Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iwu Ịhụnanya nke Dị n’Obi Anyị

Iwu Ịhụnanya nke Dị n’Obi Anyị

Iwu Ịhụnanya nke Dị n’Obi Anyị

“M ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka m ga-edekwasị ya dị ka n’akwụkwọ.”—JEREMAỊA 31:33.

1, 2. (a) Gịnị ka anyị ga-atụle ugbu a? (b) Olee otú Jehova si gosipụta onwe ya n’Ugwu Saịnaị?

N’ISIOKWU abụọ bu nke a ụzọ, anyị mụtara na mgbe Mozis si n’Ugwu Saịnaị rịdata, ìhè nke na-egosi ebube Jehova gbukepụrụ n’ihu ya. Anyị tụlekwara ihe Mozis kpudoro n’ihu. Ka anyị tụlezie ihe ya na ya nwere njikọ nke nwere ihe ọ pụtaara Ndị Kraịst taa.

2 Mgbe Mozis nọ n’elu ugwu ahụ, Jehova nyere ya ntụziaka. Ka ha zukọrọ n’ihu Ugwu Saịnaị, ụmụ Izrel hụrụ ihe àmà dị ebube nke ọnụnọ Chineke. “Ọtụtụ égbè eluigwe na àmụ̀mà dị, na igwe ojii dị arọ n’elu ugwu ahụ, na olu opi ike dị ike nke ukwuu; ndị Izrel nile ndị nọ n’ọmụma ụlọikwuu ha wee maa jijiji. . . . Ugwu Saịnaị nile na-akwụ anwụrụ, n’ihi na Jehova rịdakwasịrị ya n’ọkụ: anwụrụ ya wee kwụgoo dị ka anwụrụ nke oké ọkụ, ugwu ahụ nile wee maa jijiji nke ukwuu.”—Ọpụpụ 19:16-18.

3. Olee otú Jehova si nye Izrel Iwu Iri ahụ, gịnịkwa ka mba ahụ mesịrị ghọta?

3 Jehova gwara ndị ahụ okwu site n’ọnụ otu mmụọ ozi, ma nye ha ihe a bịara mara dị ka Iwu Iri ahụ. (Ọpụpụ 20:1-17) N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na iwu ndị a sitere n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Jehova dere iwu ndị ahụ ná mbadamba nkume—mbadamba nkume Mozis tiwasịrị mgbe ọ hụrụ ka ụmụ Izrel na-efe nwa ehi ọlaedo. Jehova deghachiri iwu ndị ahụ na nkume. Mgbe Mozis bu mbadamba nkume ndị ahụ rịdata na nke ugbu a, ìhè nwupụtara n’ihu ya. Mgbe nke a mere, mmadụ nile ghọtara na iwu ndị ahụ dị ezigbo mkpa.—Ọpụpụ 32:15-19; 34:1, 4, 29, 30.

4. Gịnị mere Iwu Iri ahụ ji dị oké mkpa?

4 E tinyere mbadamba nkume abụọ ahụ e dere Iwu Iri ahụ n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ e debere n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọikwuu ahụ, ma mesịa debe ya n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọ nsọ ahụ. Iwu ndị e dere na ha kwuru ụkpụrụ ndị bụ́ isi nke ọgbụgba ndụ Iwu Mozis ma bụrụ ihe Chineke ga-eji na-achị mba ahụ. Ha gosiri na Jehova na-emeso otu ndị a kapịrị ọnụ ihe, ndị a họpụtara ahọpụta.

5. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka iwu Chineke nyere Izrel si gosipụta ịhụnanya ya?

5 Iwu ndị a kpughere ọtụtụ ihe banyere Jehova, karịsịa ịhụnanya o nwere maka ndị ya. Lee onyinye dị oké ọnụ ahịa ha bụụrụ ndị na-erube isi na ha! Otu ọkà mmụta dere, sị: “Ọ dịtụbeghị iwu ụmụ mmadụ nyere tupu iwu iri ahụ Chineke nyere ma ọ bụ kemgbe e nyesịrị ya . . . nke pụrụ iyi ya, ka ọ fọkwa ịdị ka ya, ma ọ bụ ịka ya.” Jehova kwuru banyere Iwu Mozis n’ozuzu, sị: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karịa ndị nile: n’ihi na ọ bụ Mụ nwe ụwa nile: unu onwe unu ga-abụkwara m alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ.”—Ọpụpụ 19:5, 6.

Iwu E Dere n’Obi

6. Olee iwu bara uru karịa iwu ndị e dere na nkume?

6 Ee, iwu ndị a Chineke nyere bara uru nke ukwuu. Otú ọ dị, ị̀ maara na Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere iwu bara nnọọ uru karịa iwu ndị ahụ e dere na nkume? Jehova buru amụma banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke na-adịghị ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ o so mba Izrel gbaa. “M ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka m ga-edekwasị ya dị ka n’akwụkwọ.” (Jeremaịa 31:31-34) Jizọs, bụ́ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ejighị aka ya detuo iwu o nyere ụmụazụ ya. Ọ kụnyere iwu Jehova n’ime uche na obi ndị na-eso ụzọ ya site n’ihe ndị o kwuru ma mee.

7. Ole ndị ka e bu ụzọ nye “iwu nke Kraịst,” ole ndị mesịkwara nabata ya?

7 A kpọrọ iwu a “iwu nke Kraịst.” Ọ bụ mba ime mmụọ, “Izrel nke Chineke,” ka e bu ụzọ nye ya, ọ bụghị Izrel anụ ahụ́, bụ́ ndị sitere n’eriri Jekọb. (Ndị Galeshia 6:2, 16; Ndị Rom 2:28, 29) Ọ bụ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ mejupụtara Izrel nke Chineke. Ka oge na-aga, “oké ìgwè mmadụ” si ná mba nile, bụ́kwa ndị na-achọ ife Jehova, sonyeere ha. (Mkpughe 7:9, 10; Zekaraịa 8:23) Dị ka “otu ìgwè atụrụ” nọ n’okpuru “otu onye ọzụzụ atụrụ,” ìgwè abụọ ahụ na-anabata “iwu nke Kraịst,” na-ekwe ka ọ na-eduzi ihe nile ha na-eme.—Jọn 10:16.

8. Olee ọdịiche dị n’etiti Iwu Mozis na iwu nke Kraịst?

8 N’adịghị ka ndị Izrel anụ ahụ́, bụ́ ndị a mụrụ n’okpuru Iwu Mozis, Ndị Kraịst na-eji aka ha ahọrọ ịnọgide n’okpuru iwu Kraịst, ihe ndị dịkwa ka agbụrụ na ebe a mụrụ mmadụ adịghị emetụta ya. Ha na-amụ banyere Jehova na ụzọ ya ma na-enwe agụụ ime uche ya. N’ihi na iwu Chineke dị “n’ime ha,” bụrụ nke e dere “n’obi ha” n’ụzọ ihe atụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ adịghị erubere Chineke isi nanị n’ihi na o nwere ike ịta ha ahụhụ; ha adịghịkwa erubere ya isi nanị n’ihi na ọ bụ ọrụ dịịrị ha. E nwere ihe gbara ọkpụrụkpụ ma sie nnọọ ike karịa nke ahụ mere ha ji erubere ya isi, ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ na-erubekwara Chineke isi n’ihi na iwu ya dị n’obi ha.

Iwu Ndị Dabeere n’Ịhụnanya

9. Olee otú Jizọs si gosi na ịhụnanya bụ ihe pụtara ìhè n’iwu Jehova?

9 A pụrụ iji otu okwu kọwaa ihe bụ́ isi n’iwu nile nke Jehova: ịhụnanya. Nke a abụrụwo akụkụ dị mkpa nke ezi ofufe, ọ ga-anọgidekwa na-abụ akụkụ dị mkpa. Mgbe a jụrụ ya nke kachasị n’Iwu ahụ, Jizọs zara, sị: ‘Jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Nke abụọ bụ: ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ O kwuziri, sị: “N’ihe abụọ a e nyere n’iwu ka Iwu ahụ dum, nakwa akwụkwọ Ndị Amụma dabeere.” (Matiu 22:35-40) Jizọs si otú a gosi na ọ bụghị nanị Iwu ahụ nke Iwu Iri ahụ dị na ya dabeere n’ịhụnanya kamakwa Akwụkwọ Nsọ Hibru dum.

10. Olee otú anyị si mara na iwu nke Kraịst dabeere n’ịhụnanya?

10 Iwu ahụ dị n’obi Ndị Kraịst ọ̀ dabekwaara n’ịhụnanya maka Chineke na maka ndị agbata obi? Eenụ! Iwu nke Kraịst na-agụnye ịhụnanya sitere n’obi maka Chineke, ọ gụnyekwara iwu ọhụrụ—Ndị Kraịst ga-enwe ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà maka ibe ha. Ha ga na-ahụ ndị ọzọ n’anya dị ka Jizọs hụrụ ha, o jikwa obi ya nyefee ndụ ya maka ndị enyi ya. Ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ahụ Chineke nakwa ibe ha n’anya, dị nnọọ ka ọ hụrụ ha n’anya. Ịhụnanya pụtara ìhè ha nwere n’ebe ibe ha nọ bụ akara bụ́ isi e ji amata ezi Ndị Kraịst. (Jọn 13:34, 35; 15:12, 13) Jizọs kụzidịịrị ha ịhụ ndị iro ha n’anya.—Matiu 5:44.

11. Olee otú Jizọs si gosipụta ịhụnanya maka Chineke nakwa maka ihe a kpọrọ mmadụ?

11 Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè n’ịhụ ndị ọzọ n’anya. Dị ka nwa mmụọ siri ike nke nọ n’eluigwe, o ji obi ụtọ nabata ohere e nyere ya ime ka ọrụ Nna ya gaa n’ihu n’ụwa. E wezụga inyefe ndụ mmadụ ya ka ndị ọzọ nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi, o gosiri ndị mmadụ otú ha kwesịrị isi na-ebi ndụ. Ọ dị umeala n’obi, nwee obiọma, na-echebakwara ndị ọzọ echiche, na-enyere ndị a na-ebogbu n’ibu na ndị a na-emegbu emegbu aka. Ọ na-agwakwa ndị mmadụ “okwu nke ndụ ebighị ebi,” ike adịghị agwụ ya n’inyere ndị ọzọ aka ịmata Jehova.—Jọn 6:68.

12. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụnanya maka Chineke nakwa maka ndị agbata obi nwere njikọ chiri anya?

12 N’ezie, ịhụnanya maka Chineke na maka ndị agbata obi nwere njikọ chiri anya. Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ịhụnanya sitere na Chineke . . . Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo, sị: ‘Ahụrụ m Chineke n’anya,’ ma na-akpọkwa nwanna ya asị, ọ bụ onye ụgha. N’ihi na onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, apụghị ịdị na-ahụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụbeghị.” (1 Jọn 4:7, 20) Jehova bụ onye ịhụnanya sitere n’aka ya, bụrụkwa ịhụnanya n’onwe ya. Ịhụnanya na-achịkwa ihe ọ bụla ọ na-eme. Anyị na-ahụ n’anya n’ihi na e kere anyị n’onyinyo ya. (Jenesis 1:27) Mgbe anyị na-ahụ ndị agbata obi anyị n’anya, anyị na-egosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ.

Ịhụ n’Anya Pụtara Irube Isi

13. Ọ bụrụ na anyị ga-ahụ Chineke n’anya, gịnị ka anyị na-aghaghị ibu ụzọ mee?

13 Olee otú anyị pụrụ isi hụ Chineke n’anya, bụ́ onye anyị na-apụghị ịhụ anya? Ihe mbụ dị mkpa anyị ga-eme bụ ịmata ya. Anyị apụghị n’ezie ịhụ onye anyị na-amaghị n’anya ma ọ bụ tụkwasị ya obi. N’ihi ya, Okwu Chineke na-agba anyị ume ịmata Chineke site n’ịgụ Bible, ikpe ekpere, na site n’iso ndị maara ya ma hụ ya n’anya na-akpakọrịta. (Abụ Ọma 1:1, 2; Ndị Filipaị 4:6; Ndị Hibru 10:25) Oziọma anọ ndị ahụ bara uru karịsịa, n’ihi na ha na-ekpughe àgwà Jehova dị ka e gosipụtara ha ná ndụ na n’ozi Jizọs Kraịst. Ọchịchọ anyị irubere Chineke isi na iṅomi àgwà ya na-esikwu ike ka anyị na-amarakwu ya ma na-ekele ya maka ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ. Ee, ịhụnanya maka Chineke gụnyere irubere ya isi.

14. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na iwu Chineke adịghị arọ?

14 Mgbe anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya, anyị na-amata ihe ndị na-amasị ha na ihe ndị na-adịghị amasị ha, anyị na-ebukwa nke ahụ n’uche mgbe anyị na-emeso ha ihe. Anyị adịghị achọ imejọ ndị anyị hụrụ n’anya. Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) Ha adịghị arọ, ha adịghịkwa ọtụtụ. Ịhụnanya na-eduzi ihe anyị na-eme. Ọ dịghị anyị mkpa iburu ọtụtụ ụkpụrụ na iwu n’isi iji chịkwaa ihe ọ bụla anyị na-eme; ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-eduzi anyị. Iwu Chineke adịghị arọ, ijere ndị anyị hụrụ n’anya ozi na-ewetara anyị ọṅụ n’ezie. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, ime uche ya ga na-atọ anyị ụtọ. Anyị na-esi otú ahụ enweta ihu ọma Chineke ma na-abara onwe anyị uru, nduzi ya ana-abakwara anyị uru.—Aịsaịa 48:17.

15. Gịnị ga-akwali anyị iṅomi Jehova? Kọwaa.

15 Ịhụnanya maka Chineke na-akwali anyị iṅomi àgwà ya. Mgbe anyị hụrụ mmadụ n’anya, anyị na-enwe mmasị n’àgwà ya ma na-agbalị ịdị ka onye ahụ. Tụlee mmekọrịta dị n’etiti Jehova na Jizọs. Ha abụọ nọrọ n’eluigwe ikekwe ruo ọtụtụ ijeri afọ. Ha hụkwara onwe ha n’anya n’ụzọ miri emi. Jizọs yiri nnọọ Nna ya nke eluigwe n’ụzọ zuru ezu nke na ọ pụrụ ịgwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) Ka anyị na-amara Jehova na Ọkpara ya ma na-egosipụta ekele anyị nwere n’ebe ha nọ, a na-akwali anyị ịdị ka ha. Ịhụnanya anyị nwere maka Jehova, tinyekwara enyemaka nke mmụọ nsọ ya, ga-enyere anyị aka ‘iyipụ ụdị mmadụ ochie ahụ na omume ya, ma yikwasị onwe anyị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ.’—Ndị Kọlọsi 3:9, 10; Ndị Galeshia 5:22, 23.

Ịhụnanya Nọ n’Ọrụ

16. Olee otú anyị si egosipụta ịhụnanya maka Chineke na maka ndị agbata obi n’ọrụ nkwusa na izi ihe anyị?

16 Dị ka Ndị Kraịst, anyị na-ekwe ka ịhụnanya anyị nwere maka Chineke nakwa maka ndị agbata obi anyị na-akwali anyị ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ. Site n’ime nke a, anyị na-eme ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ, “onye ọ bụ uche ya ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:3, 4) N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ inweta obi ụtọ n’inyere ndị ọzọ aka ịbụ ndị e dere iwu nke Kraịst n’obi ha. Obi na-adịkwa anyị ụtọ ịhụ ka ha na-agbanwe àgwà ha iji na-egosipụta àgwà Jehova. (2 Ndị Kọrint 3:18) N’ezie, inyere ndị ọzọ aka ịmata Chineke bụ onyinye kasị oké ọnụ ahịa anyị pụrụ inye ha. Ndị kwere ka ha na Jehova bụrụ enyi pụrụ ịnụ ụtọ ọbụbụenyi a ruo mgbe nile ebighị ebi.

17. Gịnị mere o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya karị ịhụ ihe onwunwe n’anya?

17 Anyị bi n’ụwa ebe e ji ihe onwunwe kpọrọ oké ihe, ọbụna hụ ya n’anya. Ma, ihe onwunwe anaghị adịru ebighị ebi. A pụrụ izuru ha n’ohi ma ọ bụ ha emebie. (Matiu 6:19) Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:16, 17) Ee, Jehova ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi, otú ahụ ka ọ ga-adịkwa ndị hụrụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi. N’ihi nke a, ọ́ bụghị ihe amamihe dị na ya ịhụ Chineke na ndị mmadụ n’anya karịa ịchụso ihe nke ụwa, bụ́ nke na-agaghị adịte aka?

18. Olee otú otu onye ozi ala ọzọ si gosipụta ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà?

18 Ndị na-ahụ n’anya na-ewetara Jehova otuto. Tụlee ihe banyere Sonia, onye na-eje ozi ala ọzọ na Senegal. Ọ mụụrụ otu nwanyị aha bụ Heidi Bible, bụ́ onye butere nje HIV n’aka di ya na-ekweghị ekwe. Mgbe di ya nwụrụ, e mere Heidi baptizim, ma n’oge na-adịghị anya, ọ rịawara ọrịa AIDS, e nyekwara ya àkwà n’ụlọ ọgwụ. Sonia na-akọ, sị: “Ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ mere ike ha nile, ma ha dị ole na ole. A gwara ndị wepụtara onwe ha n’ọgbakọ ka ha gaa lekọta ya n’ụlọ ọgwụ. N’abalị nke abụọ, ehiri m n’ute a tọrọ n’akụkụ àkwà ya ma nye aka lekọta ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Dọkịta na-agwọ ya kwuru, sị: ‘Nsogbu kasị sie ike anyị na-enwe bụ na ọbụna ndị ikwu nke mmadụ na-agbahapụ ya mgbe ha matara na o nwere ọrịa AIDS. Olee ihe mere i ji kwere itinye onwe gị n’ihe ize ndụ ebe gị na ya na-abụghị nwanne, gị na ya esighị n’otu mba, unu enwedịghị otu ụcha akpụkpọ ahụ́?’ Akọwaara m ya na nye m, Heidi bụ nnọọ nwanne m nwanyị, dị nnọọ ka ọ̀ bụ otu nne na nna mụrụ anyị. Ebe m matarala nwanne m nwanyị ọhụrụ a, obi dị m ụtọ ilekọta ya.” Ọ dabara na ọ dịghị ihe mere Sonia n’ihi mgbalị o ji ịhụnanya tinye n’ilekọta Heidi.

19. Ebe iwu Chineke dị n’ime anyị, ohere dị aṅaa ka anyị kwesịrị iji mee ihe?

19 A pụrụ ịhụ ihe atụ nke ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà n’etiti ndị ohu Jehova nke oge a. E nweghị iwu e dere ede e ji amata ndị Chineke nke oge a. Kama nke ahụ, anyị na-ahụ mmezu nke ihe e dere ná Ndị Hibru 8:10: “‘Nke a bụ ọgbụgba ndụ nke mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị,’ ka Jehova na-asị. ‘M ga-etinye iwu m n’uche ha, n’ime obi ha ka m ga-edekwa ha. M ga-abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.’” Ka anyị jiri iwu ịhụnanya nke Jehova dere n’obi anyị kpọrọ ihe mgbe nile, na-eji ohere ọ bụla anyị nwere egosipụta ịhụnanya.

20. Gịnị mere iwu nke Kraịst ji bụrụ ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa?

20 Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ iso òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ bụ́ ndị na-egosipụta ịhụnanya dị otú a na-ejere Chineke ozi! Ndị nwere iwu nke Kraịst n’obi ha nwere ihe dị oké ọnụ ahịa n’ụwa a nke ịhụnanya kọrọ. Ọ bụghị nanị na Jehova hụrụ ha n’anya, kamakwa ịhụnanya siri ike nke kekọrọ ha na òtù ụmụnna ha na-eme ha obi ụtọ. “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!” Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova bi n’ọtụtụ mba, na-asụ ọtụtụ asụsụ, nweekwa ọtụtụ ọdịbendị, ha nwere ịdị n’otu okpukpe na-enweghị atụ. Ịdị n’otu a na-eweta ihu ọma Jehova. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “N’ebe ahụ [n’etiti ndị ịhụnanya jikọtara] ka Jehova nyere ngọzi ahụ iwu, bụ́ ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 133:1-3.

Ị̀ Pụrụ Ịza?

• Olee otú Iwu Iri ahụ dịruru ná mkpa?

• Olee iwu e dere n’obi?

• Olee òkè ịhụnanya na-ekere ‘n’iwu nke Kraịst’?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya anyị nwere maka Chineke nakwa maka ndị agbata obi anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 25]

Ụmụ Izrel nwere iwu ndị e dere ná mbadamba nkume

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ndị Kraịst nwere iwu Chineke n’obi ha

[Foto dị na peeji nke 28]

Sonia na nwata nwanyị onye Senegal ná mgbakọ distrikti nke 2004