Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-ele Onwe Gị Anya Dị Ka Onye Na-abaghị Uru?

Ị̀ Na-ele Onwe Gị Anya Dị Ka Onye Na-abaghị Uru?

Ị̀ Na-ele Onwe Gị Anya Dị Ka Onye Na-abaghị Uru?

N’IHE ka ukwuu ná ndụ ya, Lena anọwo na-enwe echiche na-ezighị ezi banyere onwe ya. O kwuru, sị: “Mmetọ e metọrọ m n’ụzọ mmekọahụ ruo ọtụtụ afọ n’oge m bụ nwata napụrụ m ihe dị ukwuu n’ùgwù m. Echere m na abaghị m uru ọ bụla.” Simone chekwara echiche laa azụ n’oge ọ na-eto eto ma kwuo, sị, “N’ime m, atọgbọ m chakoo, ọ dịkwa m ka abachaghị m uru.” Oké obi ilu mmetụta ndị dị otú ahụ na-akpata yiri ka ò jupụtara ebe nile taa. Otu òtù nke na-enye ndị nọ n’afọ iri na ụma ndụmọdụ na telifon kwuru na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị na-akpọ ha na fon na-ekwu na ha “na-ele onwe ha anya mgbe nile dị ka ndị na-abaghị uru.”

Dị ka ụfọdụ ndị ọkachamara si kwuo, mmadụ na-amalite inwe mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru mgbe e mere ka o chee na ọ baghị uru. Mmetụta dị otú ahụ pụrụ ibilite mgbe a na-abara mmadụ mba mgbe nile, na-akatọ ya gabiga ókè, ma ọ bụ jiri obi ọjọọ na-emegbu ya. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya, ihe na-esi na ya apụta pụrụ ime ka onye ahụ daa mbà n’obi, ọ pụkwara ọbụna ibibi ndụ onye ahụ. N’otu ihe ọmụmụ ahụ́ ike e nwere n’oge na-adịchabeghị anya, a chọpụtara na ndị nwere echiche na-ezighị ezi banyere onwe ha adịchaghị atụkwasị onwe ha na ndị ọzọ obi, si otú ahụ na-emebi ezi mmekọrịta na ọbụbụenyi n’amaghị ama. Akwụkwọ chịkọtara ihe a chọpụtara n’ihe ọmụmụ ahụ na-ekwu, sị: “N’ụzọ ụfọdụ, ha ‘na-akpata’ nnọọ ọnọdụ ahụ ha na-atụ oké egwu.”

Ndị na-enwe mmetụta dị otú ahụ na-enwekarị ihe Bible na-akpọ “nchegbu.” (Abụ Ọma 94:19) Ha na-eche na ha adịtụghị eme nke ọma. Mgbe ihe na-agazighị agazi, ha na-ata onwe ha ụta ozugbo. Ọ bụ ezie na ndị ọzọ pụrụ ito ha maka ihe ndị ha rụzuru, n’ime onwe ha, ọ na-adị ha ka hà bụ ndị wayo a ga-agba n’anwụ n’oge na-adịghị anya. Ebe ọ bụ na ha kweere na ha erughị eru inwe obi ụtọ, ọtụtụ n’ime ha na-amalite ịkpa àgwà ndị na-ebibi onwe onye, ọ na-adịkwa ha ka ha enweghịzi ike ịgbanwe àgwà ndị a. Lena, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’elu, bịara nwee oké nsogbu iri ihe n’ihi enweghị ùgwù onwe onye, o kwetakwara, sị, “Ọ bịara dị m ka apụghị m ịgbanwe ihe ọ bụla.”

Ndị ha na “nchegbu” dị otú ahụ na-alụ hà ga-anọgiderịrị na-enwe mmetụta ahụ ná ndụ ha nile? Ọ̀ dị ihe a pụrụ ime iji lụso mmetụta dị otú ahụ ọgụ? Bible na-enye ụkpụrụ na ndụmọdụ dị irè bụ́ ndị nyewooro ọtụtụ ndị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ọgụ ahụ. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị a, oleekwa otú ha siworo nyere ndị na-enwe mmetụta dị otú ahụ aka inwe ọṅụ ná ndụ? Isiokwu na-esonụ ga-akọwa nke a.