Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Onye Nwere Ezi Uche Na-aghọta Ijeụkwụ Ya”

“Onye Nwere Ezi Uche Na-aghọta Ijeụkwụ Ya”

“Onye Nwere Ezi Uche Na-aghọta Ijeụkwụ Ya”

ONYE nwere ezi uche maara ka e si edozi nsogbu ma dị nkọ, ọ na-eche echiche nke ọma ma na-eme mkpebi ziri ezi, nwee nghọta na amamihe, ma dị akọ. Ọ bụghị onye aghụghọ ma ọ bụ onye na-echepụta ihe ọjọọ. Ilu 13:16 na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nke nwere ezi uche ji ihe ọmụma arụ ọrụ.” Ee, ezi uche, ma ọ bụ akọ, bụ àgwà a na-achọsi ike.

Olee otú anyị pụrụ isi jiri ezi uche na-eme ihe ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị? Olee otú àgwà a si apụta ìhè ná nhọrọ ndị anyị na-eme, n’otú anyị si emeso ndị ọzọ ihe, na n’ihe anyị na-eme n’ọnọdụ dịgasị iche? Ụgwọ ọrụ ndị dị aṅaa ka ndị dị akọ na-enweta? Ọdachi ndị dị aṅaa ka ha na-ezere? Eze Solomọn nke Izrel oge ochie zara ajụjụ ndị a n’ụzọ ziri ezi n’Ilu 14:12-25. *

Jiri Amamihe Họrọ Ụzọ Ị Ga-agbaso

Ime nhọrọ ndị amamihe dị na ha na inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ chọrọ n’ezie ikike nke ịma ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ. Otú ọ dị, Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ụzọ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ, ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ.” (Ilu 14:12) N’ihi ya, anyị aghaghị ịmụta ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe ziri nnọọ ezi na ihe yiri ka ò ziri ezi. Okwu ahụ bụ́ “ụzọ nile nke ọnwụ” na-egosi na e nwere ọtụtụ ụzọ dị otú ahụ na-eduhie eduhie. Tụlee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ịmara ma zere.

A na-elekarị ndị ọgaranya na ndị a ma ama n’ụwa anya dị ka ndị a ga-akwanyere ùgwù. Ihe ịga nke ọma ha na-enwe n’obodo nakwa n’ịkpata ego pụrụ ime ka o yie ka otú ha si eme ihe ò ziri ezi. Oleekwanụ maka otú ọtụtụ n’ime ndị dị otú ahụ si enweta akụ̀ na ụba na oké aha? Ụzọ ha ọ̀ na-ezi ezi ma na-adị ọcha mgbe nile? E nwekwara ụfọdụ ndị na-anụrụ nnọọ nkwenkwe okpukpe ha ọkụ n’obi. Ma, ezi obi ha ọ̀ na-egosi n’ezie na nkwenkwe ha ziri ezi?—Ndị Rom 10:2, 3.

Ụzọ pụkwara iyi ihe ziri ezi n’ihi nduhie onwe onye. Ime mkpebi dabere n’ihe anyị onwe anyị chere na o ziri ezi bụ ịdabere n’obi anyị, bụ́ ihe nduzi dị aghụghọ. (Jeremaịa 17:9) Akọ na uche a na-azụghị azụ pụrụ ime ka anyị chee na ụzọ ọjọọ ziri ezi. Gịnịzi ga-enyere anyị aka ịhọrọ ụzọ ziri ezi?

Iji ịdị uchu na-amụ eziokwu ndị ka mie emie nke Okwu Chineke dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-enweta ‘ikike nghọta a zụrụ ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.’ Ọzọkwa, anyị aghaghị ịzụ ikike a ‘site n’iji ya eme ihe’ n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. (Ndị Hibru 5:14) Anyị aghaghị ịkpachara anya ịghara ikwe ka ụzọ yiri ka ò ziri ezi mee ka anyị gharazie ịga ‘n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduga ná ndụ.’—Matiu 7:13, 14.

Mgbe “Ihe Na-egbu Obi Mgbu”

Ànyị pụrụ inwe obi ụtọ mgbe anyị na-enweghị udo nke obi? Ọchị na ntụrụndụ hà pụrụ ibelata ihe mgbu nke obi? Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya mmadụ iji mmanya na-aba n’anya na ịnụ ọgwụ ọjọọ ekpuchi nkụda mmụọ, ma ọ bụ ịgbalị ikpuchi mmetụta ahụ site n’ibi ndụ rụrụ arụ? Azịza ya bụ ee e. Eze ahụ maara ihe na-ekwu, sị: “N’ọchị ka ihe na-egbu obi mgbu.”Ilu 14:13a.

Ọchị pụrụ ikpuchi ihe mgbu, ma ọ dịghị ewepụ ya. Bible na-ekwu, sị: “Ihe ọ bụla nwere oge.” N’ezie, e nwere “mgbe ịkwa ákwá, na mgbe ịchị ọchị; mgbe iru újú, na mgbe ite egwú.” (Eklisiastis 3:1, 4) Mgbe nkụda mmụọ dịgidere, anyị aghaghị ime ihe iji merie ya, chọọ “ezi ndụmọdụ” mgbe ọ dị mkpa. (Ilu 24:6) * Ọchị na ntụrụndụ na-abatụ uru, ma abamuru ha ebughị ibu. N’ịdọ aka ná ntị megide ụdị ihe ntụrụndụ ndị na-adịghị mma na ntụrụndụ gabigara ókè, Solomọn kwuru, sị: “Ikpeazụ ọṅụ bụ iru újú.”Ilu 14:13b.

Afọ Ga-eju Onye Laghachiworo Azụ n’Obi na Ezi Mmadụ —N’ụzọ Dị Aṅaa?

Eze Izrel ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Site n’ụzọ nile nke aka ya ka afọ ga-eju onye laghachiworo azụ n’obi: ma ọ bụ site n’onwe ya ka afọ ga-eju ezi mmadụ.” (Ilu 14:14) Olee otú onye laghachiworo azụ n’obi na ezi mmadụ si enweta afọ ojuju site n’ihe si n’omume ha pụta?

Onye laghachiworo azụ n’obi adịghị eche banyere ịza Chineke ajụjụ. Ya mere, ime ihe ziri ezi n’anya Jehova adịghị onye laghachiworo azụ n’obi mkpa. (1 Pita 4:3-5) Ndụ ịhụ ihe onwunwe n’anya nke onye dị otú ahụ na-ebi na-eju ya afọ. (Abụ Ọma 144:11-15a) N’aka nke ọzọ, ezi mmadụ na-eche banyere ihe ime mmụọ. Ọ na-agbaso ụkpụrụ ezi omume nke Chineke n’ihe nile ọ na-eme. Ihe si n’omume onye dị otú ahụ pụta na-eju ya afọ n’ihi na Jehova bụ Chineke ya, ọ na-enwetakwa ọṅụ na-enweghị atụ n’ijere Onye Kasị Ihe Nile Elu ozi.—Abụ Ọma 144:15b.

Ekwerela Okwu Nile Ọ Bụla’

N’igosi ọdịiche dị n’ụzọ onye na-enweghị uche na nke onye dị akọ, Solomọn na-ekwu, sị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” (Ilu 14:15) Ọ naghị adị mfe ịghọgbu onye nwere ezi uche. Kama ikwere ihe nile ọ nụrụ ma ọ bụ ikwe ka ndị ọzọ na-agwa ya ihe ọ ga-eme, ọ na-eji amamihe atụle ijeụkwụ ya. Mgbe ọ ghọtachara ihe nile banyere okwu ahụ, ọ na-eji ihe ọmụma o nwetara eme ihe.

Were ajụjụ ahụ bụ́ “È nwere Chineke?” dị ka ihe atụ. Onye na-enweghị uche na-anakwere echiche nke ihe ka ọtụtụ ma ọ bụ na-ekwere ihe ndị a ma ama kweere. N’aka nke ya, onye nwere uche na-ewepụta oge iji chọpụta ihe ndị bụ́ eziokwu. Ọ na-atụgharị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Ndị Rom 1:20 na Ndị Hibru 3:4. N’ihe metụtara ihe ime mmụọ, onye dị akọ adịghị nnọọ ekwere ihe ọ bụla ndị ndú okpukpe na-ekwu. Ọ ‘na-anwale okwu ndị sitere ná mkpali nke mmụọ ịhụ ma hà sitere na Chineke.’—1 Jọn 4:1.

Lee otú o si bụrụ ihe amamihe dị na ya ige ntị na ndụmọdụ ahụ bụ́ ka anyị ghara ‘ikwere okwu nile ọ bụla’! Ndị e nyere ibu ọrụ nke inye ndị ọzọ ndụmọdụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst aghaghị iburu nke a n’uche karịsịa. Onye na-enye ndụmọdụ aghaghị ịmata ihe nile merenụ. Ọ ghaghị ige ntị nke ọma ma ghọta otú ihe ahụ si mee ka ndụmọdụ ya ghara ịbụ nke na-erijughị afọ ma ọ bụ nke lara otu akụkụ.—Ilu 18:13; 29:20.

“Onye Ọ Bụla nke Na-ezu Nzube Ọjọọ Dị Iche Iche, A Na-akpọ Ya Asị”

N’ikwu banyere ọdịiche ọzọ dị n’etiti onye maara ihe na onye nzuzu, eze Izrel ahụ na-ekwu, sị: “Onye maara ihe na-atụ egwu, wee si n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya: ma onye nzuzu na-ewebiga iwe ókè, wee na-atụkwasị obi. Onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ ga-eme ihe nke uche gbagọrọ agbagọ: ọzọ, onye ọ bụla nke na-ezu nzube ọjọọ dị iche iche, a na-akpọ ya asị.”Ilu 14:16, 17.

Onye maara ihe na-atụ ụjọ ihe ga-esi n’ime ihe ọjọọ pụta. N’ihi ya, ọ na-eji akọ eme ihe ma na-eji ndụmọdụ ọ bụla ga-enyere ya aka izere ime ihe ọjọọ akpọrọ ihe. Onye nzuzu adịghị atụ ụdị ụjọ ahụ. N’ịbụ onye tụkwasịrị onwe ya obi, ọ na-eji mpako eleghara ndụmọdụ ndị ọzọ na-enye ya anya. N’ihi ịbụ onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ, onye dị otú ahụ na-eme ihe nzuzu. Ma olee otú o si bụrụ na a na-akpọ onye nke na-ezu nzube ọjọọ asị?

Okwu mbụ a sụgharịrị ịbụ ‘izu nzube ọjọọ’ nwere ihe abụọ ọ pụtara. Ọ bụrụ na e jiri ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi, ọ pụrụ ịpụta nghọta ma ọ bụ ịdị nkọ. (Ilu 1:4; 2:11; 3:21) E jirikwanụ ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, okwu ahụ pụrụ izo aka ná nzube ọjọọ ma ọ bụ echiche ọjọọ.—Abụ Ọma 37:7; Ilu 12:2; 24:8.

Ọ bụrụ na okwu mbụ ahụ na-ezo aka ‘n’onye ọ bụla nke na-ezu nzube ọjọọ dị iche iche,’ ọ gaghị eju anya ihe mere e ji akpọ onye dị otú ahụ asị. Ma ọ bụrụ na e jiri ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi, olee otú o si bụrụ na a na-akpọ onye ahụ asị? Ọ́ bụghị eziokwu na ndị na-enweghị nghọta pụrụ ịkpọ onye nwere àgwà a asị? Dị ka ihe atụ, ụwa kpọrọ ndị na-eji ikike iche echiche ha eme ihe ma họrọ ịghara ịbụ “akụkụ nke ụwa” asị. (Jọn 15:19) A na-akwa ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst na-eji ikike iche echiche ha eme ihe ma na-eguzogide nrụgide na-adịghị mma nke ndị ọgbọ ha iji zere àgwà ọjọọ emo. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụwa, bụ́ nke dị n’ike aka Setan bụ́ Ekwensu, kpọrọ ndị na-efe ezi ofufe asị.—1 Jọn 5:19.

“Ndị Ọjọọ Ehudawo Ala”

Ndị dị akọ, ma ọ bụ ndị nwere ezi uche, dị iche n’ebe ndị na-enweghị uche nọ n’ụzọ ọzọkwa. “Ndị na-enweghị uche eketawo uche gbagọrọ agbagọ: ma ndị nwere ezi uche ka a na-ekpuwe ihe ọmụma n’isi.” (Ilu 14:18) N’ihi ịbụ ndị na-enweghị nghọta, ndị na-enweghị uche na-ahọrọ ime ihe nzuzu. Nke a na-aghọ ụzọ ndụ ha. N’aka nke ọzọ, ihe ọmụma na-achọ onye nwere ezi uche mma dị ka okpueze si achọ eze mma.

Eze ahụ maara ihe na-ekwu, sị: “Ndị ọjọọ ehudawo ala n’ihu ndị ezi mmadụ; ndị na-emebi iwu kwa n’ọnụ ụzọ ámá nile nke onye ezi omume.” (Ilu 14:19) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mee elu mee ala, ihe ga-agara ezi mmadụ nke ọma karịa ajọ mmadụ. Tụlee mmụba ndị Chineke na-amụba n’ọnụ ọgụgụ taa na ndụ ka mma ha na-ebi. Ịhụ ngọzi ndị a Jehova na-awụkwasị ndị ohu ya ga-eme ka ụfọdụ ndị mmegide ‘huru ala’ n’ihu nwanyị ihe atụ eluigwe nke Jehova, bụ́ onye ihe fọdụrụ e tere mmanụ nọ n’ụwa na-anọchi anya ya. Ya dịkarịa anya, n’Amagedọn, a ga-amanye ndị mmegide ikweta na akụkụ elu ala nke nzukọ Chineke na-anọchi anya akụkụ nke eluigwe n’ezie.—Aịsaịa 60:1, 14; Ndị Galeshia 6:16; Mkpughe 16:14, 16.

‘Imere Ndị E Wedara n’Ala Amara’

N’ikwu banyere àgwà ọ hụrụ ụmụ mmadụ na-akpa, Solomọn na-ekwu, sị: “Ọbụna onye agbata obi nke ogbenye na-akpọ ya asị: ma ndị na-ahụ ọgaranya n’anya dị ọtụtụ.” (Ilu 14:20) Lee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ! N’ịbụ ndị na-achọkarị ọdịmma onwe ha nanị, ha na-emere ọgaranya amara karịa ogbenye. Ọ bụ ezie na ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi, o jighị ha n’aka dị nnọọ ka ọ na-ejighị akụ̀ ya n’aka. Mgbe ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị izere ime enyi n’ihi ego ma ọ bụ otuto?

Gịnị ma ọ bụrụ na nnyocha anyị ji ezi obi mee ekpughee na anyị na-emere ndị ọgaranya amara ma na-eleda ndị ogbenye anya? Anyị aghaghị ịghọta na a katọrọ ime amara dị otú ahụ n’ime Bible. Ọ na-ekwu, sị: “Onye na-eleda mmadụ ibe ya anya na-emehie: ma onye na-emere ndị e wedara n’ala amara, onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ.”Ilu 14:21.

Anyị kwesịrị ichebara ndị nọ n’ọnọdụ tara akpụ echiche. (Jems 1:27) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? Site n’inye ha “ihe ụwa a ndị e ji akwado ndụ,” nke pụrụ ịgụnye ego, nri, ụlọ, uwe, na nlebara anya. (1 Jọn 3:17) Obi ụtọ na-adịrị onye na-emere ndị dị otú ahụ amara, ebe ọ bụ na “a na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

Olee Otú Ihe Na-adịrị Ha?

Ụkpụrụ ahụ bụ́ “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa” na-emetụta ma ndị nwere ezi uche ma ndị nzuzu. (Ndị Galeshia 6:7) Onye nwere ezi uche na-eme ezi ihe; ebe onye nzuzu na-echepụta ihe ọjọọ. Eze ahụ maara ihe na-ajụ, sị: “Hà adịghị akpafu, bụ́ ndị na-echepụta ihe ọjọọ?” Azịza ya bụ ee; ha ‘na-akpafu.’ “Ma ebere na eziokwu ga-adịrị ndị na-echepụta ezi ihe.” (Ilu 14:22) Ndị na-eme ezi ihe na-enweta ihu ọma nke ndị ọzọ nakwa obiọma sitere n’ịhụnanya Chineke.

Solomọn jikọtara ịrụsi ọrụ ike na ihe ịga nke ọma nakwa oké okwu na arụsighị ọrụ ike, na-asị: “Ná ndọgbu nile nke mmadụ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ uru dị ya: ma okwu egbugbere ọnụ na-eduba nanị n’ihe ịkọ ụkọ.” (Ilu 14:23) N’ezie, ụkpụrụ a metụtara mgbalị anyị na-eme n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe anyị rụsiri ọrụ ike n’ozi Ndị Kraịst, anyị na-enweta ụgwọ ọrụ nke ime ka ọtụtụ nweta eziokwu na-azọpụta ndụ nke Okwu Chineke. Iji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ ọchịchị Chineke ọ bụla e kenyere anyị pụrụ ime ka anyị nweta ọṅụ na afọ ojuju.

Ilu 14:24 na-ekwu, sị: “Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụ̀ ha: ma uche gbagọrọ agbagọ nke ndị nzuzu bụ nanị uche gbagọrọ agbagọ.” Nke a pụrụ ịpụta na amamihe nke ndị maara ihe na-agbalị inweta bụ akụ̀ ha, ọ na-ekpuwekwa ha okpueze, ma ọ bụ na-achọ ha mma. N’aka nke ọzọ, onye nzuzu na-enweta nanị ihe nzuzu. Dị ka otu akwụkwọ ntụaka si kwuo, ilu a pụkwara inye echiche na “akụ̀ bụ ihe ịchọ mma nye ndị na-eji ya eme ihe nke ọma . . . [ebe] ndị nzuzu na-enweta nanị nzuzu.” Nke ọ bụla ọ bụ, onye maara ihe na-eme nke ọma karịa onye nzuzu.

Eze Izrel ahụ na-ekwu, sị: “Onye na-anapụta mkpụrụ obi dị iche iche ka onyeàmà nke na-ekwu eziokwu bụ: ma onye na-ekupụ ọtụtụ okwu ụgha dị ka ume na-aghọ aghụghọ.” (Ilu 14:25) Ọ bụ ezie na nke a bụ nnọọ eziokwu n’ihe metụtara ikpe, tụlee ihe ọ pụtara n’ihe banyere ozi anyị. Ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ anyị na-arụ na-agụnye ịgbara eziokwu nke Okwu Chineke àmà. Àmà ahụ na-anapụta ndị nwere obi eziokwu n’okpukpe ụgha ma na-azọpụta ndụ. Site n’ilezi onwe anyị na ozizi anyị anya mgbe nile, anyị ga-azọpụta ma onwe anyị ma ndị na-ege anyị ntị. (1 Timoti 4:16) Ka anyị na-anọgide na-eme nke a, ka anyị mụrụ anya igosipụta ezi uche n’akụkụ nile nke ndụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Iji hụ ebe a tụlere Ilu 14:1-11, lee peeji nke 26-29 nke mbipụta Ụlọ Nche nke November 15, 2004.

^ par. 11 Lee peeji nke 19-24 nke mbipụta Teta! nke March 8, 1989.

[Foto dị na peeji nke 18]

Iji ịdị uchu na-amụ eziokwu ndị ka mie emie dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-amata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya ọ̀ na-enye afọ ojuju n’ezie?