“Ha Ajụghị Okwukwe Ha”
“Ha Ajụghị Okwukwe Ha”
“JIZỌS KRAỊST gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m.” (Matiu 5:11) Ndịàmà Jehova taa nwere obi ụtọ n’ihi na, n’ime ihe kwekọrọ n’ozizi na ihe nlereanya Kraịst, ha ka bụ ndị ‘na-abụghị akụkụ nke ụwa,’ ha adịtụghịkwa etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha na-eguzosikwa ike n’ezi ihe nye Chineke n’agbanyeghị ọnọdụ ọ bụla ha nọ na ya.—Jọn 17:14; Matiu 4:8-10.
Banyere nkwụsi ike nke Ndịàmà Jehova nọ n’ebe bụbu Soviet Union, tinyekwara ndị nọ n’Estonia, ọkà mmụta okpukpe Lutheran na onye nsụgharị Bible bụ́ Toomas Paul na-ede n’akwụkwọ ya bụ́ Kirik keset küla (Chọọchị Dị n’Etiti Obodo), sị: “Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole nụrụla ihe mere n’isi ụtụtụ April 1, 1951. E mere atụmatụ ịchụpụ Ndịàmà Jehova na ndị nile na-akwado ha—ndị nile e jidere ma chụga Siberia dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na itoolu . . . E nyere ha ohere ịbịanye aka na fọm na-egosi na ha ajụla okwukwe ha ka a ghara ịchụpụ ma ọ bụ ịtụ ha mkpọrọ. . . . Tinyere ndị e jidere tupu mgbe ahụ, a tụrụ narị mmadụ atọ na iri ise na atọ mkpọrọ, gụnyere, ma ọ dịkarịa ala, otu narị mmadụ na iri asaa na otu bụ́ ndị malitere iso ha ọhụrụ. Ha ajụghị okwukwe ha—ọbụna na Siberia. . . . Ọ bụghị mmadụ nile na-ekpe Chọọchị [Lutheran nke Estonia] nwere okwukwe dị ka nke Ndịàmà Jehova.”
Ndịàmà Jehova n’ụwa nile nwere ntụkwasị obi na Chineke ga-enyere ha aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-erubere ya isi n’agbanyeghị mkpagbu. Ha na-enwe ọṅụ ịmata na ụgwọ ọrụ ha maka ikwesị ntụkwasị obi dị ukwuu.—Matiu 5:12.