Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Okwu Ebiela”

“Okwu Ebiela”

“Okwu Ebiela”

N’AFỌ 2002, Ndịàmà Jehova mere mgbakọ distrikti n’obodo Mbandaka, n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Democratic Republic of Congo. Mgbe e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Lingala ná mgbakọ ahụ, ndị na-ege ntị wụliri elu n’ihi ọṅụ, anya mmiri gbakwara ụfọdụ. Ka e mesịrị, ndị mmadụ gbagara n’elu ikpo okwu iji lerukwuo Bible ọhụrụ ahụ anya, na-eti, sị: “Basuki, Basambwe,” nke pụtara: “Okwu ebiela! Ihere emeela ha!”

Gịnị mere ndị na-ege ntị ji nwee obi ụtọ dị ukwuu otú ahụ, gịnịkwa ka ha bu n’uche kwuo ihe ndị ahụ ha kwuru? N’akụkụ ụfọdụ nke Mbandaka, Ndịàmà Jehova anaghị azụtali Bible ndị e dere n’asụsụ Lingala. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị chọọchị jụrụ iresị ha Ndịàmà Jehova. Ndịàmà aghaghị ịgwa ndị ọzọ ka ha zụpụtara ha ya. Ugbu a, ha nwere obi ụtọ dị ukwuu n’ihi na ndị chọọchị apụghịzi igbochi ha inweta Bible.

Ọ bụghị nanị Ndịàmà Jehova ka nsụgharị ọhụrụ ahụ ga-abara uru kamakwa, ọ ga-abara ọha na eze uru. Otu nwoke nke pụrụ ịnọ n’ụlọ ya nụ ihe a na-ekwu ná mgbakọ site n’ígwè okwu, detaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova akwụkwọ ozi, na-asị: “Mwepụta nke Bible a mere m nnọọ obi ụtọ. Ọ ga-eme ka anyị mụta ọtụtụ ihe. Abụghị m Onyeàmà Jehova, ma anọ m nnọọ na-eche ka e bipụta Bible a unu ka bipụtara.”

E nwere Bible New World Translation of the Holy Scriptures ugbu a n’ozuzu n’asụsụ 33, e nwekwara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ 19 ọzọ, gụnyere Lingala. Gịnị ma ị jụọ otu n’ime Ndịàmà Jehova otú ị pụrụ isi nweta otu nsụgharị a magburu onwe ya?