Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible Eze—Ọrụ Dị Ịrịba Ama Ndị Ọkà Mmụta Rụrụ

Bible Eze—Ọrụ Dị Ịrịba Ama Ndị Ọkà Mmụta Rụrụ

Bible Eze—Ọrụ Dị Ịrịba Ama Ndị Ọkà Mmụta Rụrụ

OTU ụgbọ mmiri hapụrụ Spen ma na-aga n’ebe ala dịịrị banye na mmiri n’Ịtali ná mmalite nke narị afọ nke 16. O bu ihe dị nnọọ oké ọnụ ahịa—ihe ka ọtụtụ na Bible Complutensian Polyglot nile e bipụtara n’agbata afọ 1514 na 1517. Na mberede, oké ifufe malitere ife. Ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ gbalịrị ịzọ ụgbọ ahụ ma mgbalị ha kụrụ afọ n’ala. Ụgbọ mmiri ahụ na ihe ndị dị oké ọnụ ahịa o bu mikpuru n’ime mmiri.

Ọdachi a mere ka ọ dị mkpa ibipụta Bible Polyglot ọhụrụ. N’ikpeazụ, ọkà n’ibipụta akwụkwọ bụ́ Christophe Plantin nakweere ọrụ ahụ siri ike. Ọ dị ya mkpa inwe aka ji akụ̀ ga-akwado ọrụ a buru ibu n’ụzọ ego, ya mere, ọ rịọrọ eze Spen bụ́ Philip nke Abụọ ka ọ kwado ya. Tupu eze ahụ ekpebie ma ọ̀ ga-akwado ọrụ ahụ, ọ kpọtụụrụ ndị ọkà mmụta dị iche iche nke Spen, ọkà mmụta Bible a ma ama bụ́ Benito Arias Montano so ná ndị ọ kpọtụụrụ. Ọ gwara Eze Philip, sị: “E wezụga na ibipụta ya ga-abụ ịrụrụ Chineke ọrụ na ime ihe ga-abara chọọchị ahụ zuru ụwa ọnụ uru, ọ ga-ewetakwara aha Onyenwe m bụ́ eze otuto dị ukwuu, ma mee ka aha gị na-ede ude.”

Ịnọ n’obodo ahụ bipụta Complutensian Polyglot ọhụrụ ga-abụ ihe dị ịrịba ama, ya mere, Philip kpebiri iji obi ya nile kwado atụmatụ Plantin. O nyere Arias Montano nnukwu ọrụ nke ide ihe e mechara kpọọ Bible Eze, ma ọ bụ Polyglot Antwerp. *

Philip nwere nnọọ mmasị ịhụ na mbipụta nke Bible Polyglot a gara n’ihu nke na o kwuru ka e zitere ya ibe akwụkwọ nke ọ bụla e bipụtara ka ya gụgharịa. O kwere nghọta na Plantin chere na ọ ga-adọghachi ọrụ ya azụ ichere ka eze ahụ si Spen zighachi ibe akwụkwọ nke ọ bụla e nyere ya ka ọ gụgharịa ma dezigharịa ihe na ya tupu e bie Bible ahụ n’Antwerp. O mesịrị bụrụ na nanị ihe Philip nwetara bụ ibe akwụkwọ nke mbụ e bipụtara, nakwa ma eleghị anya, ụfọdụ peeji ndị mbụ e bipụtara. Ka ọ dịgodị, Montano gara n’ihu ịgụgharị peeji ndị ahụ, ndị prọfesọ atọ bi na Louvain, tinyere ada Plantin nke dị afọ iri na ụma, nyekwaara ya aka.

Onye Hụrụ Okwu Chineke n’Anya

Ahụ́ ruru Arias Montano ala iso ndị ọkà mmụta nke Antwerp rụkọọ ọrụ. Plantin nwere mmasị n’ebe ọ nọ n’ihi na ọ bụ onye na-anabata echiche ndị ọzọ, ha nọgidere bụrụ enyi ma na-emekọrịta ihe ná ndụ ha nile. Ọ bụghị nanị n’ihi na Montano bụ ọkà mmụta mere e ji mara ya nke ọma, kamakwa n’ihi na ọ hụrụ Okwu Chineke n’anya. * Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, ọ dị ya nnọọ ọkụ n’obi ịgụcha akwụkwọ iji nwee ike itinye onwe ya kpamkpam n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ.

Arias Montano kweere na e kwesịrị ịsụgharị okwu ndị dị na Bible n’ụzọ nkịtị ruo ókè o kwere mee. Ọ gbalịrị ịsụgharị kpọmkwem ihe dị n’ihe odide mbụ ahụ, si otú a mee ka o kwe ndị ga-agụ ya omume ịgụ Okwu Chineke otú ọ dị n’ezie. Montano gbasoro ụkpụrụ nduzi Erasmus, bụ́ onye gbara ndị ọkà mmụta ume “iji okwu ndị dị n’ihe odide ndị mbụ kwusaa banyere Kraịst.” Ruo ọtụtụ narị afọ, e zonahụrụ ndị mmadụ ihe ihe odide ndị mbụ nke Akwụkwọ Nsọ pụtara n’ihi na nsụgharị Latin siri ike nghọta.

Otú E Si Hazie Ya

Ihe odide nile ndị Alfonso de Zamora kwadebere ma degharịa maka ibipụta Bible Complutensian Polyglot ruru Arias Montano aka, bụ́ onye ji ha mee ihe maka Bible Eze. *

E cheburu na Bible Eze ga-abụ mbipụta nke abụọ nke Complutensian Polyglot, ma e mesịrị gbanwee ọtụtụ ihe na ya. E nwetara ihe odide Hibru na nke Grik nke Septuagint site na Bible Complutensian; a gbakwụnyeziri ihe odide ọhụrụ ndị ọzọ na ihe odide ntụkwasị buru nnọọ ibu. Bible Polyglot ọhụrụ ahụ mesịrị nwee mpịakọta asatọ. O were afọ ise iji bipụta ya, malite n’afọ 1568 ruo 1572—oge dị nnọọ nta ma e jiri ya tụnyere otú ọrụ ahụ bururu n’ibu. N’ikpeazụ, e bipụtara ya otu puku, narị abụọ na iri na atọ.

Ọ bụ ezie na Bible Complutensian Polyglot nke afọ 1517 bụ “ihe ncheta nke nkà mbipụta akwụkwọ,” Polyglot Antwerp ọhụrụ ahụ ka nke Complutensian mma n’otú e si hazie ya nakwa n’ihe dị n’ime ya. Ọ bụ ihe dị ịrịba ama n’ọrụ obibi akwụkwọ nakwa, nke ka mkpa, n’ịkwadebe ihe odide Bible ziri ezi a pụrụ isi na ya sụgharịa ndị ọzọ.

Mmegide Sitere n’Aka Ndị Iro nke Okwu Chineke

Ọ bụghị ihe ijuanya na n’oge na-adịghị anya, a malitere inwe ndị na-emegide nsụgharị Bible ndị gbasoro ihe odide ndị mbụ. Ọ bụ ezie na popu kwadoro mbipụta nke Polyglot Antwerp, Arias Montano abụrụkwa onye a ma ama dị ka ọkà mmụta a na-akwanyere ùgwù, e boro ya ebubo n’ihu òtù Njuta Okwukwe. Ndị na-emegide ya sịrị na ihe odide ya mere ka o yie ka ihe odide Latin Santes Pagninus nke e dezigharịrị ọhụrụ ọ̀ sụgharịrị okwu Hibru na nke Grik nke ọma karịa Vulgate, bụ́ nke a sụgharịrị ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. Ha bokwara Montano ebubo na o leere anya n’asụsụ ndị mbụ n’ihi na ọ chọrọ iwepụta nsụgharị Bible ziri ezi— bụ́ ihe ha weere dị ka ịjụ okwukwe.

Òtù Njụta Okwukwe ahụ kwudịrị na “Eze ahụ enwetabeghị nkwanye ùgwù dị ukwuu n’ihi ịkwado mbipụta nke akwụkwọ ahụ.” Ha kwuru na o wutere ha na Montano ejichaghị Vulgate bụ́ nke ndị ọchịchị kwadoro mee ihe. N’agbanyeghị ebubo ndị a, ha enwetaghị ihe akaebe zuru ezu iji maa Montano ma ọ bụ Bible Polyglot ya ikpe. N’ikpeazụ, a nabatara Bible Eze ahụ nke ọma, ọ ghọkwara akwụkwọ mahadum dị iche iche na-agụ.

Ngwá Ọrụ Bara Uru ná Nsụgharị Bible

Ọ bụ ezie na e deghị Polyglot Antwerp maka ọha na eze, n’oge na-adịghị anya, ọ ghọrọ ngwá ọrụ baara ndị nsụgharị Bible uru. Dị ka Complutensian Polyglot nke bu ya ụzọ, o so n’ihe ndị e ji dezigharịa ihe odide Akwụkwọ Nsọ ndị e nwere mgbe ahụ. O nyekwaara ndị nsụgharị aka ịghọtakwu asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible nke ọma. Bible a nyere aka n’ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ ndị bụ́ isi nke Europe. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ The Cambridge History of the Bible na-akọ na ndị dere nsụgharị Bible ahụ a ma ama bụ́ King James Version, ma ọ bụ Authorized Version nke afọ 1611 ji Polyglot Antwerp mee ihe dị ka ihe enyemaka bara uru n’ịsụgharị asụsụ ndị oge ochie. Bible Eze metụtakwara nnọọ Bible Polyglot abụọ dị mkpa e bipụtara na narị afọ nke 17.—Lee igbe bụ́ “Bible Polyglot.”

Otu n’ime ọtụtụ uru ndị Polyglot Antwerp bara bụ na o mere ka ndị ọkà mmụta Europe nweta nsụgharị Syriac nke Akwụkwọ Nsọ Grik na nke mbụ ya. Ihe odide Syriac ahụ dị n’akụkụ nsụgharị nkịtị nke Latin. Nsụgharị Syriac a e webatara bara ezigbo uru ebe ọ bụ na asụsụ Syriac bụ otu n’ime asụsụ ndị kasị ochie e ji sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Nsụgharị Syriac, bụ́ nke e wepụtara na narị afọ nke ise O.A., dabeere n’ihe odide Bible ndị e dere laa azụ na narị afọ nke abụọ O.A. Dị ka akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia si kwuo, “onye ọ bụla maara uru Peshitta [Syriac] bara n’inyocha ihe odide ndị ọzọ. Ọ bụ otu n’ime ebe ndị kasị ochie ma zie ezie e si amata otú e si dee ihe n’oge ochie.”

Ma oké ifufe nke oké osimiri ma mmegide nke ndị Njụta Okwukwe nke Spen adịghị nke mere ka a ghara ibipụtaghachi Complutensian Polyglot ka mma na nke ka buo ibu n’afọ 1572, bụ́ nke a kpọrọ Bible Eze. Akụkọ banyere Bible Polyglot nke Antwerp bụ ihe atụ ọzọ nke mgbalị ndị nwere obi eziokwu mere iji gbachitere Okwu Chineke.

Ma hà maara ma ọ bụ na ha amaghị, site n’ọrụ ha rụrụ n’achọghị ọdịmma onwe ha nanị, ndị ikom a raara onwe ha nye gosiri na okwu amụma nke Aịzaịa bụ eziokwu. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ atọ gara aga, o dere, sị: “Ahịhịa akpọnwụwo, okooko ọhịa ajanwụwo: ma okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 40:8.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 A kpọrọ ya Bible Eze n’ihi na ọ bụ Eze Philip wetara ego e ji hụ maka odide ya, a kpọkwara ya Polyglot Antwerp n’ihi na e biri ya n’obodo Antwerp, bụ́ nke dị n’Alaeze Ukwu Spen n’oge ahụ.

^ par. 7 Ọ maara asụsụ Arabic, Grik, Hibru, Latin na Syriac nke ọma, bụ́ asụsụ ise bụ́ isi e ji mee ihe na Bible Polyglot. Ọ makwaara nkà mmụta ihe ochie, nkà mmụta ahụ́ ike, nkà mmụta sayensị banyere ihe ndị e kere eke na nkà mmụta okpukpe nke ọma, o jikwa ihe ọmụma ndị a mee ihe nke ọma mgbe ọ na-akwadebe ihe odide ntụkwasị ya.

^ par. 10 Iji nweta nkọwa nke abamuru Bible Complutensian Polyglot, lee Ụlọ Nche nke April 15, 2004.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

“Ma okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 12]

BIBLE POLYGLOT

Ọkà mmụta bụ́ onye Spen bụ́ Federico Pérez Castro na-akọwa, sị: “Bible Polyglot bụ Bible nwere asụsụ dịgasị iche iche n’ime ya. Otú ọ dị, okwu ahụ na-ezokarị aka na Bible ndị nwere ihe odide Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible. E si otú a lee ya anya, Bible polyglot e nwere dị nnọọ ole na ole.”

1. E bipụtara The Complutensian Polyglot (1514-1517), nke Kadinal Cisneros kwadoro, n’Alcalá de Henares, Spen. Mpịakọta isii ya nwere ihe odide Bible n’asụsụ anọ: Hibru, Grik, Aramaic na Latin. O mere ka ndị nsụgharị nke narị afọ nke 16 nwee ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru na Aramaic nke ga-enyere ha aka ná nsụgharị ha.

2. The Antwerp Polyglot (1568-1572), nke Benito Arias Montano dere, gbakwụnyere nsụgharị Syriac Peshitta nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na Targum Aramaic nke Jonathan n’ihe odide Complutensian. E degharịrị ihe odide Hibru ya, bụ́ nke nwere ụdaume na akara ụda olu dabere n’ihe odide Hibru e nwetara n’aka Jacob ben Hayyim. O si otú ahụ ghọọ ihe odide nke ndị nsụgharị Bible na-elere anya asụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru.

3. The Paris Polyglot (1629-1645) nke ọkàiwu bụ́ onye France bụ́ Guy Michel le Jay kwadoro. Ọ dabeere na Polyglot Antwerp, ọ bụ ezie na o nwekwara ihe odide ụfọdụ nke asụsụ ndị Sameria na nke asụsụ Arabic.

4. The London Polyglot (1655-1657), bụ́ nke Brian Walton dere, dabekwaara na Polyglot Antwerp. Polyglot a nwere nsụgharị Bible ndị merela ochie n’asụsụ ndị Etiopia na ndị Peshia, ọ bụ ezie na nsụgharị ndị a emechaghị ka a ghọtakwuo ihe odide Bible.

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ọkọlọtọ e dere ihe na ya na Polyglot Antwerp (abụọ ahụ dị n’ala ala): Biblioteca Histórica. Universidad Complutense de Madrid; Polyglot Antwerp (n’elu): Site n’ikike nke Museum Plantin-Moretus/Stedelijk Prentenkabinet Antwerpen; Polyglot London: Site n’akwụkwọ bụ́ The Walton Polyglot Bible, Mpịakọta nke Atọ, 1655-1657

[Foto dị na peeji nke 9]

Philip nke Abụọ, eze Spen

[Ebe E Si Nweta Foto]

Philip nke Abụọ: Biblioteca Nacional, Madrid

[Foto dị na peeji nke 10]

Arias Montano

[Ebe E Si Nweta Foto]

Montano: Biblioteca Histórica. Universidad Complutense de Madrid

[Foto dị na peeji nke 10]

Ígwè obibi akwụkwọ ndị mbụ dị n’Antwerp, Belgium

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ígwè obibi akwụkwọ: Site n’ikike nke Museum Plantin-Moretus/Stedelijk Prentenkabinet Antwerpen

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

N’aka ekpe: Christophe Plantin na ihu akwụkwọ nke Polyglot Antwerp

[Ebe E Si Nweta Foto]

Peeji bu aha akwụkwọ na Plantin: Site n’ikike nke Museum Plantin-Moretus/Stedelijk Prentenkabinet Antwerpen

[Foto dị na peeji nke 11]

N’elu: Ọpụpụ isi 15 nke dị na kọlụm anọ

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 9]

Peeji bu aha akwụkwọ na Plantin: Site n’ikike nke Museum Plantin-Moretus/Stedelijk Prentenkabinet Antwerpen

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 13]

Biblioteca Histórica. Universidad Complutense de Madrid