Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Bụ “Onye Na-akwụghachi Ndị Na-achọsi Ya Ike Ụgwọ Ọrụ”

Jehova Bụ “Onye Na-akwụghachi Ndị Na-achọsi Ya Ike Ụgwọ Ọrụ”

Jehova Bụ “Onye Na-akwụghachi Ndị Na-achọsi Ya Ike Ụgwọ Ọrụ”

“Onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—NDỊ HIBRU 11:6.

1, 2. Gịnị mere ụfọdụ ndị ohu Jehova ji enwe echiche na-ezighị ezi?

BARBARA * kwuru, sị: “Abụwo m Onyeàmà Jehova ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 30, ma ọ dịtụbeghị mgbe m chere na m ruru eru ịza aha ahụ. Ọ bụ ezie na anọwo m na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ, nweekwa ọtụtụ ihe ùgwù ndị ọzọ, ọ dịbeghị nke ọ bụla n’ime ha zuru ezu ime ka m kweta n’ime obi m na e kwesịrị ka a kpọọ m Onyeàmà.” Keith kwukwara ihe yiri nke ahụ. O kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ana m eche na erughị m eru n’ihi na ndị ohu Jehova nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji nwee obi ụtọ, ma enweghị m. Nke a mere ka obi m na-ama m ikpe, bụ́ nke mere ka ihe kakwuo njọ.”

2 Ọtụtụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, ma n’oge gara aga ma ugbu a, enweela echiche yiri nke ahụ. Ị̀ na-enwe ya mgbe ụfọdụ? Ọtụtụ nsogbu ndị ị na-enwe pụrụ ime ka ị daa mbà n’obi, ebe o yiri ka ndụ ọ̀ na-atọ ndị kwere ekwe ibe gị ụtọ, ha adịkwa ka ndị na-enweghị nsogbu ọ bụla na ndị na-enwe obi ụtọ. N’ihi ya, ị pụrụ iche na i nweghị ihu ọma Jehova ma ọ bụ na i rughị eru ịbụ onye ọ na-elebara anya. Adịla ngwa ikwubi na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “[Jehova eledaghị] mweda n’ala nke onye e wedara n’ala anya, Ọ kpọghịkwa ya ihe arụ; O zonahụghịkwa ya ihu Ya; ma mgbe o tikuru Ya, Ọ nụrụ olu ya.” (Abụ Ọma 22:24) Okwu amụma a banyere Mezaịa na-egosi na ọ bụghị nanị na Jehova na-anụ olu ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi, kamakwa na ọ na-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ.

3. N’ihi gịnị ka anyị apụghị iji zere nrụgide nke usoro ihe a na-akpata?

3 E nweghị onye na-adịghị enwe nrụgide nke usoro ihe a na-akpata—ọbụna ndị Jehova. Anyị bi n’ụwa nke onye iro ukwu Jehova, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, na-achị. (2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 5:19) Kama ịbụ ndị e chebere n’ụzọ ọrụ ebube, ndị ohu Jehova na-aghọ n’ezie ndị bụ́ isi Setan lekwasịrị anya. (Job 1:7-12; Mkpughe 2:10) Ya mere, ruo mgbe Chineke kara aka, ọ dị anyị mkpa ịdị ‘na-atachi obi n’ime mkpagbu’ ma ‘na-anọgidesi ike n’ekpere,’ na-enwe obi ike na Jehova na-eche banyere anyị. (Ndị Rom 12:12) Anyị ekwesịghị ịdị na-eche na Chineke anyị, bụ́ Jehova, ahụghị anyị n’anya!

Ihe Atụ nke Ndị Tachiri Obi n’Oge Ochie

4. Nye ihe atụ ụfọdụ nke ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị tachiri obi n’ọnọdụ ndị na-akpata obi erughị ala.

4 Ọtụtụ ndị ohu Jehova nke oge ochie aghaghị ịtachi obi n’ọnọdụ ndị na-akpata obi erughị ala. Dị ka ihe atụ, ọ dị Hana “ilu ná mkpụrụ obi” n’ihi na ọ mụghị nwa—ọnọdụ o chere na ya na ịbụ onye Chineke chefuru bụ otu ihe. (1 Samuel 1:9-11) Mgbe Eze Nwanyị na-egbu ọchụ bụ́ Jezibel nọ na-achụgharị Ịlaịja, ụjọ tụrụ ya, ya ekpegakwara Jehova ekpere, sị: “O zuwo; ugbu a, Jehova, wepụ ndụ m; n’ihi na mụ onwe m adịghị mma karịa nna m hà.” (1 Ndị Eze 19:4) Ọ ghaghịkwa ịbụ na ezughị okè Pọl onyeozi nyere ya nnọọ nsogbu n’obi nke ukwuu nke na o kwuru, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ihe ọjọọ na-anọ n’ebe m nọ.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya!”—Ndị Rom 7:21-24.

5. (a) Olee otú e si kwụghachi Hana, Ịlaịja na Pọl ụgwọ ọrụ? (b) Olee nkasi obi anyị pụrụ inweta site n’Okwu Chineke ma ọ bụrụ na anyị enwee mmetụta ndị na-akụda mmụọ?

5 N’ezie, anyị maara na Hana, Ịlaịja, na Pọl tachichara obi n’ozi Jehova, Ọ kwụghachichakwara ha ụgwọ ọrụ. (1 Samuel 1:20; 2:21; 1 Ndị Eze 19:5-18; 2 Timoti 4:8) N’agbanyeghị nke ahụ, ha nwechara ụdị mmetụta nile ụmụ mmadụ na-enwe, bụ́ ndị na-agụnye mwute, obi nkoropụ na ụjọ. Mgbe ahụ, o kwesịghị iju anyị anya ma ọ bụrụ na anyị enwee mmetụta ndị na-akụda mmụọ mgbe ụfọdụ. Ma gịnị ka ị pụrụ ime mgbe nchegbu nke ndụ mere ka ị chewe ma Jehova ọ̀ hụkwara gị n’anya n’ezie? Ị pụrụ inweta nkasi obi site n’Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, n’isiokwu bu ụzọ, anyị tụlere ihe Jizọs kwuru, nke bụ́ na Jehova agụwo ‘ntutu nile nke isi gị ọnụ.’ (Matiu 10:30) Okwu ndị ahụ na-agba ume na-egosi na Jehova nwere mmasị dị ukwuu n’ebe ohu ya nke ọ bụla nọ. Chetakwa ihe atụ Jizọs banyere nza. Ọ bụrụ na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime obere nnụnụ ndị ahụ nke pụrụ ịda n’ala Jehova aghara ịma, oleezi ihe mere ọ ga-eji leghara nsogbu gị anya?

6. Olee otú Bible pụrụ isi kasie ndị na-enwe mmetụta ndị na-akụda mmụọ obi?

6 Ọ̀ ga-ekwe omume n’ezie na anyị bụ́ mmadụ na-ezughị okè ga-adị oké ọnụ ahịa n’anya Onye Okike anyị nwere ike kasịnụ, bụ́ Jehova Chineke? Ee! N’ezie, e nwere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-emesi anyị obi ike banyere nke a. Ọ bụrụ na anyị eburu ha n’uche, anyị pụrụ ikwughachi okwu ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye kwuru, sị: “Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi Gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.” (Abụ Ọma 94:19) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime okwu nkasi obi ndị a sitere n’Okwu Chineke bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịghọtakwu na Chineke ji anyị kpọrọ ihe, nakwa na ọ ga-akwụghachi anyị ụgwọ ọrụ ma anyị nọgide na-eme uche ya.

‘Ihe Onwunwe Pụrụ Iche’ nke Jehova

7. Amụma dị aṅaa na-agba ume ka Jehova mere ka Malakaị buoro mba ahụ rụrụ arụ?

7 Ndị Juu nọ n’ọnọdụ ọjọọ na narị afọ nke ise T.O.A. Ndị nchụàjà nọ na-anabata anụmanụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, jirikwa ha na-achụ àjà n’ebe ịchụàjà Jehova. Ndị ikpe nọ na-ele mmadụ anya n’ihu. Ịgba afa, ịgha ụgha, igwu wayo na ịkwa iko juru ebe nile. (Malakaị 1:8; 2:9; 3:5) Malakaị buuru mba a rụrụ nnọọ arụ amụma na-atụ n’anya. Ka oge na-aga, Jehova ga-eme ka ndị ya nọrọghachi n’ọnọdụ dị mma. Anyị na-agụ, sị: “Ha ga-abụkwa nke m, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, n’ụbọchị ahụ mgbe Mụ onwe m ga na-eme ihe, bụ́ ihe nke aka m [ma ọ bụ “ihe onwunwe m pụrụ iche,” NW]; M ga-enwekwa ọmịiko n’ahụ́ ha, dị ka mmadụ si enwe ọmịiko n’ahụ́ nwa ya nke na-efe ya.”—Malakaị 3:17.

8. Gịnị mere ụkpụrụ dị na Malakaị 3:17 pụrụ iji metụta oké ìgwè mmadụ ahụ?

8 Amụma Malakaị nwere mmezu ya nke oge a n’ahụ́ Ndị Kraịst e tere mmadụ, bụ́ ndị mejupụtara mba ime mmụọ nke dị narị puku na iri puku anọ na anọ. Mba ahụ bụ n’ezie “ihe onwunwe pụrụ iche” nke Jehova. (1 Pita 2:9) Amụma Malakaị pụkwara ịgba “oké ìgwè mmadụ” ahụ ume, bụ́ ndị “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, na-eyi uwe mwụda ọcha.” (Mkpughe 7:4, 9) Ndị a na ndị e tere mmanụ na-aghọ otu ìgwè atụrụ, n’okpuru otu Onye Ọzụzụ Atụrụ, bụ́ Jizọs Kraịst.—Jọn 10:16.

9. Gịnị mere ndị Jehova ji bụrụ ‘ihe onwunwe ya pụrụ iche’?

9 Olee otú Jehova si ele ndị họọrọ ijere ya ozi anya? Dị ka e kwuru na Malakaị 3:17, ọ na-ele ha anya otú nna na-ahụ n’anya si ele nwa ya anya. Rịbakwa ama okwu na-egosi ịhụnanya o ji kọwaa ndị ya—“ihe onwunwe m pụrụ iche.” Nsụgharị ndị ọzọ dere ahịrịokwu ahụ ịbụ “ndị nke m,” “ihe onwunwe m kasị oké ọnụ ahịa” na “akụ̀ m dị oké ọnụ ahịa.” Gịnị mere Jehova ga-eji were ndị na-ejere ya ozi dị ka ndị pụrụ iche otú ahụ? Otu ihe kpatara ya bụ na ọ bụ Chineke nke nwere ekele. (Ndị Hibru 6:10) Ọ na-abịaru ndị na-eji obi ha ejere ya ozi nso, ma na-ewere ha dị ka ndị pụrụ iche.

10. Olee otú Jehova si echebe ndị ya?

10 Ị̀ pụrụ icheta otu ihe i nwere bụ́ nke i ji kpọrọ oké ihe nke na ị na-ewere ya dị ka ihe onwunwe pụrụ iche? Ọ̀ bụ na ị naghị eme ihe iji chekwaa ya? Ọ bụkwa otú ahụ ka Jehova si eme ‘ihe onwunwe ya pụrụ iche.’ N’ezie, ọ dịghị echebe ndị ya pụọ n’ọnwụnwa na ọdachi nile nke ndụ. (Eklisiastis 9:11) Ma Jehova pụrụ ichebe ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi n’ụzọ ime mmụọ, ọ ga-emekwa otú ahụ. Ọ na-enye ha ume dị ha mkpa iji nagide ule ọ bụla. (1 Ndị Kọrint 10:13) Ọ bụ ya mere Mozis ji gwa ndị Chineke nke oge ochie bụ́ ụmụ Izrel, sị: “Dịnụ ike, nweekwanụ ume . . . Jehova, bụ́ Chineke gị, Ya onwe ya bụ onye gị na Ya na-eje; Ọ gaghị aha gị aka, Ọ gaghị ahapụkwa gị.” (Deuterọnọmi 31:6) Jehova na-akwụghachi ndị ya ụgwọ ọrụ. Nye ya, ha bụ ‘ihe onwunwe pụrụ iche.’

Jehova “Onye Na-akwụghachi Ụgwọ Ọrụ”

11, 12. Olee otú ịghọta Jehova dị ka Onye na-akwụghachi ụgwọ ọrụ pụrụ isi nyere anyị aka ịkwụsị inwe obi abụọ?

11 Ihe ọzọ na-egosi na Jehova ji ndị ohu ya akpọrọ ihe bụ na ọ na-akwụghachi ha ụgwọ. Ọ gwara ụmụ Izrel, sị: “Biko, nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma Ḿ gaghị emeghere unu windo nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.” (Malakaị 3:10) N’ezie, mee elu mee ala, Jehova ga-eji ndụ ebighị ebi kwụghachi ndị ohu ya ụgwọ ọrụ. (Jọn 5:24; Mkpughe 21:4) Ụgwọ ọrụ a na-enweghị atụ na-egosi otú ịhụnanya na mmesapụ aka Jehova haruru. Ọ na-egosikwa na ọ na-eji ndị họọrọ ijere ya ozi akpọrọ ihe n’ezie. Ịmụta ile Jehova anya dị ka Onye na-eji mmesapụ aka akwụghachi ụgwọ ọrụ pụrụ inyere anyị aka ịkwụsị inwe obi abụọ banyere ọnọdụ anyị n’ebe Chineke nọ. N’ezie, Jehova na-agba anyị ume ile ya anya dị ka Onye na-akwụghachi ụgwọ ọrụ! Pọl dere, sị: “Onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.

12 N’ezie, anyị na-ejere Jehova ozi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya—ọ bụghị nanị n’ihi na o kwere nkwa ịkwụ anyị ụgwọ ọrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, iburu olileanya nke ịnata ụgwọ ọrụ n’obi abụghị ihe ọjọọ ma ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. (Ndị Kọlọsi 3:23, 24) N’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ na otú o si jiri ha kpọrọ ihe, Jehova na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.

13. Gịnị mere ndokwa àjà mgbapụta ahụ ji bụrụ ngosipụta kasịnụ nke ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ?

13 Ihe kasị egosi na ihe a kpọrọ mmadụ dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova bụ ndokwa o mere maka ihe mgbapụta ahụ. Jọn onyeozi dere, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ndokwa maka àjà mgbapụta Jizọs Kraịst na-emegide echiche ahụ bụ́ na anyị abaghị uru n’anya Jehova ma ọ bụ na ọ hụghị anyị n’anya. N’ezie, ọ bụrụ na Jehova kwụrụ ụgwọ há otú ahụ maka anyị—iji Ọkpara ọ mụrụ nanị ya chụọ àjà—ọ ga-abụrịrị na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.

14. Olee ihe na-egosi otú Pọl si were àjà mgbapụta ahụ?

14 Ya mere, ọ bụrụ na ị malite inwe mmetụta ndị na-akụda mmụọ, tụgharịa uche n’ihe mgbapụta ahụ. Ee, were onyinye a dị ka ihe Jehova nyere gị onwe gị. Nke ahụ bụ ihe Pọl onyeozi mere. Cheta na o kwuru, sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya!” Ma ọ gaziri n’ihu kwuo, sị: “Ọ bụ Chineke site na Jizọs Kraịst Onyenwe anyị,” bụ́ “onye hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.” (Ndị Rom 7:24, 25; Ndị Galeshia 2:20) N’ikwu otú ahụ, Pọl adịghị ewere onwe ya dị ka onye dị oké mkpa. Nanị ihe o mere bụ inwe obi ike na Jehova ji ya kpọrọ ihe. Dị ka Pọl, i kwesịkwara ịmụta iwere àjà mgbapụta ahụ dị ka onyinye Chineke nyere gị onwe gị. Ọ bụghị nanị na Jehova bụ Onye Nzọpụta dị ike, kamakwa ọ bụ Onye ji ịhụnanya akwụghachi ụgwọ ọrụ.

Kpachara Anya Maka “Nzupụta Ọjọọ” nke Setan

15-17. (a) Olee otú Ekwensu si eji mmetụta ndị na-akụda mmụọ eme ihe? (b) Olee agbamume anyị pụrụ inweta site n’ahụmahụ Job?

15 N’agbanyeghị nke ahụ, ọ pụrụ isiri gị ike ikweta na nkasi obi ndị sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ndị dị n’Okwu Chineke bụ maka gị. Ị pụrụ iche na ndị ọzọ pụrụ inweta ụgwọ ọrụ nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke, ma na gị onwe gị erughị nnọọ eru inweta ya. Ọ bụrụ otú a ka ị na-eche, gịnị ka ị pụrụ ime?

16 Obi abụọ adịghị ya na ị maara ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere ndị Efesọs: “Yikwasịnụ ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:11) Mgbe a na-ekwu banyere atụmatụ Setan, ihe ndị dị ka ịhụ ihe onwunwe n’anya na omume rụrụ arụ pụrụ ịgbata anyị nnọọ n’obi, ha bụkwa atụmatụ ya n’ezie. Ọtụtụ ndị ohu Chineke, ma ndị nke oge ochie ma ndị nke oge anyị, adabala n’ọnyà ndị a. Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ileghara nzupụta ọjọọ ọzọ nke Setan—mgbalị ya ime ka ndị mmadụ kweta na Jehova Chineke ahụghị ha n’anya—anya.

17 Ekwensu bụ ọkà n’iji mmetụta ndị na-akụda mmụọ eme ihe ná mgbalị ya ime ka ụmụ mmadụ gbakụta Chineke azụ. Cheta ihe Bildad gwara Job: “Mmadụ ga-esikwa aṅaa bụrụ onye ezi omume n’ihu Chineke? ma ọ bụ, ọ̀ ga-esi aṅaa dị ọcha n’obi, bụ́ onye nwanyị mụrụ? Lee, ọbụna ọnwa adịghị eti, ọzọ, kpakpando adịghị ọcha n’anya Ya: ọ̀ ga-esikwa aṅaa dị ọcha, bụ́ mmadụ, nke bụ́ nanị ikpuru? ma ọ bụ nwa nke mmadụ, nke bụ́ nanị idide?” (Job 25:4-6; Jọn 8:44) Lee nnọọ ka okwu ndị a na-aghaghị isiwo bụrụ ihe na-akụda mmụọ! Ya mere, ekwela ka Setan kụda gị mmụọ. N’aka nke ọzọ, mara nzupụta Setan nke ọma ka i wee nwee obi ike na ume iji gbalịsikwuo ike ime ezi ihe. (2 Ndị Kọrint 2:11) N’ihe metụtara Job, ọ bụ ezie na a gbaziri ya olu, Jehova kwụghachiri ya ụgwọ ọrụ n’ihi ntachi obi ya site n’inyeghachi ya ihe nile funahụrụ ya okpukpu abụọ.—Job 42:10.

Jehova “Karịrị Obi Anyị”

18, 19. Olee otú o si bụrụ na Chineke “karịrị obi anyị,” oleekwa otú o si ‘mara ihe nile.’

18 N’ezie, ọ pụrụ isi ike ịkwụsị inwe nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na ọ gbanyesiri mkpọrọgwụ ike. Ma mmụọ Jehova pụrụ inyere gị aka iji nke nta nke nta kpuo “ihe ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike . . . e welitere megide ihe ọmụma Chineke” ihu. (2 Ndị Kọrint 10:4, 5) Mgbe echiche na-ezighị ezi na-enye gị nnọọ nsogbu n’obi, tụgharịa uche n’ihe a Jọn onyeozi kwuru: “Anyị ga-esite na nke a mara na anyị sitere n’eziokwu ahụ, anyị ga-emekwa ka obi sie anyị ike n’ihu ya banyere ihe ọ bụla obi anyị nwere ike ịma anyị ikpe na ya, n’ihi na Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe nile.”—1 Jọn 3:19, 20.

19 Gịnị ka ahịrịokwu ahụ bụ́ “Chineke karịrị obi anyị” pụtara? Mgbe ụfọdụ, obi anyị pụrụ ịma anyị ikpe, karịsịa mgbe anyị chetara ezughị okè na amaghị eme anyị. Ma ọ bụ, ọ pụrụ ịbụ na n’ihi otú e si zụlite anyị, anyị na-enwekarị echiche na-ezighị ezi banyere onwe anyị, dị ka à ga-asị na Jehova apụghị ịnabata ihe ọ bụla anyị mere. Ihe Jọn onyeozi kwuru na-emesi anyị obi ike na Jehova karịrị nke ahụ! Ọ bụghị nanị ebe ndị anyị mejọrọ ka ọ na-ahụ, ọ na-ahụkwa ebe ndị anyị mere nke ọma. Ọ makwaara ebumnobi na ọchịchọ obi anyị. Devid dere, sị: “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:14) Ee, Jehova maara anyị nke ọma karịa ka anyị maara onwe anyị!

“Okpueze nke Ịma Mma” na “Ákwà Ike n’Isi nke Alaeze”

20. Gịnị ka amụma mweghachi nke Aịzaịa na-ekpughe banyere otú Jehova si ele ndị ohu ya anya?

20 Site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, Jehova mere ka ndị ya nke oge ochie nwee olileanya na ha ga-alaghachi n’ala ha. Mgbe e mere ka ha jee biri na Babilọn, ọ bụ nkasi obi na mmesi obi ike a bụ ihe dị nnọọ ndị a nwere nkụda mmụọ mkpa! N’ilepụ anya n’ihu gaa n’oge ha ga-alaghachi n’ala ha, Jehova kwuru, sị: “Ị ga-aghọkwa okpueze nke ịma mma n’aka Jehova, na ákwà ike n’isi nke alaeze n’ọbụ aka Chineke gị.” (Aịsaịa 62:3) Site n’ikwu nke a, Jehova yikwasịrị ndị ya ebube na ịma mma dị ka uwe. O meworo mba Izrel ime mmụọ ya otu ihe ahụ taa. Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na o buliri ha elu ka mmadụ nile wee nwee mmasị n’ebe ha nọ.

21. Olee otú ị pụrụ isi nweta obi ike na Jehova ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ maka iji ikwesị ntụkwasị obi tachie obi?

21 Ọ bụ ezie na, n’ụzọ bụ́ isi, amụma a na-emezu n’ahụ́ ndị e tere mmanụ, ọ na-enye ihe atụ nke ihe ùgwù Jehova na-enye ndị nile na-ejere ya ozi. Ya mere, mgbe ị malitere inwe obi abụọ, cheta na ọ bụ ezie na i zughị okè, ị pụrụ ịbara Jehova uru dị ka “okpueze nke ịma mma” na “ákwà ike n’isi nke alaeze.” Ya mere, nọgide na-eme ka obi ya ṅụrịa site n’iji ezi obi na-agbalịsi ike ime uche ya. (Ilu 27:11) Site n’ime otú ahụ, ị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ maka iji ikwesị ntụkwasị obi tachie obi!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 A gbanweela aha ụfọdụ.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú anyị si bụrụ ‘ihe onwunwe pụrụ iche’ nke Jehova?

• Gịnị mere o ji dị mkpa ile Jehova anya dị ka Onye na-akwụghachi ụgwọ ọrụ?

• Olee “nzupụta ọjọọ” Setan nke anyị na-aghaghị ịnọ na nche megide?

• Olee otú o si bụrụ na Chineke “karịrị obi anyị”?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Pọl

[Foto dị na peeji nke 26]

Ịlaịja

[Foto dị na peeji nke 26]

Hana

[Foto dị na peeji nke 28]

E nwere ọtụtụ ihe ndị na-akasi obi dị n’Okwu Chineke