Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ìhè Na-enwu Bbaa” Amụkwasị Bible Site n’Ọ́bá Akwụkwọ Kasị Ochie na Russia

“Ìhè Na-enwu Bbaa” Amụkwasị Bible Site n’Ọ́bá Akwụkwọ Kasị Ochie na Russia

“Ìhè Na-enwu Bbaa” Amụkwasị Bible Site n’Ọ́bá Akwụkwọ Kasị Ochie na Russia

NDỊ ọkà mmụta abụọ nọ na-achọ ihe odide ochie nke Bible. Onye nke ọ bụla n’ime ha mere njem gabiga ọzara ma chọgharịa n’ọgba, ebe obibi ndị mọnk, nakwa n’ebe obibi ndị oge ochie ndị dị n’elu ugwu. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ha zutere n’ọ́bá akwụkwọ ọha na eze kasị ochie e nwere na Russia, bụ́ ebe a chọtara ihe odide Bible ndị kasị akpali akpali ụwa hụtụrụla. Ole ndị ka ndị ikom a bụ? Olee otú ihe ndị dị oké ọnụ ahịa ha chọtara si rute Russia?

Ihe Odide Oge Ochie—Ihe Ndị Na-agbara Okwu Chineke Akaebe

Iji mata onye otu n’ime ndị ọkà mmụta a bụ, anyị aghaghị ịgụ banyere ihe ndị mere ná mmalite narị afọ nke 19 bụ́ mgbe ndị ọkachamara na-eme mgbanwe n’ebe nile na Europe. Ọ bụ oge e nwere ọganihu n’ụzọ nkà mmụta sayensị bụ́kwa mgbe a rụpụta ọtụtụ ihe n’ụzọ ọdịnala,” ihe ndị a rụzuru n’oge a mekwara ka a malite inyo nkwenkwe ndị dịbu adị enyo. Ndị oké nkatọ nwara ime ka a kwụsị ịtụkwasị Bible obi. N’ezie, ndị ọkà mmụta nọ na-ekwupụta obi abụọ ha nwere banyere ịbụ eziokwu nke ihe ndị e dere na Bible.

Ụfọdụ ndị ji ezi obi na-agbachitere Bible ghọtara na ihe akaebe ndị ọhụrụ—ihe odide ochie nke Bible bụ́ ndị a na-achọpụtabeghị mgbe ahụ—ga-eme nnọọ ka a tụkwasị Okwu Chineke obi. Ọ bụrụ na e nwee ike ịchọta ihe odide ndị e dere tupu ndị nke e nwere n’oge ahụ, ha ga-agba akaebe na ihe ndị dị na Bible ziri ezi, n’agbanyeghị na ọ dịla anya a gbalịwara ibibi ma ọ bụ ịgwagbu ozi ya. Ihe odide ndị dị otú ahụ pụkwara ikpughe ebe ole na ole e denyere ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị n’ihe odide Bible.

Ọ bụ na Germany ka a nọrọ nwee ụfọdụ n’ime arụmụka ndị kasị sie ike banyere ịbụ eziokwu nke Bible. Otu nwa okorobịa bụ́ onye prọfesọ n’ebe ahụ hapụrụ ọrụ nkụzi ya na-eme ka ahụ́ ruo ya ala ma mee njem nke ga-eme ka ọ chọta ihe odide Bible kasị mkpa a chọtatụrụla. Aha ya bụ Konstantin von Tischendorf, bụ́ ọkà mmụta Bible nke ọjụjụ ọ jụrụ oké nkatọ Bible mere ka o nwee nnọọ ihe ịga nke ọma n’ịgbachitere ịbụ eziokwu nke ihe odide Bible. O nwere nnọọ ihe ịga nke ọma a na-atụghị anya ya mgbe o mere njem mbụ ya gaa n’ịkpa Saịnaị n’afọ 1844. Anya nkịtị o nyobara n’ebe mkpofu ahịhịa dị n’ebe obibi ndị mọnk mere ka ọ hụ ihe odide oge ochie nke Septuagint, ma ọ bụ nsụgharị Grik nke Akwụkwọ Nsọ Hibru—ihe odide kasị ochie a hụtụrụla!

N’obi ụtọ, Tischendorf jisiri ike were mpempe 43 laa. N’agbanyeghị na o kwenyesiri ike na ọ ka fọrọ ebe ahụ, mgbe ọ gaghachiri na 1853, ọ bụ nanị ihe odide na-ezughị ezu ka ọ hụrụ. Ebee ka ndị nke ọzọ dị? Ebe ego gwụnahụrụ Tischendorf, ọ chọrọ enyemaka nke onye aka ji akụ̀, o kpebikwara ịhapụ obodo ya ọzọ iji chọọ ihe odide ochie. Otú ọ dị, tupu ya emee njem a, ọ ga-arịọ eze ukwu Russia ka ọ nabata ya.

Eze Ukwu Egosi Mmasị

Ọ pụrụ nnọọ ịbụ na Tischendorf nọ na-eche otú a ga-esi nabata ya na Russia bụ́ nnukwu obodo nabatarala okpukpe Ọtọdọks nke Russia ebe ya onwe ya bụ ọkà mmụta bụ́ onye Protestant. Ọ bụ ihe obi ụtọ na Russia abanyela n’oge mgbanwe mgbe ahụ. Eze Nwanyị Ukwu Catherine nke Abụọ (onye a makwa dị ka Catherine Onye Ukwu) ehiwela Ọ́bá Akwụkwọ Alaeze Ukwu nke St. Petersburg n’afọ 1795 n’ihi mmalite a malitere iji agụmakwụkwọ kpọrọ oké ihe. Dị ka ọ́bá akwụkwọ ọha na eze mbụ e nwere na Russia, o meela ka ọtụtụ nde mmadụ nwee ike ịgụ ọtụtụ akwụkwọ.

N’agbanyeghị na e toro ya dị ka otu n’ime ọ́bá akwụkwọ ndị kasị mma e nwere na Europe, Ọ́bá Akwụkwọ Alaeze Ukwu ahụ nwere otu ihe na-adọla ya azụ. Ọ́bá akwụkwọ ahụ ka nwere nanị ihe odide Hibru isii mgbe ọ nọsịrị afọ 50. O nweghị akwụkwọ ga-ezuru ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị Russia nwere mmasị ịmụ asụsụ ndị e ji dee Bible na nsụgharị ya dị iche iche. Catherine nke Abụọ ezigala ndị ọkà mmụta na mahadum ndị dị na Europe ịga mụọ asụsụ Hibru. Mgbe ndị ọkà mmụta ahụ lọghachiri, a malitere ịmụ asụsụ Hibru na seminarị ndị bụ́ isi nke ndị Ọtọdọks nke Russia, na nke mbụ ya kwa, ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Russia malitere ọrụ ná nsụgharị ziri ezi nke Bible site n’asụsụ Hibru oge ochie gaa na Russian. Ma ụkọ ego nyere ha nsogbu, ọbụna ndị ndú okpukpe na-achọghị mgbanwe megidekwara ha. Ndị na-achọ ihe ọmụma Bible abanyebeghị n’ezi oge mmepeanya.

O weghị eze ukwu, bụ́ Alexander nke Abụọ, oge ịghọta abamuru nke ọrụ Tischendorf, ọ kwadokwara ya n’ụzọ ego. N’agbanyeghị “ekworo na mmegide sitere n’aka ụfọdụ ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè,” Tischendorf ji akụkụ fọrọ afọ nke Septuagint * si Saịnaị lọta. E mechara kpọọ ya Codex Saịnaị, ọ ka bụkwa otu n’ime ihe odide Bible ndị kasị ochie e nwere. Mgbe Tischendorf lọghachiri St. Petersburg, ọ gbagara n’ụlọ eze ukwu ahụ, bụ́ Obí Eze nke Oge Oyi. Ọ gwara eze ahụ ka ọ kwado “mwepụta nke otu n’ime akwụkwọ ndị kasị enye aka n’ime nnyocha na n’ịmụ Bible”—bụ́ mbipụta nke ihe odide Bible ndị ahụ a chọtara ọhụrụ, nke e mesịrị tinye n’Ọ́bá Akwụkwọ Alaeze Ukwu ahụ. Eze ukwu ahụ kweere nnọọ ozugbo, Tischendorf bụ́ onye obi dị ụtọ mesịkwara dee, sị: “Chineke enyela ọgbọ anyị . . . Bible Saịnaị, ka ọ bụụrụ anyị ìhè na-enwu gbaa n’ihe banyere ihe e dere n’Okwu Chineke n’ezie, na iji nyere anyị aka ịgbachitere eziokwu ahụ site n’igosi otú ọ dị n’ezie.”

Ihe Odide Bible Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Si Crimea

E kwuru banyere ọkà mmụta ọzọ na-achọ akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Bible ná mmalite. Ònye ka ọ bụ? Afọ ole na ole tupu Tischendorf alaghachi Russia, e kwere Ọ́bá Akwụkwọ Alaeze Ukwu ahụ nkwa inye ya ihe na-atụ nnọọ n’anya nke na ọ dọọrọ mmasị eze ukwu ma mee ka ndị ọkà mmụta nọ n’akụkụ nile nke Europe bịa Russia. Ihe ha hụrụ tụrụ ha n’anya. Ha hụrụ ikpo akwụkwọ buru nnọọ ibu nke ihe odide Bible na akwụkwọ ndị ọzọ. Ha dị nnọọ puku ihe odide abụọ, narị anọ na iri na abụọ, gụnyere narị ihe odide Bible na akwụkwọ mpịakọta itoolu na iri asaa na ise. Ihe odide Bible 45 ndị dịwara tupu narị afọ nke iri so na ha. Ma ndị mmadụ hà kweere ya ma ọ bụ na ha ekweghị, ọ bụ otu nwoke aha ya bụ Abraham Firkovich, bụ́ ọkà mmụta bụ́ onye Karaịt nke dị ihe karịrị afọ 70 n’oge ahụ, chịkọtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe odide nile a! Ma olee ndị bụ́ ndị Karaịt? *

Ajụjụ a kpaliri nnọọ mmasị eze ukwu ahụ. Russia agbasapụla ókèala ya ịgụnye ókèala ndị dịbu n’aka mba ndị ọzọ. Nke a mere ka e nwee agbụrụ ndị ọhụrụ n’alaeze ukwu ahụ. Ndị bi n’ógbè Crimea nke mara mma, bụ́ nke dị n’ụsọ Oké Osimiri Ojii, yiri ka hà bụ ndị Juu ma nwee omenala ndị Turkey ma na-asụ asụsụ yiri Tatar. Ndị Karaịt a kwuru na ha sitere ná ndị Juu e mere ka ha jee biri na Babilọn mgbe e bibisịrị Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. Otú ọ dị, n’adịghị ka ndị Juu nwere ndị rabaị, ha anabataghị Talmud, ha jikwa ịgụ Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ihe. Ndị Karaịt nke Crimea ji nnọọ ịnụ ọkụ n’obi gosi eze ukwu ahụ ihe àmà na-egosi na ha dị iche ná ndị Juu nwere ndị rabaị, nke ahụ mekwara ka e lee ha anya dị ka ndị kwụụrụ onwe ha. Ha bu n’uche igosi na ha sitere ná ndị Juu kwafetara na Crimea mgbe e mesịrị ka ndị Juu jee biri na Babilọn site n’igosi ihe odide oge ochie nke ndị Karaịt.

Mgbe Firkovich malitere ịchọ ihe ndekọ na ihe odide Bible oge ochie, ọ malitere n’ebe obibi ndị Crimea ndị dị n’elu ugwu Chufut-Kale. Ọgbọ dị iche iche nke ndị Karaịt ebiela ma fee ofufe n’obere ụlọ ndị a e ji nkume ndị a wapụtara n’ugwu ndị ahụ wuo. Ndị Karaịt anaghị ebibi Akwụkwọ Nsọ ndị merela ochie, bụ́ ebe e dere aha Chineke bụ́ Jehova, n’ihi na ha lere ime otú ahụ anya dị ka arụ. E ji nlezianya debe ihe odide Bible ndị ahụ n’obere ụlọ nkwakọba ihe a na-akpọ genizah, nke pụtara “ebe nzuzo” n’asụsụ Hibru. N’ihi na ndị Karaịt nwere nkwanye ùgwù miri emi maka aha Chineke, a dịghị akpakarị ihe odide ndị ahụ aka.

N’ekweghị ka uzuzu kpochirila ebe ndị ahụ kemgbe ọtụtụ narị afọ kụda mmụọ ya, Firkovich ji nlezianya nyochaa ebe ndị ahụ e nwere genizah. N’otu n’ime ha, ọ chọtara ihe odide Bible a ma ama nke e dere n’afọ 916 O.A. A na-akpọ ya Codex Petersburg nke Ndị Amụma Ikpeazụ, ọ bụkwa otu n’ime ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị kasị mee ochie e nwere.

Firkovich jisiri ike nweta ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ihe odide Bible, n’afọ 1859 kwa, o kpebiri iresị ya Ọ́bá Akwụkwọ Alaeze Ukwu ihe ndị ahụ ọ chịkọtara. N’afọ 1862, Alexander nke Abụọ nyere aka zụtara ọ́bá akwụkwọ ahụ ihe ndị ahụ a chịkọtara n’ọnụ ego buru ibu n’oge ahụ nke bụ́ otu narị na iri puku ruble abụọ na ise. N’oge ahụ, ego ọ́bá akwụkwọ ahụ na-eme atụmatụ imefu kwa afọ anaghị akarị puku ruble iri! Ihe odide ahụ a ma ama bụ́ Codex Leningrad (B 19A) so n’ihe ndị ahụ a zụtara. E dere ya n’afọ 1008, ọ bụkwa ya bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru zuru ezu nke kasị mee ochie e nwere n’ụwa nile. Otu ọkà mmụta kwuru na “ọ pụrụ ịbụ ya bụ ihe odide Bible kasị mkpa, n’ihi na ihe ka ọtụtụ ná nsụgharị Bible Hibru ndị e dezigharịrị edezigharị e nwere n’oge a dabeere na ya.” (Lee igbe dị na peeji a.) N’otu afọ ahụ, bụ́ 1862, e bipụtara Codex Saịnaị nke Tischendorf, ụwa nile tokwara ya.

Mmepeanya Ime Mmụọ n’Oge A

Ọ́bá akwụkwọ ahụ bụ́ nke a maara ugbu a dị ka Ọ́bá Akwụkwọ Mba Russia nwere ihe odide Bible kasị ukwuu n’ụwa nile. * N’ikwekọ ná mgbanwe ndị e nweworo n’akụkọ ihe mere eme nke Russia, a gbanweela aha ọ́bá akwụkwọ ahụ ugboro asaa n’ime narị afọ abụọ gara aga. Otu aha ya a ma ama bụ Ọ́bá Akwụkwọ Ọha na Eze nke Mba Saltykov-Shchedrin. Ọ bụ ezie na ọgba aghara nke narị afọ nke 20 metụtara ọ́bá akwụkwọ ahụ, ihe odide Bible ndị dị na ya lanahụrụ agha ụwa abụọ ahụ na nnọchibido a nọchibidoro Leningrad. Olee otú ihe odide Bible ndị dị otú ahụ si abara anyị uru?

Ihe odide ochie bụ ebe a pụrụ ịtụkwasị obi isi sụgharịa Bible n’oge a. Ha na-eme ka o kwe ndị ji ezi obi achọ eziokwu omume inweta nsụgharị Akwụkwọ Nsọ ziri ezi. Ma codex Saịnaị na nke Leningrad enyela nnọọ aka ná nsụgharị nke New World Translation of the Holy Scriptures, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara na nke e wepụtara n’ozuzu ya n’afọ 1961. Dị ka ihe atụ, Biblia Hebraica Stuttgartensia na Biblia Hebraica nke Kittel sụgharịrị, bụ́ ndị Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ ji mee ihe, dabeere na Codex Leningrad, o jikwa Tetragrammaton, ma ọ bụ aha Chineke, mee ihe ugboro puku isii, narị asatọ na iri abụọ na asatọ n’ihe odide mbụ ya.

Ọtụtụ ndị na-agụ Bible amaghị otú ọ́bá akwụkwọ St. Petersburg ahụ dị jụụ na ihe odide ya, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha bu aha ochie nke obodo ahụ bụ́ Leningrad, sirila baara ha uru. Ma, onye anyị ga-ekele karịsịa bụ Onye chepụtara Bible, bụ́ Jehova, onye na-enye ìhè ime mmụọ. N’ihi ya, ọbụ abụ ahụ rịọrọ ya, sị: “Zipụta ìhè Gị na eziokwu Gị; ka ha onwe ha na-edu m.”—Abụ Ọma 43:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 O jikwa Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nke zuru ezu bụ́ nke e dere laa azụ na narị afọ nke anọ O.A. lọta.

^ par. 13 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ndị Karaịt, lee isiokwu bụ́ “Ndị Karaịt na Ọchịchọ Ha Na-achọ Eziokwu,” ná mbipụta Ụlọ Nche nke July 15, 1995.

^ par. 19 E resịrị Ebe Ndebe Ihe Ochie Britain ihe ka ọtụtụ na Codex Saịnaị. Ọ bụ nanị akụkụ ya ụfọdụ fọrọ n’Ọ́bá Akwụkwọ Mba Russia.

[Igbe dị na peeji nke 13]

A MAARA AHA CHINEKE MA JIRI YA MEE IHE

Site n’amamihe ya, Jehova ahụla na e chebere Okwu ya, bụ́ Bible, ruo n’oge anyị. Ọrụ dị ukwuu ndị odeakwụkwọ rụrụ kemgbe ọtụtụ afọ etinyela aka n’ịhụ na e chekwara ya. Ndị kasị lezie anya n’ime ha bụ ndị Masorete, bụ́ ndị odeakwụkwọ nwere nkà, bụ́ ndị Hibru rụrụ ọrụ malite na narị afọ nke isii ruo na nke iri O.A. Asụsụ Hibru oge ochie enweghị ụdaume. Ka oge na-aga, nke a mere ka o sikwuo ike ịma otú e kwesịrị isi na-akpọpụta okwu ka asụsụ Aramaic na-anọchi Hibru. Ndị Masorete wepụtara akara ụdaume a ga na-etinye n’ihe odide Bible iji gosi otú e kwesịrị isi na-akpọpụta okwu Hibru.

Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na akara ụdaume ndị Masorete tinyere na Codex Leningrad gosiri otú e si akpọpụta Tetragrammaton ahụ—mgbochiume Hibru anọ mejupụtara aha Chineke—dị ka Yehwah’, Yehwih’, na Yeho·wah’. “Jehova” bụzi ugbu a otú ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ si akpọ aha ahụ. Aha Chineke bụ aha e ji mee ihe, aha ndị dere Bible na ndị oge ochie ndị ọzọ maara nke ọma. Taa, ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị kweere na ‘Jehova bụ nanị Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile’ maara aha Chineke ma jiri ya na-eme ihe.—Abụ Ọma 83:18.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ime ụlọ ebe a na-edebe ihe odide Bible n’Ọ́bá Akwụkwọ Mba Russia

[Foto dị na peeji nke 11]

Eze Nwanyị Ukwu Catherine nke Abụọ

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Konstantin von Tischendorf (n’etiti) na Alexander nke Abụọ, bụ́ eze ukwu nke Russia

[Foto dị na peeji nke 12]

Abraham Firkovich

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 10]

Foto abụọ ahụ: Ọ́bá Akwụkwọ Mba Russia, St. Petersburg

[Ebe E Sigasị Nweta Foto dị na peeji nke 11]

Catherine nke Abụọ: Ọ́bá Akwụkwọ Mba Russia, St. Petersburg; Alexander nke Abụọ: Site n’akwụkwọ bụ́ Spamers Illustrierte Weltgeschichte, Leipzig, 1898