Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ihe mere a ga-eji kwuo na nkebi ahịrịokwu ndị bụ́ “onye nanị ya nwere anwụghị anwụ” nakwa “onye ọ na-adịghị otu onye n’ime ụmụ mmadụ hụworo ma ọ bụ pụrụ ịhụ,” na-ekwu banyere Jizọs kama ịbụ banyere Jehova Chineke?

Pọl onyeozi dere, sị: “Mpụta ìhè a ka onye obi ụtọ ahụ na onye nanị ya bụ Eze Ukwu ga-egosi n’oge a kara aka nke ya, onye bụ́ Eze nke ndị na-achị achị dị ka ndị eze na Onyenwenụ nke ndị na-achị achị dị ka ndị nwenụ, onye nanị ya nwere anwụghị anwụ, onye bi n’ìhè a na-apụghị iru nso, onye ọ na-adịghị otu onye n’ime ụmụ mmadụ hụworo ma ọ bụ pụrụ ịhụ.”—1 Timoti 6:15, 16.

Ndị na-akọwa Bible echegidela nke a ma jụọ, sị: ‘Olee otú nkebi ahịrịokwu ndị bụ́ “onye nanị ya nwere anwụghị anwụ,” “onye nanị ya bụ Eze Ukwu,” na “onye ọ na-adịghị otu onye n’ime ụmụ mmadụ hụworo ma ọ bụ pụrụ ịhụ,” pụrụ isi na-ezo aka n’onye ọzọ ma ọ bụghị Onye pụrụ ime ihe nile?’ N’ezie, a pụrụ iji okwu ndị dị otú ahụ kọwaa Jehova. Otú ọ dị, ihe ndị gbara 1 Timoti 6:15, 16 gburugburu na-egosi na Pọl nọ na-ekwu kpọmkwem banyere Jizọs.

Ná ngwụsị nke amaokwu nke 14, Pọl kwuru banyere “mpụta ìhè nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” (1 Timoti 6:14) N’ihi ya, mgbe Pọl dere n’amaokwu nke 15 na “mpụta ìhè a ka onye obi ụtọ ahụ na onye nanị ya bụ Eze Ukwu ga-egosi n’oge a kara aka nke ya,” ọ na-ekwu banyere mpụta ìhè nke Jizọs, ọ bụghị nke Jehova Chineke. Ònyezi bụ “onye nanị ya bụ Eze Ukwu”? O yiri ka ezi uche ọ̀ dị n’ikwubi na Jizọs bụ Eze Ukwu ahụ Pọl kwuru banyere ya. N’ihi gịnị? Ihe ndị gbara okwu ahụ gburugburu na-eme ka o doo anya na Pọl ji Jizọs na-atụnyere ndị ọchịchị bụ́ mmadụ. Jizọs bụ n’ezie, dị ka Pọl dere, “Eze nke [mmadụ] ndị na-achị dị ka ndị eze na Onyenwenụ nke [mmadụ] ndị na-achị dị ka ndị nwenụ.” * N’ezie, e jiri Jizọs tụnyere ha, Jizọs bụ onye “nanị ya bụ Eze Ukwu.” E nyewo Jizọs “ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya.” (Daniel 7:14) Ọ dịghị eze bụ́ mmadụ nke pụrụ ikwu na ya nwere ihe ndị ahụ!

Oleekwanụ banyere nkebi ahịrịokwu bụ́ “onye nanị ya nwere anwụghị anwụ”? N’ebe a kwa, e ji Jizọs na-atụnyere ndị eze bụ́ mmadụ. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-achị achị nke ga-asị na ya nwere anwụghị anwụ, ma Jizọs pụrụ ikwu otú ahụ. Pọl dere, sị: “Anyị maara na Kraịst, ebe e siworo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, adịkwaghị anwụ anwụ; ọnwụ abụkwaghị nna ukwu n’ebe ọ nọ.” (Ndị Rom 6:9) N’ihi ya, Jizọs bụ onye mbụ a kọwara n’ime Bible dị ka onye nwetara onyinye nke anwụghị anwụ. N’ezie, n’oge Pọl na-ede akwụkwọ ozi ya, ọ bụ nanị Jizọs bụ onye e nyeworo ndụ nke a na-agaghị ebibi ebibi.

E kwesịkwara iburu n’uche na ọ garaghị ezi ezi ma a sị na Pọl kwuru na ọ bụ nanị Jehova Chineke nwere anwụghị anwụ, ebe ọ bụ na Jizọs nwekwara anwụghị anwụ mgbe Pọl dere okwu ndị ahụ. Ma Pọl pụrụ ikwu na ọ bụ nanị Jizọs nwere anwụghị anwụ ma e jiri ya tụnyere ndị ọchịchị nke ụwa.

Ọzọkwa, ọ bụ nnọọ eziokwu na mgbe e mesịrị ka Jizọs si n’ọnwụ bilie, ya arịgorokwa eluigwe, a pụrụ ịkọwa ya dị ka “onye ọ na-adịghị otu onye n’ime ụmụ mmadụ hụworo ma ọ bụ pụrụ ịhụ.” Ọ bụ eziokwu na ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị e tere mmanụ, ga-ahụ ya mgbe ha onwe ha nwụsịrị, e meekwa ka ha si n’ọnwụ bilie ma gaa eluigwe dị ka ndị e kere eke bụ́ mmụọ. (Jọn 17:24) Ma, ọ dịghị mmadụ nọ n’ụwa nke ga-ahụ Jizọs nke a e meworo ka ọ dị ebube. N’ihi ya, a pụrụ ikwu n’eziokwu na kemgbe e mesịrị ka Jizọs si n’ọnwụ bilie, “ọ dịghị otu onye n’ime ụmụ mmadụ” hụworo Jizọs anya n’ezie.

N’eziokwu, ọ bụrụ na e lee ya anya elu elu, ọ pụrụ iyi ka ọ̀ bụ Chineke ka a na-ekwu banyere ya na 1 Timoti 6:15, 16. Ma, ihe ndị gbara okwu Pọl ahụ gburugburu—tinyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ kwadoro ya—na-egosi na Pọl nọ na-ekwu banyere Jizọs.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 E jikwa okwu ndị yiri nke ahụ kọwaa Jizọs ná 1 Ndị Kọrint 8:5, 6; Mkpughe 17:12, 14; 19:16.