Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“A Gaara Atọhapụ Ha Ozugbo”

“A Gaara Atọhapụ Ha Ozugbo”

“A Gaara Atọhapụ Ha Ozugbo”

GENEVIÈVE DE GAULLE, bụ́ nwa nwanne Charles de Gaulle, onye bụbu president France, matara Ndịàmà Jehova n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi nke dị na Ravensbrück, n’ebe ugwu Germany. O dere ihe ahụ dị n’elu n’akwụkwọ ozi o dere n’August 1945.

A tọhapụrụ ndị nọ n’ogige ịta ahụhụ Auschwitz, Poland, na January 27, 1945. Kemgbe 1996, a nọwo na-echeta ụbọchị a na Germany maka ndị tara ahụhụ n’Ọchịchị Alaeze Ukwu nke Atọ nke Hitler.

N’otu okwu ememe ncheta gọọmentị haziri na January 27, 2003, president nke Òtù Na-achị Baden-Württemberg, bụ́ Peter Straub kwuru, sị: “O kwesịrị ka anyị kwanyere ndị nile tara ahụhụ n’ihi nkwenkwe okpukpe ha ma ọ bụ nke ọchịchị na ndị dị njikere ịnwụ kama ịnakwere ọchịchị Hitler ùgwù, o siri ike iji ọnụ ekwupụta nkwanye ùgwù dị otú ahụ. Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova bụ okpukpe jụwapụrụ isi ime ihe ọchịchị Hitler chọrọ ha n’aka: Ha egbuchapụghịrị Hitler. Ha jụrụ ikwe nkwa ịkwado ‘Onye Ndú na Mba,’ dị nnọọ ka ha jụrụ ịga agha na ịrụ ọrụ ọchịchị. Ụmụ ha esonyeghịkwa n’Òtù Ndị Ntorobịa Hitler.”

Jizọs Kraịst kwuru banyere ụmụazụ ya, sị: “Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:16) Ya mere, nnọpụiche nke Ndịàmà Jehova bụ nnọọ n’ihi okpukpe. Straub gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị a kwanyere purple triangle n’uwe ha dị ka ndị mkpọrọ nọ n’ogige ịta ahụhụ, bụ ndị pụrụ iji aka ha gbochie ọnwụ ha nwụrụ n’ihi okwukwe ha. Nanị ịbịanye aka n’akwụkwọ na-egosi na ha ajụla okwukwe ha gaara ezu iji tọhapụ ha.”

Ihe ka nnọọ ọtụtụ ná Ndịàmà ahụ agatụghị ajụ okwukwe ha. N’ihi ya, ihe dị ka otu puku na narị mmadụ abụọ n’ime ha nwụrụ n’oge ọchịchị Nazi. E gburu narị mmadụ abụọ na iri asaa n’ime ha dị ka ndị jụrụ ije agha n’ihi akọ na uche ha. Ha mezuru okwu ndị a: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

Ndịàmà Jehova bụ ụmụ mmadụ nkịtị, dị ka Ulrich Schmidt, bụ́ president nke Òtù Na-achị Mba North Rhine-Westphalia, si kwuo. N’izo aka n’okwu ya, akwụkwọ nta bụ́ Landtag Intern kpọrọ ha “ndị nkịtị, bụ́ ndị, n’ihi akọ na uche ha, jigidesiri nkwenkwe okpukpe ha ike, nwee obi ike ma jụ echiche ọchịchị Nazi n’ihi nkwenkwe ha dị ka Ndị Kraịst.” Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova Chineke na-enwe obi ụtọ maka ndị nile na-eji iguzosi ike n’ihe arapara ya n’ahụ́ n’oge ihe isi ike. N’Ilu 27:11, anyị na-agụ, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.”

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 30]

Site n’ikike nke Ebe Ndebe Ihe Ncheta Oké Mgbukpọ nke United States