọ Baara Anyị Uru nke Ukwuu

Mgbe ọ na-akọ banyere Iwu ahụ e nyere n’Ugwu Saịnaị, Mozis gwara ụmụ Izrel, sị: “Lee, mụ onwe m na-etinye n’ihu unu taa ngọzi na nkọcha; ngọzi ahụ, ma a sị na unu egee ntị ihe nile Jehova, bụ́ Chineke unu, nyere unu n’iwu, bụ́ nke mụ onwe m na-enye unu n’iwu taa: ma nkọcha ahụ, ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị ihe nile Jehova, bụ́ Chineke unu, nyere n’iwu, ma unu ewezụga onwe unu n’ụzọ ahụ nke Mụ onwe m na-enye unu n’iwu taa.”—Deuterọnọmi 11:26-28.

Lee otú akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ si dọrọ nnọọ uche anyị gaa n’eziokwu a dị mkpa! Dị ka anyị hụworo, akwụkwọ a na-enyekwa ihe mmụta ndị ọzọ bara uru. N’ezie, ozi ya dị ndụ ma na-akpa ike.—Ndị Hibru 4:12.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ụlọ nsọ ahụ na ụlọ ndị ọzọ Solomọn wuru

[Foto dị na peeji nke 30, 31]

Mgbe Jehova gosipụtara ike ya, ndị ahụ kwuru, sị: “Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke!”