“Nọgidenụ Na-anwapụta Ihe Unu Onwe Unu Bụ”
“Nọgidenụ Na-anwapụta Ihe Unu Onwe Unu Bụ”
“Nọgidenụ na-anwale ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ, nọgidenụ na-anwapụta ihe unu onwe unu bụ.”—2 NDỊ KỌRINT 13:5.
1, 2. (a) Olee otú inwe obi abụọ banyere ihe ndị anyị kweere pụrụ isi metụta anyị? (b) Olee ọnọdụ e nwere na Kọrint na narị afọ mbụ nke pụrụ imewo ka ụfọdụ ghara ịma ihe ha ga-eme?
OTU nwoke nke nọ na-eme njem n’ime ime obodo bịarutere ebe ụzọ wara ngalaba. N’amaghị nke ga-eduga ya ebe ọ na-aga, ọ jụrụ ndị na-agafe agafe, ma ihe ha zara ya dịgasị iche. N’amaghị nke ọ ga-eso eso, ọ pụghịkwa ịga n’ihu na njem ya. Inwe obi abụọ banyere ihe ndị anyị kweere pụkwara imetụta anyị n’otu ụzọ ahụ. Ọnọdụ dị otú ahụ nke amaghị ihe a ga-eme pụrụ imetụta ikike ime mkpebi anyị, mee ka anyị ghara iji n’aka ihe anyị ga-eme.
2 E nwere ọnọdụ biliterenụ bụ́ nke gaara enwe mmetụta yiri nke ahụ e kwuru n’elu n’ahụ́ ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ na Kọrint, Gris. “Ndịozi ọkasị mma” nọ na-ama ikike Pọl onyeozi aka, na-asị: “Akwụkwọ ozi ya na-adị arọ, na-adịkwa ike, ma ọnụnọ ya ná mmadụ adịghị ike, okwu ya abaghịkwa n’ihe.” (2 Ndị Kọrint 10:7-12; 11:5, 6) Ọ pụrụ ịbụ na echiche dị otú ahụ mere ka ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Kọrint ghara ịma ihe ha ga-eme.
3, 4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee mmasị na ndụmọdụ Pọl nyere ndị Kọrint?
3 Pọl hiwere ọgbakọ dị na Kọrint n’oge ọ gara ebe ahụ n’afọ 50 O.A. Ọ nọrọ na Kọrint “otu afọ na ọnwa isii, na-ezi okwu Chineke n’etiti ha.” N’ezie, “ọtụtụ n’ime ndị Kọrint bụ́ ndị nụrụnụ malitere ikwere nakwa ịbụ ndị e mere baptizim.” (Ọrụ 18:5-11) Pọl nwere mmasị dị ukwuu n’ọganihu ime mmụọ nke ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Kọrint. Ọzọkwa, ndị Kọrint edegaworo Pọl akwụkwọ ozi ka o nye ha ndụmọdụ n’okwu ụfọdụ. (1 Ndị Kọrint 7:1) Ya mere, o nyere ha ezigbo ndụmọdụ.
4 Pọl dere, sị: “Nọgidenụ na-anwale ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ, nọgidenụ na-anwapụta ihe unu onwe unu bụ.” (2 Ndị Kọrint 13:5) Ọ ga-abụ na itinye ndụmọdụ a n’ọrụ chebere ụmụnna nọ na Kọrint pụọ n’ịbụ ndị na-amaghị ihe ha ga-eme. Ọ pụkwara imere anyị otu ihe ahụ taa. Oleezi otú anyị pụrụ iji gbasoo ndụmọdụ Pọl? Olee otú anyị pụrụ isi nwalee ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ? Gịnịkwa ka ịnwapụta ihe anyị onwe anyị bụ gụnyere?
“Nọgidenụ Na-anwale Ma Ùnu Nọ n’Okwukwe Ahụ”
5, 6. Olee ụkpụrụ anyị na-eji anwale ma ànyị ka nọ n’okwukwe ahụ, gịnịkwa mere nke ahụ ji bụrụ ụkpụrụ kwesịrị nnọọ ekwesị?
5 Mgbe a na-eme nnwale, ọ na-abụkarị mmadụ ma ọ bụ ihe ka a na-anwale, e nwekwara ụkpụrụ a na-eji eme ya. Na nke a, ihe ahụ a na-anwale abụghị okwukwe ahụ—ihe ndị anyị kweere na ha n’ozuzu. Ọ bụ anyị n’otu n’otu ka a na-anwale. Iji mee nnwale a, anyị nwere ụkpụrụ zuru okè e ji eme ya. Otu abụ nke ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid dere na-agụ, sị: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachi mkpụrụ obi; ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Ụkpụrụ nile Jehova tọrọ ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ: ihe Jehova nyere n’iwu na-enwu enwu, na-enye anya ìhè.” (Abụ Ọma 19:7, 8) Iwu zuru okè na ụkpụrụ ziri ezi nke Jehova, ihe àmà ya ndị kwesịrị ntụkwasị obi na ihe o nyere n’iwu dịcha n’ime Bible. Ozi ndị dị n’ime ya bụ ụkpụrụ kwesịrị nnọọ ekwesị iji mee nnwale.
6 Banyere ozi Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee, Pọl onyeozi na-ekwu, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, na-amapukwa amapu ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, nakwa nkwonkwo na ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) Ee, okwu Chineke pụrụ ịnwale obi anyị—ihe anyị bụ n’ime n’ezie. Olee otú anyị pụrụ isi tinye ozi a dị nkọ ma dị ike n’ọrụ? Ọbụ abụ ahụ mere ka ihe nke a gụnyere doo nnọọ anya. Ọ bụrụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke . . . [ihe ụtọ ya dị n’iwu] Jehova; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.” (Abụ Ọma 1:1, 2) A na-achọta ‘iwu Jehova’ n’Okwu Chineke e dere ede, bụ́ Bible. Ịgụ Okwu Jehova aghaghị ịdị na-atọ anyị ụtọ. N’ezie, anyị aghaghị iwepụta oge iji na-agụ ya ehihie na abalị, ma ọ bụ na-atụgharị uche na ya. Ka anyị na-eme nke a, ọ dị mkpa ka anyị—ndị a na-anwale—jiri ihe ndị e dere n’ime ya na-anwale onwe anyị.
7. Olee ụzọ kasị mma isi nwalee ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ?
7 Mgbe ahụ, ụzọ kasị mma isi nwalee ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ bụ ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke ma na-enyocha otú àgwà anyị si ekwekọ n’ihe anyị na-amụta. Anyị pụrụ inwe obi ụtọ na anyị nwere ọtụtụ ihe ga-enyere anyị aka ịghọta Okwu Chineke.
8. Olee otú mbipụta dị iche iche nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” pụrụ isi nyere anyị aka ịnwale ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ?
8 Jehova eziwo anyị ihe ma nye anyị ntụziaka site ná mbipụta dị iche iche nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” bụ́ ndị na-akọwa Akwụkwọ Nsọ. (Matiu 24:45) Dị ka ihe atụ, tụlee igbe isiokwu ya bụ “Ajụjụ Maka Ntụgharị Uche” nke dị ná ngwụcha nke ihe ka ọtụtụ n’isiakwụkwọ ndị dị n’akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. * Lee ka akụkụ a nke akwụkwọ ahụ si enye anyị ohere ịtụgharị uche! Ọtụtụ isiokwu ndị a tụlere n’akwụkwọ anyị ndị bụ́ Ụlọ Nche na Teta!, na-enyekwara anyị aka ịnwale ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ. Otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst kwuru banyere isiokwu ndị dabeere n’akwụkwọ Ilu bụ́ ndị pụtara ná mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ, sị: “Ihe e kwuru n’isiokwu ndị a bara nnọọ uru. Ha na-enyere m aka ịnwale ma okwu ọnụ m, omume m, na àgwà m hà kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Jehova.”
9, 10. Olee ndokwa ndị Jehova mere iji nyere anyị aka ịnọgide na-anwale ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ?
9 Anyị na-enwetakwa nduzi na agbamume bara ụba ná nzukọ ọgbakọ nakwa ná mgbakọ ukwu na ndị nke nta. Ndị a so ná ndokwa ime mmụọ ndị Chineke meworo bụ́ ndị Aịzaịa buru amụma banyere ha, sị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, . . . Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.” (Aịsaịa 2:2, 3) N’ezie, ọ bụ ngọzi inweta ntụziaka dị otú ahụ banyere ụzọ Jehova.
10 Anyị ekwesịghịkwa ileda ndụmọdụ anyị na-enweta site n’aka ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, gụnyere ndị okenye ọgbakọ, anya. Bible na-ekwu banyere ha, sị: “Ụmụnna m, ọ bụrụgodị na mmadụ azọhie ụkwụ tupu ya amara banyere ya, unu ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, gbalịanụ ịgbazigharị onye dị otú ahụ na mmụọ nke ịdị nwayọọ, ka onye ọ bụla n’ime unu na-elekwasị onwe ya anya, a dịghị ama ama a nwaakwa gị.” (Ndị Galeshia 6:1) Lee ka anyị ga-esi nwee ekele maka ndokwa a e mere iji nyere anyị aka ime mgbanwe!
11. Gịnị ka ịnwale ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ na-achọ?
11 Akwụkwọ anyị dị iche iche, nzukọ Ndị Kraịst, ndị ikom a họpụtara ahọpụta—ndị a bụ ndokwa magburu onwe ha Jehova mere. Otú ọ dị, ịnwale ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ na-achọ nnyocha onwe onye. Ya mere, mgbe anyị na-agụ akwụkwọ anyị ma ọ bụ na-egere ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ, ọ dị anyị mkpa ịjụ onwe anyị, sị: ‘Nke a ọ̀ na-akọwa ụdị onye m bụ? Àna m eme nke a? Àna m anakwere nkwenkwe Ndị Kraịst n’ozuzu?’ Àgwà anyị n’ebe ihe ọmụma ndị anyị na-enweta site ná ndokwa ndị a dị pụkwara imetụta ọnọdụ ime mmụọ anyị. Bible na-ekwu, sị: “Onye anụ ahụ́ na-achị adịghị anata ihe ndị metụtara mmụọ Chineke, n’ihi na ha bụ ihe nzuzu nye ya. . . . Otú ọ dị, onye mmụọ nsọ na-achị na-enyocha ihe nile n’ezie.” (1 Ndị Kọrint 2:14, 15) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbalịsi ike ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi banyere ihe ndị anyị na-agụta n’akwụkwọ anyị, magazin, na mbipụta anyị ndị ọzọ, nakwa ihe anyị na-anụ ná nzukọ anyị na n’ọnụ ndị okenye, ma na-ele ha anya dị ka ihe ime mmụọ?
“Nọgidenụ Na-anwapụta Ihe Unu Onwe Unu Bụ”
12. Gịnị ka ịnwapụta ihe anyị onwe anyị bụ na-agụnye?
12 Ịnwapụta ihe anyị onwe anyị bụ na-agụnye ịtụ onwe anyị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ee, anyị pụrụ ịnọ n’eziokwu ahụ, ma ruo ókè ha aṅaa ka ọnọdụ ime mmụọ anyị siruru ike? Ịnwapụta ihe anyị bụ na-agụnye inye ihe àmà na-egosi na anyị bụ ndị tozuru okè na igosipụta ezi ekele maka ndokwa ime mmụọ.
13. Dị ka Ndị Hibru 5:14 si kwuo, gịnị na-egosi na anyị etozuola okè?
13 Ihe àmà dị aṅaa nke na-egosi na mmadụ bụ Onye Kraịst tozuru okè ka anyị pụrụ ịtụ anya ya n’ime onwe anyị? Pọl onyeozi dere, sị: “Nri siri ike dịịrị ndị tozuru okè, ndị siteworo n’iji ikike nghọta ha eme ihe zụọ ikike a ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:14) Anyị na-enye ihe àmà na anyị tozuru okè site n’ịzụ ikike nghọta anyị. Dị nnọọ ka ọ dị onye na-eme egwuregwu mkpa ịzụ uru ahụ́ ya ụfọdụ site n’iji ya eme ihe ugboro ugboro tupu ya enwee ike ime nke ọma n’egwuregwu, anyị aghaghịkwa ịzụ ikike nghọta anyị site n’iji ya eme ihe n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.
14, 15. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị itinye mgbalị siri ike ịmụ ihe ndị ka mie emie nke Okwu Chineke?
14 Otú ọ dị, tupu anyị enwee ike ịzụ ikike nghọta anyị, anyị aghaghị inweta ihe ọmụma. Iji mee nke a, ọ dị anyị oké mkpa iji ịdị uchu na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye. Mgbe anyị na-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya—karịsịa n’ihe ndị ka mie emie nke Okwu Chineke—anyị na-eme ka ikike nghọta anyị ka mma. N’ime afọ ndị gafeworonụ, a tụlewo ọtụtụ isiokwu ndị miri emi n’Ụlọ Nche. Gịnị ka anyị na-eme mgbe anyị hụrụ isiokwu ndị na-atụle eziokwu ndị ka mie emie? Ànyị na-ahapụ ha nanị n’ihi na “e nwere ihe ụfọdụ n’ime ha siri ike ịghọta”? (2 Pita 3:16) Kama ime otú ahụ, anyị ga-agbalịsikwu ike ịghọta ihe a na-ekwu.—Ndị Efesọs 3:18.
15 Gịnị ma ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike inwe ọmụmụ ihe onwe onye? Ọ dị oké mkpa ka anyị gbalịa inwe ma ọ bụ ịzụlite agụụ maka ya. * (1 Pita 2:2) Iji bụrụ ndị tozuru okè anyị aghaghị ịmụta otú e si enweta ume site ná nri siri ike, bụ́ eziokwu ndị ka mie emie nke Okwu Chineke. Ma ọ́ bụghị ya, ikike nghọta anyị agaghị eto eto. Otú ọ dị, igosipụta na anyị tozuru okè gụnyere ihe karịrị inweta ikike nghọta. Anyị aghaghị ịdị na-etinye ihe ọmụma ndị anyị na-enweta site n’iji ịdị uchu na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye n’ọrụ ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị.
16, 17. Olee ndụmọdụ Jems onye na-eso ụzọ nyere banyere ịghọ “ndị na-eme okwu ahụ”?
16 Anyị na-enyekwa ihe àmà nke ihe anyị onwe anyị bụ site n’igosipụta na anyị nwere ekele maka eziokwu ahụ—ọrụ nke okwukwe anyị. N’iji otu ihe atụ magburu onwe ya mee ihe iji kọwaa akụkụ a nke ịtụ onwe onye n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, Jems onye na-eso ụzọ na-ekwu, sị: “Bụrụnụ ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghịkwa ndị na-anụ nanị ọnụnụ, jiri echiche ụgha na-aghọgbu onwe unu. N’ihi na ọ bụrụ na onye ọ bụla bụ onye na-anụ okwu ahụ, ma ọ bụghị onye na-eme ya, onye a dị ka onye na-ekiri ihu nkịtị ya n’enyo. N’ihi na ọ na-ekiri onwe ya, ọ na-apụkwa ma chefuo ozugbo ahụ ụdị mmadụ ọ bụ. Ma onye na-enyonye anya n’iwu ahụ zuru okè nke dịịrị nnwere onwe, onye na-anọgidekwa na ya, onye a, n’ihi na ọ ghọwo, ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama onye na-arụ ọrụ ahụ, ga-enwe obi ụtọ na ọ na-arụ ya.”—Jems 1:22-25.
17 Ihe Jems na-ekwu bụ: ‘Nyonye anya n’enyo nke okwu Chineke, ma tụọ onwe gị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Nọgide na-eme nke a, jirikwa ihe ị chọtara n’okwu Chineke na-enyocha onwe gị nke ọma. Mgbe ahụ, echefula ihe ị hụrụ ngwa ngwa. Mee mgbanwe ndị dị mkpa.’ Ọ pụrụ isi ike mgbe ụfọdụ ịgbaso ndụmọdụ a.
18. Gịnị mere o ji esi ike ịgbaso ndụmọdụ Jems nyere?
18 Were ọchịchọ a chọrọ ka anyị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ dị ka ihe atụ. Pọl dere, sị: “Mmadụ na-eji obi egosipụta okwukwe maka ezi omume, ma ọnụ ka mmadụ na-eji eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta.” (Ndị Rom 10:10) Iji ọnụ anyị eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta na-achọ ime ọtụtụ mgbanwe. Ikere òkè n’ọrụ nkwusa anaghị adịrị ihe ka ọtụtụ n’ime anyị mfe. Iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ya na idebe ya n’ọnọdụ kwesịịrị ya ná ndụ anyị na-achọkwudị ime mgbanwe na ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. (Matiu 6:33) Ma, ozugbo anyị ghọrọ ndị na-arụ ọrụ a Chineke nyere anyị, anyị na-enwe obi ụtọ n’ihi otuto ọ na-ewetara Jehova. Ya mere, ànyị bụ ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi?
19. Gịnị ka ọrụ nke okwukwe anyị kwesịrị ịgụnye?
Ndị Filipaị 4:9) Anyị na-anwapụta ndị anyị bụ site n’ime ihe ndị anyị mụtara, nakwere, nụ ma hụ—ihe nile metụtara nraranye Ndị Kraịst na ịbụ ndị na-eso ụzọ. Jehova na-adụ ọdụ site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, sị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.”—Aịsaịa 30:21.
19 Gịnị ka ọrụ okwukwe anyị kwesịrị ịgụnye? Pọl na-ekwu, sị: “Ihe ndị unu mụtara ma nakwere, nke unu nụkwara ma hụ n’ihe metụtara m, na-emenụ ndị a; Chineke nke udo ga-anọnyekwara unu.” (20. Ụdị ndị dị aṅaa bụụrụ ọgbakọ nnukwu ngọzi?
20 Ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị bụ́ ndị ji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke, ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ, ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ụzọ na-enweghị atụ, ndị jikwa ikwesị ntụkwasị obi na-akwado Alaeze ahụ na-abụrụ ọgbakọ ọ bụla ha nọ na ya nnukwu ngọzi. Ọnụnọ ha na-eme ka ọgbakọ ha so na-eje ozi kwụsie ike. Ha na-enye aka n’ụzọ dị ukwuu, karịsịa n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị ọhụrụ ha ga-elekọta. Mgbe anyị buuru ndụmọdụ Pọl bụ́ ‘ka anyị nọgide na-anwale ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ, nọgide na-anwapụta ihe anyị onwe anyị bụ’ n’obi, anyị onwe anyị ga-akpalikwa ndị ọzọ ime nke ọma.
Na-enwe Obi Ụtọ n’Ime Ihe Na-atọ Chineke Ụtọ
21, 22. Olee otú anyị pụrụ isi jiri obi ụtọ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ?
21 Eze Devid nke Izrel oge ochie bụrụ, sị: “Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke; iwu Gị dịkwa n’ime obi m.” (Abụ Ọma 40:8) Devid nwere obi ụtọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na iwu Jehova dị n’obi Devid. Devid enweghị obi abụọ banyere ihe ọ ga-eme.
22 Mgbe iwu Chineke dị n’obi anyị, anyị adịghị enwe obi abụọ banyere ihe anyị ga-eme. Anyị na-enwe obi ụtọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Mgbe ahụ, ka anyị ‘tinyesie mgbalị ike’ ka anyị ji obi nile na-ejere Jehova ozi.—Luk 13:24.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 15 Iji nweta aro ndị na-enye aka n’otú e si amụ ihe, lee peeji nke 27-32 nke akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
• Olee otú anyị pụrụ isi na-anwale ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ?
• Gịnị ka ịnwapụta ihe anyị onwe anyị bụ gụnyere?
• Olee ihe àmà anyị pụrụ inye iji gosi na anyị bụ Ndị Kraịst tozuru okè?
• Olee otú ọrụ nke okwukwe anyị si enyere anyị aka ịtụ ihe anyị bụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 23]
Ị̀ maara ụzọ kasị mma isi nwalee ma ị nọ n’okwukwe ahụ?
[Foto dị na peeji nke 24]
Anyị na-enye ihe àmà na anyị bụ Ndị Kraịst tozuru okè site n’iji ikike nghọta anyị eme ihe
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Anyị na-anwapụta ihe anyị bụ site n’ịbụ ‘ndị na-adịghị echefu ihe ha nụrụ, kama ndị na-eme okwu ahụ’