Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ma Nwee Afọ Ojuju n’Ozi Jehova

Ndị Na-alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ma Nwee Afọ Ojuju n’Ozi Jehova

“Inyeaka M Na-esi N’aka Jehova Bịa”

Ndị Na-alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ma Nwee Afọ Ojuju n’Ozi Jehova

OTU nwanyị bụ́ Onye Kraịst nke bi na Spen kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime anyị nwere nnọọ obi ụtọ ọ bụ ezie na anyị alụghị di ma ọ bụ nwunye.” Gịnị mere o ji nwee afọ ojuju? “Ọ na-eme anyị obi ụtọ inwere onwe anyị pụọ n’ọtụtụ nchekasị iji nwee ike ijere Chineke anyị, bụ́ Jehova, ozi n’ụzọ zuru ezu karị.”

Mmetụta dị otú ahụ kwekọrọ n’ihe Okwu Chineke kwuru banyere alụghị di ma ọ bụ nwunye. Mgbe Pọl onyeozi kwuru ihe ndị metụtara alụmdi na nwunye, o ji ike mmụọ nsọ kwuo okwu a amamihe dị na ya: “M na-agwa ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ọ dịrị ha mma ka ha nọrọ ọbụna dị ka m nọ.” Pọl n’onwe ya alụghị nwanyị. Ma olee ihe mere o ji tụọ aro ka mmadụ nọrọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye? O kwuru na onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye bụ onye e kewara ekewa, ebe onye na-alụghị “na-echegbu onwe ya maka ihe nke Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:8, 32-34) Ijere Jehova ozi bụ isi ihe na-eme ka onye na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nwee obi ụtọ na afọ ojuju.

Ịnọ n’Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye n’Ihi Nzube Magburu Onwe Ya

Ihe Pọl kwuru pụrụ isiri ndị bi n’ebe ndị a na-ele alụmdi na nwunye na inwe ezinụlọ anya dị ka ihe dị oké mkpa ike ịghọta. Otú ọ dị, Jizọs Kraịst—bụ́ onye na-alụghị nwanyị ma nwee obi ụtọ na afọ ojuju—kwuru nzube magburu onwe ya Ndị Kraịst pụrụ iji maka ya nọrọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. O kwuru, sị: “[E nwere] ndị ọnaozi meworo onwe ha ndị ọnaozi n’ihi alaeze nke eluigwe. Onye ọ bụla nke pụrụ ime ohere maka ya, ya mee ohere maka ya.”—Matiu 19:12.

N’ikwekọ n’okwu ndị ahụ, ọtụtụ ndị achọpụtala na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye na-enye ha ohere ijere Chineke ozi n’enweghị ihe ndọpụ uche ndị a na-ahụkarị n’alụmdi na nwunye. (1 Ndị Kọrint 7:35) Ọtụtụ puku Ndị Kraịst ji obi ụtọ na-efe Jehova n’enweghị di ma ọ bụ nwunye, ha na-enwetakwa ọṅụ n’iji ịdị uchu na-enyere ndị ọzọ aka. *

Ọtụtụ Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-aghọta na ọ bụghị nanị ndị lụrụ di na nwunye na-enwe obi ụtọ, nakwa na ọ bụghị ndị nile na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ka obi na-anaghị adị ụtọ. Ma ndị lụrụ ma ndị na-alụghị na-enwe ma obi ụtọ ma mwute mgbe ụfọdụ. N’ezie, Bible na-ekwu hoo haa na alụmdi na nwunye n’onwe ya na-eweta “mkpagbu n’anụ ahụ́.”—1 Ndị Kọrint 7:28.

Ndị Na-alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye n’Ihi Ọnọdụ

Ọtụtụ ndị alụghị di ma ọ bụ nwunye ọ bụghị n’ihi na ha chọrọ ịnọ otú ahụ kama n’ihi ọnọdụ. Ọ pụrụ ịbụ na obi ụtọ, mkpakọrịta na ịhụnanya alụmdi na nwunye pụrụ iweta na-agụ ha agụụ. Otú ọ dị, nye ụfọdụ, ego ma ọ bụ ihe ndị ọzọ pụrụ igbochigodị ha ịlụ. Ụfọdụ Ndị Kraịst—ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụnna anyị nwanyị anyị hụrụ n’anya—anọọla n’alụghị di n’ihi na ha kpebisiri ike irube isi na ndụmọdụ Bible bụ́ ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Ha ji iguzosi ike n’ihe na-achọ di n’etiti ndị na-efe Jehova raara onwe ha nye, ndị e mekwara baptizim.

Mgbe ụfọdụ, owu na-ama ụfọdụ n’ime ha. Mgbe otu Onye Kraịst na-alụghị di kwetasịrị na owu na-ama ya, o kwuru, sị: “Anyị maara iwu Jehova, anyị agaghịkwa achọ imejọ Jehova n’ụzọ ọ bụla. Ọ pụrụ ịgụ anyị agụụ inwe di, ma n’agbanyeghị ugboro ole ndị ụwa nwara ‘ịchọtara anyị di,’ anyị na-ajụ. Anyị anaghịdị achọ iso ndị na-ekweghị ekwe akpakọrịta.” E kwesịrị ịja Ndị Kraịst dị otú ahụ mma maka itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ na ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ dị elu iji mee Jehova obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu mmetụta uche ọ bụla ha pụrụ ịdị na-enwe.

Enyemaka Bara Ụba Sitere n’Aka Chineke

Jehova na-emere ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya n’okwu ndị metụtara ịjụ ịlụ onye na-adịghị ejere ya ozi ebere. Site n’ahụmahụ onwe onye, Eze Devid pụrụ ịgba akaebe, sị: “N’ebe onye ebere nọ Ị [Jehova] ga-egosi onwe Gị onye ebere.” (Abụ Ọma 18:25) Chineke na-ekwekwa ndị ji ikwesị ntụkwasị obi erubere ya isi nkwa, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) N’iṅomi Jehova, anyị pụrụ ịja nnọọ Ndị Kraịst nile na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nọ n’afọ ndụ nile mma, bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi rapara n’Okwu Chineke. Anyị pụkwara ịrịọ ka Jehova wusie ha ike ịnagide ihe ịma aka ndị ha na-eche ihu.—Ndị Ikpe 11:30-40.

Ọtụtụ Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-achọpụta na ikere òkè zuru ezu n’ọrụ nkụzi Bible na-eme ka ndụ ha nwee nzube. Dị ka ihe atụ, tụlee banyere Patricia, bụ́ nwanyị dị ihe dị ka afọ 35 nke na-alụghị di, bụ́ onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ onye na-ezisa ozi ọma oge nile. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na e nwere ọnwụnwa ndị dị n’ịbụ onye na-alụghị di, o nyela m ohere ịghọ onye ọsụ ụzọ oge nile. Ebe ọ bụ na alụghị m di, ọ na-aka adịrị m mfe ịgbanwe atụmatụ m mgbe ọ bụla, bụ́ nke na-eme ka m nwekwuo ohere ịmụ ihe. Amụtakwala m ịdaberesikwu ike n’ebe Jehova nọ, karịsịa n’oge ihe isi ike.”

Okwu ndị dị otú ahụ dabeere ná nkwa a na-emesi obi ike nke Bible: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ́; tụkwasịkwa Ya obi, Ya onwe ya ga-emekwa ya.” (Abụ Ọma 37:5) N’ezie, ndị nile ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova, ma hà lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ha alụghị, pụrụ inweta nkasi obi na ume n’ihe a e dere n’ike mmụọ nsọ: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.”—Abụ Ọma 121:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Lee 2005 Calendar of Jehovah’s Witnesses, July/August.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Onye na-alụghị nwanyị na-echegbu onwe ya maka ihe nke Onyenwe anyị, otú ọ pụrụ isi nweta nnwapụta nke Onyenwe anyị.”—1 NDỊ KỌRINT 7:32

[Igbe dị na peeji nke 8]

IME KA ALỤGHỊ DI MA Ọ BỤ NWUNYE BỤRỤ IHE NA-AKWỤGHACHI ỤGWỌ

Jizọs, bụ́ onye na-alụghị nwanyị, kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche nke onye ahụ zitere m nakwa ka m rụchaa ọrụ ya.”—Jọn 4:34.

Ụmụ Filip anọ bụ́ ndị na-alụghị di ji ọrụ n’aka “na-ebu amụma.”—Ọrụ 21:8, 9.

Ụmụnna nwanyị na-alụghị di bụ́ ndị na-akpọsa ozi Alaeze ahụ so ‘n’usuu bara ụba ndị na-ezisa ozi ahụ.’—Abụ Ọma 68:11.