Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Agụwo “Ntutu Nile nke Isi Unu Ọnụ”

Jehova Agụwo “Ntutu Nile nke Isi Unu Ọnụ”

Jehova Agụwo “Ntutu Nile nke Isi Unu Ọnụ”

“O nweghị otu n’ime [nza] ga-ada n’ala Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu nile nke isi unu ọnụ.”—MATIU 10:29, 30.

1, 2. (a) Gịnị mere Job ji chee na Chineke agbahapụla ya? (b) Ihe ndị Job kwuru hà na-egosi na ọ gbakụtala Jehova azụ? Kọwaa.

“ANA M etiku Gị [Chineke], ma ị dịghị aza m: eguzoro m ọtọ, I wee lekwasị m anya. Ị na-agbanwe ịbụrụ m onye na-enweghị obi ebere: Ị na-eji ume aka Gị kpagbuo m.” Onye kwuru okwu ahụ nọ n’oké nhụjuanya, ọ bụghịkwa ihe ijuanya na ọ nọ n’ọnọdụ ahụ! Ihe ndị o ji biri efunahụla ya, ọdachi dị mgbagwoju anya egbukpọọla ụmụ ya, ugbu a kwa, a kụọla ya ọrịa na-agwụ ike. Aha nwoke ahụ bụ Job, e dekọkwara ahụhụ ọ tara n’ime Bible maka abamuru anyị.—Job 30:20, 21.

2 Ihe ndị Job kwuru pụrụ ime ka o yie ka ọ̀ gbakụtala Chineke azụ, ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. Nanị ihe Job mere bụ ikwupụta otú ọ dị ya n’obi. (Job 6:2, 3) Ọ maghị na ọ bụ Setan na-anwa ya, ya mere, o kwubiri n’ụzọ hiere ụzọ na Chineke agbahapụla ya. N’otu oge, Job jụdịrị Jehova, sị: “N’ihi gịnị ka Ị na-ezo ihu Gị, na-echekwa na m bụ onye iro n’ebe Ị nọ?” *Job 13:24.

3. Mgbe anyị na-ata ahụhụ, gịnị pụrụ ịgbata anyị n’obi?

3 Taa, ọtụtụ Ndịàmà Jehova nọgidere na-ata ahụhụ n’ihi agha, ọgba aghara ọchịchị ma ọ bụ nke obodo, ọdachi ndị na-emere onwe ha, nká, ọrịa, ogbenye ọnụ ntụ na mmachibido iwu nke ndị ọchịchị. Ọ pụkwara ịbụ na gị onwe gị na-enwe otu ọnwụnwa ma ọ bụ ọzọ. Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ịdị na-eche na Jehova na-ezonahụ gị ihu ya. Ị maara ihe dị na Jọn 3:16 nke ọma. Ọ na-asị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya.” N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ị na-ata ahụhụ n’enweghị olileanya na ọ ga-akwụsị, ị pụrụ iche, sị: ‘Chineke ọ̀ hụrụ mụnwa n’anya n’ezie? Ọ̀ maara maka ahụhụ m na-ata? Ọ̀ na-eche banyere mụ onwe m?’

4. Olee ọnọdụ na-ekweghị akwụsị akwụsị Pọl na-aghaghị ịnagide, n’ụzọ ndị dịkwa aṅaa ka ọnọdụ dị otú ahụ pụrụ isi metụta anyị?

4 Tụlee ihe mere Pọl onyeozi. O dere, sị: “E mere ka m nwee ogwu n’anụ ahụ́ m, bụ́ mmụọ ozi Setan, ka ọ nọgide na-ama m ụra,” ọ gbakwụnyere, sị: “Ugboro atọ ka m rịọsiri Onyenwe anyị arịrịọ ike ka ihe a wee si n’ebe m nọ pụọ.” Jehova nụrụ arịrịọ ya. Otú ọ dị, ọ gwara Pọl na ya agaghị ewepụ ogwu ahụ n’ụzọ ọrụ ebube. Kama nke ahụ, Pọl aghaghị ịdabere n’ike Chineke iji nyere ya aka ịnagide ‘ogwu ahụ dị ya n’anụ ahụ́.’ * (2 Ndị Kọrint 12:7-9) Dị ka Pọl, ọ pụrụ ịbụ na o nwere ọnwụnwa gị na ya na-alụ. Eleghị anya, ị na-eche, sị, ‘Na o yiri ka Jehova emebeghị ihe ọ bụla banyere ule m ọ̀ na-egosi na ọ maghị maka ọnọdụ m, ka ọ̀ bụ na ọ naghị eche banyere m?’ Ọ bụtụghị otú ahụ! Ihe Jizọs gwara ndịozi ya obere oge tupu ya ahọpụta ha mere ka nchegbu Jehova nwere maka ohu ya nke ọ bụla na-ekwesị ntụkwasị obi pụta ìhè. Ka anyị hụ otú ihe ndị o kwuru pụrụ isi gbaa anyị ume taa.

“Unu Atụla Egwu”—N’ihi Gịnị?

5, 6. (a) Olee otú Jizọs si nyere ndịozi ya aka ịghara ịtụ egwu maka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu? (b) Olee otú Pọl si gosi na ya nwere obi ike na Jehova na-eche banyere ya?

5 Jizọs nyere ndịozi ya ikike pụrụ iche, gụnyere “ikike n’ebe ndị mmụọ na-adịghị ọcha nọ, ka ha wee chụpụ ha na ka ha gwọọ ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla.” Ma, nke a apụtaghị na ha agaghị enweta ule na ihe isi ike ná ndụ. Kama nke ahụ, Jizọs kọwara n’ụzọ zuru ezu ụfọdụ n’ime ihe ndị ga-adakwasị ha. Otú ọ dị, ọ gbara ha ume, sị: “Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ́ ma ha enweghị ike igbu mkpụrụ obi; kama na-atụnụ egwu onye ahụ nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.”—Matiu 10:1, 16-22, 28.

6 Iji nyere ndịozi ya aka ịghọta ihe mere ha na-ekwesịghị iji tụọ egwu, Jizọs nyeziri ha ihe atụ abụọ. Ọ gwara ha, sị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụta nanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu nile nke isi unu ọnụ. Ya mere unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” (Matiu 10:29-31) Rịba ama na Jizọs jikọtara atụghị egwu mgbe anyị na-ata ahụhụ na inwe obi ike na Jehova na-eche banyere anyị n’otu n’otu. Ihe àmà na-egosi na Pọl onyeozi nwere obi ike dị otú ahụ. O dere, sị: “Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị? Onye ahụ nke na-azọghị ọbụna Ọkpara nke ya kama nyefee ya maka anyị nile, gịnị mere ya na ya na-agaghịkwa eji obiọma nye anyị ihe nile ọzọ?” (Ndị Rom 8:31, 32) N’agbanyeghị ihe ịma aka ndị ị na-eche ihu, ị pụkwara ijide n’aka na Jehova na-eche banyere gị onwe gị ma ọ bụrụhaala na ị nọgide na-eguzosi ike n’ihe nye ya. Nke a ga-apụta ìhè ọbụna karị ma anyị lebakwuo anya na ndụmọdụ Jizọs nyere ndịozi ya.

Otú E Si Were Nza

7, 8. (a) Olee otú e si lee nza anya n’oge Jizọs? (b) Dị ka ihe àmà na-egosi, olee ihe mere Matiu 10:29 ji jiri ụdị okwu Grik e ji eme ihe maka “nza” bụ́ nke pụtara obere nnụnụ mee ihe?

7 Ihe atụ Jizọs kọwara nke ọma nchegbu Jehova na-enwe maka ohu Ya nke ọ bụla. Buru ụzọ tụlee banyere nza. N’oge Jizọs, a na-eri nza eri, ma ebe ọ bụ na ha na-emebisị ihe a kụrụ akụ, a na-elekarị ha anya dị ka ihe ndị na-akpata nsogbu. Nza juru ebe nile, dịkwa ọnụ ala nke na a pụrụ iji ihe na-erughị cent ise zụta abụọ. Cent iri ga-azụta, ọ bụghị nza anọ, kama ise—nke ga-eme ya ise ga-abụ nke e ji mezie ya, dị ka à ga-asị na ọ baghị uru * ọ bụla!—Luk 12:6.

8 Cheekwa banyere otú nnụnụ a juru ebe nile hà. E jiri ya tụnyere ọtụtụ nnụnụ ndị ọzọ, ọbụna nza nke tozurula etozu na-adị nnọọ ntakịrị. N’agbanyeghị nke ahụ, okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “nza” na Matiu 10:29 pụtara kpọmkwem obere nza. Ihe àmà na-egosi na Jizọs chọrọ ka ndịozi ya jiri anya nke uche ha hụ obere nnụnụ nke na-abachaghị uru. Dị ka otu akwụkwọ e mere nnyocha na ya si kwuo, “Jizọs kpọtụrụ nnụnụ dị nnọọ ntakịrị aha ma jirikwa okwu gosiri na ọ bụ nnọọ obere nnụnụ mee ihe!”

9. Olee isi ihe gbara ọkpụrụkpụ Jizọs mere ka ọ pụta ìhè n’ihe atụ o mere banyere nza?

9 Ihe atụ Jizọs ji nza mee mere ka otu isi ihe gbara ọkpụrụkpụ pụta ìhè: Ihe yiri ihe na-abaghị uru n’anya ụmụ mmadụ dị mkpa n’anya Jehova Chineke. Jizọs gara n’ihu ime ka eziokwu a pụta ìhè site n’ịgbakwụnye na obere nza agaghị ‘ada n’ala’ Jehova aghara ịma. * Ihe mmụta dị na ya doro anya. Ọ bụrụ na Jehova Chineke maara maka nnụnụ kasị nta na nke a kasị ele anya dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ, lezienụ ka ọ ga-esi na-echegbu onwe ya karị banyere ọnọdụ nke onye kpebiri ijere ya ozi!

10. Gịnị ka okwu ahụ bụ́: “A gụwo ntutu nile nke isi unu ọnụ” pụtara?

10 Tụkwasị n’ihe atụ o mere banyere nza, Jizọs kwuru, sị: “A gụwo ntutu nile nke isi unu ọnụ.” (Matiu 10:30) Okwu a nke dị mkpirikpi ma gbaa ọkpụrụkpụ na-eme ka ihe Jizọs kwuru n’ihe atụ o mere banyere nza pụta ìhè. Tụlee nke a: Ntutu isi nke na-adị n’isi mmadụ na-adị ihe dị ka otu narị puku. Dị ka ọ na-adịkarị, otu ntutu na-eyi nnọọ ibe ya, ọ dịghịkwa ntutu nke o yiri ka ànyị na-elebara anya n’ụzọ pụrụ iche karịa ndị ọzọ. Ma, Jehova Chineke maara banyere ntutu isi nke ọ bụla, gụọkwa ya ọnụ. Ya bụrụ otú ahụ, ò nwere ihe banyere ndụ anyị nke Jehova na-apụghị ịma? N’ezie, Jehova maara otú e si kee onye nke ọ bụla n’ime ndị ohu ya. N’ezie, ọ “na-ele obi.”—1 Samuel 16:7.

11. Olee otú Devid si gosi obi ike o nwere na Jehova na-eche banyere ya?

11 Devid, bụ́ onye jiworo anya ya hụ ihe a na-akpọ ihe isi ike, nwere obi ike na Jehova maara ya. O dere, sị: “Jehova, I gwupụtawo ala obi m, I wee mara m. Gị onwe gị amawo nnọdụ ala m na mbili ọtọ m, Ị na-aghọta echiche m nile site n’ebe dị anya.” (Abụ Ọma 139:1, 2) Ị pụkwara ijide n’aka na Jehova maara gị onwe gị. (Jeremaịa 17:10) Ekwubila ngwa ngwa na ị dị nnọọ ntakịrị nke na anya Jehova nke na-ahụ ihe nile apụghị ịhụ gị!

“Tinye Anya Mmiri M Nile n’Ime Karama Akpụkpọ Gị”

12. Olee otú anyị si mara na Jehova maara ahụhụ ndị ya na-ata nke ọma?

12 Ọ bụghị nanị na Jehova maara ndị ohu ya n’otu n’otu kamakwa ọ maara ahụhụ nke ọ bụla n’ime ha na-ata nke ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-akpagbu ndị Izrel dị ka ndị ohu, Jehova gwara Mozis, sị: “Ahụwo m n’ezie mweda n’ala nke ndị m nke dị n’Ijipt, anụwokwa m iti mkpu ha n’ihi ndị na-achị ha n’ihe ike; n’ihi na amawo m ihe mgbu ha nile.” (Ọpụpụ 3:7) Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmata na mgbe anyị na-atachi obi n’ule, Jehova na-ahụ ihe na-emenụ ma na-anụ iti mkpu anyị! N’ezie, ahụhụ anyị na-ata na-emetụ ya n’obi.

13. Gịnị na-egosi na Jehova na-eche banyere ndị ohu ya n’ezie?

13 Mmetụta Jehova nwere maka ụmụ Izrel na-egosi na ọ na-eche banyere ndị ya na ha na-emekọ ihe. N’agbanyeghị na ahụhụ ha na-ata na-abụkarị n’ihi isi ike ha, Aịzaịa dere banyere Jehova, sị: “Ná mkpagbu nile ha Ya ka a na-akpagbu.” (Aịsaịa 63:9) Ya mere, dị ka ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, ị pụrụ ijide n’aka na mgbe ihe na-ewute gị, ọ na-ewute Jehova. Ọ̀ bụ na nke a adịghị akpali gị iche ahụhụ ọ bụla ihu n’atụghị ụjọ na ịnọgide na-eme ike gị nile ijere ya ozi?—1 Pita 5:6, 7.

14. Olee ọnọdụ a nọ na ya dee Abụ Ọma nke 56?

14 E mere ka obi ike Eze Devid nwere na Jehova na-eche banyere ya ma nwee ọmịiko n’ahụ́ ya pụta ìhè n’Abụ Ọma nke 56, bụ́ nke Devid dere mgbe ọ na-agbara Eze Sọl na-achọ igbu ya ọsọ. Devid gbagara Gat, ma o chere na a ga-ejide ya mgbe ndị Filistia matara onye ọ bụ. O dere, sị: “Ndị na-eche m anwụ na-ekusi ume ike ilo m ogologo ụbọchị nile: n’ihi na ha bara ụba, bụ́ ndị na-ebu agha imegide m n’ibuli onwe ha elu.” N’ihi ọnọdụ ya nke dị nnọọ ize ndụ, Devid chigharịkwuuru Jehova. O kwuru, sị: “Ogologo ụbọchị nile ka ha na-ahịgharị okwu m nile: n’imegide m echiche nile ha bụ ime ihe ọjọọ.” —Abụ Ọma 56:2, 5.

15. (a) Gịnị ka Devid bu n’obi mgbe ọ rịọrọ Jehova ka o tinye anya mmiri ya na karama akpụkpọ ma ọ bụ detuo ya n’akwụkwọ? (b) Mgbe anyị na-atachi obi n’ọnọdụ na-ama okwukwe anyị aka, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka?

15 Mgbe ahụ, dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma nke 56:8, Devid kwuru ihe ndị a na-adọrọ mmasị: “Mwagharị m ka Gị onwe gị gụworo ọnụ: tinye anya mmiri m nile n’ime karama akpụkpọ Gị; hà adịghị n’akwụkwọ Gị?” Lee otú e si kọwaa nlekọta ịhụnanya Jehova n’ụzọ na-emetụ n’ahụ́! Mgbe e nwere ihe na-echegbu anyị, anyị pụrụ ịkpọku Jehova n’anya mmiri. Ọbụna Jizọs, bụ́ onye zuru okè, mere otú ahụ. (Ndị Hibru 5:7) Obi siri Devid ike na Jehova na-ahụ ya nakwa na ọ ga-echeta ahụhụ ọ na-ata, dị ka à ga-asị na ọ na-agbanye anya mmiri ya n’ime karama akpụkpọ ma ọ bụ na-edetu ha n’akwụkwọ. * Ikekwe, ị na-eche na anya mmiri gị ga-afọ obere ka o ju karama akpụkpọ ahụ ma ọ bụ ọtụtụ peeji nke akwụkwọ ahụ. Ya bụrụ otú ahụ, kara obi. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

Ịghọ Ezigbo Enyi Chineke

16, 17. (a) Olee otú anyị si mara na nsogbu ndị ohu Jehova na-enwe na-emetụ ya n’obi? (b) Gịnị ka Jehova merela iji mee ka o kwe ụmụ mmadụ omume ịbụ ezigbo ndị enyi ya?

16 Eziokwu ahụ bụ́ na Jehova agụwo ‘ntutu isi anyị ọnụ’ na-eme ka anyị ghọtatụ ụdị Chineke na-eleru anya ala na nke na-ahụ n’anya anyị nwere ihe ùgwù ife ofufe. Ọ bụ ezie na anyị aghaghị ichere ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa bụ́ mgbe ihe mgbu nile na nhụjuanya nile ga-apụ n’anya, o nwere ihe magburu onwe ya Jehova na-emere ndị ya ugbu a. Devid dere, sị: “Izu nzuzo [ma ọ bụ ịbụ ezigbo enyi] Jehova dịịrị ndị na-atụ egwu Ya; ya na ọgbụgba ndụ Ya, ime ka ha mara ihe.”—Abụ Ọma 25:14.

17 ‘Ịbụ ezigbo enyi Jehova.’ Leenụ, nke ahụ yiri ka ọ̀ bụ ihe na-apụghị ikwe omume n’anya ụmụ mmadụ! Ma Jehova na-akpọ ndị na-atụ egwu ya òkù ịnọ dị ka ndị ọbịa n’ụlọikwuu ya. (Abụ Ọma 15:1-5) Gịnịkwa ka Jehova na-emere ndị ọbịa ya? Dị ka Devid si kwuo, ọ na-eme ka ha mara ọgbụgba ndụ ya. Jehova na-akọrọ ha ihe o bu n’obi, na-ekpughere ndị amụma “izu nzuzo” ya ka ha wee mara ihe bụ́ nzube ya na ihe ha na-aghaghị ime iji bie ndụ kwekọrọ na ha.—Emọs 3:7.

18. Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka anyị na ya nwee mmekọrịta chiri anya?

18 N’eziokwu, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịmara na anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ ịbụ ezigbo ndị enyi nke Onye Kasị Ihe Nile Elu, bụ́ Jehova Chineke. N’eziokwu, ọ na-agba anyị ume ime otú ahụ. Bible na-ekwu, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Jehova chọrọ ka anyị na ya nwee mmekọrịta chiri anya. N’ezie, o nweela ihe ndị o mere iji mee ka mmekọrịta dị otú ahụ kwe omume. Àjà mgbapụta Jizọs emeela ka o kwe omume anyị na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ịbụ enyi. Bible na-ekwu, sị: “Ma anyị onwe anyị, anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.”—1 Jọn 4:19.

19. Olee otú ntachi obi pụrụ isi mee ka mmekọrịta anyị na Jehova chikwuo anya?

19 Anyị na-eme ka mmekọrịta ahụ chikwuo anya mgbe anyị na-atachi obi n’ọnọdụ ndị siri oké ike. Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems dere, sị: “Ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee zuo ezu ma gbasie ike n’ụzọ nile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.” (Jems 1:4) Olee “ọrụ” a na-arụzu site n’ịtachi obi n’ihe isi ike? Cheta na Pọl nwere “ogwu n’anụ ahụ́.” Gịnị ka ntachi obi rụzuru n’ebe ọ nọ? Pọl kwuru banyere ule ndị bịaara ya, sị: “Ya mere, n’ụzọ kasị enye ọṅụ, ọ kara m mma ịnya isi n’ihe metụtara adịghị ike m, ka ike nke Kraịst ahụ wee nọgide na-ekpuchi m dị ka ụlọikwuu. Ya mere, ana m enweta obi ụtọ n’adịghị ike, ná mkparị, n’ịnọgasị ná mkpa, ná mkpagbu na ihe isi ike, maka Kraịst. N’ihi na mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:9, 10) Ihe Pọl maara bụ na Jehova ga-enye ya ike dị ya mkpa—“ike karịrị ike nkịtị,” ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa—iji tachie obi. N’aka nke ya, nke ahụ dọtakwuru ya nso n’ebe Kraịst na Jehova Chineke nọ.—2 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Filipaị 4:11-13.

20. Olee otú anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova ga-akwado anyị ma kasie anyị obi mgbe anyị na-ata ahụhụ?

20 Ikekwe, Jehova ekwela ka ọnwụnwa gị dịrị gaa n’ihu. Ya bụrụ otú ahụ, buru nkwa a o kwere ndị na-atụ egwu ya n’obi: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) Ị pụrụ inweta nkwado na nkasi obi dị otú ahụ. Jehova agụọla ‘ntutu nile nke isi gị ọnụ.’ Ọ na-ahụ ntachi obi ị na-enwe. Ihe mgbu gị na-emetụ ya n’obi. Ọ na-eche banyere gị n’ezie. Ọ gaghịkwa ‘echefu ọrụ gị na ịhụnanya i gosiri maka aha ya.’—Ndị Hibru 6:10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Devid, bụ́ onye ezi omume, na ụmụ Kora, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, kwuru ihe ndị yiri nke ahụ.—Abụ Ọma 10:1; 44:24.

^ par. 4 Bible ekwughị kpọmkwem ihe ‘ogwu ahụ dị n’anụ ahụ́’ Pọl bụ. Ọ pụrụ ịbụ ọrịa anụ ahụ́, dị ka nsogbu anya. Ma ọ bụkwanụ, ọ pụrụ ịbụ na okwu ahụ bụ́ “ogwu n’anụ ahụ́” na-ezo aka ná ndịozi ụgha na ndị ọzọ na-ama ọbụbụ Pọl bụ onyeozi nakwa ozi ya aka.—2 Ndị Kọrint 11:6, 13-15; Ndị Galeshia 4:15; 6:11.

^ par. 7 Cent ise n’ego ndị United States bụ naịra isii.

^ par. 9 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-enye echiche na nza ịda n’ala pụrụ ịpụta ihe ọzọ n’abụghị ịnwụ anwụ. Ha na-ekwu na nkebi ahịrịokwu ahụ n’asụsụ mbụ e ji dee ya pụrụ izo aka ná nnụnụ ifedata n’ala iji kpaa nri. Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-apụta na Chineke maara maka ụmụ nnụnụ ma na-elekọta ha n’ihe ọ bụla ha na-eme kwa ụbọchị, ọ bụghị nanị mgbe ha nwụrụ anwụ.—Matiu 6:26.

^ par. 15 N’oge ochie, a na-eji akpụkpọ atụrụ, nke ewu, na nke ehi a mịkpọrọ amịkpọ eme karama akpụkpọ. A na-eji karama ndị dị otú ahụ agbanye mmiri ara ehi, bọta, cheese, ma ọ bụ mmiri. A na-agbanye mmanụ ma ọ bụ mmanya ná ndị nke a mịkpọrọ nnọọ nke ọma.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee ihe ndị pụrụ ime ka mmadụ chee na Chineke agbahapụla ya?

• Olee ihe anyị mụtara site n’ihe atụ Jizọs banyere nza nakwa banyere ịgụ ntutu nile nke isi anyị ọnụ?

• Gịnị ka itinye anya mmiri mmadụ n’ime “karama akpụkpọ” Jehova ma ọ bụ idetu ya ‘n’akwụkwọ’ ya pụtara?

• Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ‘ezigbo ndị enyi Jehova’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 22]

Gịnị mere na Jehova ewepụghị “ogwu n’anụ ahụ́” Pọl?

[Foto dị na peeji nke 23]

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ Jizọs mere banyere nza?

[Ebe E Si Nweta Foto]

© J. Heidecker/VIREO

[Foto dị na peeji nke 25]

Site n’ịgụchi Bible anya, anyị pụrụ inwe obi ike na Chineke na-eche banyere anyị n’otu n’otu