“Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
“Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
“Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke . . . onye na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe.”—AỊSAỊA 52:7.
1, 2. (a) Olee ihe ndị dị egwu na-eme kwa ụbọchị? (b) Olee otú ọtụtụ ndị si emeghachi omume mgbe ha na-anụ akụkọ ọjọọ mgbe nile?
TAA, n’ụwa nile, ndị mmadụ chere na ntị echiela ha n’akụkọ ọjọọ. Ha gbanye redio, ha anụ akụkọ ndị dị egwu banyere ọrịa ndị na-egbu egbu, bụ́ ndị na-eyi ụwa egwu. Ha kiriwe akụkọ ụwa na telivishọn, ha ahụkwa onyoonyo ndị a na-apụghị ichefu echefu nke ụmụaka agụụ na-agụgbu bụ́ ndị na-arịọ ka e nyere ha aka. Ha were akwụkwọ akụkọ sị ka ha gụọ, ha agụọ banyere bọmbụ ndị na-agbawa ma bibie ihe owuwu dị iche iche, gbuokwa ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha.
2 Ee, ihe ndị dị egwu na-eme kwa ụbọchị. Ọnọdụ ụwa a na-agbanwe n’ezie—n’ụzọ ka njọ. (1 Ndị Kọrint 7:31) Otu magazin a na-ebipụta n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe kwuru na, mgbe ụfọdụ, ọ na-eyi ka ụwa nile “ọ̀ na-achọ ịgba ọkụ.” Ka a sịkwa ihe mere ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmadụ ji enwe nchegbu! Otu onye e hotara ihe o kwuru ná njụta echiche e mere banyere akụkọ ụwa ndị a na-akọ na telivishọn na United States kwuru nnọọ echiche ọtụtụ nde mmadụ mgbe o kwuru, sị: ‘Ana m enwe nnọọ nkụda mmụọ ma m kirisịa akụkọ ụwa. Ọ bụ nanị akụkọ ọjọọ ka ha na-akọ. Ọ na-eri ọnụ.’
Akụkọ Mmadụ Nile Kwesịrị Ịnụ
3. (a) Olee ozi ọma Bible na-akpọsa? (b) Gịnị mere i ji were ozi ọma Alaeze ahụ dị ka ihe dị mkpa?
3 À pụrụ inwe ozi ọma n’ụwa nke akụkọ ọjọọ juru na ya otú a? N’ezie, a pụrụ! Ọ bụ ihe na-akasi obi ịmata na Bible na-akpọsa ozi ọma. Ozi ahụ bụ na Alaeze Chineke ga-eweta ọrịa, agụụ, mpụ, agha, na ụdị mmegbu nile ná njedebe. (Abụ Ọma 46:9; 72:12) Nke ahụ ọ́ bụghị ụdị akụkọ onye ọ bụla chọrọ ịnụ? Ndịàmà Jehova chere nnọọ otú ahụ. N’ihi ya, a ma ha ama ebe nile maka mgbalị ha nọgidere na-etinye n’ikwusara ndị nke mba nile ozi ọma Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.
4. Olee akụkụ ozi anyị ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a na nke na-esonụ?
4 Ma, olee ihe ndị anyị pụrụ ime iji nọgide na-ekere òkè zuru ezu na nke dị mkpa n’ikwusa ozi ọma a—ọbụna n’ókèala ndị a na-adịghị anabatacha ozi ọma na ha? (Luk 8:15) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịtụle, n’ụzọ dị nkenke, akụkụ atọ ndị dị mkpa nke ọrụ nkwusa anyị ga-enyere anyị aka. Anyị pụrụ ịtụle (1) ebumnobi anyị, ma ọ bụ ihe mere anyị ji eme nkwusa; (2) ozi anyị, ma ọ bụ ihe anyị na-ekwusa; na (3) usoro anyị ji eme ihe, ma ọ bụ otú anyị si eme nkwusa. Site n’ịnọgide na-enwe ebumnobi dị ọcha, na-eme ka ozi anyị doo anya, jirikwa usoro dị irè na-eme nkwusa, anyị ga-enye ụdị mmadụ dị iche iche n’ụwa nile ohere ịnụ ozi kasị mma e nwere taa—ozi ọma nke Alaeze Chineke. *
Ihe Mere Anyị Ji Ekwusa Ozi Ọma
5. (a) Karịsịa ihe nile, gịnị na-akpali anyị ikere òkè n’ozi? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na anyị irube isi n’iwu Bible bụ́ ikwusa ozi ọma bụ ngosipụta nke ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ?
5 Ka anyị tụlee akụkụ nke mbụ—ebumnobi anyị. N’ihi gịnị ka anyị ji ekwusa ozi ọma? Ọ bụ n’ihi otu ihe ahụ mere Jizọs ji kwusaa ya. O kwuru, sị: “M hụrụ Nna m n’anya.” (Jọn 14:31; Abụ Ọma 40:8) Karịsịa ihe nile, ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali anyị ime otú ahụ. (Matiu 22:37, 38) Bible na-ejikọta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na ozi anyị n’ihi na ọ na-ekwu, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu.” (1 Jọn 5:3; Jọn 14:21) Iwu nke ịga ‘mee ndị na-eso ụzọ,’ ò so n’iwu Chineke nyere? (Matiu 28:19) Ee. Ọ bụ ezie na ọ bụ Jizọs kwuru okwu ahụ, o sitere nnọọ n’aka Jehova. N’ụzọ dị aṅaa? Jizọs kọwara, sị: “Adịghịkwa m eme ihe ọ bụla n’uche nke aka m; kama dị nnọọ ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.” (Jọn 8:28; Matiu 17:5) N’ihi ya, site n’irube isi n’iwu ahụ bụ́ ikwusa ozi ọma, anyị na-egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya.
6. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ si akpali anyị ime nkwusa?
6 Ọzọkwa, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-akpali anyị ime nkwusa n’ihi na anyị chọrọ ịgbagha ụgha Setan na-agbasa banyere ya. (2 Ndị Kọrint 4:4) Setan ekwuola na otú Chineke si achị adịghị mma. (Jenesis 3:1-5) Dị ka Ndịàmà Jehova, ọ na-agụsi anyị agụụ ike iso gbaa nkatọ Setan n’anwụ na iso doo aha Chineke nsọ n’ihu ọha mmadụ. (Aịsaịa 43:10-12) Ọzọkwa, anyị na-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma n’ihi na anyị amatala àgwà na ụzọ Jehova. Anyị nwere mmetụta nke ịnọ ya nso, nweekwa ọchịchọ siri ike nke ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke anyị. N’ezie, ịdị mma Jehova na ụzọ ezi omume ya na-enye anyị ọṅụ dị ukwuu nke na anyị enweghị ike ịkwụsị ikwu banyere ya. (Abụ Ọma 145:7-12) A na-akpali anyị ịkọsa otuto ya na ịgwa ndị ga-ege ntị banyere “ịdị mma” ya.—1 Pita 2:9; Aịsaịa 43:21.
7. E wezụga ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ, olee ihe ọzọ dị mkpa mere anyị ji ekere òkè n’ọrụ nkwusa?
7 E nwere ihe ọzọ dị mkpa mere anyị ji anọgide na-ekere òkè n’ozi: Anyị ji ezi obi na-achọ ịkasi ndị mmadụ obi, bụ́ ndị ọtụtụ akụkọ ọjọọ ha na-anụ mgbe nile na-akụda mmụọ na ndị na-ata ahụhụ n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ. Anyị na-agbalị iṅomi Jizọs na nke a. Dị ka ihe atụ, lee ihe a kọwara na Mak isi 6.
8. Gịnị ka ihe ndekọ ahụ dị na Mak isi 6 na-egosi banyere mmetụta Jizọs nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ?
8 Ndịozi si n’ọrụ ime nkwusa lọta ma kọọrọ Jizọs ihe nile ha mere na ihe ndị ha ziri. Jizọs hụrụ na ike gwụrụ ndịozi ahụ, ya agwakwa ha ka ha soro ya gaa “zurutụ ike.” N’ihi ya, ha banyere n’ụgbọ mmiri gawa ebe dị jụụ. Ndị mmadụ gbaara ikpere mmiri ikpere mmiri chụrụ ha gawa, n’oge na-adịghịkwa anya ha chụkwutere ha. Gịnị ka Jizọs mere? Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Ọ hụrụ oké ìgwè mmadụ, ma o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:31-34) Ọmịiko kpaliri Jizọs ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ike gwụrụ ya. N’ụzọ doro anya, Jizọs meteere ndị a ebere. O nwere ọmịiko n’ahụ́ ha.
9. Olee ihe anyị na-amụta site n’ihe ndekọ dị na Mak isi 6 banyere ihe kwesịrị ịbụ ezi ebumnobi anyị ji ekwusa ozi ọma?
9 Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe ndekọ a? Dị ka Ndị Kraịst, anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị iwu ji ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. Anyị ghọtara na anyị nwere ibu ọrụ nke ịkpọsa ozi ọma, ebe ọ bụ na uche Chineke bụ ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile.” (1 Timoti 2:4) Otú ọ dị, anyị na-eje ozi anyị ọ bụghị nanị dị ka ọrụ dịịrị anyị ịrụ, kamakwa n’ihi ọmịiko. Ọ bụrụ na anyị nwere ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ dị ka Jizọs nwere, obi anyị ga-akpali anyị ime ihe nile anyị nwere ike ime iji nọgide na-ekwusara ha ozi ọma. (Matiu 22:39) Ibu ihe ziri ezi dị otú ahụ n’obi mgbe anyị na-eje ozi ga-akpali anyị ikwusa ozi ọma n’esepụghị aka.
Ozi Anyị—Ozi Ọma nke Alaeze Chineke
10, 11. (a) Olee otú Aịzaịa si akọwa ozi anyị na-ekwusa? (b) Olee otú Jizọs si weta ozi ọma nke ezi ihe, oleekwa otú ndị ohu Chineke nke oge a sirila gbasoo ihe nlereanya Jizọs?
10 Olee maka akụkụ nke abụọ nke ọrụ nkwusa anyị—ozi anyị? Gịnị ka anyị na-ekwusa? Onye amụma bụ́ Aịzaịa nyere nkọwa magburu onwe ya nke ozi anyị na-akpọsa, na-ekwu, sị: “Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-ezisa ozi ọma, bụ́ onye na-eme ka a nụrụ okwu udo, onye na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe, onye na-eme ka a nụrụ okwu nzọpụta; onye na-asị Zaịọn, Chineke gị bụ eze!”—Aịsaịa 52:7.
11 Okwu bụ́ isi n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, bụ́ “Chineke gị bụ eze,” na-echetara anyị banyere ozi anyị na-aghaghị ịkpọsa, ya bụ, ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Mak 13:10) Rịbakwa ama otú amaokwu a si ekpughe abamuru nke ozi anyị. Aịzaịa ji okwu ndị dị ka “nzọpụta,” “ozi ọma,” “udo” na “ezi ihe” mee ihe. Ọtụtụ narị afọ ka Aịzaịa nwụsịrị, na narị afọ mbụ O.A., Jizọs Kraịst mezuru amụma a n’ụzọ pụtara ìhè site n’iji ịnụ ọkụ n’obi setịpụ ihe nlereanya n’ịkpọsa akụkọ banyere ezi ihe—Alaeze Chineke nke na-abịanụ. (Luk 4:43) N’oge a, karịsịa kemgbe afọ 1919, Ndịàmà Jehova agbasoola ihe nlereanya Jizọs site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma banyere Alaeze Chineke e guzobere eguzobe na ngọzi ndị ọ ga-eweta.
12. Mmetụta dị aṅaa ka ozi ọma Alaeze ahụ na-enwe n’ahụ́ ndị nabatara ya?
12 Mmetụta dị aṅaa ka ozi Alaeze ahụ na-enwe n’ahụ́ ndị nabatara ya? Taa, dị ka ọ dị n’oge Jizọs, ozi ọma ahụ na-enye olileanya na nkasi obi. (Ndị Rom 12:12; 15:4) Ọ na-enye ndị nwere obi eziokwu olileanya n’ihi na ha na-amụta na e nwere ezi ihe ndị mere ha ga-eji kwere na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. (Matiu 6:9, 10; 2 Pita 3:13) Olileanya dị otú ahụ na-enyere ndị na-atụ egwu Chineke aka nke ukwuu ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi. Ọbụ abụ ahụ na-ekwu na ha ‘agaghị esite n’ihe ọjọọ a nụworo tụọ egwu.’—Abụ Ọma 112:1, 7.
Ozi nke ‘Ga-ekechi Ọnyá Ndị Obi Ha Tiwara Etiwa’
13. Olee otú Aịzaịa onye amụma si kọwaa ngọzi ndị na-abịara ndị nabatara ozi ọma ahụ ozugbo?
13 Ọzọkwa, ozi ọma anyị na-ekwusa na-ewetara ndị nabatara ya ahụ́ efe na ngọzi ozugbo. N’ụzọ dị aṅaa? Aịzaịa onye amụma kpọtụrụ ụfọdụ n’ime ngọzi ndị ahụ aha mgbe o buru amụma, sị: “Mmụọ nke Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, dị n’ahụ́ m; n’ihi na Jehova etewo m mmanụ izi ndị e wedara n’ala ozi ọma; O zitewo m ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, ịkpọsa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha, na ịkpọsa mmeghepụ ụlọ mkpọrọ gwa ndị e kere agbụ; ịkpọsa afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ, na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere; ịkasi ndị nile na-eru újú obi.”—Aịsaịa 61:1, 2; Luk 4:16-21.
14. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa” na-egosi banyere ozi Alaeze ahụ? (b) Olee otú anyị si eṅomi nchegbu Jehova nwere maka ndị obi ha tiwara etiwa?
14 Dị ka amụma ahụ si kwuo, site n’ikwusa ozi ọma, Jizọs ‘ga-ekechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa.’ Lee okwu ihe atụ magburu onwe ya Aịzaịa jiri mee ihe! Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu Bible si kwuo, ‘a na-ejikarị okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ikechi” eme ihe maka iji bandeeji “kechie” ọnyá, ma si otú ahụ na-agwọ ọnyá nke ndị merụrụ ahụ́.’ Nọọsụ nke nwere ọmịiko pụrụ iji bandeeji, ma ọ bụ ákwà, kechie ebe mmadụ merụrụ ahụ́ iji nyere onye ahụ aka. N’otu aka ahụ kwa, mgbe ha na-ekwusa ozi Alaeze ahụ, ndị nkwusa nwere ọmịiko na-enyere ndị nile gere ntị, bụ́ ndị na-ata ahụhụ n’ụzọ ụfọdụ aka. Sitekwa n’inyere ndị nọ ná mkpa aka, ha na-eṅomi nchegbu Jehova na-enwe n’ebe ndị dị otú ahụ nọ. (Ezikiel 34:15, 16) Ọbụ abụ ahụ kwuru banyere Chineke, sị: “Ọ bụ onye na-eme ka ndị obi ha tiwara etiwa dịrị ndụ, Ọ na-ekechikwa ihe mgbu nile ha.”—Abụ Ọma 147:3.
Otú Ozi Alaeze ahụ Si Agbanwe Ndụ Mmadụ
15, 16. Olee ihe atụ ndị mere eme na-egosi otú ozi Alaeze ahụ si enyere ndị nọ ná mkpa aka ma na-ewusi ha ike?
15 Ọtụtụ ihe atụ ndị mere eme na-egosi otú ozi Alaeze ahụ si enyere ndị obi ha tiwara etiwa aka ma na-ewusi ha ike n’ezie. Tụlee ihe banyere Oreanna, bụ́ agadi nwanyị bi n’Ebe Ndịda America, nke ike ndụ gwụrụla. Otu Onyeàmà Jehova malitere ileta Oreanna ma na-agụrụ ya Bible na akwụkwọ bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible. * Na mbụ, nwanyị ahụ dara mbà n’obi na-edina n’àkwà, mechie anya ya ma na-egere ihe a na-agụrụ ya, na-ama ọsụ site n’oge ruo n’oge. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịgbalị ịnọ ọdụ n’àkwà ya mgbe a na-agụrụ ya ihe. Obere oge ka e mesịrị, ọ malitere ịdị na-anọdụ ala n’oche dị n’ime ụlọ ya, na-eche ka onye na-akụziri ya Bible bịa. Ọzọkwa, nwanyị ahụ malitere ịga nzukọ Ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ịbụ onye ihe ndị ọ mụtara ná nzukọ ndị ahụ gbara ume, ọ malitere inyefe onye ọ bụla na-agafe n’ụlọ ya akwụkwọ e ji amụ Bible. Mgbe Oreanna gbaziri afọ 93, e mere ya baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ozi Alaeze ahụ emeela ka o nweghachi ọchịchọ ịdị ndụ.—Ilu 15:30; 16:24.
16 Ozi Alaeze ahụ na-eme ka ọbụna ndị maara na ọrịa ha na-arịa ga-egbu ha nweta enyemaka dị ha ezigbo mkpa. Were Maria, bụ́ onye sitere n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe, dị ka ihe atụ. Ọ na-arịa ọrịa ga-egbu ya, o nweghịkwa olileanya ọ bụla. Ọ bụ onye dara nnọọ mbà n’obi mgbe Ndịàmà Jehova zutere ya. Otú ọ dị, mgbe ọ nụrụ banyere nzube Chineke, ndụ ya nweghachiri nzube. E mere ya baptizim, ya arụsiekwa ọrụ nkwusa ike. N’ime afọ abụọ ndị ikpeazụ ọ Ndị Rom 8:38, 39.
dịrị ndụ, o nwetara olileanya na ọṅụ. Maria nwụrụ na-enwe olileanya siri ike ibilite n’ọnwụ.—17. (a) Olee otú ozi Alaeze ahụ si agbanwe ndụ nke ndị nabatara ya? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka i siworo hụta n’onwe gị na Jehova “na-akwagide ndị nile na-ada ada”?
17 Akụkọ ndị dị otú ahụ na-egosi otú ozi Alaeze pụrụ isi gbanwee ndụ nke ndị eziokwu Bible na-agụ agụụ. Ndị na-eru újú n’ihi ọnwụ nke onye ha hụrụ n’anya na-enweta nkasi obi mgbe ha mụtara banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. (1 Ndị Tesalonaịka 4:13) Ndị dara ogbenye ma na-adọga inyeju ezinụlọ ha afọ na-enweghachi ùgwù na obi ike mgbe ha mụtara na Jehova agaghị ahapụ ha ma ọlị ma ha guzosie ike n’ihe nye ya. (Abụ Ọma 37:28) Site n’enyemaka Jehova, ọtụtụ ndị dara nnọọ mbà n’obi ji nke nta nke nta na-azụlite obi ike a chọrọ iji nagide ọnọdụ ha, a na-enyekwara ha aka n’oge ụfọdụ, ọbụna imeri ọrịa ahụ. (Abụ Ọma 40:1, 2) N’ezie, site n’ike Jehova na-enye anyị site n’Okwu ya, ọ “na-akwagide ndị nile na-ada ada” ugbu a. (Abụ Ọma 145:14) Site n’ịhụ otú ozi ọma Alaeze ahụ si ewetara ndị obi ha tiwara etiwa nkasi obi n’ókèala anyị nakwa n’ọgbakọ Ndị Kraịst, a na-echetara anyị ugboro ugboro na anyị nwere akụkọ kasị mma taa!—Abụ Ọma 51:17.
“Arịrịọ M Na-arịọsi Chineke Ike Maka Ha”
18. Olee otú ọjụjụ ndị Juu jụrụ ozi ọma ahụ si metụta Pọl, n’ihi gịnịkwa?
18 Ọ bụ ezie na ozi anyị nwere akụkọ kasị mma, ọtụtụ na-ajụ ya. Olee otú nke a pụrụ isi metụta anyị? Ọ bụ otú ahụ o siri metụta Pọl. O ziri ndị Juu ozi ọma mgbe mgbe, ma ọtụtụ n’ime ha jụrụ ozi nzọpụta ahụ. Ọjụjụ ha jụrụ metụtara Pọl nke ukwuu. O kwetara, sị: “M nwere oké iru újú na ihe mgbu na-adịghị akwụsị akwụsị n’ime obi m.” (Ndị Rom 9:2) Pọl nwere ọmịiko n’ebe ndị Juu ọ na-ekwusara ozi ọma nọ. O wutere ya na ha jụrụ ozi ọma ahụ.
19. (a) Gịnị mere o ji kwe nghọta na anyị pụrụ inwe nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ? (b) Gịnị nyeere Pọl aka ịnọgide n’ọrụ nkwusa ya?
19 Ọ bụkwa ọmịiko na-akpali anyị ikwusa ozi ọma ahụ. N’ihi ya, ọ bụ ihe kwere nghọta na anyị pụrụ inwe nkụda mmụọ mgbe ndị mmadụ jụrụ ozi Alaeze ahụ. Inwe mmetụta dị otú ahụ na-egosi na anyị nwere ezi nchegbu maka ọdịmma ime mmụọ nke ndị anyị na-ekwusara ozi ọma. Otú ọ dị, anyị kwesịrị icheta ihe nlereanya Pọl onyeozi. Gịnị nyeere ya aka ịnọgide n’ọrụ nkwusa ya? Ọ bụ ezie na ọjụjụ ndị Juu jụrụ ịnabata ozi ọma ahụ kpataara ya iru újú na ihe mgbu, ike agwụghị Pọl n’ebe ndị Juu nile nọ, o cheghịkwa na ha agafeela Ndị Rom 10:1.
mmekwata. Olileanya ya bụ na a ka nwere ụfọdụ n’ime ha ga-anabata Kraịst. N’ihi ya, Pọl dere banyere mmetụta o nwere n’ebe ndị Juu n’otu n’otu nọ, sị: “Ezi ọchịchọ nke obi m na arịrịọ m na-arịọsi Chineke ike maka ha bụ, n’ezie, maka nzọpụta ha.”—20, 21. (a) Banyere ozi anyị, olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Pọl? (b) Olee akụkụ ozi anyị nke anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
20 Rịba ama ihe abụọ Pọl mere ka ha pụta ìhè. Ọ bụ ọchịchọ obi ya ka ụfọdụ n’ime ha nweta nzọpụta, ọ rịọkwara Chineke arịrịọ maka nke ahụ. Taa, anyị na-agbaso ihe nlereanya Pọl. Anyị na-anọgide jiri obi anyị nile na-agbalị ịchọta ndị ọ pụrụ ịbụ na ha ka nwere ezi ọchịchọ obi n’ebe ozi ọma ahụ dị. Anyị ga-anọgide na-arịọ Jehova ka anyị chọta ndị dị otú ahụ ka anyị wee nwee ike inyere ha aka ịgbaso ụzọ ndụ nke ga-eduga ha ná nzọpụta.—Ilu 11:30; Ezikiel 33:11; Jọn 6:44.
21 Otú ọ dị, iji were ozi Alaeze ahụ gakwuru ọtụtụ ndị dị ka o kwere mee, ọ dị anyị mkpa ilezi anya, ọ bụghị nanị n’ihe mere anyị ji eme nkwusa na ihe anyị na-ekwusa, kamakwa n’otú anyị si eme nkwusa. A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Isiokwu a ga-atụle akụkụ abụọ ndị bu ụzọ. Isiokwu nke abụọ ga-atụle akụkụ nke atọ.
^ par. 15 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Gịnị Ka Ị Mụtaworo?
• Olee ihe ndị mere anyị ji ekere òkè n’ozi?
• Gịnị bụ isi ihe anyị na-ekwusa?
• Olee ngọzi ndị nabatara ozi Alaeze ahụ na-enweta?
• Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide n’ozi anyị?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ozi Alaeze ahụ na-enye ndị obi ha tiwara etiwa ume
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Ekpere na-enyere anyị aka ịnọgide na-atachi obi n’ozi anyị