Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kwe Ka “Okwu Ọnụ” Jehova Na-echebe Gị

Kwe Ka “Okwu Ọnụ” Jehova Na-echebe Gị

Kwe Ka “Okwu Ọnụ” Jehova Na-echebe Gị

N’AFỌ 490 T.O.A., n’agha ahụ mere ihe akụkọ, nke a lụrụ na Marathon, ndị agha Atens dị agbata puku iri ruo puku iri abụọ zutere ndị agha Pesia ka ha nnọọ ike. Ihe bụ́ isi nyeere ndị Gris aka n’agha ahụ bụ otú ndị agha ha si nọkọchie nnọọ anya n’ahịrị, na-eche ndị iro ha ihu. Ọta ha bịakọtara ọnụ ma yie nnọọ mgbidi a na-apụghị itipu etipu, bụ́ nke e tunyejuru ube n’elu ya. Otú ahụ ndị agha Atens si nọkọchie anya mere ka ha merie usuu ndị agha Pesia, bụ́ ndị ka ha nnọọ n’ọnụ ọgụgụ.

Ezi Ndị Kraịst nọ n’agha ime mmụọ. Ha na ndị iro dị ike na-alụ—ndị ọchịchị a na-adịghị ahụ anya nke ajọ usoro ihe dị ugbu a, bụ́ ndị a kọwara n’ime Bible dị ka “ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, . . . ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12; 1 Jọn 5:19) Ndị Chineke nọgidere na-enwe mmeri—ma ọ bụghị n’ike aka ha. Otuto nile na-agara Jehova, bụ́ onye na-echebe ha ma na-enye ha ntụziaka, dị ka e dekọrọ ya n’Abụ Ọma 18:30: “Okwu ọnụ Jehova bụ ihe a nụchara anụcha; ọta ka Ọ bụụrụ ndị nile nke na-agbaba n’ime Ya.”

N’ezie, Jehova na-eji “okwu ọnụ” ya a nụchara anụcha, bụ́ nke dị n’Akwụkwọ Nsọ, echebe ndị ohu ya nọgidere na-efe ya ka ha ghara ịnọ n’ihe ize ndụ ime mmụọ. (Abụ Ọma 19:7-11; 119:93) Solomọn dere banyere amamihe dị n’Okwu Chineke, sị: “Ahapụla ya, ọ ga-edebekwa gị; hụ ya n’anya, ọ ga-echebekwa gị.” (Ilu 4:6; Eklisiastis 7:12) Olee otú amamihe Chineke si echebe anyị ka anyị ghara imerụ ahụ́? Tụlee ihe banyere Izrel oge ochie.

Ndị Amamihe Chineke Chebere

Iwu Jehova chebere ma duzie ụmụ Izrel n’akụkụ nile nke ndụ ha. Dị ka ihe atụ, iwu ndị metụtara ihe oriri, idebe ihe ọcha, na ịkpọpụ ndị ọrịa iche mere ka ha ghara ibute ọtụtụ n’ime ọrịa ndị mekpọrọ mba ndị ọzọ ọnụ. Ọ bụ nanị mgbe ndị sayensị chọpụtasịrị nje bacteria na narị afọ nke 19 ka ha malitere isetịpụ ụdị ụkpụrụ ahụ dị n’Iwu Chineke. Iwu ndị na-achịkwa inwe ala, ịgbapụta ihe, ọmụrụnwa, na ịkagbu ụgwọ, baara ndị Izrel uru site n’ime ka udo dị n’etiti ha, meekwa ka ha nwee ọnọdụ akụ̀ na ụba dị mma. (Deuterọnọmi 7:12, 15; 15:4, 5) Iwu Jehova nyedịrị aka mee ka ala ndị Izrel nọgide na-adị mma! (Ọpụpụ 23:10, 11) Iwu ndị megidere ofufe ụgha chebere ha n’ụzọ ime mmụọ, na-eme ka ha ghara ịbụ ndị ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu, ka ha ghara iji ụmụaka chụọ àjà, nakwa ka ha ghara itinye aka n’ọtụtụ arụ ndị ọzọ, gụnyekwara omume na-eweda n’ala nke mmadụ ịkpọ isiala nye arụsị.—Ọpụpụ 20:3-5; Abụ Ọma 115:4-8.

N’ụzọ doro anya, “okwu ọnụ” Jehova ‘abụghị ihe efu’ n’ebe Izrel nọ; kama nke ahụ, o mere ka ndị nile ṅara ntị na ya dị ogologo ndụ. (Deuterọnọmi 32:47) Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị taa nye ndị na-eme ihe kwekọrọ n’okwu amamihe Jehova, ọ bụ ezie na Ndị Kraịst anọghịzi n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (Ndị Galeshia 3:24, 25; Ndị Hibru 8:8) N’eziokwu, kama inwe usoro iwu, Ndị Kraịst nwere ụkpụrụ Bible dịgasị iche iche e mere iduzi na ichebe ha.

Ndị Ụkpụrụ Na-echebe

Iwu nwere ike imetụta nanị ihe ole na ole, ọ pụkwara ịdịru nwa oge. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ụkpụrụ Bible na-abụ eziokwu ndị bụ́ isi, ha na-emetụtakarị ọtụtụ ihe ma na-adịte aka. Dị ka ihe atụ, tụlee ụkpụrụ e dekọrọ na Jems 3:17, nke akụkụ ya ụfọdụ na-asị: “Amamihe nke sitere n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo.” Olee otú eziokwu ahụ bụ́ isi ga-esi bụrụ ọta nye ndị Chineke taa?

Ịdị ọcha pụtara inwe omume dị ọcha. N’ihi ya, ọ bụghị nanị omume rụrụ arụ ka ndị na-eji omume dị ọcha akpọrọ ihe na-agbalịsi ike izere kamakwa ha na-ezere ihe ndị na-akpata ya, nke gụnyere ịdị na-eche banyere mmekọahụ nakwa ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. (Matiu 5:28) N’otu aka ahụ, nwoke na nwanyị chọrọ ịlụ onwe ha, bụ́ ndị ji ụkpụrụ dị na Jems 3:17 kpọrọ ihe, na-ezere omume ndị pụrụ ime ka ha ghara ijide onwe ha. Ebe ha bụ ndị na-agbaso ụkpụrụ Chineke, ha adịghị etinye aka n’omume na-adịghị ọcha, ikekwe na-eche na ọ bụrụhaala na ọ dịghị iwu Chineke a ga-asị na ha mebiri kpọmkwem, Jehova ga-anabata omume ha. Ha maara na Jehova “na-ele obi” nakwa na ọ na-emeso mmadụ ihe dị ka obi ya si dị. (1 Samuel 16:7; 2 Ihe E Mere 16:9) Ndị dị otú ahụ maara ihe na-echebe onwe ha pụọ n’ọtụtụ ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ bụ́ ndị jupụtara ebe nile taa. Ha na-echebekwa uche na obi ha.

Amamihe Chineke “na-emekwa udo,” ka Jems 3:17 na-ekwu. Anyị maara na Setan na-anwa ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma site n’ime ka anyị na-enwe mmasị n’ime ihe ike. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji akwụkwọ, fim, egwú, na egwuregwu kọmputa ndị rụrụ arụ emezu nke a. Ụfọdụ egwuregwu kọmputa na-akpali ndị na-egwu ha ime ihe ike na igbu ọchụ n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́! (Abụ Ọma 11:5) Ime ihe ike na mpụ nke na-arị elu n’ike n’ike na-egosi na Setan na-enwe ihe ịga nke ọma na nke a. N’afọ ole na ole gara aga, otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’Australia hotara ihe Robert Ressler kwuru banyere ụdị mpụ dị otú ahụ. Ressler kwuru na ihe kpaliri ndị ogbu ọchụ ya gbara ajụjụ ọnụ n’afọ ndị 1970 igbu ndị mmadụ bụ ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ́ bụ́ “ndị na-enweghị ebe ha ruru ma e jiri ha tụnyere ndị nke oge a.” N’ihi ya, Ressler kwuru na “ihe ga-aka njọ n’ọdịnihu—narị afọ ọhụrụ bụ́ mgbe ọnụ ọgụgụ nke ndị ji igbu mmadụ mere aka ọrụ ga-amụba.”

N’ezie, nanị ọnwa ole na ole akụkọ ahụ gbasịrị n’akwụkwọ akụkọ, otu nwoke gbagburu ụmụaka 16 na onye nkụzi ha n’otu ụlọ akwụkwọ ọta akara dị na Dunblane, Scotland, ma mesịa gbagbuo onwe ya. N’ọnwa na-eso ya, nwoke ọzọ ara na-acha gbagburu mmadụ 32 n’obodo Port Arthur nke dị na Tasmania, Australia, bụ́ nke na-adị jụụ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e nwewo ọtụtụ ebe ndị e gburu ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na United States, nke mere ka ndị America na-ajụ, Oleekwanụ ihe a ga-akpọ nke a? Na June 2001, Japan gbara n’akụkọ ụwa mgbe otu nwoke isi na-adịghị mma banyere n’otu ụlọ akwụkwọ ma jiri mma magbuo ụmụaka asatọ nọ n’elementrị nke mbụ na nke abụọ, jirikwa mma merụọ mmadụ 15 ndị ọzọ ahụ́. N’ezie, ihe ndị na-akpata arụ ndị dị otú ahụ dị ọtụtụ, ma ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmadụ na-ele ime ihe ike ndị a na-egosi n’usoro mgbasa ozi anya dị ka ihe na-eso akpata ha. “Ọ bụrụ na mkpọsa ngwá ahịa nke were sekọnd 60 ga-eme ka ndị ahịa ree gwoo gwoo,” ka onye Australia na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ, bụ́ Phillip Adams, dere, “olee otú ị ga-esi gwa m na fim ga-ewe awa abụọ, nke gburu ego, agaghị agbanwe àgwà ndị mmadụ.” Ị̀ makwa na ndị uwe ojii nwetara puku vidio abụọ ndị na-egosi ime ihe ike na ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’ụlọ nwoke ahụ gbagburu ndị mmadụ na Port Arthur?

Ndị na-agbasochi ụkpụrụ Bible anya adịghị ekwe ka ụdị ihe ntụrụndụ nile na-akwalite ọchịchọ ime ihe ike bata ha n’obi. N’ihi ya, obi ha adịghị anabata “mmụọ nke ụwa.” Kama nke ahụ, ọ bụ ‘mmụọ nsọ Chineke na-akụziri’ ha ihe, ha na-agbalịsikwa ike ịzụlite ịhụnanya maka mkpụrụ ya, bụ́ nke gụnyere udo. (1 Ndị Kọrint 2:12, 13; Ndị Galeshia 5:22, 23) Ha na-eme nke a site n’inwechi ọmụmụ Bible anya, ikpechi ekpere anya, na ịtụgharị uche n’ụzọ na-ewuli elu. Ha na-ezerekwa iso ndị nwere àgwà nke ime ihe ike na-akpakọrịta, kama nke ahụ, ha na-ahọrọ iso ndị ọ na-agụsi agụụ ike ka e nwee ụwa ọhụrụ nke udo nke Jehova kwere ná nkwa, otú ahụ ọ na-agụ ha onwe ha, na-akpakọrịta. (Abụ Ọma 1:1-3; Ilu 16:29) Ị̀ hụkwara ka amamihe Chineke si echebe mmadụ!

Kwe Ka “Okwu Ọnụ” Jehova Na-echebe Obi Gị

Mgbe Setan nwara Jizọs n’ịkpa, Jizọs gbaghara ihe Setan kwuru site n’ihota Okwu Chineke n’ụzọ ziri ezi. (Luk 4:1-13) Otú ọ dị, ọ gaghị ka ya na Ekwensu mawa aka. Site n’ịgbakwasị ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ na-azaghachi Setan, ihe Jizọs kwuru sitere ya n’obi, ọ bụkwa ya mere aghụghọ Ekwensu, bụ́ nke gaara ya nke ọma n’Iden, ji kụọ afọ n’ala n’ebe Jizọs nọ. Aghụghọ Setan ga-akụkwa afọ n’ala n’ebe anyị nọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri okwu ọnụ Jehova mejupụta obi anyị. Ọ dịghị ihe ka nke ahụ mkpa, n’ihi na “site [n’obi] ka mpụta nile nke ndụ dị.”—Ilu 4:23.

Ọzọkwa, anyị aghaghị ịnọgide na-echekwa obi anyị, n’esepụghị aka. Mgbe ọnwụnwa Setan kụrụ afọ n’ala n’ịkpa, ọ kwụsịghị ịnwa Jizọs. (Luk 4:13) Ọ ga-anọgidekwa na-anwa anyị site n’ụzọ dịgasị iche iche iji mee ka anyị gharazie ịnọgide na-eme ezi ihe. (Mkpughe 12:17) N’ihi ya, ka anyị ṅomie Jizọs site n’ịzụlite mmasị dị ukwuu n’Okwu Chineke, na-ekpekwa ekpere maka mmụọ nsọ na amamihe n’esepụghị aka. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17; Ndị Hibru 5:7) N’aka nke ya, Jehova na-ekwe ndị nile gbabara n’ebe ọ nọ nkwa na ọ dịghị ihe ọ bụla ga-emerụ ha ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ.—Abụ Ọma 91:1-10; Ilu 1:33.

Okwu Chineke Na-echebe Ọgbakọ

Setan apụghị igbochi “oké ìgwè mmadụ” ahụ e buru n’amụma ịlanarị oké mkpagbu ahụ. (Mkpughe 7:9, 14) Ka o sina dị, ọ ka na-agbalịsi ike imerụ Ndị Kraịst, ka ọ ga-abụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ n’ime ha aghọọ ndị ha na Jehova na-adịghịzi ná mma. Nke ahụ gaara ya nke ọma n’Izrel oge ochie, bụ́ nke mere ka puku mmadụ iri abụọ na anọ nwụọ n’ọnụ ọnụ Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9) N’ezie, Ndị Kraịst mere mmehie ma gosipụta ezi nchegharị na-abụ ndị e ji ịhụnanya nyere aka ịgbake n’ụzọ ime mmụọ. Ma ndị mmehie na-enweghị nchegharị, dị ka Zimri oge ochie, na-eme ka ndị ọzọ nọrọ n’ọnọdụ dị ize ndụ nke ịbụ ndị e mebiri omume ha na ọnọdụ ime mmụọ ha. (Ọnụ Ọgụgụ 25:14) Dị nnọọ ka ndị agha nọkọchiri anya, bụ́ ndị na-ejighịzi ọta ha, ndị dị otú ahụ na-etinye ọ bụghị nanị onwe ha kamakwa ndị ibe ha n’ihe ize ndụ.

N’ihi ya, Bible na-enye iwu, sị: “Ka unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna bụ́ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye anyaukwu ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ ma ọ bụ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe kwụsị ịdị na-akpakọ, ọbụna unu na onye dị otú a erikọla ihe. . . . Wepụnụ onye ọjọọ ahụ n’etiti onwe unu.” (1 Ndị Kọrint 5:11, 13) Ọ̀ bụ na i kweghị na “okwu” amamihe a na-enye aka n’ime ka ọgbakọ Ndị Kraịst nọgide na-adị ọcha ma a bịa n’omume nakwa n’ụzọ ime mmụọ?

N’ụzọ dị nnọọ iche, ọtụtụ chọọchị Krisendọm nakwa ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ewere akụkụ Bible ndị na-emegide echiche ọgbara ọhụrụ nke onye mere otú ọ masịrị ya dị ka ihe oge ya gafeworo. N’ihi ya, ha na-anabata ụdị mmehie nile dị oké njọ, na ọbụna nke ndị ụkọchukwu na-eme. (2 Timoti 4:3, 4) Otú ọ dị, rịba ama na Ilu 30:5, bụ́ nke na-ezokwa aka ‘n’okwu ọnụ’ Jehova nke yiri ọta, bụ nke iwu dị n’amaokwu nke 6 sochiri: “Atụkwasịla ihe n’okwu [Chineke] nile, ka O wee ghara ịbara gị mba, i wee ghọọ onye okwu ụgha.” N’ezie, ndị na-etinye ma ọ bụ na-ewepụ ihe na Bible bụ ndị ụgha n’ụzọ ime mmụọ—bụ́ ndị ụgha ikpe ga-ama karịsịa! (Matiu 15:6-9) Ya mere, anyị kwesịrị inwe ezi ekele na anyị so ná nzukọ nke na-akwanyere Okwu Chineke ùgwù dị ukwuu.

Ndị “Ísìsì Ụtọ” Na-echebe

Ebe ọ bụ na ndị Chineke na-agbaso Bible n’ụzọ chiri anya ma na-ezi ndị ọzọ ozi na-akasi obi, “ísìsì ụtọ” nke ndụ nke yiri insensi, bụ́ nke na-enye Jehova obi ụtọ, na-esi n’ahụ́ ha esipụta. Ma n’imi ndị ajọ omume, ísìsì na-esi n’ahụ́ ndị na-ezi ozi ahụ apụta, dị ka nsụgharị Union Version si kwuo ya, bụ ‘ísìsì na-eduba n’ọnwụ.’ N’ezie, usoro ihe Setan emebiwo imi ihe atụ nke ndị ajọ omume nke na ọ bụrụ na ha ahụ ndị na-esi “ísìsì ụtọ nke Kraịst,” ahụ́ adịghị eru ha ala ma ọ bụ ọbụna oké iwe na-ewe ha. N’aka nke ọzọ, ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma ahụ na-aghọ “ísìsì ụtọ nke Kraịst n’etiti ndị a na-azọpụta.” (2 Ndị Kọrint 2:14-16) Ihu abụọ na ụgha ndị e ji mara okpukpe ụgha na-asọ ndị dị otú ahụ nwere obi eziokwu oyi. N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị meghere Okwu Chineke ma zie ha ozi Alaeze ahụ, ha na-abụ ndị a dọtara n’ebe Kraịst nọ, ha na-achọkwa ịmụtakwu ihe.—Jọn 6:44.

Ya mere, obi adala gị mbà mgbe ụfọdụ ndị na-egeghị ntị n’ozi Alaeze ahụ. Kama nke ahụ, na-ele “ísìsì ụtọ nke Kraịst” anya dị ka ihe nchebe ime mmụọ nke na-achụ ọtụtụ ndị dị ize ndụ n’ebe obibi ime mmụọ nke ndị Chineke ma na-adọta ndị nwere ezi obi.—Aịsaịa 35:8, 9.

Ebe ọ bụ na ndị agha Gris ahụ lụrụ agha na Marathon nọkọchiri ọnụ ma jidesie ọta ha ike, ha meriri n’agbanyeghị na ndị iro ha ka ha n’ọnụ ọgụgụ. N’otu aka ahụ, a na-emesi Ndịàmà Jehova na-anọgidesi ike n’ihe obi ike na ha ga-enwe mmeri zuru ezu n’ọgụ ime mmụọ ha na-alụ, n’ihi na nke ahụ bụ “ihe nketa” ha. (Aịsaịa 54:17) N’ihi ya, ka onye ọ bụla n’ime anyị nọgide na-agbaga n’ebe Jehova nọ maka nchebe site n’ịnọgide “na-ejidesi okwu nke ndụ ike.”—Ndị Filipaị 2:16.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

‘Amamihe nke sitere n’elu dị ọcha, na-emekwa udo’