Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpamkpa Ọnwụ Na-akpa

Mkpamkpa Ọnwụ Na-akpa

Mkpamkpa Ọnwụ Na-akpa

“NWATA DỊ AFỌ ISII EGBUO ONWE YA.” Ihe a na-awụ akpata oyi n’ahụ́ bụ́ nke gbara n’isi akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ na-ekwu banyere ọnwụ na-agbawa obi nke otu nwata nwanyị aha ya bụ Jackie. Ọ dịbeghị anya ọrịa na-egbu egbu gburu mama ya. Tupu Jackie agbabara ụgbọ okporo ígwè, ọ gwara ụmụnne ya na ya chọrọ ‘ịghọ mmụọ ozi ma nọnyere mama ya.’

Ian dị afọ 18 mgbe ọ rịọrọ ụkọchukwu ya ka ọ kọwaara ya ihe mere ọrịa cancer ji gbuo papa ya. Ụkọchukwu ahụ kwuru na ebe ọ bụ na papa Ian bụ ezigbo mmadụ, Chineke chọrọ ya n’eluigwe. Mgbe Ian nụsịrị nkọwa ahụ, o kpebiri na ya achọghị ịma onye Chineke dị otú ahụ obi tara mmiri bụ. Ebe ọ bụ na ndụ yiri ihe na-enweghị nnọọ nzube, Ian kpebiri ibi ndụ ihe ụtọ. Iji mezuo nke ahụ, o mikpuru onwe ya n’ịṅụ mmanya na-aba n’anya, jiri ọgwụ ọjọọ na-eme ihe ma na-eme omume rụrụ arụ. Ọ fọrọ nke nta ka ọ gharazie ịchịkwali ndụ ya.

“Ndị Dị Ndụ Maara na Ha Ga-anwụ”

Ọdachi abụọ ahụ na-agbawa obi na-egosi otú ọnwụ pụrụ isi bibie ndụ ndị mmadụ, karịsịa ma ọ bụrụ na mmadụ anwụchuo ọnwụ. N’ezie, mmadụ nile maara eziokwu a dị na Bible: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ.” (Eklisiastis 9:5) Ma ọtụtụ ndị na-ahọrọ ileghara eziokwu a dị mwute anya. Olee maka gị? Anyị na-eji nnọọ ọrụ n’aka ná ndụ nke na anyị pụrụ ịkwụsị iche banyere ọnwụ bụ́ nke na-eyi ihe ka dị anya.

Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-atụ egwu ọnwụ ma na-agbalị izere iche banyere ya.” Otú ọ dị, nnukwu ihe mberede ma ọ bụ ọrịa na-egbu egbu nwere ike ime ka anyị chewe banyere ọnwụ. Ma ọ bụkwanụ, olili nke enyi ma ọ bụ onye ikwu anyị echetara anyị n’ụzọ dị mwute ihe na-echere ihe nile a kpọrọ mmadụ.

N’agbanyeghị nke ahụ, ndị na-eru újú n’ebe a na-eli ozu na-ekwukarị ihe dị ka, “Ndụ ga na-aga n’ihu.” Ya ana-agakwanụ. N’eziokwu, ndụ pụrụ iyi ka ọ̀ na-apụ n’anya ngwa ngwa nke na n’oge na-adịghị anya, mmadụ aghaghị iche nsogbu nke ime agadi ihu. Mgbe ahụ, ọnwụ na-anọzi nso. A na-enwe nnọọ ọtụtụ olili ozu a ga-aga, na-enwekwa ọtụtụ ọnwụ nke ndị enyi a ga-edi. Ajụjụ bụ́ “Ònye ma mgbe nke m ga-abụ?” na-enye ọtụtụ ndị agadi nsogbu n’obi.

Oké Ihe Mgbagwoju Anya

Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye na-ajụ ma mmadụ ọ̀ na-anwụkwa anwụ, ihe na-eme mgbe mmadụ nwụsịrị pụrụ ịbụ oké ihe mgbagwoju anya. Ọtụtụ nkọwa na-emegide onwe ha a na-enye pụrụ ime ka onye nwere obi abụọ were ha dị ka ịchọ ịmata ihe mmadụ na-apụghị ịmata amata. Onye na-ele ihe anya otú ọ dị pụrụ ikwubi na ebe ọ bụ na “a naghị adị ndụ ugboro abụọ,” mmadụ kwesịrị ịnụ ụtọ ihe ọma nke ndụ ruo n’ókè o kwere ya mee.

Ndị ọzọ kwanụ na-ajụ ikwere na ọ bụ n’ọnwụ ka ihe nile biri. Ka o sina dị, ha amachaghị ihe na-eme mgbe mmadụ nwụsịrị. Ụfọdụ na-eche na ha ga-adịrị ndụ gaa n’ihu n’obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi n’ebe nsogbu na-adịghị, ebe ndị ọzọ na-eche na ha ga-adị ndụ ọzọ n’ọdịnihu, eleghị anya dị ka onye ọzọ.

Ndị mmadụ nwụnahụrụ na-ajụ onwe ha mgbe nile, sị, “Olee ebe ndị nwụrụ anwụ nọ?” Afọ ole na ole gara aga, ndị so n’otu òtù egwuregwu bọl ụkwụ nọ na-aga ebe ha ga-anọ gbaa bọl mgbe otu nnukwu ụgbọala kụbara obere bọs ha ọhịa. Mmadụ ise n’ime ha nwụrụ. Kemgbe ụbọchị ahụ nwa otu nwanyị nwụrụ n’ihe mberede ahụ, ndụ ya adịbeghịkwa otú ọ dịbu. Ọ na-achọ ịmata ebe nwa ya nwoke nọ. Ọ na-aga n’ili ya mgbe nile ma na-agwa ya okwu n’olu dara ụda ruo ọtụtụ awa. Ọ kwara arịrị, sị: “Apụghị m nnọọ ikweta na ihe nile na-ebi mgbe mmadụ nwụrụ, ma ejighị m ya n’aka.”

O doro anya na otú anyị si ele ọnwụ anya pụrụ imetụta ndụ anyị ugbu a. N’ihi ihe ndị mmadụ na-eme mgbe mmadụ nwụrụ, ọtụtụ ajụjụ na-ebilite. Tụlee otú ị ga-esi zaa ha. Ànyị kwesịrị ichefu banyere ịnwụ anwụ ma lekwasị anya n’ịdị ndụ? Ànyị kwesịrị ikwe ka egwu ọnwụ bibie ndụ anyị? Onye onye ikwu ya nwụnahụrụ ọ̀ ga-anọgide na-eche ebe onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ anwụ nọ? Ọnwụ ọ̀ ga-anọgide na-abụ ihe omimi?