Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Maara Mkpa nke Ime Mmụọ Ha”

“Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Maara Mkpa nke Ime Mmụọ Ha”

“Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Maara Mkpa nke Ime Mmụọ Ha”

MGBE ụmụ nnụnụ tetara n’ụtụtụ, ha na-ebekarị ube ruo nwa oge ma fepụzie ịga chọọ ihe oriri. N’uhuruchi, ha na-alaghachi n’akwụ́ ha, betụkwuo ube ma lakpuo. N’oge ụfọdụ n’afọ, ndị nke oké na-esi ndị nke nne, ndị nke nne na-eyi àkwá, ha na-azụkwa ụmụ ha. Ụmụ anụmanụ ndị ọzọ na-agbasokwa otu usoro ahụ onye ọ bụla maara.

Anyị bụ́ ụmụ mmadụ dị iche. Ọ bụ ezie na anyị na-eri nri, na-ehi ụra, na-amụkwa ụmụ, ma ime nanị ihe ndị a adịghị eju ihe ka ọtụtụ n’ime anyị afọ. Anyị chọrọ ịma ihe mere anyị ji nọrọ ebe a. Anyị chọrọ ibi ndụ nwere nzube. Anyị chọkwara inwe olileanya maka ọdịnihu. Mkpa ndị a bụ́ ndị siri ike karị na-eme ka àgwà nke nanị ụmụ mmadụ nwere pụta ìhè—iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, ma ọ bụ ikike nke ịghọta ihe ime mmụọ.

Ndị E Mere n’Onyinyo Chineke

Bible na-akọwa ihe mere ụmụ mmadụ ji nwee mkpa ime mmụọ, na-ekwu, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwanyị ka O kere ha.” (Jenesis 1:27) Anyị ịbụ ndị e kere “n’onyinyo Chineke” pụtara na ọ bụ ezie na mmehie na ezughị okè emewo ka anyị nwee ntụpọ, anyị nwere ikike nke igosipụta àgwà ụfọdụ nke Chineke. (Ndị Rom 5:12) Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịbụ ndị na-arụpụta ihe. Anyị nwetụkwara amamihe, ikike ikpe ikpe ziri ezi, na ikike nke igosi ibe anyị ịhụnanya n’achọghị ọdịmma onwe anyị nanị. Ọzọkwa, anyị pụrụ ịtụgharị uche n’ihe ndị gara aga ma mee atụmatụ maka ọdịnihu.—Ilu 4:7; Eklisiastis 3:1, 11; Maịka 6:8; Jọn 13:34; 1 Jọn 4:8.

Ihe kasị egosi na anyị nwere ikike nke iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe bụ ọchịchọ anyị bu pụta ụwa nke ife Chineke. Ọ gwụla ma ànyị gboro mkpa nke ịnọ Onye Okike anyị nso, anyị apụghị ịchọta ezi obi ụtọ, nke na-adịgidekwa adịgide. Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Otú ọ dị, anyị aghaghị ịkpachara anya iji eziokwu ime mmụọ gboo mkpa ahụ—eziokwu banyere Chineke, ụkpụrụ ya, na nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ebee ka anyị pụrụ ịchọta eziokwu ime mmụọ? Ọ bụ n’ime Bible.

“Okwu Gị Bụ Eziokwu”

Pọl onyeozi dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie.” (2 Timoti 3:16) Ihe Pọl kwuru kwekọrọ n’ihe Jizọs kwuru n’ekpere o kpegaara Chineke, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” Taa, anyị maara Okwu ahụ dị ka Bible Nsọ, ọ ga-abụkwara anyị ihe amamihe dị na ya ịhụ na nkwenkwe na ụkpụrụ anyị kwekọrọ n’ihe ndị dị n’ime ya.—Jọn 17:17.

Site n’iji Okwu Chineke na-atụle nkwenkwe anyị, anyị na-eṅomi ndị Biria oge ochie, bụ́ ndị gbalịrị ịchọpụta ma ihe Pọl na-akụzi ò kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. Kama ịkatọ ndị Biria, Luk jara ha mma maka àgwà ahụ ha kpara. O dere na ha “ji ọchịchọ obi siri nnọọ ike nabata okwu ahụ, jiri nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.” (Ọrụ 17:11) N’ihi na ozizi okpukpe na nke omume bụ́ ndị jupụtara ebe nile taa dịgasị nnọọ iche, ọ dị mkpa ka anyị ṅomie ihe nlereanya nke ndị Biria ahụ nwere obi sara mbara.

Ụzọ ọzọ isi mata eziokwu ime mmụọ bụ ile otú o si emetụta ndụ ndị mmadụ. (Matiu 7:17) Dị ka ihe atụ, ibi ndụ kwekọrọ n’eziokwu Bible kwesịrị ime ka mmadụ ghọọ di ka mma, nna ka mma, nwunye ka mma, ma ọ bụ nne ka mma, si otú a na-eme ka ezinụlọ na-enwekwu obi ụtọ, meekwa ka onye ahụ nwekwuo afọ ojuju. Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya.”—Luk 11:28.

Okwu Jizọs na-echetara anyị ihe Nna ya nke eluigwe kwuru, bụ́ onye gwara ụmụ Izrel oge ochie, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.” (Aịsaịa 48:17, 18) Arịrịọ ahụ e ji obiọma rịọ ga-emetụrịrị ndị nile hụrụ ihe dị mma na ezi omume n’anya n’obi!

Ụfọdụ Na-ahọrọ Ka E “Mee Ka Ntị Ha Na-akọ Ha Ọkọ”

Chineke rịọrọ ndị Izrel arịrịọ ahụ sitere n’obi n’ihi na e ji ụgha okpukpe na-eduhie ha. (Abụ Ọma 106:35-40) Anyị onwe anyị kwa aghaghị ịnọ na nche ka a ghara iji okwu ụgha duhie anyị. Pọl dere banyere ndị na-asị na ha bụ Ndị Kraịst, sị: “A ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anagide ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, n’ikwekọ n’ọchịchọ nke ha, ha ga-akpọkọjuru onwe ha ndị ozizi iji mee ka ntị ha na-akọ ha ọkọ; ha ga-ewepụkwa ntị ha n’ebe eziokwu ahụ dị.”—2 Timoti 4:3, 4.

Ndị ndú okpukpe na-eme ka ntị ndị mmadụ na-akọ ha ọkọ site n’ịnabata omume ọjọọ, dị ka mmadụ iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya na-enwe mmekọahụ, idina ụdị onwe na ịṅụbiga mmanya ókè. Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na ndị na-anabata ihe ndị dị otú ahụ nakwa ndị na-eme ha “agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Rom 1:24-32.

O doro anya na ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible chọrọ obi ike, karịsịa mgbe anyị zutere ndị na-akwa emo, ma ọ pụrụ ikwe omume. N’etiti Ndịàmà Jehova, e nwere ndị bụbu ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ndị aṅụrụma, ndị na-akwa iko, ndị agamevu, ndị ohi na ndị ụgha. N’agbanyeghị nke ahụ, ha nabatara Okwu Chineke, sitekwa n’enyemaka nke mmụọ nsọ, mee mgbanwe ná ndụ ha iji nwee ike ‘ije ije n’ụzọ kwesịrị Jehova.’ (Ndị Kọlọsi 1:9, 10; 1 Ndị Kọrint 6:11) N’ịbụ ndị e mere ka ha na Chineke dịrị n’udo, ha nwetakwara udo nke obi, dịkwa ka anyị ga-ahụ, ha nwere ezi olileanya maka ọdịnihu.

Olileanya Alaeze Ahụ

A ga-eji Alaeze Chineke emezu olileanya dabeere na Bible nke ụmụ mmadụ na-erube isi inwe udo na-adịgide adịgide. Jizọs kwuru n’ekpere nlereanya ya, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Ee, ọ bụ nanị Alaeze Chineke pụrụ ịhụ na e mere uche Chineke n’ụwa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Alaeze eluigwe ahụ—ọchịchị dị n’aka Jizọs Kraịst—bụ ihe Chineke ga-eji gosipụta oruru o ruuru Ya ịchị ụwa.—Abụ Ọma 2:7-12; Daniel 7:13, 14.

Dị ka Eze nke Alaeze eluigwe ahụ, Jizọs Kraịst ga-atọhapụ ụmụ mmadụ na-erube isi site n’ụdị agbụ nile, gụnyere njichi nke mmehie Adam jichiri ha na ọrịa na ọnwụ na-esi na ya apụta. Mkpughe 21:3, 4 na-ekwu, sị: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ . . . Ọ [Jehova Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”

A ga-enwe udo na-adịgide adịgide n’ebe nile n’ụwa. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na nke a ga-eme? E kpughere ihe mere a ga-eji jide ya n’aka n’Aịsaịa 11:9, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Ha [ndị Alaeze ahụ ga-achị] agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” Ee, mmadụ nile nọ n’ụwa ga-enweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke ma rubere ya isi. Atụmanya ahụ ọ́ dịghị eme gị obi ụtọ? Ya bụrụ otú ahụ, ugbu a bụ oge iji malite inweta “ihe ọmụma Jehova” nke dị oké ọnụ ahịa.

Ị̀ Ga-ege Ntị n’Ozi Alaeze Ahụ?

Site n’Alaeze ahụ, Chineke ga-emeghasị ọrụ nile Setan rụrụ ma kụziere ndị mmadụ ụzọ ezi omume Ya. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ozizi Jizọs lekwasịrị anya n’Alaeze ahụ. O kwuru, sị: ‘Aghaghịkwa m ịkpọsa ozi ọma banyere alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.’ (Luk 4:43) Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu izi ndị ọzọ otu ozi ahụ. (Matiu 28:19, 20) O buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ọgwụgwụ ahụ ji ọsọ na-abịa. Lezienụ otú o si dị mkpa ka ndị nwere obi eziokwu gee ntị n’ozi ọma ahụ na-azọpụta ndụ!

Albert, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, nụrụ ozi Alaeze ahụ mgbe nwunye ya na nwa ya nwoke malitere iso Ndịàmà Jehova amụ Bible. Na mbụ, Albert nwere obi abụọ. Ọbụna ọ gwara ụkọchukwu chọọchị ha ka ọ bịa leta nwunye ya na nwa ya nwoke iji gbaa ụgha nke Ndịàmà n’anwụ. Ma ụkọchukwu ahụ achọghị itinye ọnụ n’okwu ahụ. Ya mere, Albert kpebiri ige ntị ka Ndịàmà ahụ na nwunye ya na nwa ya na-enwe mkparịta ụka dabeere na Bible iji chọpụta ụgha dị n’ozizi Ndịàmà. Ka o sosịrị ha mụọ ihe otu ugboro, o sonyere n’ọmụmụ ihe ahụ, na-achọ ka a kụzitụkwuoro ya ihe. O mesịrị kọwaa ihe mere o ji gbanwee obi ya. O kwuru, sị: “Nke a bụ ihe m nọworo na-achọ.”

N’ikpeazụ, Albert malitere igbo mkpa ime mmụọ ya, ọ dịtụghị mgbe ọ laghachiri azụ. Eziokwu Bible mere ka o nweta ihe ọ nọworo na-achọ ná ndụ ya nile—ihe ga-akwụsị ikpe na-ezighị ezi na mpụ bụ́ ndị gbanyeworo mkpọrọgwụ n’obi ọha na eze nakwa olileanya maka ọdịnihu. Eziokwu Bible mere ka o nwee udo nke obi. À na-egbo mkpa ime mmụọ gị? Gịnị ma i wepụta oge iji gụọ ajụjụ ndị e depụtara n’igbe dị na peeji nke 6? Ọ bụrụ na ị chọrọ inwetakwu ihe ọmụma, Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6]

À NA-EGBO MKPA IME MMỤỌ GỊ?

Nri ime mmụọ ị na-enweta ọ̀ na-eju gị afọ? Anyị na-akpọ gị òkù ka ị gụọ ajụjụ ndị na-esonụ ma kanye akara ná ndị ị pụrụ ịza nke ọma.

□ Ònye bụ Chineke, gịnịkwa bụ aha ya?

□ Ònye bụ Jizọs Kraịst? Gịnị mere o ji nwụọ? Olee otú ọnwụ ya pụrụ isi baara gị uru?

□ È nwere Ekwensu? Ọ bụrụ na e nwere, ebee ka o si bịa?

□ Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?

□ Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ?

□ Gịnị bụ Alaeze Chineke?

□ Gịnị bụ ụkpụrụ Chineke maka omume ọma?

□ N’ime ezinụlọ, olee ọrụ Chineke kenyere di, oleekwa nke o kenyere nwunye? Olee ụfọdụ ụkpụrụ Bible ndị na-eme ka e nwekwuo obi ụtọ n’ezinụlọ?

Ọ bụrụ na e nwere ajụjụ nke ị na-amaghị azịza ya n’ime ajụjụ ndị a, ị pụrụ ịrịọ ka e wetara gị broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Ndịàmà Jehova bipụtara broshuọ a n’ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị asụsụ atọ, o nwekwara isiokwu 16 ndị bụ́ isi dabeere na Bible ma nye azịza dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke ajụjụ nile e depụtara n’elu.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

N’adịghị ka ụmụ anụmanụ, ụmụ mmadụ nwere mkpa ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 5]

“Ha ga-akpọkọjuru onwe ha ndị ozizi iji mee ka ntị ha na-akọ ha ọkọ.”—2 Timoti 4:3

[Foto dị na peeji nke 7]

Alaeze Mezaịa nke Chineke ga-eweta udo na-adịgide adịgide