Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Ga-egbukepụ Ebube Chineke?

Ị̀ Ga-egbukepụ Ebube Chineke?

Ị̀ Ga-egbukepụ Ebube Chineke?

“Anyị na-egbukepụ ebube Jehova dị ka enyo.”—2 NDỊ KỌRINT 3:18.

1. Gịnị ka Mozis hụrụ, gịnịkwa mere mgbe nke ahụ gasịrị?

Ọ BỤ otu n’ime ọhụụ ndị kasị emenye ụjọ mmadụ hụtụrụla. Mgbe nanị Mozis nọ n’Ugwu Saịnaị, e meere ya otu ihe dị nnọọ ịtụnanya ọ rịọrọ. E mere ka ọ hụ ihe ọ na-adịtụbeghị mmadụ ọ bụla hụrụ ya—ebube Jehova. N’ezie, Mozis ahụghị Jehova n’onwe ya. Ọdịdị Chineke na-egbukepụ nnọọ egbukepụ nke na ọ dịghị mmadụ pụrụ ịhụ ya ma ka dịrị ndụ. Ma, Jehova ji “ọbụ aka” ya kpuchie Mozis ruo mgbe Ọ gafechara, ihe àmà na-egosi na o ji mmụọ ozi mee ihe dị ka onye nnọchianya ya. Jehova kweziri ka Mozis hụpere mgbukepụ nke ebube ya mgbe ọ gafesịrị. Jehova sitekwara n’ọnụ mmụọ ozi gwa Mozis okwu. Bible kọwara ihe mere mgbe nke a gasịrị: “O ruo, mgbe Mozis siri n’ugwu Saịnaị rịda . . . akpụkpọ ihu ya na-enwupụta ìhè mgbe [Jehova] kpanyeere ya ụka.”—Ọpụpụ 33:18–34:7, 29.

2. Gịnị ka Pọl onyeozi dere banyere ebube Ndị Kraịst na-egbukepụ?

2 Were ya na gị na Mozis nọ n’ugwu ahụ. Lee ihe na-akpali akpali ọ ga-abụ ịhụ ịma mma na-egbu mara mara nke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile na ịnụ okwu ya! Lee ihe ùgwù ọ ga-abụ iso Mozis, bụ́ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, na-arịdata n’Ugwu Saịnaị! Otú ọ dị, ị̀ maara na n’ụzọ ụfọdụ, ezi Ndị Kraịst na-egbukepụ ebube Chineke n’ụzọ karịdịrị ụzọ Mozis si gbukepụ ya? Eziokwu ahụ na-akpali iche echiche dị n’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi dere. O dere na Ndị Kraịst e tere mmanụ “na-egbukepụ ebube Jehova dị ka enyo.” (2 Ndị Kọrint 3:7, 8, 18) A pụkwara ikwu na Ndị Kraịst nwere olileanya elu ala na-egbukepụ ebube Chineke.

Otú Ndị Kraịst Si Egbukepụ Ebube Chineke

3. Olee otú anyị sirila mata Jehova otú Mozis na-esighị mara ya?

3 Olee otú ọ pụrụ isi kwe anyị omume igbukepụ ebube Chineke? Anyị ahụtụbeghị Jehova ma ọ bụ nụ olu ya dị ka Mozis hụrụ ma nụ. Otú ọ dị, anyị amarawo Jehova otú Mozis na-esighị mara ya. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku afọ na narị ise Mozis nwụsịrị tupu Jizọs apụta dị ka Mezaịa ahụ. N’ihi nke a, ọ dịghị otú Mozis ga-esi mara otú Iwu ahụ ga-esi mezuo n’ahụ́ Jizọs, bụ́ onye nwụrụ iji gbapụta ụmụ mmadụ n’ahụhụ jọgburu onwe ya nke mmehie na ọnwụ kpatara. (Ndị Rom 5:20, 21; Ndị Galeshia 3:19) Ọzọkwa, Mozis pụrụ ịhụ nanị n’ụzọ dị nta nzube dị ebube nke Jehova, bụ́ nke hiwere isi n’Alaeze Mezaịa ahụ, nakwa na Paradaịs elu ala Alaeze ahụ ga-eweta. Anyị si otú a eji anya nke okwukwe bụ́ nke dabeere n’ozizi Bible, ọ bụghị anya nkịtị anyị, ahụ ebube Jehova. Ọzọkwa, anyị anụwo olu Jehova, ọ bụghị site n’ọnụ mmụọ ozi, kama site na Bible, karịsịa n’Oziọma ndị ahụ, bụ́ ndị kọwara ozizi na ozi Jizọs n’ụzọ magburu onwe ya.

4. (a) Olee otú Ndị Kraịst e tere mmanụ si egbukepụ ebube Chineke? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị nwere olileanya elu ala pụrụ isi na-egbukepụ ebube Chineke?

4 Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst anaghị egbukepụ ebube Chineke site n’ìhè inwupụta ha n’ihu, ihu ha na-egbukepụtụ egbukepụ ka ha na-agwa ndị ọzọ banyere àgwà na nzube ndị dị ebube nke Jehova. Banyere ụbọchị anyị, Aịzaịa onye amụma buru amụma na ndị Chineke “ga-egosi ebube [Jehova] n’etiti mba nile.” (Aịsaịa 66:19) Ọzọkwa, ná 2 Ndị Kọrint 4:1, 2, anyị na-agụ, sị: “Ọ bụ ya mere na, ebe anyị nwere ozi a dị ka ebere nke e meere anyị si dị . . . , anyị ajụwo ihe nzuzo ndị a ga-emere ihere, n’adịghị eje ije n’aghụghọ, n’adịghịkwa agwagbu okwu Chineke, kama site n’ime ka eziokwu ahụ pụta ìhè, anyị na-eme ka akọ na uche mmadụ ọ bụla nakwere anyị n’anya Chineke.” Pọl nọ na-ezo aka karịsịa n’ebe Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ, bụ́ ndị bụ́ “ndị ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ” ahụ. (2 Ndị Kọrint 3:6) Ma, ozi ha emetụtawo ọnụ ọgụgụ a na-apụghị ịgụta ọnụ nke ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ozi ìgwè abụọ ahụ na-eje na-agụnye igbukepụ ebube Jehova ọ bụghị nanị n’ihe ha na-akụzi kamakwa n’otú ha si ebi ndụ. Ọ bụ ọrụ dịịrị anyị na ihe ùgwù anyị nwere igbukepụ ebube Chineke nke Kasị Ihe Nile Elu dị ka enyo!

5. Gịnị ka ọganihu ime mmụọ anyị na-enwe na-enye ihe àmà ya?

5 Taa, a na-ekwusa ozi ọma dị ebube nke Alaeze Chineke n’elu ụwa dum mmadụ bi, dị ka Jizọs buru n’amụma. (Matiu 24:14) Ndị si ná mba, ebo na asụsụ nile ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi nabata ozi ọma ahụ, ha agbanwewokwa ndụ ha iji mee uche Chineke. (Ndị Rom 12:2; Mkpughe 7:9) Dị ka Ndị Kraịst oge mbụ, ha apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị ha hụrụ ma nụ. (Ọrụ 4:20) E nwere ihe karịrị nde mmadụ isii na-egbukepụ ebube Chineke taa, bụ́ ọnụ ọgụgụ karịrị nke e nwetụrụla n’oge ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ì so na ha? Ọganihu ime mmụọ nke ndị Chineke na-enye ihe àmà doro anya na Jehova na-agọzi ma na-echebe ndị ya. Ikike ndị dị ike bụ́ ndị na-emegide anyị na-emekwu ka ọ pụta ìhè na mmụọ Jehova dịkwasịrị anyị. Ka anyị hụzie ihe mere nke a ji bụrụ eziokwu.

A Gaghị Emechi Ọnụ Ndị Chineke

6. Gịnị mere okwukwe na obi ike ji dị mkpa iji nwee ike ịkwado Jehova?

6 Ka e were ya na a kpọrọ gị òkù ịbịa gbaa akaebe megide otu omempụ obi tara mmiri. Ị maara na omempụ ahụ nwere òtù siri ike, marakwa na ọ pụrụ ime ihe ọ bụla o nwere ike ime iji gbochie gị ịgba ya n’anwụ. Gị ịgba akaebe megide omempụ dị otú ahụ ga-achọ na ị ga-enwe obi ike na ndị ọchịchị ga-echebe gị pụọ n’aka ya. Anyị nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ. Site n’ịgbara Jehova na nzube ya àmà, anyị na-agba akaebe megide Setan bụ́ Ekwensu, na-ekpughe ya dị ka ogbu mmadụ na onye ụgha nke na-eduhie ụwa dum mmadụ bi. (Jọn 8:44; Mkpughe 12:9) Ịkwado Jehova ma guzogide Ekwensu na-achọ ma okwukwe ma obi ike.

7. Olee otú mmetụta Setan na-enwe haruru, gịnịkwa ka ọ na-agbalị ime?

7 N’ezie, Jehova bụ Onye Kasị Elu. Ike ya karịrị nnọọ nke Setan. Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ bụghị nanị na Jehova pụrụ ichebe anyị ka anyị ji iguzosi ike n’ihe na-ejere ya ozi kamakwa na ọ dị njikere ime otú ahụ. (2 Ihe E Mere 16:9) Ka o sina dị, Setan bụ onye na-achị ma ndị mmụọ ọjọọ ma ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. (Matiu 12:24, 26; Jọn 14:30) N’ihi ịbụ onye na-apụghịzi isi n’ụwa pụọ na onye “oké iwe” ji, Setan ji obi ọjọọ na-emegide ndị ohu Jehova, ọ na-ejikwa ụwa nke ọ na-achịkwa agbalị imechi ndị nile na-ekwusa ozi ọma ahụ ọnụ. (Mkpughe 12:7-9, 12, 17) Olee otú o si eme nke a? Ya dịkarịa ala, ọ dị ụzọ atọ o si eme ya.

8, 9. Olee otú Setan si eji ịhụnanya hiere ụzọ eme ihe, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji jiri nlezianya na-ahọrọ ndị anyị na ha na-akpakọ?

8 Otu ụzọ Setan si agbalị ịdọpụ uche anyị bụ site n’ihe ndị e ji elekọta ndụ. Ndị bi n’ụbọchị ikpeazụ ndị a bụ ndị hụrụ ego n’anya, ndị hụrụ onwe ha n’anya na ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya. Ha ahụghị Chineke n’anya. (2 Timoti 3:1-4) N’ịbụ ndị mikpuru onwe ha n’ihe omume ndị a na-eme kwa ụbọchị, ihe ka ọtụtụ ‘amaghị’ maka ozi ọma anyị na-ewegara ha. Ha enweghị nnọọ mmasị n’ịmụ eziokwu Bible. (Matiu 24:37-39) Àgwà dị otú ahụ pụrụ ife anyị, mee ka anyị gharazie inwe mmasị n’ihe ime mmụọ. Ọ bụrụ na anyị azụlite ịhụnanya maka ihe onwunwe na ihe ụtọ nke ndụ, ịhụnanya anyị nwere maka Chineke ga-ajụ oyi.—Matiu 24:12.

9 N’ihi nke a, Ndị Kraịst na-eji nlezianya ahọrọ ndị ha na ha na-akpakọ. Eze Solomọn dere, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ka anyị “na-ejeso” ndị na-egbukepụ ebube Chineke. Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya anyị ime otú ahụ! Ka anyị na ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na-agbakọta ná nzukọ anyị na n’oge ndị ọzọ, ịhụnanya, okwukwe, ọṅụ na amamihe ha na-agba anyị ume. Ezi mkpakọrịta dị otú ahụ na-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịnọgide n’ozi anyị.

10. Olee ụzọ ndị Setan siworo jiri ịkwa emo megide ndị na-egbukepụ ebube Chineke?

10 Ụzọ nke abụọ Setan si agbalị ime ka Ndị Kraịst nile kwụsị igbukepụ ebube Chineke bụ ịkwa ha emo. Nke a ekwesịghị iju anyị anya. N’oge ozi elu ala Jizọs Kraịst, a kwara ya emo—chịa ya ọchị, jiri ya mee ihe ọchị, kparịa ya, ọbụnakwa gbụọ ya ọnụ mmiri. (Mak 5:40; Luk 16:14; 18:32) A kwakwara Ndị Kraịst oge mbụ emo. (Ọrụ 2:13; 17:32) Ndị ohu Jehova nke oge a na-eche mmeso ọjọọ yiri nke ahụ ihu. Dị ka Pita onyeozi si kwuo, a ga-akpọ ha nnọọ “ndị amụma ụgha.” Pita buru amụma, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa, na-aga n’ihu dị ka ọchịchọ nke aka ha si dị ma na-asị: ‘Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị? Leenụ, . . . ihe nile na-adịgide kpọmkwem dị ka hà dị site ná mmalite nke ihe e kere eke.’” (2 Pita 3:3, 4) A na-akwa ndị Chineke emo dị ka ndị na-amaghị nke a na-akọ. A na-ele ụkpụrụ omume Bible anya dị ka ihe oge ya gaferela. Nye ọtụtụ ndị, ozi anyị na-ezisa bụ ihe nzuzu. (1 Ndị Kọrint 1:18, 19) Dị ka Ndị Kraịst, a pụrụ ịkwa anyị emo n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, nakwa mgbe ụfọdụ ọbụna n’ezinụlọ anyị. N’adaghị mbà, anyị na-anọgide na-egbukepụ ebube Chineke site n’ozi ọma anyị na-ezi, na-amara dị nnọọ ka Jizọs maara na Okwu Chineke bụ eziokwu.—Jọn 17:17.

11. Olee otú Setan siworo gbalịa iji mkpagbu mechie Ndị Kraịst ọnụ?

11 Ihe nke atọ Ekwensu ji eme ihe ná mgbalị ya imechi anyị ọnụ bụ mmegide ma ọ bụ mkpagbu. Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Ndị mmadụ ga-enyefe unu ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu, mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Matiu 24:9) N’ezie, dị ka Ndịàmà Jehova, anyị enwetawo mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ n’ọtụtụ akụkụ ụwa. Anyị maara na Jehova ebuwo amụma eri ogologo oge na mkpọrọmasị, ma ọ bụ iro, ga-adị n’etiti ndị na-ejere Chineke ozi na ndị na-ejere Setan bụ́ Ekwensu ozi. (Jenesis 3:15) Anyị makwaara na site n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’okpuru ule, anyị na-agba akaebe na ọ bụ Jehova ka o ruuru ịchị ụwa nile. Ịmara nke a pụrụ iwusi anyị ike ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị taa akpụ. Ọ dịghị mkpagbu ga-emechili anyị ọnụ kpamkpam ma ọ bụrụ na anyị kpebisiri ike ịdị na-egbukepụ ebube Chineke.

12. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ ka anyị na-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị mmegide Setan?

12 Ị̀ na-ajụ ihe ụrà ụwa ma na-eguzosi ike n’ihe n’agbanyeghị ịkwa emo na mmegide? Ya bụrụ otú ahụ, i nwere ezi ihe mere ị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ. Jizọs mesiri ndị ga-agbaso ya obi ike, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m. Na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-amalikwanụ elu n’ọṅụ, ebe ọ bụ na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe; n’ihi na n’ụzọ dị otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma bu unu ụzọ.” (Matiu 5:11, 12) Ntachi obi gị na-enye ihe àmà na mmụọ nsọ dị ike nke Jehova dịnyeere gị, na-enye gị ike igbukepụ ebube Chineke.—2 Ndị Kọrint 12:9.

Ntachi Obi Na-esite n’Aka Jehova

13. Olee otu isi ihe mere anyị ji atachi obi n’ozi Ndị Kraịst anyị?

13 Otu isi ihe mere anyị ji atachi obi n’ozi anyị bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, ya ana-atọkwa anyị ụtọ igbukepụ ebube ya. Ndị mmadụ na-achọkarị iṅomi ndị ha hụrụ n’anya ma na-akwanyere ùgwù, Jehova Chineke bụkwa onye kasị kwesị nṅomi. N’ihi ịhụnanya dị ukwuu o nwere, o zitere Ọkpara ya n’ụwa ịgbara eziokwu ahụ àmà na ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. (Jọn 3:16; 18:37) Dị ka Chineke, anyị na-achọ ka ụdị mmadụ nile ruo nchegharị na nzọpụta; ọ bụ ihe mere anyị ji ekwusara ha ozi ọma. (2 Pita 3:9) Ọchịchọ a, tinyekwara mkpebi siri ike anyị mere iṅomi Chineke, na-akpali anyị ịnọgidesi ike na-egbukepụ ebube ya site n’ozi anyị.

14. Olee otú Jehova si ewusi anyị ike ịtachi obi n’ozi anyị?

14 Otú ọ dị, n’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ Jehova na-enye anyị ike ịtachi obi n’ozi Ndị Kraịst anyị. Ọ na-eji mmụọ ya, nzukọ ya na Okwu ya, bụ́ Bible, akwagide ma na-ewusi anyị ike. Jehova ‘na-enye ndị dị njikere igbukepụ ebube ya ntachi obi.’ Ọ na-aza ekpere anyị ma na-enye anyị amamihe anyị ga-eji nagide ọnwụnwa ndị na-abịara anyị. (Ndị Rom 15:5; Jems 1:5) Ọzọkwa, Jehova adịghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla anyị na-agaghị edili bịara anyị. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-emeghere anyị ụzọ mgbapụ ka anyị wee gaa n’ihu igbukepụ ebube ya.—1 Ndị Kọrint 10:13.

15. Gịnị na-enyere anyị aka ịtachi obi?

15 Obi anyị na-atachi n’ozi anyị na-enye ihe àmà na mmụọ Chineke dịnyeere anyị. Iji maa atụ: Ka e were ya na mmadụ gwara gị ka ị gaa kesaa otu ụdị bred site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’anaghị ego. Ya agwa gị ka i jiri ego na oge gị mee nke a. Ọzọkwa, obere oge, gị achọpụta na ọ bụ nanị mmadụ ole na ole n’ezie chọrọ bred gị; ọbụna ụfọdụ ga-emegide mgbalị ị na-eme ikesa ya. Ì chere na ị ga-anọgide na-arụ ọrụ ahụ kwa ọnwa, nakwa kwa afọ? Eleghị anya, ị ga-akwụsị ya. Ma, ọ pụrụ ịbụ na ị gbalịsiwo ike iji oge na ego gị kwusaa ozi ọma ahụ ruo ọtụtụ afọ, ọbụna ruo ọtụtụ iri afọ. N’ihi gịnị? Ọ́ bụghị n’ihi na ị hụrụ Jehova n’anya, nakwa n’ihi na o jiriwo mmụọ ya gọzie mgbalị gị site n’inyere gị aka ịtachi obi? N’ezie, ọ bụ ya!

Ọrụ A Ga-echeta

16. Olee ihe anyị ịtachi obi n’ozi anyị pụtaara anyị na ndị gere anyị ntị?

16 Ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ onyinye na-enweghị atụ. (2 Ndị Kọrint 4:7) N’ụzọ yiri nke ahụ, ozi Ndị Kraịst nke atụrụ ọzọ ahụ na-eje gburugburu ụwa bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Ka ị na-anọgide na-atachi obi n’ozi gị, ị pụrụ, dị ka Pọl degaara Timoti akwụkwọ, ‘ịzọpụta ma onwe gị ma ndị na-ege gị ntị.’ (1 Timoti 4:16) Chee echiche ihe nke ahụ pụtara. Ozi ọma ị na-ezisa na-enye ndị ọzọ ohere ịdị ndụ ebighị ebi. Gị na ndị i nyeere aka n’ụzọ ime mmụọ pụrụ ịghọ ezigbo enyi. Cheedị ụdị ọṅụ ị ga-enwe iso ndị i nyeere aka ịmụta banyere Chineke biri ruo mgbe ebighị ebi na Paradaịs! N’ezie, ha agaghị echefu mgbalị i mere iji nyere ha aka echefu. Lee nnọọ ihe na-enye afọ ojuju nke ahụ ga-abụ!

17. Gịnị mere oge anyị ji bụrụ oge pụrụ iche n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ?

17 Ị na-ebi n’oge pụrụ iche n’akụkọ ihe mere nke mmadụ. A gaghịkwa ekwusa ozi ọma a ọzọ n’ụwa nke e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. Noa biri n’ụwa dị otú ahụ, ọ hụkwara ka ọ gabigara. Lee ọṅụ ọ na-aghaghị inwewo ịmara na ya ji ikwesị ntụkwasị obi mee uche Chineke n’ịrụ ụgbọ, bụ́ nke mere ka a zọpụta ya na ezinụlọ ya! (Ndị Hibru 11:7) Gị onwe gị pụrụ inwe ọṅụ dị otú ahụ. Cheedị echiche otú ọ ga-adị gị n’ụwa ọhụrụ ka i leghachiri anya azụ n’ihe ndị ị rụzuru n’ụbọchị ikpeazụ ndị a, na-amara na i mere ihe nile ị pụrụ ime iji kwalite ihe ndị metụtara Alaeze ahụ.

18. Mmesi obi ike na agbamume dị aṅaa ka Jehova na-enye ndị ohu ya?

18 Mgbe ahụ, ka anyị nọgide na-egbukepụ ebube Chineke. Anyị ime otú ahụ ga-abụ ihe anyị ga na-echeta ruo mgbe ebighị ebi. Jehova na-echetakwa ọrụ anyị. Bible na-enye agbamume a: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi. Ma anyị chọrọ ka onye ọ bụla n’ime unu na-egosi otu ịdị uchu ahụ iji wee nwee obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ, ka unu wee ghara ịdị umengwụ, kama bụrụnụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.”—Ndị Hibru 6:10-12.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú Ndị Kraịst si egbukepụ ebube Chineke?

• Olee ihe ụfọdụ Setan ji eme ihe ná mgbalị ya imechi ndị Chineke ọnụ?

• Olee ihe àmà na-egosi na mmụọ Chineke dịnyeere anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Ihu Mozis gbukepụrụ ebube

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Anyị na-egbukepụ ebube Chineke n’ozi anyị