Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’Izrel oge ochie, gịnị ka ìhè ahụ sitere n’aka Chineke nke a na-akpọ Shechinah mgbe ụfọdụ, bụ́ nke na-egbuke n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọikwuu ahụ pụtara?

Jehova, bụ́ Nna nke na-ahụ n’anya na Onye Na-echebe ndị ya, mere ka ọnụnọ ya pụta ìhè nke ọma n’Izrel. Otu ụzọ o si mee nke ahụ bụ site n’igwe ojii na-egbukepụ egbukepụ, bụ́ nke ya na ebe ofufe ya nwere njikọ chiri anya.

Ìhè ahụ dị ịrịba ama nọchiri anya ọnụnọ Jehova a na-adịghị ahụ anya. Ọ pụtara n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọikwuu ahụ na nke ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru. Ìhè ahụ sitere n’aka Chineke adịghị egosi na Jehova nọ n’ebe ahụ n’anụ ahụ́. Chineke apụghị ibi n’ụlọ ọ bụla nke mmadụ wuru. (2 Ihe E Mere 6:18; Ọrụ 17:24) Ìhè a Chineke mere ka ọ na-egbuke n’ebe nsọ ya pụrụ imesi nnukwu onye nchụàjà obi ike, ma site n’aka nnukwu onye nchụàjà ahụ mesie ụmụ Izrel nile obi ike na Jehova nọ ya ichebe ha na igbo mkpa ha.

N’asụsụ Aramaic a na-asụ mgbe e desịrị Bible, a kpọrọ ìhè ahụ Shechinah (shekhi·nahʹ), bụ́ okwu pụtara “nke na-ebinyere” ma ọ bụ “nke bi.” Okwu a apụtaghị na Bible, ma a ọ dị ná nsụgharị Aramaic nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ nke a na-akpọkwa Targum.

Mgbe Jehova na-enye ntụziaka maka iwu ụlọikwuu ahụ, ọ gwara Mozis, sị: ‘Ị ga-atụkwasịkwa ebe mkpuchi mmehie ahụ n’igbe ahụ, n’elu ya; n’ime igbe ahụ ka ị ga-etinye ihe àmà nke M ga-enye gị. M ga-ezutekwa gị n’ebe ahụ, kpanyere gị ụka site n’elu ebe mkpuchi mmehie, site n’etiti cherubim abụọ nke dị n’elu igbe ahụ.’ (Ọpụpụ 25:21, 22) Igbe ahụ a kpọtụrụ aha bụ igbe e ji ọlaedo machite nke dị n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile. E nwere ndị cherub abụọ e ji ọlaedo mee n’elu ihe e ji ekpuchi Igbe ahụ.

Ebee ka Jehova ga-esi kwuo okwu? Ọ zara ajụjụ ahụ mgbe ọ gwara Mozis, sị: “N’ime igwe ojii ka a ga-ahụ m n’elu ebe mkpuchi mmehie.” (Levitikọs 16:2) Igwe ojii a dị n’elu Igbe nsọ ahụ, n’etiti ndị cherub abụọ ahụ e ji ọlaedo mee. Bible ekwughị otú igwe ojii ahụ dịruru n’elu ma ọ bụ otú ọ haruru n’elu site na cherub ndị ahụ.

Igwe ojii a na-egbuke egbuke mere ka ìhè dịrị n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile. N’ezie, ọ bụ nanị ya na-enye ìhè n’ime ụlọ ahụ. Nnukwu onye nchụàjà ga-eji ìhè ahụ hụ ụzọ mgbe ọ batara n’ọnụ ụlọ dị n’ime ime n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. O guzo n’ihu Jehova.

È nwere ihe ìhè a na-egbuke n’ụzọ ọrụ ebube pụtaara Ndị Kraịst? Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ obodo nke ‘abalị na-agaghị adị’ na ya. Obodo ahụ bụ Jeruselem Ọhụrụ, bụ́ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ e si n’ọnwụ kpọlite iso Jizọs chịa mejupụtara. Ìhè nke obodo ihe atụ a esiteghị n’anyanwụ ma ọ bụ n’ọnwa. Ebube Jehova Chineke na-amụkwasị ìhè ná nzukọ a, dị nnọọ ka igwe ojii Shechinah si enye ìhè n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile. Ọzọkwa, Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ “oriọna” nke obodo ahụ. N’otu aka ahụ, “obodo” a na-enye ndị a gbapụtara agbapụta si ná mba nile pụta ìhè ime mmụọ na ihu ọma ya iji na-eduzi ha.—Mkpughe 21:22-25.

Ebe ọ bụ na ha na-enweta ngọzi bara ụba dị otú ahụ site n’aka Chineke, ndị na-efe Jehova pụrụ ijide n’aka na Jehova bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ nke nwere ike ichebe ha na Nna nke hụrụ ha n’anya.