Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe E Nwere Ezi Ihe Mere A Ga-eji Wee Iwe?

Olee Mgbe E Nwere Ezi Ihe Mere A Ga-eji Wee Iwe?

Olee Mgbe E Nwere Ezi Ihe Mere A Ga-eji Wee Iwe?

N’EKLISIASTIS 7:9, Bible na-ekwu, sị: ‘Mkpasu iwe nwere ọnọdụ ya n’obi ndị nzuzu.’ Amaokwu a na-egosi na anyị ekwesịghị iwebiga iwe ókè mgbe mmadụ kpasuru anyị iwe; kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịdị na-agbaghara.

Otú ọ dị, Eklisiastis 7:9 ọ̀ na-ekwu na ọ dịtụghị ihe ma ọ bụ onye anyị kwesịrị iwere iwe, na anyị kwesịrị ịgbaghara mmejọ nile n’agbanyeghị otú ha dịruru ná njọ ma ọ bụ ugboro ole e mere ha, na anyị ekwesịghị ime ihe ọ bụla banyere ha? Ànyị kwesịrị ịkpasu ndị ọzọ iwe site n’okwu ma ọ bụ n’omume anyị n’achọghị ịma ebe ọ bụ na anyị maara na onye anyị mejọrọ kwesịrị ịgbaghara anyị? Mbanụ.

Jehova Chineke bụ ịhụnanya, ọ na-eme ebere, na-agbara mmehie ma na-enwe ogologo ntachi obi. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ọtụtụ ebe Bible kwuru na ndị mmadụ kpasuru Chineke iwe. Mgbe a kpasuru ya iwe nke ukwuu, o mere ihe megide ndị ahụ kpasuru ya iwe. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Iwe Ndị A kpasuru Jehova

Ihe e dekọrọ ná 1 Ndị Eze 15:30 na-ekwu banyere mmehie nke Jeroboam ‘nke o ji mee ka Izrel mehie; n’ime mkpasu iwe ya nke o ji kpasuo Jehova iwe.’ N’Ihe E Mere nke Abụọ 28:25, Bible na-ekwu banyere Eze Ehaz nke Juda, sị: “O mekwara ebe dị elu isurere chi dị iche iche ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, o wee kpasuo Jehova, bụ́ Chineke nke nna ya hà, iwe.” Ihe atụ ọzọ dị ná Ndị Ikpe 2:11-14: “Izrel wee mee ihe ọjọọ n’anya Jehova, fee Bealim ofufe . . . , wee kpasuo Jehova iwe. . . . Iwe Jehova wee dị ọkụ megide Izrel, O wee nye ha n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe.”

E nwere ihe ndị ọzọ kpasuru Jehova iwe, bụ́ ndị mere ka o nye ntaramahụhụ. Dị ka ihe atụ, n’Ọpụpụ 22:18-20, anyị na-agụ, sị: “Ekwela ka nwanyị mgbaasị dị ndụ. Onye ọ bụla ya na anụmanụ na-edina, a ghaghị ime ka ọ nwụọ. Onye na-achụrụ chi àjà, ma ọ́ bụghị ịchụrụ Jehova, nanị Ya, a ga-ewezuga ya ka e bibie ya.”

Mgbe Izrel nọgidere na-akpasu Jehova iwe n’egosighị ezi nchegharị, Jehova anọgideghị na-agbaghara ha mmejọ ha ndị dị oké njọ. Mgbe ha na-egosighị ezi nchegharị, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ha mere gosiri na ha chọrọ ichigharị iji rubere Jehova isi, Chineke meziri ka e bibie ndị mmehie ahụ. Ndị Babilọn bibiri mba ahụ n’ozuzu ya n’afọ 607 T.O.A., ndị Rom bibikwara ya n’afọ 70 O.A.

Ee, Jehova na-ewe iwe n’ihi ihe ọjọọ ndị mmadụ na-ekwu ma ọ bụ na-eme, ọbụnakwa, ọ na-egbu ndị mmehie na-enweghị nchegharị, bụ́ ndị mmehie ha dị oké njọ. Ma nke a ò mere ka o soro ná ndị ahụ Eklisiastis 7:9 na-ekwu banyere ha? Mbanụ. Iwe ọ na-ewe n’ihi mmehie ndị dị oké njọ kwesịrị ekwesị, ikpe ya na-ezikwa ezi mgbe nile. Bible na-ekwu banyere Jehova, sị: “Ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.”—Deuterọnọmi 32:4.

Mmejọ Ndị Dị Oké Njọ E Mejọrọ Ndị Mmadụ

N’Iwu ahụ Chineke nyere Izrel oge ochie, e nwere ntaramahụhụ ndị siri ike a na-enye ndị mejọrọ ndị mmadụ n’ụzọ dị oké njọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ohi abịa n’ụlọ mmadụ n’abalị, onye nwe ụlọ egbuokwa ya, ikpe ọbara agaghị ama onye ahụ nwe ụlọ. Ọ bụ onye aka ya dị ọcha nke e mesoro ihe ike. Ya mere, anyị na-agụ, sị: “Ọ bụrụ na a hụ onye ohi ka ọ na-etipu ụlọ, e wee tigbuo ya, o wee nwụọ, ọ dịghị ikpe ọmụma ọbara ga-adị [n’isi onye nwe ụlọ ahụ] banyere ya.”—Ọpụpụ 22:2.

Oké iwe kwesịrị iwe nwanyị ọ bụla e dinara n’ike, n’ihi na nke a bụ mpụ jọgburu onwe ya n’anya Chineke. N’okpuru Iwu Mozis, nwoke nke dinara nwanyị n’ike ga-anwụ “dị ka mgbe nwoke na-ebili imegide mmadụ ibe ya, wee gbuo ya egbuo.” (Deuterọnọmi 22:25, 26) N’agbanyeghị na anyị anọghịzi n’okpuru Iwu ahụ, ọ na-eme ka anyị ghọta otú Jehova si ele idina mmadụ n’ike anya—omume jọgburu onwe ya.

N’oge anyị a, idina mmadụ n’ike bụ omume jọgburu onwe ya nke a na-enye onye mere ya ntaramahụhụ siri oké ike. Onye e dinara n’ike nweere nnọọ onwe ya ịga kọọrọ ndị uwe ojii. Ọ bụrụ na e mee ya otú ahụ, ndị e nyere ikike ịhụ maka okwu ndị dị otú ahụ pụziri ịta onye ahụ mejọrọnụ ahụhụ. Ọ bụrụkwa na ọ bụ nwatakịrị ka e dinara n’ike, ndị mụrụ ya pụrụ ịga kọọrọ ndị uwe ojii.

Mmejọ Ndị Na-adịghị Oké Njọ

Otú ọ dị, ọ bụghị mmejọ nile ka ọ dị mkpa ka ndị ọchịchị nye ntaramahụhụ maka ha. N’ihi ya, anyị ekwesịghị iwe iwe n’ụzọ na-enweghị isi n’ihi mmejọ ndị dị nnọọ nta nke ndị ọzọ mejọrọ anyị, kama anyị kwesịrị ịgbaghara. Ugboro ole ka anyị ga-agbaghara? Pita onyeozi jụrụ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ugboro ole ka nwanna m ga-emehie megide m, mụ agbaghara ya? Ọ̀ bụ ruo ugboro asaa?” Jizọs zara, sị: “Asị m gị, ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa.”—Matiu 18:21, 22.

N’aka nke ọzọ, ọ dị mkpa ka anyị nọgide na-emeziwanye àgwà Ndị Kraịst anyị iji ghara ịdị na-akpasukarị ndị ọzọ iwe. Dị ka ihe atụ, mgbe gị na ndị ọzọ na-emekọ ihe, ị̀ na-ekwu okwu n’echeghị echiche, na-ekwu okwu ọjọọ, na-ekwukwa okwu mkparị mgbe ụfọdụ? Àgwà ndị dị otú ahụ yikarịrị ka hà ga-akpasu mmadụ iwe. Kama ịtawa onye e mejọrọ ụta maka iwe iwe, na iche na onye ahụ kwesịrị nnọọ ịgbaghara, onye ahụ mejọrọnụ kwesịrị ịghọta na ọ bụ ya kpasuru onye ahụ iwe. Ọ dịkwa ya mkpa ịdị na-akpachara anya otú o si eme omume na otú o si ekwu okwu iji gharadị ịdị na-akpasu mmadụ iwe. Mgbalị dị otú a ga-ebelata ugboro ole anyị na-emejọ ndị ọzọ. Bible na-echetara anyị, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha: ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) Mgbe anyị mejọrọ ndị ọzọ, a sịgodị na anyị amaghị ama mee ya, ịrịọ mgbaghara ga-eme ka ihe ka nnọọ mma.

Okwu Chineke na-egosi na anyị kwesịrị ịdị “na-achụso ihe ndị na-akpata udo na ihe ndị na-ewuli ibe anyị elu.” (Ndị Rom 14:19) Mgbe anyị ji akọ na obiọma na-eme ihe, anyị na-eme ihe kwekọrọ n’ilu ahụ, nke na-asị: “Mkpụrụ osisi [apụl] ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ.” (Ilu 25:11) Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe na-enye obi ụtọ na nke na-akpali mmasị! Okwu dị nro nke e ji akọ kwuo pụrụ ọbụna ime ka ndị na-ekwesi olu ike gbanwee obi ha: “Ire nro na-anyajikwa ọkpụkpụ.”—Ilu 25:15.

Ya mere, Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ, sị: “Kwenụ ka okwu unu dịrị n’amara mgbe nile, bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Ndị Kọlọsi 4:6) “Ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ” pụtara na anyị ga-eme ka okwu anyị na-atọ ndị ọzọ ụtọ, si otú a na-ebelata ihe ndị pụrụ ịkpasu ha iwe. Ma n’okwu ma n’omume, Ndị Kraịst na-agbalị itinye ndụmọdụ a dị na Bible n’ọrụ, nke na-asị: “Chọọ udo, chụsookwa ya.”—1 Pita 3:11.

N’ihi ya, ihe àmà na-egosi na ihe Eklisiastis 7:9 na-ekwu bụ na anyị kwesịrị izere ịdị na-ewe iwe maka obere mmejọ ndị ọzọ mejọrọ anyị. Mmejọ ndị a nwere ike bụrụ n’ihi ezughị okè mmadụ, ma ọ bụkwanụ ha abụrụdị ndị a ma ụma mee ma ha adịghị oké njọ. Ma ọ bụrụ na e mejọọ mmadụ n’ụzọ dị oké njọ, ọ ga-ekwe nghọta ma onye ahụ wee iwe ma chọọ ime ihe ụfọdụ kwesịrị ekwesị banyere ya.—Matiu 18:15-17

[Foto dị na peeji nke 14]

Jehova kwere ka ndị Rom bibie Izrel na-enweghị nchegharị n’afọ 70 O.A.

[Foto dị na peeji nke 15]

“Mkpụrụ osisi [apụl] ọlaedo . . . ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ”