Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mma Agha Dịịrị Jehova Dịkwara Gidiọn!”

“Mma Agha Dịịrị Jehova Dịkwara Gidiọn!”

“Mma Agha Dịịrị Jehova Dịkwara Gidiọn!”

HA DỊ nnọọ ọtụtụ dị ka igurube, na-eme ka ala na-emepụta nri gharazie imepụta nri. Ọ bụ oge ndị ikpe na-achị Izrel, ụmụ Izrel nọkwa n’obi nkoropụ. Ruo afọ asaa, ozugbo mkpụrụ ndị a kụrụ n’ubi pulitewere, ìgwè ndị mpụnara bụ́ ndị Midian, ndị Amalek na ụmụ Ihu Anyanwụ bụ́ ndị na-eji kamel abịa, na-awakpo ala ahụ. Ìgwè atụrụ ndị mpụnara ahụ na-agbasa ebe nile ịchọ nri, na-atachapụ akwụkwọ ndụ nile. Ma ụmụ Izrel enweghị ịnyịnya ibu nke ha ji enwe oké ehi ma ọ bụkwanụ atụrụ. Ọchịchị aka ike ndị Midian ruru n’ókè nke na ndị Izrel ahụ dara ogbenye maliteziri ịkwakọba ihe oriri ha n’ọ́bá ndị dị n’okpuru ugwu, n’ime ọgba, nakwa n’ebe ndị e wusiri ike.

Gịnị mere ha ji nọrọ n’ọnọdụ dị otú ahụ? Ndị Izrel bụ́ ndị si n’ezi ofufe dapụ nọ na-efe chi ụgha. N’ihi ya, Jehova kwere ka ndị mmegbu chie ha ọnụ n’ala. Mgbe ụmụ Izrel na-enweghịzi ike idi ya, ha kpọkuru Jehova maka enyemaka. Ọ̀ ga-ege ha ntị? Gịnị ka ahụmahụ Izrel nwere pụrụ ịkụziri anyị?—Ndị Ikpe 6:1-6.

Onye Ọrụ Ugbo Dị Akọ Ka Ọ̀ Bụ “Dike Bụ́ Dimkpa”?

Ndị Izrel bụ́ ndị ọrụ ugbo na-ejikarị oké ehi na ihe nzọcha ọka azọcha ọka wit n’èzí n’ebe ikuku na-efe ka ikuku wee nwee ike ibupụ igbogbo ha ma hapụ ọka mgbe a na-azọcha ya. Ma egwu nke ndị mpụnara ahụ bụ́ ndị na-achọ ibibi ala ahụ kpamkpam mere ka ịrụ ọrụ nzọcha bụrụ mmadụ ibupụta onwe ya. Gidiọn na-anọ n’ebe nzọcha mkpụrụ vaịn—ikekwe nnukwu olulu e kpuchiri elu ya ekpuchi nke e gwuru na nkume—bụ́ ebe ndị Midian na-apụghị ịhụ ya, eticha ọka. (Ndị Ikpe 6:11) O yiri ka nanị ihe mmadụ pụrụ ime ọ̀ bụ iji osisi eticha ọka obere obere. N’ihi ọnọdụ e nwere n’oge ahụ, Gidiọn ji ihe ọ hụrụ mee ihe.

Cheedị otú ọ na-aghaghị isi tụọ Gidiọn n’anya mgbe mmụọ ozi Jehova mere ka ọ hụ ya anya ma gwa ya, sị: “Jehova nọnyeere gị, gị dike bụ́ dimkpa.” (Ndị Ikpe 6:12) Dị ka onye na-eticha ọka na nzuzo, Gidiọn echeghị na ya bụ dike. N’agbanyeghị nke ahụ, okwu ahụ na-egosi na Chineke nwere obi ike na Gidiọn pụrụ ịbụ onye ndú bụ́ dike n’Izrel. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị mkpa ka e mee ka o kweta na nke a ga-ekwe omume.

Mgbe Jehova nyere ya ọrụ ‘ịzọpụta Izrel n’aka Midian,’ Gidiọn ji obi umeala kwuo, sị: “Biko Onyenwe anyị, m̀ ga-eji gịnị zọpụta Izrel? Lee, [otu puku usuu ndị ikom] nke m bụ nke na-enweghị ike na Manase, mụ onwe m bụkwa onye pekasịrị mpe n’ụlọ nna m.” Gidiọn, bụ́ onye dị akọ, rịọrọ ka e nye ya ihe àmà na-egosi na Chineke ga-anọnyere ya iji merie Midian, Jehova dịkwa njikere imere Gidiọn ihe ọ bụla ezi uche dị na ya nke ọ chọrọ iji nwee obi ike. Ya mere, Gidiọn nyere mmụọ ozi ahụ bịara na nke ya ihe oriri, ọkụ sikwa na nkume pụta ma ripịa onyinye ahụ. Mgbe Jehova mesịrị ka Gidiọn kwụsị ịtụ egwu, Gidiọn wuru ebe ịchụàjà n’ebe ahụ.—Ndị Ikpe 6:12-24.

“Ka Bel Kpegide Ya”

Nsogbu kasịnụ Izrel nwere abụghị mmegbu ndị Midian na-emegbu ha. Ọ bụ ofufe ha na-efe Bel. Jehova bụ “Chineke ekworo,” ọ dịghịkwa onye pụrụ ife ya ofufe n’ụzọ ọ na-anara nke ọma ma ọ bụrụ na onye ahụ na-efe chi ndị ọzọ. (Ọpụpụ 34:14) Ya mere, Jehova nyere Gidiọn iwu ka o bibie ebe ịchụàjà Bel nke nna ya wuru, kwatuokwa Ashera ya. N’ịtụ ụjọ ihe nna ya na ndị ọzọ ga-eme ma o mee nke a n’ehihie, Gidiọn mere ya n’abalị site n’enyemaka nke ndị ohu ya iri.

Akọ ahụ Gidiọn ji mee ihe kwesịrị ekwesị, n’ihi na mgbe ndị obodo ha na-efe Bel chọpụtara “arụ” ahụ ọ kpara, ha kwuru ka a kpụpụta ya ka e gbuo ya. Otú ọ dị, site n’arụmụka na-enweghị mgbagha, nna Gidiọn bụ́ Joash, gwara ndị obodo ha na ọ bụrụ na Bel bụ chi, ọ ga-azọ onwe ya. Mgbe ahụ, Joash kpọrọ nwa ya aha dabara adaba bụ́ Jerubel, nke pụtara “Ka Bel kpegide ya.”—Ndị Ikpe 6:25-32.

Chineke na-agọzi ndị ohu ya mgbe nile n’ihi ịnọgidesi ike n’ezi ofufe. Mgbe ndị Midian na ndị òtù ha wakporo ókèala Izrel ọzọ, ‘Jehova jiri mmụọ ya kpuchie Gidiọn dị ka uwe.’ (Ndị Ikpe 6:34) Site ná nduzi nke mmụọ Chineke, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, Gidiọn kpọkọtara usuu ndị agha site n’ebo Manase, Asha, Zebulọn, na Naftalaị.—Ndị Ikpe 6:35.

Ijikere Agha

Ọ bụ ezie na Gidiọn nwere iri puku ndị agha atọ na abụọ ugbu a, ọ gwara Chineke ka o nye ya ihe ịrịba ama. Ọ bụrụ na igirigi edee ajị anụ e debere n’ebe nzọcha ọka, ala akpọọkwa nkụ, nke a ga-egosi na Chineke ga-echebe Izrel site n’aka ya. Jehova rụrụ ọrụ ebube a, ma Gidiọn rịọkwara ka e megharịa ihe ịrịba ama ahụ n’ụzọ ọzọ—ka igirigi dee ala ebe ajị anụ ahụ ga-akpọ nkụ—e mekwara ya. Gidiọn ọ̀ dị akọ gabiga ókè? O doro anya na ọ dịghị otú ahụ, n’ihi na Jehova meere ya ihe ọ rịọrọ iji mesie ya obi ike. (Ndị Ikpe 6:36-40) Anyị adịghị atụ anya ọrụ ebube dị otú ahụ taa. Ma, Jehova pụrụ ichebe ma mesie anyị obi ike site n’Okwu ya.

Chineke kwuziri na ndị agha Gidiọn dị ọtụtụ. Ọ bụrụ na ha ejiri ọtụtụ ndị agha a merie ndị iro ha, ndị Izrel pụrụ itu ọnụ na ọ bụ ha zọpụtara onwe ha. Ma ọ bụ Jehova ka a na-aghaghị inye otuto maka mmeri ahụ ha ga-emeri. Gịnị ka a ga-eme? Gidiọn ga-eme ihe dị n’Iwu Mozis site n’ịgwa ndị ụjọ ji ka ha laa. Mgbe ahụ, iri puku ndị ikom abụọ na abụọ lara, ha afọdụzie nanị puku iri.—Deuterọnọmi 20:8; Ndị Ikpe 7:2, 3.

N’anya Chineke, ndị ikom ahụ ka karịrị akarị. A gwara Gidiọn ka ọ kpọrọ ha gbadaa na mmiri. Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus kwuru na Chineke gwara Gidiọn ka ọ kpọrọ ndị agha ya zọrọ ije gaa na mmiri n’etiti anwụ ehihie. Ma ọ̀ bụ ihe merenụ ma ọ bụ na ọ bụghị, Gidiọn nọ na-ekiri otú ndị ikom ahụ si na-aṅụ mmiri. Ọ bụ nanị narị atọ n’ime ha ji aka na-akwọrọ mmiri ma na-elepụ anya iji mara ma ndị iro ha hà abịawala. Ọ bụ nanị narị mmadụ atọ ahụ nọ na-elepụ anya so Gidiọn gaa. (Ndị Ikpe 7:4-8) Were ya na ị nọ n’ọnọdụ ha. Ebe ọ bụ na ndị iro unu dị otu narị puku na puku iri atọ na ise, ị ghaghị nnọọ ikwubi na ọ bụ nanị site n’ike Jehova ka unu pụrụ imeri, ọ bụghị n’ike nke unu!

Chineke gwara Gidiọn ka ọ kpọrọ otu nwa okorobịa gaa ledo ọmụma ụlọikwuu ndị Midian. Mgbe ha nọ n’ebe ahụ, Gidiọn nụpeere ka otu nwoke na-ezere ibe ya nrọ ya, onye ahụ ọ na-ezere nrọ ana-akọkwara ya n’egbughị oge na nrọ ahụ pụtara na Chineke ekpebiela inye Midian n’aka Gidiọn. Nke ahụ bụ nnọọ ihe ọ dị Gidiọn mkpa ịnụ. O ji n’aka na Jehova ga-eme ka ya na narị ndị ikom atọ ya merie ndị Midian.—Ndị Ikpe 7:9-15.

Atụmatụ Agha

E kere narị ndị ikom atọ ahụ ụzọ atọ, otu narị otu narị. E nyere onye nke ọ bụla opì na nnukwu ite ihe na-adịghị n’ime ya. E tinyekwara ọwa n’ime ite ahụ. Iwu mbụ Gidiọn nyere bụ: ‘Leenụ m anya, dị ka m na-eme, otú a ka unu ga-eme. Mgbe m fụrụ opì ike, unu ga-afụkwa nke unu ma tie, sị, Mma agha dịịrị Jehova dịkwara Gidiọn!’—Ndị Ikpe 7:16-18, 20.

Narị ndị dike Izrel atọ ahụ ji nwayọọ nwayọọ ruo ná nsọtụ ọmụma ụlọikwuu nke ndị iro ha. Ọ bụ ihe dị ka n’elekere iri nke abalị—mgbe ndị nche ọhụrụ ka nọchisịrị ndị nọbu anọ. Nke a yiri ka ọ̀ bụ oge kwesịrị ekwesị ịwakpo ha, n’ihi na ọ ga-ewe ndị nche ọhụrụ ahụ oge ụfọdụ tupu ha ahụwa ihe na-emenụ n’ebe ahụ gbara ọchịchịrị.

Lee ka oké ụjọ si jide ndị Midian ugbu a! Na mberede, narị ite atọ ahụ a tụpịara, narị opì ike atọ ahụ a fụrụ, na mkpu nke narị ndị ikom atọ ahụ mere ka mkpọtụ dị n’ebe ahụ daburu jụụ. N’ịbụ ndị na-amaghị ihe ha ga-eme, karịsịa n’ihi mkpu ahụ bụ́ “Mma agha dịịrị Jehova dịkwara Gidiọn!,” ndị Midian malitekwara iti mkpu nke ha. N’ọgba aghara ahụ, ha amaghịzi onye bụ́ enyi na onye bụ́ onye iro ha. Narị ndị ikom atọ ahụ guzooro ebe a sị ha guzoro ka Chineke mere ka ndị iro ahụ jiri mma agha ha gburịta onwe ha. A chụsasịrị ndị nile nọ n’ọmụma ụlọikwuu ahụ, e nweghị ụzọ mgbapụ, a chụsoro nnọọ ma gbuo ndị fọrọ afọ, nke ahụ mekwara ka ndị Midian gharazie iyi Izrel egwu ọzọ. Ọchịchị ahụ nọrọ ogologo oge na nke kpatara ọnwụ ọtụtụ ndị emesịala bịa ná njedebe.—Ndị Ikpe 7:19-25; 8:10-12, 28.

Ọbụna mgbe Gidiọn merisịrị n’agha ahụ, ọ ka dị umeala n’obi. Mgbe ndị Ifrem, bụ́ ndị ihe àmà na-egosi na ha chere na e ledara ha anya n’ịghara ịkpọ ha maka agha ahụ, sesoro ya okwu, o ji olu ọma zaghachi ha. Ọzịza okwu ya nke dị nro mere ka ọnụma ha laghachi azụ ma mee ka obi ha jụrụ.—Ndị Ikpe 8:1-3; Ilu 15:1.

Ugbu a e nweziri udo, ụmụ Izrel gwara Gidiọn ka ọ chịwa ha. Lee ọnwụnwa nke a bụ! Ma Gidiọn jụrụ ịchị ha. O chefubeghị onye meriri ndị Midian. O kwuru, sị: “Mụ onwe m agaghị achị unu, nwa m agaghị achịkwa unu: Jehova ga-achị unu.”—Ndị Ikpe 8:23.

Otú ọ dị, n’ihi na Gidiọn ezughị okè, ọ bụghị mgbe nile ka o jiri ezi uche mee ihe. E kwughị ihe mere o ji jiri ihe ọ kwatara n’agha mee ephod ma guzobe ya n’obodo ya. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu na ndị Izrel nile ‘sooro ephod ahụ kwaa iko.’ Ha fere ya, ya aghọọkwa ọnyà ọbụna nye Gidiọn na ezinụlọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ghọghị onye na-ekpere arụsị kpamkpam n’ihi na Akwụkwọ Nsọ na-akpọ ya nwoke nwere okwukwe na Jehova.—Ndị Ikpe 8:27; Ndị Hibru 11:32-34.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị

Akụkọ banyere Gidiọn na-enye ma ịdọ aka ná ntị ma agbamume. Ọ na-adọ anyị aka ná ntị na ọ bụrụ na Jehova anapụ anyị mmụọ ya na ngọzi ya n’ihi omume ọjọọ anyị, ọnọdụ ime mmụọ anyị ga-adị ka nke ndị bi n’ala ahụ ogbenye kpara aka ọjọọ, bụ́ nke igurube richapụrụ ihe dị na ya. Anyị na-ebi n’oge pụrụ iche, anyị ekwesịghịkwa ịnwa anwa chefuo na ngọzi Jehova “na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” (Ilu 10:22) Anyị na-enweta ngọzi Chineke n’ihi na anyị ji “obi zuru okè, werekwa mkpụrụ obi ọ na-atọ ụtọ” na-efe ya. Ma ọ́ bụghị ya, ọ ga-ajụ anyị.—1 Ihe E Mere 28:9.

Anyị pụrụ inweta agbamume site n’akụkọ banyere Gidiọn n’ihi na ọ na-egosi na Jehova pụrụ ịzọpụta ndị ya pụọ n’ihe ize ndụ ọ bụla, ọbụna na-eji ndị o yiri ka ọ̀ bụ na ha adịghị ike ma ọ bụ ndị na-enweghị enyemaka eme ihe. Na Gidiọn na narị ndị ikom atọ ya nwere ike ikpochapụ otu narị puku ndị Midian na iri puku atọ na ise na-egosi na Chineke nwere ike na-adịghị agwụ agwụ. Anyị pụrụ ịhụ onwe anyị n’ọnọdụ siri nnọọ ike, ya eyiekwa ka ndị iro anyị hà hiri nnọọ nne karịa anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, akụkọ banyere Gidiọn nke dị na Bible na-agba anyị ume ịtụkwasị Jehova obi, bụ́ onye ga-agọzi ma napụta ndị nile na-egosipụta okwukwe n’ebe Ọ nọ.