Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible German Mbụ Jiri Aha Chineke Mee Ihe

Bible German Mbụ Jiri Aha Chineke Mee Ihe

Bible German Mbụ Jiri Aha Chineke Mee Ihe

EZIGBO aha Chineke, bụ́ Jehova, pụtara ọtụtụ puku ugboro na New World Translation of the Holy Scriptures, bụ́ nke e bipụtara n’asụsụ German n’afọ 1971. * Ma nke a abụghị Bible German mbụ ji aha Chineke mee ihe. O yikarịrị ka ọ̀ bụ Johann Eck, bụ́ ọkà mmụta okpukpe a ma ama nke Roman Katọlik, bipụtara Bible German mbụ ji aha Jehova mee ihe n’ihe dị ka narị afọ ise gara aga.

A mụrụ Johann Eck n’afọ 1486 n’ebe ndịda Germany. Mgbe ọ na-erula afọ 24, ọ ghọrọ prọfesọ nkà mmụta okpukpe na mahadum Ingolstadt, bụ́ ọkwá ọ nọ na ya ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1543. Eck na Martin Luther tokọrọ, ha abụọ bụkwara enyi ruo oge ụfọdụ. Otú ọ dị, Luther mesịrị ghọọ onyeisi n’òtù chọrọ ka a gbanwee ụfọdụ n’ime ozizi Chọọchị Katọlik, ebe Eck bụ onye na-agbachitere Chọọchị Katọlik.

Onyeisi obodo Bavaria nyere Eck ọrụ ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ German, e bipụtakwara nsụgharị ahụ n’afọ 1537. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, nsụgharị ya gbasoro nnọọ ihe odide mbụ ahụ, ‘e kwesịkwara ịnabata ya karịa ka a na-eme.’ Eck si otú a sụgharịa Ọpụpụ 6:3: “Abụ m Onyenwenụ, nke pụtara n’ihu Ebram, Aịzik, na Jekọb n’ime Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile: aha m bụkwa Adonai, emebeghị m ka ha mata ya.” Eck gbakwụnyere okwu na-esonụ n’akụkụ peeji ebe amaokwu ahụ dị: “Aha ahụ bụ Adonai Jehoua.” Ọtụtụ ndị ọkà mmụta Bible kwere na nke a bụ nke mbụ e ji ezigbo aha Chineke mee ihe na Bible German.

Otú ọ dị, o ruwo ọtụtụ puku afọ a matara ezigbo aha Chineke ma jiri ya na-eme ihe. Ọ bụ n’asụsụ Hibru ka e bu ụzọ dee ya ede, bụ́ ebe a kpọrọ nanị ezi Chineke ahụ “Jehova.” (Deuterọnọmi 6:4) Ọ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga ka e dekọrọ n’asụsụ Grik, okwu Jizọs kwuru bụ́ na ya onwe ya mere ka a mara aha Chineke. (Jọn 17:6) Kemgbe ahụ, e bipụtawo aha ahụ n’ọtụtụ asụsụ, n’oge na-adịghịkwa anya, ná mmezu nke Abụ Ọma 83:18, mmadụ nile ga-amara na onye ahụ nke aha ya bụ Jehova bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara na nke mbụ ya n’asụsụ Bekee n’afọ 1961. E nwere ya ugbu a n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ n’ihe karịrị asụsụ iri ise.

[Foto dị na peeji nke 32]

Bible Eck nke e bipụtara n’afọ 1558, bụ́ nke nwere ihe odide n’akụkụ peeji ebe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara n’Ọpụpụ 6:3