Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“E Lodawo Ọnwụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

“E Lodawo Ọnwụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

“E Lodawo Ọnwụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

WERE ya na ị na-agụ akwụkwọ akụkọ nke ihe a dị n’elu bụ isi akụkọ ya kama ịnọ na-agụ banyere nwata nwanyị gburu onwe ya. N’ezie, ọ dịtụbeghị akwụkwọ akụkọ nwere ike ikwu ihe dị otú ahụ. Ma ihe a e dere n’elu dị n’otu akwụkwọ gbarala ọtụtụ puku afọ—Bible.

N’Akwụkwọ Nsọ, a kọwara ọnwụ n’ụzọ doro anya. Ọzọkwa, ọ bụghị nanị na Bible na-ekpughe ihe mere anyị ji anwụ anwụ kama ọ na-akọwakwa ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ ma na-ekwu ihe bụ́ olileanya dịịrị ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Ọ na-ekwukwa banyere oge dị mkpa, bụ́ mgbe ọ ga-ekwe omume ịkọ, sị: “E lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Ndị Kọrint 15:54.

Bible na-akọwa ọnwụ n’ụzọ doro anya ọ bụghị n’ụzọ na-agaghị ekwe nghọta. Dị ka ihe atụ, mgbe mgbe, ọ na-eji ọnwụ atụnyere ‘ịrahụ ụra,’ ọ na-akọwakwa ndị nwụrụ anwụ dị ka ndị nọ “n’ụra ọnwụ.” (Abụ Ọma 13:3; 1 Ndị Tesalonaịka 4:13; Jọn 11:11-14) Ọ kpọkwara ọnwụ “onye iro.” (1 Ndị Kọrint 15:26) Nke ka mkpa, Bible na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere ọnwụ ji dị ka ụra, ihe mere ihe a kpọrọ mmadụ ji anwụ anwụ na otú a ga-esi merie onye iro a n’ikpeazụ.

Gịnị Mere Anyị Ji Anwụ Anwụ?

Akwụkwọ mbụ nke Bible na-akọ otú Chineke si kee mmadụ mbụ, bụ́ Adam, ma mee ka o biri n’ebe obibi paradaịs. (Jenesis 2:7, 15) Mgbe e kere Adam, e nyere ya ihe ndị ọ ga na-arụ, gwakwa ya ihe ọ na-agaghị anwa anwa mee. Chineke gwara ya banyere otu osisi dị n’ubi Iden, sị: “Gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” * (Jenesis 2:17) Ya mere, Adam ghọtara na a pụrụ izere ọnwụ ezere. Ọnwụ bụ ihe si nnọọ n’inupụ isi n’iwu Chineke pụta.

N’ụzọ dị mwute, Adam na nwunye ya, bụ́ Iv, nupụrụ isi. Ha họọrọ ileghara uche Onye Okike ha anya, ha takwara ahụhụ ihe ndị si na ya pụta. Mgbe Chineke kwupụtara ihe ndị si ná mmehie ha pụta, ọ gwara ha, sị: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” (Jenesis 3:19) Ha ghọrọ ndị gbara nnọọ ọrụ—ndị na-ezughị okè. Ezughị okè, ma ọ bụ mmehie ha, ga-egbu ha.

Ịgba ọrụ—mmehie a—fekwara ụmụ Adam na Iv, agbụrụ mmadụ nile. N’ụzọ ụfọdụ, ọ dị ka ọrịa e ketara eketa. Ọ bụghị nanị na Adam tụfuru ohere nke ịdị ndụ anwụghị anwụ, kamakwa o bufere ụmụ ya ezughị okè. Ezinụlọ mmadụ banyere n’agbụ nke mmehie. Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụ ya mere na, dị nnọọ ka mmehie sitere n’otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.”—Ndị Rom 5:12.

‘Mmehie Batara n’Ụwa’

A pụghị iji onyokomita hụ ịgba ọrụ, ma ọ bụ mmehie a, e ketara eketa. “Mmehie” na-ezo aka n’ịgba ọrụ n’omume na n’ụzọ ime mmụọ bụ́ nke nne na nna mbụ anyị bufere anyị, ọ na-emetụtakwa mmadụ n’ụzọ anụ ahụ́. Otú ọ dị, Bible na-ekpughe na Chineke ewetala ihe ga-agwọta nsogbu ahụ. Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site na Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kọrint, ọ gbakwụnyere ihe mesiri ya obi ike nke o weere dị ka ihe dị ezigbo mkpa, sị: “Dị nnọọ ka mmadụ nile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ nile dị ndụ n’ime Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 15:22.

O doro anya na Jizọs Kraịst keere òkè bụ́ isi n’iwepụ mmehie na ọnwụ. O kwuru na ọ bịara n’ụwa iji “nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) A pụrụ iji ọnọdụ ahụ tụnyere ịtọrọ mmadụ, nke ọ bụ nanị mgbe a kwụrụ ụgwọ a kapịrị ọnụ ka a ga-atọhapụ onye ahụ a tọọrọ. N’ọnọdụ a, ihe ga-agbapụtali anyị pụọ ná mmehie na ọnwụ bụ ndụ mmadụ zuru okè nke Jizọs. *Ọrụ 10:39-43.

Iji nye ihe mgbapụta ahụ, Chineke zitere Jizọs n’ụwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà. “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka . . . onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya . . . nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Tupu ya anwụọ ọnwụ ịchụàjà, Kraịst ‘gbaara eziokwu ahụ àmà.’ (Jọn 18:37) N’oge ọ na-ejekwa ozi ihu ọha ya, o ji ihe omume ụfọdụ kpughee ihe bụ́ eziokwu banyere ọnwụ.

“Nwata Nwanyị A . . . Na-ehi Ụra”

Ọnwụ abụghịrị Jizọs ihe ọhụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. O ruru újú mgbe ndị nọ ya nso nwụrụ, ọ makwaara nke ọma na ya onwe ya ga-anwụchu ọnwụ. (Matiu 17:22, 23) Ihe àmà na-egosi na ọnwa ole na ole tupu e gbuo Jizọs, ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. Ihe ahụ merenụ na-eme ka anyị ghọta otú Jizọs si lee ọnwụ anya.

Oge na-adịghị anya ka ọ natasịrị ozi na Lazarọs anwụọla, Jizọs kwuru, sị: “Lazarọs enyi anyị agawo izu ike, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya n’ụra.” Ndị na-eso ụzọ ya chere na ọ bụrụ na ọ bụ nanị ike ka Lazarọs na-ezu, ahụ́ ga-emecha dị ya mma. Ya mere, Jizọs kwuru hoo haa, sị: “Lazarọs anwụwo.” (Jọn 11:11-14) O doro anya na Jizọs ghọtara na ọnwụ dị ka ihi ụra. Ọnwụ pụrụ isiri anyị ike nghọta, ma anyị ma ihe ihi ụra pụtara. Mgbe anyị na-ehi ụra n’abalị, anyị adịghị ama mgbe oge ji aga na ihe na-eme gburugburu anyị n’ihi na anyị na-anọ n’ọnọdụ nke amaghị ihe na-aganụ ruo nwa oge. Nke a bụ nnọọ otú Bible si kọwaa ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Eklisiastis 9:5 na-ekwu, sị: “Ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.”

Jizọs jikwa ọnwụ tụnyere ụra n’ihi na ndị mmadụ pụrụ isi n’ọnwụ bilie site n’ike Chineke. N’otu oge, Jizọs gara n’ụlọ otu ezinụlọ na-amaghị ihe ha ga-eme eme bụ́ ndị nwa ha nwanyị ka nwụpụrụ. Jizọs kwuru, sị: “Nwata nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ na-ehi ụra.” Ọ garuziri nwata nwanyị ahụ nwụrụ anwụ nso ma jide ya aka, o wee “bilie.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, o bilitere n’ọnwụ.—Matiu 9:24, 25.

Ọ bụkwa otú ahụ ka Jizọs si kpọlite enyi ya nwoke bụ́ Lazarọs n’ọnwụ. Ma tupu ya arụọ ọrụ ebube ahụ, ọ kasiri Mata, bụ́ nwanne Lazarọs, obi site n’ikwu, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” Mata ji obi ike zaa, sị: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:23, 24) Ihe àmà na-egosi na Mata na-atụ anya na ndị ohu Chineke nile ga-ebilitecha n’ọnwụ n’ọdịnihu.

Gịnị kpọmkwem ka mbilite n’ọnwụ pụtara? Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “mbilite n’ọnwụ” (a·naʹsta·sis) pụtara n’ụzọ nkịtị “ibili ọtọ.” Ọ pụtara isi n’ọnwụ bilie. Nke a pụrụ ịdị ụfọdụ ka ihe na-apụghị ime eme, ma mgbe Jizọs kwusịrị na ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu ya, o kwuru, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya.” (Jọn 5:28) Mkpọlite Jizọs n’onwe ya kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ mgbe ọ nọ n’elu ala na-emesi anyị obi ike ná nkwa Bible bụ́ na ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke ga-esi ‘n’ụra’ ha na-ehi eri ogologo oge bilie. Mkpughe 20:13 na-ebu amụma, sị: “Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis [ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ] hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.”

À ga-esi n’ọnwụ kpọlite ndị a nwụrụ anwụ nanị ka ha bịa mee agadi ma nwụọ ọzọ, dị ka Lazarọs? Nke ahụ abụghị nzube Chineke. Bible na-emesi anyị obi ike na oge na-abịa mgbe ‘ọnwụ na-agaghị adị ọzọ,’ ya mere, o nweghịzi onye ga-eme agadi ma nwụọ.—Mkpughe 21:4.

Ọnwụ bụ onye iro. Agbụrụ mmadụ nwere ọtụtụ ndị iro ọzọ, dị ka ọrịa na nká, bụ́ ihe ndị na-akpatakwa oké ahụhụ. Chineke kwere nkwa imeri ha nile, si otú a maa onye iro kasịnụ nke ihe a kpọrọ mmadụ ikpe. “Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrint 15:26.

Mgbe e mezuru nkwa ahụ, ụmụ mmadụ ga-enwe ndụ zuru okè, nke mmehie na ọnwụ na-agaghị na-akpa aka ọjọọ. Ka ọ dịgodị, anyị pụrụ inweta nkasi obi n’ịmara na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ na-ehi ụra, ọ bụrụkwa na ha nọ ná ncheta Chineke, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ mgbe oge ya ruru.

Ịghọta Ihe Ọnwụ Bụ Na-enye Aka Eme Ka Ndụ Nwee Nzube

Ịghọta ihe ọnwụ bụ nke ọma na olileanya nke ndị nwụrụ anwụ pụrụ ịgbanwe otú anyị si ele ndụ anya. Ian, bụ́ onye e kwuru maka ya n’isiokwu bu ụzọ, dị afọ 20 na ụma mgbe ọ mụtara otú Bible si kọwaa ọnwụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ana m enwebu olileanya na-esighị ike na o nwere ebe papa m nọ. Ma mgbe m matara na ọ bụ nanị n’ụra ọnwụ ka ọ nọ, o wutere m na mbụ.” Otú ọ dị, mgbe Ian gụrụ banyere nkwa Chineke kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, o nwere nnọọ obi ụtọ ịmata na ya pụrụ ịhụ papa ya anya ọzọ. O kwuru, sị: “Na nke mbụ ná ndụ m, enwere m udo nke obi.” Ịghọta ọnwụ nke ọma wetaara ya udo nke obi bụ́ nke mere ka obi jụrụ ya.

Nwa Clive na Brenda, bụ́ Steven, nke dị afọ 21 nwụnahụrụ ha ná nnukwu ihe mberede ahụ e kwuru maka ya n’isiokwu bu ụzọ. Ọ bụ ezie na ha maara ihe Bible kwuru banyere ọnwụ, mfu mberede ahụ ka gbawara ha obi. E kwuwerị, ọnwụ bụ onye iro, ihe ọgbụgba ya na-afụkwa ụfụ. Ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ ha nwere banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ ji nke nta nke nta mee ka újú ha na-eru belata. Brenda na-ekwu, sị: “Ihe anyị ghọtara banyere ọnwụ enyerela anyị aka ịhazigharị ndụ anyị ma biri ndụ gaa n’ihu. N’eziokwu, o nweghị ụbọchị anyị na-adịghị eche banyere oge Steven ga-esi n’oké ụra ya bilie.”

“Ọnwụ, Olee Ihe Ọgbụgba Gị?”

O doro anya na ịghọta ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ pụrụ inyere anyị aka inwe echiche ziri ezi banyere ndụ. Ọnwụ ekwesịghị ịbụ ihe omimi. Anyị pụrụ ịnụ ụtọ ndụ n’atụghị egwu onye iro a nke na-echere anyị. Ịghọtakwa na ọnwụ ekwesịghị iwepụ ndụ anyị ruo mgbe ebighị ebi na-eme ka anyị ghara ịchọ ibi ndụ ihe ụtọ, n’echiche nke na “ndụ dị nnọọ mkpụmkpụ.” Ịmata na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ, ndị nke nọ ná ncheta Chineke, nọ n’ụra ọnwụ ma na-echere mbilite n’ọnwụ pụrụ ịkasi anyị obi ma mee ka anyị nwee ọchịchọ ibiri ndụ gaa n’ihu.

Ee, anyị pụrụ iji obi ike na-elepụ anya n’ihu ịhụ mgbe Jehova Chineke, bụ́ Onye Na-enye ndụ, ga-ewepụ ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Lee otú ọ ga-esi bụụrụ anyị ngọzi mgbe anyị pụrụ ịjụ n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ọnwụ, olee mmeri gị? Ọnwụ, olee ihe ọgbụgba gị?”—1 Ndị Kọrint 15:55.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Nke a bụ ebe mbụ Bible kwuru maka ọnwụ.

^ par. 11 E ji ndụ mmadụ zuru okè gbapụta anyị n’ihi na ọ bụ ihe Adam tụfuru. Mmehie merụrụ mmadụ nile, ya mere, o nweghị mmadụ na-ezughị okè nke pụrụ ịbụ ihe mgbapụta. N’ihi ya, Chineke si n’eluigwe zite Ọkpara ya maka nzube ahụ. (Abụ Ọma 49:7-9) Iji nwetakwuo ihe ọmụma n’isiokwu a, lee isi nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 5]

Nnupụisi Adam na Iv kpatara ọnwụ

[Foto dị na peeji nke 6]

Jizọs jidere nwata nwanyị ahụ nwụrụ anwụ aka, o wee bilie

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọtụtụ ndị na-echere mgbe ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-eteta n’ụra, dị ka Lazarọs tetara