Ịtachi Obi Dị Ka Onye Agha nke Kraịst
Akụkọ Ndụ
Ịtachi Obi Dị Ka Onye Agha nke Kraịst
DỊ KA YURII KAPTOLA SI KỌỌ
“Ugbu a ka o doro m anya na i nwere okwukwe n’ezie!” Okwu a sitere n’ọnụ onye m na-atụghị anya na ọ ga-ekwu ihe dị otú ahụ— onye agha nke mba Soviet—okwu ya gbakwara m ume n’oge agbamume dị m nnọọ mkpa. N’oge ahụ, a mara m ikpe ịnọ n’ụlọ mkpọrọ ruo ọtụtụ afọ, arịọsikwara m Jehova arịrịọ ike maka nkwado. Anọ m na-enwe ihe isi ike nke ga-adịte aka, bụ́ nke chọrọ ndidi na mkpebi siri ike.
AMỤRỤ m n’October 19, 1962. Anọkwa m n’ebe ọdịda anyanwụ Ukraine too. N’otu afọ ahụ, papa m, onye aha ya bụkwa Yurii, zutere Ndịàmà Jehova. N’oge na-adịghị anya, ọ ghọrọ onye mbụ na-efe Jehova n’obodo anyị. Ndị isi ọchịchị, bụ́ ndị na-emegide Ndịàmà Jehova, bịara mata banyere ihe ndị ọ na-eme.
Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị agbata obi anyị na-akwanyere ndị mụrụ m ùgwù n’ihi àgwà Ndị Kraịst ha nwere nakwa n’ihi nchegbu ha nwere maka ndị ọzọ. N’oge anyị dị obere, ndị mụrụ m jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ kụnye ịhụnanya maka Chineke n’ime obi m nakwa n’ime obi ụmụnne m ndị nwanyị atọ, nke ahụ nyekwaara m aka iche ọtụtụ ihe ịma aka ndị m zutere n’ụlọ akwụkwọ ihu. Otu n’ime ihe ịma aka dị otú ahụ bilitere mgbe e kwuru ka nwa akwụkwọ nke ọ bụla tinye baajị na-egosi na o so n’òtù Lenin guzobere, bụ́ nke a na-akpọ October Children. N’ihi ịbụ onye nọpụrụ iche dị ka Onye Kraịst, etinyeghị m baajị ahụ, n’ihi ya kwa, agbapụrụ m iche.—Jọn 6:15; 17:16.
Ka e mesịrị, mgbe m nọ n’elementrị nke atọ, e kwuru ka ụmụ akwụkwọ nile sonye
n’òtù ndị ntorobịa nke ọchịchị Kọmunist guzobere, bụ́ nke a na-akpọ Young Pioneers. Otu ụbọchị, a kpọpụtara klas anyị n’èzí ụlọ akwụkwọ ka anyị debanye aha anyị n’òtù ahụ. Atụrụ m egwu, na-atụ anya na a ga-akwa m emo ma baara m mba. Onye ọ bụla, ma e wezụga m, wetara ákwà uhie ọhụrụ ya nke ndị òtù ahụ na-eke n’olu, ụmụ akwụkwọ ahụ kwụrụ n’ahịrị dị ogologo n’ihu onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị, ndị nkụzi, na ụmụ akwụkwọ ndị nọ na klas ka elu. Mgbe a gwara ụmụ akwụkwọ ndị ahụ nọ na klas ka elu ka ha kee ákwà ahụ n’olu anyị, ehulatara m isi m, na-enwe olileanya na ha ga-eleghara m anya.A Kpọga M n’Ụlọ Mkpọrọ Dị Anya
Mgbe m dị afọ 18, a tụrụ m mkpọrọ afọ atọ maka ịnọpụ iche dị ka Onye Kraịst. (Aịsaịa 2:4) N’afọ nke mbụ, anọrọ m n’ụlọ mkpọrọ dị n’obodo bụ́ Trudovoye, nke dị n’Ógbè Vinnitskaya nke Ukraine. Mgbe m nọ n’ebe ahụ, ezutere m ihe dị ka Ndịàmà Jehova iri atọ ndị ọzọ. E kere anyị abụọ abụọ ma nye anyị ọrụ dịgasị iche iche, ebe ọ bụ na ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụ chọrọ igbochi anyị iso ibe anyị na-akpakọrịta.
N’August 1982, e ji ụgbọ okporo ígwè, nke e jikwa mere ụlọ mkpọrọ, buga mụ na Eduard, bụ́ Onyeàmà ọzọ, na otu ìgwè nke ndị mkpọrọ ndị ọzọ n’ebe ugwu nke Ugwu Ural. Anyị nọgidere na-edi oké okpomọkụ n’ime ụgbọ okporo ígwè ahụ na-akpa nnọọ akpa ruo ụbọchị asatọ, bụ́ oge o were anyị iru Ụlọ Mkpọrọ dị na Solikamsk, bụ́ nke dị n’Ógbè Permskaya. E tinyere m n’otu ụlọ mkpọrọ ma tinye Eduard n’ụlọ mkpọrọ ọzọ. Ka izu abụọ gasịrị, a kpọọrọ m gbagokwuo n’ebe ugwu ruo mgbe anyị ruru Vels, nke dị n’ógbè Krasnovishersky.
Ụgbọ bu anyị rutere n’etiti abalị, ezigbo ọchịchịrị gbakwara. N’agbanyeghị ọchịchịrị ahụ, otu onye soja nyere ìgwè anyị iwu ka anyị jiri ụgbọ epeepe gafee otu osimiri. Ma osimiri ahụ ma ụgbọ epeepe ahụ adịghị nke ọchịchịrị kwere anyị hụ! N’agbanyeghị nke ahụ, anyị dịdaara aka chọta otu ụgbọ epeepe, n’agbanyeghịkwa egwu ji anyị, anyị jisiri ike gafee osimiri ahụ. Ozugbo anyị gafesịrị osimiri ahụ, anyị gawara n’ebe anyị hụrụ ọkụ na-acha n’ugwu dị nso, bụ́ ebe anyị hụrụ ụlọ ntu ole na ole. Nke a gaje ịbụ ebe obibi ọhụrụ anyị. Ụlọ ntu nke mụ na ndị mkpọrọ iri atọ ndị ọzọ biri na ya buturu ibu karịa ndị ọzọ. N’oge oyi, ezigbo oyi tụrụ anyị, mgbe ụfọdụkwa, ọ na-akarị ọ̀tụ̀tụ̀ nke na-eme ka ihe kpụkọọ. Ụlọ ntu ahụ emeghịkwa ka ọnọdụ ahụ ka mma. Ọrụ bụ́ isi ndị mkpọrọ ahụ rụrụ bụ igbutu osisi, ma ọrụ nke m bụ ịrụrụ ndị mkpọrọ ahụ ụlọ ata.
Nri Ime Mmụọ Erute n’Ebe Dịpụrụ Adịpụ Anyị Bi
Ọ bụ nanị m bụ Onyeàmà n’ebe ahụ anyị bi; ma Jehova agbahapụghị m. Otu ụbọchị, mama m, bụ́ onye ka bi n’ebe ọdịda anyanwụ Ukraine, ziteere m otu ngwugwu. Mgbe onye nche mepere ngwugwu ahụ, ihe mbụ ọ hụrụ bụ obere Bible. O welitere ya ma malite ịsahe ya. Agbalịrị m iche ihe m ga-ekwu nke ga-eme ka a ghara ijichi akụ̀ ime mmụọ a dị oké ọnụ ahịa. “Ihe a ọ̀ bụ gịnị?” ka onye nche ahụ jụrụ na mberede. Tupu m na-echeta ihe m ga-aza, onye soja nke guzo nso ebe ahụ zara, sị: “Oo! Ọ bụ akwụkwọ ọkọwa okwu.” Ekwughị m ihe ọ bụla. (Eklisiastis 3:7) Onye soja ahụ nyochara ngwugwu ahụ dum ma nyeghachi m ya na Bible ahụ dị oké ọnụ ahịa. Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu nke na m weere ụfọdụ n’ime ihe ndị dị ná ngwugwu ahụ nye ya. Mgbe m nwetara ngwugwu a, amatara m na Jehova echezọbeghị m. O nyeere m aka ma gbooro m mkpa ime mmụọ m.—Ndị Hibru 13:5.
Ime Nkwusa n’Esepụghị Aka
Ọnwa ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, ọ tụrụ m n’anya mgbe m natara akwụkwọ ozi sitere n’aka otu nwanna nwoke a tụrụ mkpọrọ n’ebe dị ihe dị ka narị kilomita anọ. Ọ gwara m ka m chọọ otu nwoke nke gosiburu mmasị, bụ́ onye e nwere ike ya abụrụ na ọ nọ n’ogige anyị ugbu a. Amamihe adịghị n’ide Ọrụ 4:20) Onye soja ahụ ghọtara na ya apụghị imenye m egwu, n’ihi ya, o kpebiri ịkpọpụ m n’ogige ahụ. E zigara m n’ogige ọzọ.
akwụkwọ ozi dị otú ahụ kpọrọ okwu aha, n’ihi na a na-enyocha akwụkwọ ozi anyị enyocha. Dị ka m tụrụ anya ya, otu n’ime ndị na-elekọta ndị mkpọrọ kpọrọ m n’ọfịs ya ma dọsie m aka ná ntị ike ka m ghara ime nkwusa. O nyeziri m iwu ka m bịanye aka n’akwụkwọ nke na-ekwu na m ga-akwụsị ịgwa ndị ọzọ ihe m kweere. Agwara m ya na m ghọtaghị ihe mere m ga-eji bịanye aka n’akwụkwọ dị otú ahụ, ebe ọ bụ na onye ọ bụla amaralarị na m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ekwuru m na ndị mkpọrọ ndị ọzọ chọrọ ịma ihe mere e ji tụọ m mkpọrọ. Gịnị ka m ga-agwa ha? (A kpọfere m n’obodo nta bụ́ Vaya, nke dị narị kilomita abụọ site n’ebe m nọbu. N’ebe ahụ, ndị na-elekọta ọrụ kwanyeere mkpebi m mere dị ka Onye Kraịst ùgwù ma kenye m ọrụ na-emetụtaghị agha—nke mbụ ha kenyere m ọrụ ịkwa nkà, e mesịa ha ekenye m ọrụ imezi ọkụ eletrik. Ma ọrụ ndị a nwekwara ihe ịma aka nke ha. N’otu oge, a gwara m ka m buru ngwá ọrụ ma gaa n’ụlọ ezumezu dị n’ime obodo. Mgbe m rutere ebe ahụ, ndị soja nọ n’ụlọ ezumezu ahụ nwere obi ụtọ ịhụ m. O siiri ha ike ịrụzi ọkụ ndị e ji chọọ ihe nnọchianya ndị agha ndị dị n’ebe ahụ mma. Ha chọrọ ka m nyere ha aka mezie ihe ụfọdụ n’ihi na ha na-akwadebe maka ememe Red Army Day. Mgbe m kpesịrị ekpere ma chebara ihe m ga-eme echiche, agwara m ha na apụghị m ịrụ ụdị ọrụ ahụ. Enyere m ha ngwá ọrụ m ma lawa. Ha kọọrọ osote onyeisi ihe m mere, ọ tụkwara m n’anya mgbe ọ ṅachara ntị n’ihe ndị ha kwuru megide m, ma kwuo, sị: “Ana m akwanyere ya ùgwù maka nke ahụ. Ọ bụ nwoke nwere ụkpụrụ.”
Agbamume Site n’Aka Onye M Na-atụghị Anya Ya
Na June 8, 1984, mgbe a kpọchisịrị m ruo kpọmkwem afọ atọ, a tọhapụrụ m. Mgbe m laghachiri Ukraine, edebanyere m aha n’aka ndị agha dị ka onye bụ́bu onye mkpọrọ. Ndị isi ha gwara m na a ga-ekpe m ikpe ọzọ n’ime ọnwa isii nakwa na ọ ga-akara m mma isi n’ógbè ahụ pụọ kpamkpam. N’ihi ya, ahapụrụ m Ukraine ma mesịa chọta ọrụ na Latvia. Ruo oge ụfọdụ, esonyeere m otu obere ìgwè Ndịàmà bi na Riga, bụ́ isi obodo ahụ, mee nkwusa na Riga nakwa gburugburu ya. Otú ọ dị, mgbe nanị otu afọ gasịrị, e nyere m iwu ọzọ ka m jee agha. N’ọfịs ebe a na-edebanye aha ndị ga-aga agha, agwara m onye soja na-arụ n’ebe ahụ na m ajụbuola ịga agha. O ji oké olu kwuo, sị: “Ị̀ makwa ihe ị na-eme? Ka m hụgodị ihe ị ga-agwa onyeisi!”
O duuru m banye n’otu ime ụlọ dị n’okpukpu ụlọ nke abụọ, bụ́ ebe onyeisi ha nọ n’ogologo tebụl. O gere nnọọ ntị ka m na-akọwara ya mkpebi m, ọ gwaziri m na m ka nwere oge iji tụleghachi mkpebi m tupu a kpọga m n’ihu kọmitii na-ahụ maka idebanye aha ndị ga-aga agha. Ka anyị na-apụ n’ọfịs onyeisi ha, onye soja ahụ nke baara m mba na mbụ kwuru, sị: “Ugbu a ka o doro m anya na i nwere okwukwe n’ezie!” Mgbe m gara n’ihu kọmitii ndị agha, ekwughachiri m na m achọghị ịga agha, ha hapụrụ m ka m lagodị.
N’oge ahụ, ebi m n’ụlọ gọọmenti na-enye ndị na-enweghị ụlọ. N’otu uhuruchi, anụrụ m obere aka a kụrụ n’ọnụ ụzọ. Emeghere m ya ma hụ otu nwoke kpọ kootu ma buru akpa. Ọ kọwara onwe ya, sị: “Esi m n’Ụlọ Ọrụ Ndị Nchebe Obodo. Ama m na ihe na-esiri gị ike nakwa na a na-aga ikpe gị ikpe n’ụlọikpe.” “Ee, ọ bụ eziokwu,” ka m zaghachiri. Nwoke ahụ gara n’ihu kwuo, sị: “Anyị pụrụ inyere gị aka ma ọ bụrụ na i kwere iso anyị rụkọọ ọrụ.” “Ee e, agaghị m emeli ya,” ka m kwuru. “Agaghị m ahapụ ihe ndị m kweere dị ka Onye Kraịst.” Ọ hapụrụ m pụọ, n’emeghị mgbalị ọ bụla ọzọ ime ka m kweta iso ha rụkọọ ọrụ.
A Tụọ M Mkpọrọ Ọzọ, Nkwusa Ebirikwa Ọkụ
N’August 26, 1986, Ụlọikpe Etiti nke dị na Riga mara m ikpe ịrụ ọrụ mmanye ruo afọ anọ, a kpọgakwara m n’Ụlọ Mkpọrọ Etiti nke dị na Riga. Ha tinyere mụ na ndị mkpọrọ iri anọ ndị ọzọ n’ụlọ mkpọrọ buru ibu, agbalịkwara m ikwusara onye mkpọrọ nke ọ bụla nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ ozi ọma. Ụfọdụ kwuru na ha kweere na Chineke; ndị ọzọ chịrị nanị ọchị. Achọpụtara m na a chịkọtara ndị mmadụ n’ìgwè n’ìgwè, mgbe izu abụọ gasịkwara, ndị ndú nke ìgwè ndị a gwara m na m ekwesịghị ime nkwusa, ebe ọ bụ na m agbasoghị iwu ha a na-edeghị ede. Akọwaara m ha na a tụrụ m mkpọrọ maka otu ihe ahụ—ọ bụ iwu dị iche na-eduzi m.
Anọgidere m jiri akọ na-eme nkwusa, mgbe m chọtakwara ụfọdụ ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, a mụụrụ m anọ n’ime ha Bible. Mgbe anyị na-enwe nkwurịta okwu, ha na-edetu ozizi ndị bụ́ isi nke Bible n’akwụkwọ. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, a kpọgara m n’ogige nwere ihe ndị e ji eche nche bụ́ ọkpọka nke dị na Valmiera, bụ́ ebe m rụrụ ọrụ dị ka onye na-emezi ngwá ọkụ eletrik. N’ebe ahụ, a mụụrụ m onye ọzọ na-emezi ngwá ọkụ eletrik Bible, bụ́ onye mesịrị ghọọ Onyeàmà Jehova mgbe afọ anọ gasịrị.
Na March 24, 1988, e si n’ogige ahụ nwere ihe ndị e ji eche nche bụ́ ọkpọka kpọga m n’ebe dị nso ndị mmadụ bi. Nke a bụụrụ m ezi ngọzi, ebe ọ bụ na o mere ka m nwerekwuo onwe m. E kenyere m ọrụ n’ebe dị iche iche a na-ewu ihe owuwu, anọgidekwara m na-achọta ohere iji mee nkwusa. Ọtụtụ mgbe, m na-apụ n’ogige ahụ, na-eme nkwusa ruo n’uhuruchi, ma ọ dịghị mgbe ọ bụla m nwere ihe isi ike mgbe m lọtara.
Jehova gọziri mgbalị m. Ndịàmà ole na ole bi n’ebe ahụ, ma n’obodo ahụ n’onwe ya, ọ bụ nanị otu nwanna nwanyị meworo agadi, nke aha ya bụ Vilma Krūmin̗a, bụ Onyeàmà nọ na ya. Mụ na nwanna nwanyị Krūmin̗a malitere iduziri ọtụtụ ndị na-eto eto ọmụmụ Bible. Site n’oge ruo n’oge, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-esi Riga abịa ime nkwusa, ọbụna ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ oge nile na-esi Leningrad (nke bụ́ St. Petersburg ugbu a) abịa. Site n’enyemaka Jehova, anyị malitere ọtụtụ ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya, amalitere m ozi ọsụ ụzọ, na-etinye awa iri itoolu kwa ọnwa n’ọrụ nkwusa.
N’April 7, 1990, e welitere okwu banyere m n’ụlọikpe People’s Court dị na Valmiera ka a tụleghachi ya. Mgbe a malitere ịnụrụ ikpe ahụ, akọtara m onye wepụtara okwu ahụ n’ụlọikpe. Ọ bụ nwa okorobịa mụ na ya nweworo nkwurịta okwu na Bible! Ọ kọtara m ma mụmụọ ọnụ ọchị n’ekwughị ihe ọ bụla. M ka na-echeta ihe ọkàikpe gwara m n’ụbọchị ahụ a na-ekpe ikpe ahụ: “Yurii, mkpebi e mere ịtụ gị mkpọrọ afọ anọ gara aga megidere iwu. Ha ekwesịghị ịma gị ikpe.” Tupu m mara ihe na-aganụ, enwerela m onwe m!
Onye Agha nke Kraịst
Na June 1990, ọ bịakwara dị mkpa ọzọ ka m debanye aha n’ọfịs na-ahụ maka ideba aha ndị agha iji nweta akwụkwọ ikike maka ibi na Riga. Abanyekwara m n’otu ọfịs ahụ ma hụ otu ogologo tebụl ahụ bụ́ ebe m nọ gwa onyeisi ndị agha ahụ afọ anọ gara aga na agaghị m
aga agha. Na nke ugbu a, o biliri ọtọ ma kelee m, kwee m n’aka, ma kwuo, sị: “Ọ dị mwute na e mere gị ihe a nile. O wutere m na o si otú ahụ mee.”Azaghachiri m, sị: “Abụ m onye agha nke Kraịst, aghaghịkwa m ịrụzu ọrụ e nyere m. Site n’enyemaka nke Bible, gị onwe gị kwa ga-enweta ihe Kraịst kwere ụmụazụ ya ná nkwa—ndụ obi ụtọ na ọdịnihu ebighị ebi.” (2 Timoti 2:3, 4) Onyeisi ndị agha ahụ zaghachiri, sị: “Ọ dịbeghị anya m zụrụ Bible, ana m agụkwa ya ugbu a.” Eji m akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. * Asapetara m isiakwụkwọ nke na-ekwu banyere ihe ịrịba ama nke mgbe ikpeazụ ma gosi ya otú amụma Bible si metụta oge anyị. Onyeisi ndị agha ahụ ji nnọọ nkwanye ùgwù kwee m n’aka ọzọ ma sị ya gaziere m.
Ka ọ na-erule ugbu a, ubi achawo n’ezie maka owuwe ihe ubi na Latvia. (Jọn 4:35) N’afọ 1991, amalitere m ije ozi dị ka okenye ọgbakọ. E nwere nanị ndị okenye abụọ a họpụtara ahọpụta ná mba ahụ dum! Mgbe otu afọ gasịrị, e kewara nanị otu ọgbakọ e nwere na Latvia ụzọ abụọ—otu na-asụ asụsụ Latvia nke ọzọ ana-asụkwa Russian. Enwere m ihe ùgwù nke ije ozi n’ọgbakọ nke na-asụ Russian. Uto ya dị nnọọ ngwa nke na n’afọ na-esonụ, e kewara ọgbakọ anyị ụzọ atọ! N’ileghachi anya azụ, o doro anya na Jehova n’onwe ya na-edubata atụrụ ya n’ọgbakọ ya.
N’afọ 1998, a họpụtara m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche na Jelgava, bụ́ obodo dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Riga, nke dịkwa kilomita 40 site na Riga. N’otu afọ ahụ, aghọrọ m otu n’ime ndị mbụ si Latvia a kpọrọ òkù ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi e duziri n’asụsụ Russian n’obodo Solnechnoye, nke dị nso na St. Petersburg, Russia. Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, abịara m ghọta otú ọ dịruru mkpa inwe ịhụnanya n’ebe ndị mmadụ nọ iji nwee ihe ịga nke ọma n’ozi. Ihe masịrị m karịa ihe ndị a kụziiri anyị n’ụlọ akwụkwọ bụ ịhụnanya ezinụlọ Betel na ndị nkụzi ụlọ akwụkwọ ahụ gosiri n’ebe anyị nọ, na otú ha si chebara anyị echiche.
Ihe ọzọ dị ịrịba ama mere ná ndụ m n’afọ 2001 bụ́ mgbe m lụrụ Karina, bụ́ ezigbo nwanyị bụ́ Onye Kraịst. Karina sonyeere m n’ozi oge nile pụrụ iche, kwa ụbọchị, ịhụ nwunye m ka o ji obi ụtọ si n’ozi na-alọta na-enye m agbamume. N’ezie, ijere Jehova ozi na-enye nnọọ ọṅụ. Ihe isi ike m zutere n’oge ọchịchị Kọmunist kụziiri m ịtụkwasị ya obi kpamkpam. Ọ dịghị ihe ọ bụla nke onye chọrọ ka ya na Jehova nọgide na-abụ enyi nakwa nke chọrọ ịnọgide na-akwado ọbụbụeze ya ga-achụ n’àjà ya abụrụ na ọ karịrị akarị. Inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova emewo ka ndụ m nwee nzube. Ọ bụworo m ihe ùgwù dị ukwuu ijere Jehova ozi “dị ka ezi onye agha nke Kraịst.”—2 Timoti 2:3.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 29 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.
[Foto dị na peeji nke 10]
A mara m ikpe ịrụ ọrụ mmanye ruo afọ anọ, ọ bụkwa n’Ụlọ Mkpọrọ Etiti dị na Riga ka a tụrụ m mkpọrọ
[Foto dị na peeji nke 12]
Ka mụ na Karina nọ n’ozi