Ezi Ozizi—Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Ya?
Ezi Ozizi—Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Ya?
OTU nwoke nke bi na Tibet nọ na-ahịọgharị wiil ekpere, ihe yiri obere kom kom e tinyere ekpere ndị e dere ede n’ime ya, n’ọbụ aka ya. O kweere na ọ na-ekpeghachi ekpere ya mgbe ọ bụla ọ hịọgharịrị wiil ahụ. N’otu ụlọ buru ibu n’India, e debere otu obere ọnụ ụlọ iche iji ya na-eme puja—ofufe nke pụrụ ịgụnye iji insensi, okooko osisi na ihe ndị ọzọ efe ihe oyiyi nke chi na chi nwanyị dị iche iche. N’Ịtali nke dị ọtụtụ puku kilomita site na Tibet, otu nwanyị nke nọ n’otu chọọchị a chọrọ mma sekpuuru ala n’ihu ihe oyiyi Meri, nne Jizọs, ma jiri chaplet na-ekpe ekpere.
Ikekwe, i jirila anya gị hụ otú okpukpe si emetụta ndụ ndị mmadụ. Akwụkwọ bụ́ The World’s Religions—Understanding the Living Faiths na-ekwu, sị: “Okpukpe . . . abụrụla ma nọgide na-abụ isi sekpụ ntị ná ndụ ọha mmadụ n’ụwa nile.” N’akwụkwọ bụ́ God—A Brief History, onye edemede bụ́ John Bowker na-ekwu, sị: “Ọ dịbeghị ọha mmadụ nke na-ekwenyeghị na Chineke, mgbe mgbe dị ka onye ọchịchị na onye okike. Nke ahụ bụ eziokwu ọbụna banyere ọha mmadụ ndị kpebiri nnọọ ịghara iji okpukpe kpọrọ ihe.”
N’ezie, okpukpe emetụtala ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ. Nke a ọ́ bụghị ezigbo ihe àmà na-egosi na mmadụ nwere mkpa na agụụ maka ihe ime mmụọ? Dr. Carl G. Jung, bụ́ onye ọkà a ma ama n’akparamàgwà mmadụ, zoro aka ná mkpa ụmụ mmadụ nwere ife ikike ka elu ofufe n’akwụkwọ ya bụ́ The Undiscovered Self ma na-ekwu na “nke a dịwara kemgbe e kere mmadụ.”
N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ mmadụ adịghị egosipụta okwukwe na Chineke, ha adịghịkwa
egosi mmasị ọ bụla n’okpukpe. Ụfọdụ bụ́ ndị na-enwe obi abụọ ma Chineke ọ̀ dị ma ọ bụ na-ekwu na ọ dịghị adị na-eme otú ahụ n’ụzọ bụ́ isi n’ihi na okpukpe ndị ha maara egbolighị mkpa ime mmụọ ha. Ma, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile, gụnyere ndị na-ekweghị na Chineke, ji ụkpụrụ ndị ha kweere na ha kpọrọ ihe, dị ka à ga-asị na ụkpụrụ ndị a bụ okpukpe ha.Kemgbe ọtụtụ puku afọ e kere mmadụ, mgbalị mmadụ na-eme igbo mkpa ime mmụọ ya emeela ka ọ nwalee ụdị ofufe dị iche iche. Ihe si na ya pụta bụ ọtụtụ echiche dịgasị iche iche e nwere n’ụwa nile banyere okpukpe. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile kweere na e nwere ike ka elu, ha nwere echiche dịgasị iche banyere onye ma ọ bụ ihe ọ bụ. Ihe ka ọtụtụ n’okpukpe na-ekwukwa na nzọpụta ma ọ bụ ntọhapụ dị mkpa. Ma ihe ndị ha na-akụzi banyere nzọpụta dị iche n’ihe nzọpụta bụ na otú e si enweta ya. N’ime ọtụtụ ozizi ndị a, olee otú anyị pụrụ isi mata nke bụ́ ezi ozizi nke na-atọ Chineke ụtọ?