Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ozi Ọma Maka Ndị nke Mba Nile

Ozi Ọma Maka Ndị nke Mba Nile

Ozi Ọma Maka Ndị nke Mba Nile

“Unu ga-agbakwa àmà banyere m . . . ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.”—ỌRỤ 1:8.

1. Dị ka ndị nkụzi Bible, na gịnị ka anyị na-elekwasị anya, n’ihi gịnịkwa?

EZIGBO ndị nkụzi anaghị elekwasị anya nanị n’ihe ha na-agwa ụmụ akwụkwọ ha, kamakwa n’otú ha si ekwu ya. Dị ka ndị nkụzi nke eziokwu Bible, anyị na-eme otu ihe ahụ. Anyị na-elekwasị anya ma n’ozi anyị na-ezisa ma n’usoro anyị na-agbaso. Ozi anyị, nke bụ́ ozi ọma Alaeze Chineke, adịghị agbanwe agbanwe, ma mgbe ụfọdụ anyị na-agbanwe usoro anyị ji eme ihe. N’ihi gịnị? Ọ bụ iji nwee ike iji ya gakwuru ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee.

2. Ọ bụrụ na anyị ana-agbanwe usoro anyị ji eme nkwusa, ole ndị ka anyị na-eṅomi?

2 Site n’ịgbanwe usoro anyị ji eme nkwusa, anyị na-eṅomi ndị ohu Chineke nke oge ochie. Were Pọl onyeozi dị ka ihe atụ. O kwuru, sị: “N’ebe ndị Juu nọ, adịrị m ka onye Juu . . . N’ebe ndị na-enweghị iwu nọ, adịrị m ka onye na-enweghị iwu . . . N’ebe ndị na-adịghị ike nọ, aghọrọ m onye na-adịghị ike, ka m wee rite ndị na-adịghị ike n’uru. Aghọwo m ihe nile n’ebe ụdị mmadụ nile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị.” (1 Ndị Kọrint 9:19-23) Mgbanwe ndị Pọl mere n’usoro o ji mee nkwusa rụpụtara ihe. Anyị onwe anyị kwa ga-adị irè ma ọ bụrụ na anyị ejiri obiọma na-agbanwe usoro anyị ji eme nkwusa iji kwekọọ n’ọnọdụ ndị anyị na-agwa okwu.

Ruo ná “Nsọtụ Nile nke Ụwa”

3. (a) Olee ihe ịma aka anyị na-eche ihu n’ọrụ nkwusa anyị? (b) Olee otú e si emezu ihe dị n’Aịsaịa 45:22 taa?

3 Otu nnukwu ihe ịma aka na-eche ndị na-ekwusa ozi ọma ihu bụ otú ókèala ha haruru—“ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:14) N’ime narị afọ gara aga, ọtụtụ ndị ohu Jehova rụsiri ọrụ ike ịgbasa ozi ọma ahụ n’ala ọhụrụ ndị ọzọ. Gịnị siri na ya pụta? Mmụba dị ukwuu n’ụwa nile. Ná mmalite narị afọ nke 20, e mere nkwusa nanị n’ala ole na ole, ma ugbu a, Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike na narị ala abụọ na iri atọ na ise! N’ezie, a na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ọbụna ruo ná “nsọtụ nile nke ụwa.”—Aịsaịa 45:22.

4, 5. (a) Olee ndị kereworo òkè pụtara ìhè n’ikwusa ozi ọma ahụ? (b) Gịnị ka alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ kwuru banyere ndị si mba ọzọ bụ́ ndị na-eje ozi n’ókèala alaka ha?

4 Gịnị mere e ji nwee ọganihu dị otú ahụ? E nwere ọtụtụ ihe kpatara ya. Ndị ozi ala ọzọ a zụrụ na Watchtower Bible School of Gilead nakwa, n’oge na-adịchabeghị anya, ihe ruru iri puku mmadụ abụọ bụ́ ndị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, atụnyela ụtụ dị ukwuu. Otú ahụkwa ka ọ dị ọtụtụ Ndịàmà bụ́ ndị ji ego ha kwaga n’ala ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ndị Kraịst dị otú ahụ—ndị ikom na ndị inyom, ndị na-eto eto na ndị agadi, ndị na-alụbeghị di na nwunye na ndị lụworonụ—bụ́ ndị na-achụ onwe ha n’àjà, na-ekere òkè pụtara ìhè n’ikwusa ozi Alaeze ahụ n’ụwa nile. (Abụ Ọma 110:3; Ndị Rom 10:18) Anyị ji ha kpọrọ ihe nke ukwuu. Rịba ama ihe alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ dere banyere ndị si mba ọzọ bụ́ ndị na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu n’ókèala alaka ha.

5 “Ndịàmà a anyị hụrụ n’anya na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ, na-enye aka ihiwe ọgbakọ ndị ọhụrụ ma na-atụnye ụtụ n’uto ime mmụọ nke ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bi ná mba a.” (Ecuador) “Ọ bụrụ na ọtụtụ narị ndị ala ọzọ na-eje ozi ebe a alaa, ọ ga-emetụta nkwụsi ike nke ọgbakọ ndị e nwere ebe a. Ọnụnọ anyị na ha nọ bụ ngọzi.” (Dominican Republic) “N’ọtụtụ ọgbakọ anyị, ụmụnna nwanyị ka nnọọ ụmụnna nwoke n’ọnụ ọgụgụ, mgbe ụfọdụ, ruo ihe dị ka pasent 70. (Abụ Ọma 68:11) Ihe ka ọtụtụ n’ime ha batara ọhụrụ n’eziokwu ahụ, ma ụmụnna nwanyị ndị ọsụ ụzọ na-alụbeghị di bụ́ ndị si ala ọzọ na-enye nnọọ aka site n’ịzụ ndị ọhụrụ dị otú a. Ụmụnna nwanyị a si mba ọzọ bụụrụ anyị onyinye n’ezie!” (Otu ala dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe) Ì chetụla banyere ije ozi ná mba ọzọ? *Ọrụ 16:9, 10.

“Ndị Ikom Iri Ga-esi n’Asụsụ Nile”

6. Olee otú Zekaraịa 8:23 si arụtụ aka n’ihe ịma aka anyị ga-enwe n’ọrụ nkwusa anyị n’ihe metụtara asụsụ?

6 Nnukwu ihe ịma aka ọzọ e nwere bụ ọtụtụ asụsụ a na-asụ n’ụwa. Okwu Chineke buru amụma, sị: “Na mgbe ahụ ka ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ́ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) Ná mmezu nke oge a nke amụma a, ndị ikom iri ahụ na-anọchi anya oké ìgwè mmadụ ahụ e buru n’amụma ná Mkpughe 7:9. Otú ọ dị, rịba ama na dị ka amụma Zekaraịa si kwuo, “ndị ikom iri” ahụ ga-esi ọ bụghị nanị ná mba nile kamakwa ‘n’asụsụ nile nke mba nile.’ Ànyị ahụla mmezu nke akụkụ a dị mkpa nke amụma ahụ? Eenụ.

7. Olee ihe ndekọ ndị na-egosi na a na-ezi ndị si “n’asụsụ nile” ozi ọma?

7 Tụlee ihe ndekọ ụfọdụ. N’ime afọ 50 gara aga, a na-ebipụta akwụkwọ anyị n’asụsụ 90. Taa, ọnụ ọgụgụ ahụ akarịala narị anọ. “Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-eme ihe nile ha nwere ike ime iwepụta akwụkwọ e ji amụ Bible ọbụna n’asụsụ ndị ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ mmadụ ole na ole na-asụ ha. (Matiu 24:45) Dị ka ihe atụ, e nwere akwụkwọ e ji amụ Bible ugbu a n’asụsụ Greenlandic (nke iri puku mmadụ anọ na puku asaa na-asụ), Palauan (nke puku mmadụ iri na ise na-asụ), na Yapese (nke ihe na-erughị puku mmadụ asaa na-asụ).

“Ọnụ Ụzọ Buru Ibu” nke Na-eme Ka E Nwee Ohere Ndị Ọhụrụ

8, 9. Olee ihe omume meghewooro anyị “ọnụ ụzọ buru ibu,” oleekwa ihe ọtụtụ puku Ndịàmà merela?

8 Otú ọ dị, n’ụbọchị ndị a, o nwere ike ọ gaghị adị anyị mkpa ịgawa mba ọzọ iji kwusaara ndị na-asụ asụsụ nile ozi ọma. N’afọ ndị na-adịchabeghị anya, nkwabata nke ọtụtụ nde ndị mmadụ nakwa ndị gbagara ọsọ ndụ n’ala ndị bara ọgaranya emeela ka e nwee ọtụtụ ógbè ebe a na-asụ ọtụtụ asụsụ ndị mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, a na-asụ ihe dị ka otu narị asụsụ na Paris, France. Na Toronto, Canada, a na-asụ otu narị asụsụ na iri abụọ na ise; na London England kwa, a na-asụ ihe karịrị narị atọ nke asụsụ mba ọzọ! Ọnụnọ nke ndị si mba ọzọ nọ n’ókèala nke ọtụtụ ọgbakọ na-emeghe “ọnụ ụzọ buru ibu” nke na-eme ka e nwee ohere ndị ọhụrụ iji kwusaara ndị nke mba nile ozi ọma.—1 Ndị Kọrint 16:9.

9 Ọtụtụ Ndịàmà na-emeri ihe ịma aka ahụ site n’ịmụ asụsụ ọzọ. Ọ na-esiri ihe ka ọtụtụ n’ime ha ike ime otú ahụ; n’agbanyeghị nke ahụ, a na-eji ọṅụ nke na-abịa site n’inyere ndị si mba ọzọ kwabata na ndị gbara ọsọ ndụ aka ịmụta eziokwu ahụ a na-achọta n’Okwu Chineke akwụghachi ha nnọọ ụgwọ maka mgbalị ha. N’afọ ndị na-adịchabeghị anya, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na pasent 40 nke ndị nile e mere baptizim ná mgbakọ distrikti e nwere n’otu mba dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe sicha n’ala ọzọ.

10. Olee otú i sirila jiri akwụkwọ nta ahụ bụ́ Good News for People of All Nations mee ihe? (Lee igbe bụ́ “Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Nta Bụ́ Good News for People of All Nations,” nke dị na peeji nke 26.)

10 N’ezie, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị anọghị n’ọnọdụ ga-enye ha ohere ịmụ asụsụ ala ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ ikere òkè n’inyere ndị si mba ọzọ kwabata aka site n’iji akwụkwọ nta ahụ e wepụtara ọhụrụ bụ́ Good News for People of All Nations, (Ozi Ọma Maka Ndị nke Mba Nile) * na-eme ihe, akwụkwọ nta a nwere ozi Bible na-adọrọ adọrọ nke e dere n’ọtụtụ asụsụ. (Jọn 4:37) Ị̀ na-eji ya eme ihe n’ozi ubi?

Mgbe Ndị Mmadụ Na-egeghị Ntị

11. Olee ihe ịma aka ọzọ a na-enwe n’ókèala ụfọdụ?

11 Ka mmetụta Setan na-enwe n’ụwa na-amụba, a na-enwekarị ihe ịma aka ọzọ—ndị mmadụ adịghị egecha ntị n’ókèala ụfọdụ. N’ezie, ọnọdụ a adịghị atụ anyị n’anya, ebe ọ bụ na Jizọs kwuru na ọnọdụ dị otú ahụ ga-adị. O kwuru banyere oge anyị a, sị: “Ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.” (Matiu 24:12) N’ezie, ọtụtụ mmadụ ekwenyeghịzi na Chineke, ha anaghịzikwa akwanyere Bible ùgwù. (2 Pita 3:3, 4) N’ihi nke a, n’akụkụ ụwa ụfọdụ, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-aghọ ndị ọhụrụ na-eso ụzọ Kraịst. Otú ọ dị, nke ahụ apụtaghị na ezi ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị, bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ekwusa ozi ọma n’ókèala ndị dị otú ahụ bụ́ ebe ndị mmadụ na-adịghị ege ntị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu. (Ndị Hibru 6:10) N’ihi gịnị? Tụlee ihe ndị na-esonụ.

12. Olee ihe abụọ mere anyị ji ekwusa ozi ọma?

12 Oziọma Matiu mere ka isi ihe abụọ mere anyị ji ekwusa ozi ọma pụta ìhè. Otu n’ime ha bụ na anyị na-eme “ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.” (Matiu 28:19) Nke ọzọ bụ na ozi Alaeze ahụ bụ “àmà.” (Matiu 24:14) Ha abụọ dịcha mkpa, ma nke abụọ kasị mkpa. N’ihi gịnị?

13, 14. (a) Olee akụkụ ga-akasị pụta ìhè n’ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Kraịst? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche, karịsịa mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma n’ókèala ebe ndị mmadụ na-adịghị egecha ntị?

13 Matiu bụ́ onye so dee Bible dere na ndịozi jụrụ Jizọs, sị: “Gịnị [ga-abụ] ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a?” (Matiu 24:3) Ná nzaghachi, Jizọs kwuru na akụkụ ihe ịrịba ama ahụ nke ga-akasị pụta ìhè ga-abụ ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ. Ọ̀ na-ekwu banyere ime ndị na-eso ụzọ? Ee e. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14) Jizọs si otú ahụ gosi na ọrụ nkwusa Alaeze ahụ n’onwe ya ga-abụ akụkụ dị mkpa nke ihe ịrịba ama ahụ.

14 N’ihi ya, ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ, anyị na-echeta na ọ bụrụgodị na ọ bụghị mgbe nile ka anyị metara ndị na-eso ụzọ, anyị na-agba nnọọ “àmà.” N’agbanyeghị otú ndị mmadụ si meghachi omume, ha maara ihe anyị na-eme, anyị sikwa otú ahụ na-emezu amụma Jizọs. (Aịsaịa 52:7; Mkpughe 14:6, 7) Jordy, bụ́ Onyeàmà na-eto eto nke bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe, kwuru, sị: “Ịmara na Jehova ji m eme ihe n’imezu ihe dị na Matiu 24:14 na-eme m obi ụtọ.” (2 Ndị Kọrint 2:15-17) Obi abụọ adịghị ya na ọ dị gị otú ahụ.

Mgbe A Na-emegide Ozi Anyị

15. (a) Banyere gịnị ka Jizọs buru ụzọ dọọ ụmụazụ ya aka ná ntị? (b) Gịnị na-enyere anyị aka ikwusa ozi ọma n’agbanyeghị mmegide?

15 Mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ bụ ihe ịma aka ọzọ a na-enwe n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ. Jizọs buru ụzọ dọọ ụmụazụ ya aka ná ntị, sị: “Mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Matiu 24:9) Dị ka Ndị Kraịst oge mbụ, a kpọọla ụmụazụ Jizọs nke oge a asị, megide ha, kpagbuokwa ha. (Ọrụ 5:17, 18, 40; 2 Timoti 3:12; Mkpughe 12:12, 17) Ka ọ dị ugbu a n’ala ụfọdụ, gọọmenti amachibidola ha iwu. N’agbanyeghị nke ahụ, n’irubere Chineke isi, ezi Ndị Kraịst nọ n’ala ndị dị otú ahụ nọgidere na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ. (Emọs 3:8; Ọrụ 5:29; 1 Pita 2:21) Gịnị na-enyere ha na Ndịàmà ndị ọzọ nọ n’ụwa nile aka ime otú ahụ? Jehova na-eji mmụọ nsọ ya enye ha ike.—Zekaraịa 4:6; Ndị Efesọs 3:16; 2 Timoti 4:17.

16. Olee otú Jizọs si gosi njikọ dị n’etiti ọrụ nkwusa na mmụọ Chineke?

16 Jizọs mere ka njikọ dị n’etiti mmụọ Chineke na ọrụ nkwusa pụta ìhè mgbe ọ gwara ụmụazụ ya, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-agbakwa àmà banyere m . . . ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8; Mkpughe 22:17) Usoro ihe ndị e dere n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a ji mee dị mkpa. Nke mbụ, ndị na-eso ụzọ ahụ natara mmụọ nsọ ma malitezie ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụ nanị site ná nkwado nke mmụọ Chineke ka ha ga-enwe ike ịtachi obi n’ịgba “àmà nye mba nile.” (Matiu 24:13, 14; Aịsaịa 61:1, 2) Ya mere, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, Jizọs kpọrọ mmụọ nsọ ahụ “ihe inyeaka.” (Jọn 15:26) O kwuru na mmụọ Chineke ga-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe, duziekwa ha.—Jọn 14:16, 26; 16:13.

17. Mgbe mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ chere anyị ihu, olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka?

17 N’ụzọ ndị dị aṅaa ka mmụọ Chineke si enyere anyị aka taa mgbe anyị na-eche mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ihu n’ihi ikwusa ozi ọma? Mmụọ Chineke na-ewusi anyị ike, ọ na-emegidekwa ndị na-akpagbu anyị. Iji maa atụ, tụlee ihe mere ná ndụ Eze Sọl.

Ịbụ Onye Mmụọ Chineke Megidere

18. (a) Olee otú Sọl si si n’ịbụ ezigbo mmadụ ghọọ nnọọ onye ọjọọ? (b) Olee ụzọ ndị Sọl si kpagbuo Devid?

18 Sọl malitere nke ọma dị ka eze mbụ nke Izrel, ma mesịa nupụrụ Jehova isi. (1 Samuel 10:1, 24; 11:14, 15; 15:17-23) N’ihi ya, mmụọ Chineke kwụsịrị ịkwado eze ahụ. Sọl malitere iweso Devid iwe ọkụ, bụ́ onye e tere mmanụ ịnọchi ya dị ka eze, onye nwekwara nkwado nke mmụọ Chineke. (1 Samuel 16:1, 13, 14) O yiri ka Devid ọ̀ dị mfe nnweta. A sị kwuwe, nanị ụbọ akwara ka o ji, ebe Sọl ji ube. Ya mere, otu ụbọchị mgbe Devid nọ na-akpọ ụbọ akwara ya, “Sọl wee tụọ ube ahụ; ọ sị, M ga-atụgide Devid ọbụna ná mgbidi. Devid wee chigharịa onwe ya si n’ihu ya pụọ ugboro abụọ.” (1 Samuel 18:10, 11) Ka e mesịrị, Sọl gere Jonatan nwa ya, bụ́ enyi Devid, ntị ma ṅụọ iyi, sị: “Jehova na-adị ndụ, a gaghị eme ka [Devid] nwụọ ma ọlị.” Ma, ka nke ahụ gasịrị, Sọl “wee chọọ iwere ube ahụ tụgide Devid ọbụna ná mgbidi.” Otú ọ dị, Devid “hepụrụ n’ihu Sọl, o wee tụgide ube ahụ ná mgbidi.” Devid gbalagara, ma Sọl chụwara ya. N’oge ahụ siri oké ike, mmụọ Chineke nọ na-emegide Sọl. N’ụzọ dị aṅaa?—1 Samuel 19:6, 10.

19. Olee otú mmụọ Chineke si chebe Devid?

19 Devid gbakwuuru Samuel onye amụma, ma Sọl zigara ndị ikom ya ịkpụta Devid. Otú ọ dị, mgbe ha bịarutere ebe Devid zoro, “mmụọ nke Chineke wee dịkwasị ndị ozi Sọl, ha onwe ha wee buokwa amụma.” Mmụọ Chineke karịrị ha ike nke na ha chefuru nnọọ ihe mere ha ji bịa. Sọl zigara ndị ikom ugboro abụọ ọzọ ka ha gaa kpụta Devid, ma otu ihe ahụ mere na nke ọ bụla. N’ikpeazụ, Eze Sọl n’onwe ya gakwuuru Devid, ma Sọl apụghị iguzogide mmụọ Chineke. N’ezie, mmụọ Chineke mere ka ọ ghara inwe ike ịgagharị agagharị “ụbọchị ahụ nile na abalị ya nile”—nke nyere Devid oge zuru ezu ịgbalaga.—1 Samuel 19:20-24.

20. Olee ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ banyere mmegide Sọl megidere Devid?

20 Ihe ndekọ a banyere Sọl na Devid nwere ihe mmụta na-ewusi mmadụ ike: Ndị na-emegide ndị ohu Chineke agaghị enwe ihe ịga nke ọma ma mmụọ Chineke megide ha. (Abụ Ọma 46:11; 125:2) Jehova zubere na Devid ga-abụ eze Izrel. Ọ dịghị onye pụrụ ịgbanwe nke ahụ. N’oge anyị a, Jehova ekpebiela na ‘a ga-ekwusa ozi ọma nke alaeze’ ahụ. Ọ dịghị onye ga-egbochili nke ahụ imezu.—Ọrụ 5:40, 42.

21. (a) Olee otú ụfọdụ ndị mmegide nke oge a si akpa àgwà? (b) Obi ike dị aṅaa ka anyị nwere?

21 Ụfọdụ ndị ndú okpukpe na ndị isi ọchịchị na-eji ụgha na ọbụna ime ihe ike agbalị igbochi anyị. Otú ọ dị, dị ka Jehova chebere Devid n’ụzọ ime mmụọ, Ọ ga-echebekwa ndị Ya n’oge a. (Malakaị 3:6) N’ihi ya, dị ka Devid, anyị ji obi ike na-ekwu, sị: “Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịworo obi, m gaghị atụ egwu; gịnị ka anụ ahụ́, bụ́ mmadụ, ga-eme m? (Abụ Ọma 56:11; 121:1-8; Ndị Rom 8:31) Site n’enyemaka Jehova, ka anyị nọgide na-anagide ihe ịma aka nile anyị na-ezute ka anyị na-arụ ọrụ Chineke nyere anyị ikwusara ndị nke mba nile ozi ọma Alaeze ahụ.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 5 Lee igbe bụ́ “Ezi Afọ Ojuju,” nke dị na peeji nke 22.

^ par. 10 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Icheta?

• Gịnị mere anyị ji agbanwe usoro anyị ji eme nkwusa?

• “Ọnụ ụzọ buru ibu” nke na-eme ka e nwee ohere ọhụrụ ndị dị aṅaa meghere?

• Olee ihe ọrụ nkwusa anyị na-arụzu ọbụna n’ókèala ebe ndị mmadụ na-adịghị egecha ntị?

• Gịnị mere na ọ dịghị onye mmegide pụrụ ịkwụsị nkwusa nke ozi ọma Alaeze ahụ?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Igbe dị na peeji nke 22]

Ezi Afọ Ojuju

“Ndị ji obi ụtọ na ịdị n’otu na-ejere Jehova ozi.” Nke ahụ bụ otú e si kọwaa otu ezinụlọ si Spain kwaga Bolivia. Otu nwa ha nwoke gara ebe ahụ inyere otu ìgwè dịpụrụ adịpụ aka. Ọṅụ doro anya o nwetara masịrị ndị mụrụ ya nke na n’oge na-adịghị anya, ezinụlọ ahụ nile—gụnyere ụmụ ha ndị nwoke anọ, ndị nọ n’agbata afọ 14 ruo 25—na-ejezi ozi n’ebe ahụ. Atọ n’ime ụmụ nwoke anọ ahụ bụ ndị ọsụ ụzọ, nke ahụ bu ụzọ gaa gakwara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na nso nso a.

Angelica, onye dị afọ 30, nke si Canada, bụ́ onye na-eje ozi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, na-ekwu, sị: “Ihe ịma aka dị na ya dị ọtụtụ, ma ana m enweta afọ ojuju site n’inyere ndị mmadụ aka n’ozi. Okwu ekele nke ọtụtụ Ndịàmà ebe ahụ, bụ́ ndị na-abịakarị ekele m maka ịbịa inyere ha aka, na-emetụkwa m n’obi.”

Ụmụnne abụọ ndị si United States, ndị fọrọ obere ka ha gbaa afọ 30, bụ́ ndị na-eje ozi na Dominican Republic, na-ekwu, sị: “E nwere nnọọ ọtụtụ omenala anyị ga-eme ka ha mara anyị ahụ́. Otú ọ dị, anyị nọgidere n’ebe e kenyere anyị ọrụ, mmadụ asaa n’ime ndị anyị na-amụrụ Bible na-abịakwa nzukọ ugbu a.” E ji ụmụnne abụọ a mee ihe n’ihiwe otu ìgwè nke ndị nkwusa Alaeze n’otu ebe a na-enweghị ọgbakọ.

Laura, bụ́ nwanna nwanyị fọrọ obere ka ọ gbaa afọ 30, anọwo na-eje ozi n’ofesi ruo ihe karịrị afọ anọ. Ọ na-ekwu, sị: “Ama m ụma mee ka ndụ m dị mfe. Nke a na-enyere ndị nkwusa aka ịhụ na ọ bụ mmadụ na-ahọrọ ibi ndụ dị mfe n’onwe ya, nakwa na ọ na-esite ná mmadụ inwe uche zuru okè, ọ bụghị n’ihi na mmadụ dara ogbenye. Inwe ike inyere ndị ọzọ aka, karịsịa ndị na-eto eto, enyela m obi ụtọ nke na-eme ka m chefuo ihe isi ike ndị na-adị n’ije ozi ná mba ọzọ. Agaghị m eji ụdị ndụ ọzọ gbanwere ozi m na-eje ebe a, aga m anọgidekwa na ya ruo mgbe Jehova kwere ka m nọruo.”

[Igbe na Foto dị na peeji nke 26]

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Nta Bụ́ Good News for People of All Nations

Akwụkwọ nta ahụ bụ́ Good News for People of All Nations (Ozi Ọma Maka Ndị nke Mba Nile) nwere ozi dị otu peeji nke e dere n’ihe ruru asụsụ 92. E dere ozi ahụ dị ka à ga-asị na mmadụ na-agwa gị okwu. N’ihi ya, mgbe onye nwe ụlọ gụrụ ozi ahụ, ọ ga-adị ya ka ị̀ na-agwa ya okwu.

E sere map ụwa n’ime mkpo akwụkwọ ahụ. Jiri map a mee ihe dị ka ụzọ isi mee ka gị na onye nwe ụlọ bụrụ enyi. Ikekwe, ị pụrụ ịrụtụ aka ná mba ebe i bi ma mee ka ọ mara na ị ga-achọ ịmara ebe o si. N’ụzọ dị otú ahụ, ị pụrụ ime ka o kwuo uche ya ma mee ka unu jiri ahụ́ iru ala kparịta ụka dị ka enyi na enyi.

N’okwu mmalite nke akwụkwọ nta a, e depụtara nzọụkwụ dị iche iche ndị anyị kwesịrị iwere iji nyere ndị na-asụ asụsụ anyị na-adịghị anụ aka n’ụzọ dị irè. Biko, gụọ nzọụkwụ ndị a nke ọma ma jiri nlezianya tinye ha n’ọrụ.

N’akụkụ bụ́ ihe ndị dị n’ime ya, e depụtara ọ bụghị nanị asụsụ dị iche iche kamakwa akara kwekọrọ n’asụsụ nke ọ bụla. Nke a ga-enyere gị aka ịmata akara asụsụ ndị e biri na traktị na n’akwụkwọ anyị ndị ọzọ n’asụsụ dị iche iche.

[Foto]

Ị̀ na-eji akwụkwọ nta a eme ihe n’ozi?

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible dị ugbu a n’ihe karịrị narị asụsụ anọ

GHANA

PHILIPPINES

LAPLAND (SWEDEN)

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Ị̀ pụrụ ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze?

ECUADOR

DOMINICAN REPUBLIC