Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Kwanyeere Ha Ùgwù n’Ihi Mmasị Ha Nwere na Bible

A Kwanyeere Ha Ùgwù n’Ihi Mmasị Ha Nwere na Bible

A Kwanyeere Ha Ùgwù n’Ihi Mmasị Ha Nwere na Bible

MARIANNA, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova bi n’ebe ndịda Ịtali, dị afọ 18 ma nọrọ n’afọ ikpeazụ ya n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ya na Ndịàmà ndị ọzọ na-eto eto nọ n’otu ụlọ akwụkwọ.

Marianna na-ede, sị: “Ruo afọ ole na ole ugbu a, ụfọdụ n’ime anyị anọwo na-agụ akụkụ Bible dịịrị ụbọchị site n’akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị n’oge nri ehihie anyị. Nanị ebe anyị pụrụ ịnọ gụọ ya bụ n’otu n’ime paseji ndị dịdebere ọfịs ndị nkụzi. Ụzụ na-adị ebe ahụ. Ihe ka ọtụtụ ná ndị nkụzi na-ahụ anyị ka ha na-agafe, ụfọdụ na-akwụsịkwa iji hụ ihe anyị na-eme. Mgbe mgbe, nke a enyewo anyị ohere ịza ajụjụ ndị ha jụrụ. Ya dịkarịa ala, otu onye nkụzi na-akwụsị kwa ụbọchị. Ọtụtụ anọrọwo iji gee ntị ná nkwurịta okwu anyị sitere n’akụkụ Bible ma gosipụta nkwanye ùgwù ha nwere maka anyị bụ́ Ndịàmà n’ihi mmasị anyị nwere n’ihe ime mmụọ. Otu ụbọchị, osote onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị kpọrọ anyị ka anyị nọrọ n’ọfịs ndị nkụzi nwee nkwurịta okwu anyị.

“Ka onye nkụzi m hụsịrị ebe anyị na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ọ rịọrọ onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị ma ànyị pụrụ ịdị na-atụle ya n’otu ọnụ ụlọ klas, ebe ụzụ na-anaghị adịcha. Onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị nyere anyị ikike ime otú ahụ, onye nkụzi m jakwara anyị mma n’ihu ụmụ klas anyị nile maka ihe nlereanya ọma anyị na-esetịpụ. Anyị nile nwere obi ụtọ maka oké ihe ùgwù Jehova nyeworo anyị.”