Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mennonite Achọọ Eziokwu Bible

Ndị Mennonite Achọọ Eziokwu Bible

Ndị Mennonite Achọọ Eziokwu Bible

N’OTU ụtụtụ n’ọnwa November afọ 2000, ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova nọ na Bolivia si na windo nke obere ụlọ ha lepụ anya ma hụ otú ìgwè ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị yi uwe a na-achọghị oké mma ka ha ji ụjọ guzoro na geeti. Mgbe ndị ozi ala ọzọ ahụ meghere geeti, ihe mbụ ndị ọbịa ahụ kwuru bụ “Anyị chọrọ ịchọta eziokwu ahụ dị na Bible.” Ndị ọbịa ahụ bụ ndị Mennonite. Ndị nwoke ha yi traụza nwere aka, ebe ndị nwanyị ha yikwasịrị eprọn na-eji oji n’elu uwe ha, ha na-asụrịtakwa otu n’ime asụsụ ndị Germany. Ha yiri ndị ụjọ na-atụ. Ha nọgidere na-elegharị anya iji chọpụta ma ọ̀ dị onye nọworo na-eso ha n’azụ. Ka o sina dị, ọbụna mgbe ha na-arịgo na steepụ iji banye n’ime ụlọ, otu n’ime ụmụ okorobịa ndị so ha sịrị, “Achọrọ m ịmata ndị ahụ na-eji aha Chineke eme ihe.”

Mgbe ndị ọbịa ahụ nọzi n’ime ụlọ, ndị nwe ụlọ eleekwa ha ọbịa, ahụ́ malitere iru ha ala. Ha si n’otu ugbo dị anya nke dịpụrụ iche bịa. N’ebe ahụ, ha anọwo na-enweta magazin Ụlọ Nche site na post ọfịs ruo afọ isii. “Anyị agụtawo na a gaje inwe paradaịs n’elu ala. Ọ̀ bụ eziokwu?” ka ha jụrụ. Ndịàmà ahụ gosiri ha ihe Bible zara banyere nke ahụ. (Aịsaịa 11:9; Luk 23:43; 2 Pita 3:7, 13; Mkpughe 21:3, 4) “Ùnu ahụla!” ka otu n’ime ndị ọrụ ugbo ahụ gwara ndị ọzọ. “Ọ bụ eziokwu. A gaje inwe paradaịs n’elu ala.” Ndị ọzọ nọgidere na-asị: “Ọ dị m ka ànyị achọtala eziokwu ahụ.”

Ole ndị bụ ndị Mennonite? Gịnị ka ha kweere? Iji zaa ajụjụ ndị a, ọ dị mkpa ka anyị tụlee ihe ndị mere na narị afọ nke iri na isii.

Ole Ndị Bụ Ndị Mennonite?

N’afọ ndị 1500, nsụgharị a nọ na-asụgharị ma na-ebipụta Bible n’ọtụtụ asụsụ ógbè ndị dị na Europe mere ka ndị mmadụ maliteghachi inwe mmasị n’ọmụmụ Bible n’ebe ahụ. Martin Luther na ndị ọzọ na-achọ mgbanwe jụrụ ọtụtụ n’ime ozizi Chọọchị Katọlik. Ma, chọọchị Protestant ndị e hiwere ọhụrụ nọgidere na-eme ọtụtụ ihe ndị na-ekwekọghị na Bible. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime ha tụrụ anya ka a na-eme nwa ọhụrụ ọ bụla baptizim na chọọchị ahụ. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-eme nnyocha iji chọta eziokwu Bible ghọtara na mmadụ na-aghọ onye so n’ọgbakọ Ndị Kraịst nanị mgbe o nwetasịworo ihe ọmụma ma mee mkpebi, tupu e mee ya baptizim. (Matiu 28:19, 20) Ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi, bụ́ ndị kweere nke a, malitere ịga obodo na ime obodo dị iche iche na-akụzi Bible ma na-eme ndị tozuworo etozu baptizim. Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ ha ndị Anabaptist, nke pụtara, ndị “na-emegharị baptizim.”

Otu onye nke chọrọ enyemaka nke ndị Anabaptist mgbe ọ na-achọ eziokwu ahụ bụ Menno Simons, bụ́ onye ụkọchukwu Katọlik n’ime obodo Witmarsum nke dị n’ebe ugwu Netherlands. Ka ọ na-erule n’afọ 1536, o gbubisịrị ihe ọ bụla jikọrọ ya na chọọchị ahụ ma ghọọ onye a na-achọ achọ. N’afọ 1542, Eze Ukwu Rom Dị Asọ bụ́ Charles nke Ise kwere nkwa n’onwe ya inye onye ọ bụla ga-ejide Menno ego dị 100 guilder. Ka o sina dị, Menno chịkọtara ụfọdụ ndị Anabaptist n’ọgbakọ n’ọgbakọ. N’oge na-adịghị anya, a malitere ịkpọ ya na ndị na-eso ya ndị Mennonite.

Ndị Mennonite Taa

Ka oge na-aga, mkpagbu ndị Mennonite nọgidere na-enweta mere ka ọtụtụ puku n’ime ha si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe kwaga n’Ebe Ugwu America. N’ebe ahụ, ha nwere ohere nke ịnọgide na-achọ eziokwu ahụ na ịgbasara ọtụtụ ndị ọzọ ozi ha. Ma ha enweghịzi ụdị ịnụ ọkụ n’obi ahụ ndị bu ha ụzọ nwere maka ịnọgide na-amụ Bible nakwa maka ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha nọgidere na-ezi ozizi ndị na-ekwekọghị na Bible, dị ka Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, na ọkụ ala mmụọ. (Eklisiastis 9:5; Ezikiel 18:4; Mak 12:29) Taa, ọrụ ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị Mennonite na-arụkarịzi bụ ihe ndị metụtara ahụ́ ike na ijere ọhaneze ozi kama ịgbasa ozi ọma.

A na-ekwu na e nwere ugbu a ihe dị ka otu nde ndị Mennonite na narị puku atọ bụ́ ndị bi ná mba iri isii na ise. Ma, ọ na-ewute ndị Mennonite nke oge a na ha adịghị n’otu, dị ka o wutere Menno Simons ọtụtụ narị afọ gara aga. N’oge Agha Ụwa Mbụ, echiche dịgasị iche ha nwere banyere ọgba aghara e nwere n’ụwa kpataara ha nkewa dị ukwuu. Ọtụtụ n’ime ha ndị bi n’Ebe Ugwu America jụrụ ịga agha n’ihi na Bible megidere ya. Ma otu akwụkwọ nke na-akọ banyere ndị Mennonite na-ekwu, sị: “Ka ọ na-erule n’afọ 1914, chọọchị ndị Mennonite ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe adịghịzi nke na-ajụ ịga agha dị ka ha na-ajụbu.” Taa, ụfọdụ ìgwè ndị Mennonite na-ebizi ndụ ọgbara ọhụrụ ruo n’ókè ụfọdụ. Ụfọdụ ndị ka na-eji ihe ndị mgbe ochie ekochi uwe ha kama iji bọtọn tụchie ya, ha kwekwara na ụmụ nwoke ekwesịghị ịkpụ afụ ọnụ ha akpụ.

Ụfọdụ ìgwè ndị Mennonite, bụ́ ndị kpebisiri ike na ọ dịghị ihe ga-ejikọ ha na ndụ ọgbara ọhụrụ, akwagawo n’ebe ụfọdụ gọọmentị ime obodo kwere ka ha biri n’enweghị onye na-enye ha nsogbu. Dị ka ihe atụ, na Bolivia, ihe dị ka puku ndị Mennonite iri atọ na asatọ bi n’ọtụtụ ógbè ndị dịpụrụ nnọọ adịpụ, ógbè nke ọ bụla nwekwara iwu dị iche na-achịkwa ya. Ógbè ụfọdụ machibidoro ụgbọala, ọ bụ nanị ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ka ha na-ekwe ka ha bata n’ógbè ha. Ógbè ụfọdụ machibidoro inwe redio, TV, na ịkpọ egwú. Ọbụna ụfọdụ ógbè machibidoro ịmụ asụsụ nke mba ha bi na ya. “Iji hụ na anyị nọgidere n’okpuru ha, ndị ụkọchukwu anyị adịghị ekwe ka anyị mụọ asụsụ Spanish,” ka otu onye bi n’otu ógbè kwuru. Ọtụtụ n’ime ha chere na a na-emegbu ha emegbu, ha na-atụkwa ụjọ ịbụ ndị a chụrụ n’ógbè ha, bụ́ ihe kasị njọ pụrụ ime onye na-ebitụbeghị ndụ n’ebe ọzọ ma e wezụga n’ógbè ahụ.

Otú E Si Kụọ Mkpụrụ nke Eziokwu Ahụ

Ọ bụ mgbe ha nọ n’ọnọdụ a ka otu onye Mennonite, bụ́ onye ọrụ ugbo nke aha ya bụ Johann, hụrụ otu magazin Ụlọ Nche n’ụlọ otu onye agbata obi ya. Ezinụlọ Johann si Canada kwaga Mexico, ma mesịa si na Mexico kwaga Bolivia. Ma, ọ dịwo anya Johann nọworo na-achọ enyemaka n’ọchịchọ ọ na-achọ eziokwu Bible. Ọ rịọrọ onye agbata obi ya ka ya gbaziri magazin ahụ.

E mesịa, ka Johann gara n’obodo ukwu iji ree ihe ndị o wetara n’ubi, ọ gakwuuru otu Onyeàmà nke na-enyefe ndị mmadụ Ụlọ Nche n’ahịa. Onyeàmà ahụ gwara ya ka ọ gakwuru otu onye ozi ala ọzọ na-asụ asụsụ German, n’oge na-adịghịkwa anya, Johann si na post ọfịs na-anata Ụlọ Nche n’asụsụ German. Ezinụlọ nke ọ bụla nọ n’ógbè Johann na-amụ magazin Ụlọ Nche nke ọ bụla nke ọma. Ọ na-abụ ezinụlọ nke a mụsịa ha enye ezinụlọ nke ọzọ. Otú ahụ ka ha na-emegide ya ruo mgbe magazin ahụ kara. Mgbe ụfọdụ, ezinụlọ dị iche iche na-anọkọta ọnụ ma mụọ magazin Ụlọ Nche ruo etiti abalị, na-asapeta ma na-agụ akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha. Johann bịara kwenyesie ike na ọ ghaghị ịbụ Ndịàmà Jehova bụ ndị na-eme uche Chineke n’ịdị n’otu n’ụwa nile. Tupu ya anwụọ, Johann gwara nwunye ya na ụmụ ya, sị: “Unu ahapụla ịdị na-agụ Ụlọ Nche. Ọ ga-enyere unu aka ịghọta Bible.”

Ụfọdụ n’ime ndị ezinụlọ Johann malitere ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị ha na-amụta na Bible. “A gaghị ebibi ụwa a. Kama nke ahụ, Chineke ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs,” ka ha sịrị. “Chineke adịghịkwa ata ndị mmadụ ahụhụ na hel.” Ndị isi chọọchị ha nụrụ ihe ndị a ha na-akọrọ ndị ọzọ, ha yikwara ezinụlọ Johann egwu na a ga-achụ ha n’ógbè ahụ ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ime nke ahụ. E mesịa, n’oge ezinụlọ ahụ zukọrọ iji kwurịta nsogbu ndị isi ndị Mennonite na-enye ha, otu nwa okorobịa kwuru okwu n’atụghị egwu. “Amaghị m ihe mere anyị ji eme mkpesa banyere ndị isi chọọchị anyị,” ka o kwuru. “Anyị nile maara nke bụ́ ezi okpukpe ahụ, ma ọ dịbeghị ihe anyị mere banyere ya.” Okwu ahụ ruru nna nke nwa okorobịa ahụ n’obi. N’oge na-adịghị anya, mmadụ iri ndị si n’ezinụlọ ahụ malitere njem ha zoro ezo mee iji chọta Ndịàmà Jehova. Otú ahụkwa ka ha si rute n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ ahụ, dị ka e kwuru ná mmalite.

N’echi ya, ndị ozi ala ọzọ ahụ gara n’ógbè ahụ ije leta ndị enyi ha nwetara ọhụrụ. Ọ bụ nanị ụgbọala ndị ozi ala ọzọ ahụ nọ n’ụzọ ahụ. Ka ha ji nwayọọ na-agbafe ụgbọ ịnyịnya dị iche iche, ọ tụrụ ha n’anya ịhụ ka ndị bi n’ógbè ahụ ji ịtụnanya na-ekiri ha. N’oge na-adịghị anya, ndị ozi ala ọzọ ahụ na ndị Mennonite iri sitere n’ezinụlọ abụọ nọdụrụ ala ma malite ịkparịta ụka.

N’ụbọchị ahụ, o were awa anọ iji mụọ isi mbụ nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. * Na paragraf nke ọ bụla, ọ na-abụ na ndị ọrụ ugbo ahụ agụọlarị akụkụ Bible ndị ọzọ, ma chọzie ịmata ma otú ha si ghọta ha ò ziri ezi. Mgbe ọ bụla a jụrụ ajụjụ nke paragraf a na-atụle, ndị ọrụ ugbo ahụ na-echeretụ ruo minit ole na ole iji gbaa izu n’asụsụ Germany nke ha na-asụ tupu otu onye azachite ọnụ ha n’asụsụ Spanish. Ọ bụ ụbọchị a na-apụghị ichezọ echezọ, ma agwọ nọ n’akịrịka. Ha na-aga inweta ule, dị nnọọ ka Menno Simons nwetara mgbe ọ malitere ịchọ eziokwu Bible ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ ise gara aga.

Inweta Ọnwụnwa n’Ihi Eziokwu Ahụ

Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ndị isi chọọchị bịara n’ebe ezinụlọ Johann bi ma kwuo ihe a ga-eme ndị nile nọgidere na-enwe mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, sị: “Anyị nụrụ na Ndịàmà Jehova bịara na nke unu. Unu aghaghị ịgwa ha ka ha ghara ịbịaghachi, unu ga-enyefekwa anyị akwụkwọ ndị ha nyere unu ka anyị kpọọ ha ọkụ, ma ọ bụghị ya, a ga-achụ unu.” Ọ bụ nanị otu ugbo ka ha na Ndịàmà ahụ mụrụ Bible, n’ihi ya, nke a ghọrọ ule tara akpụ.

“Anyị apụghị ime ihe unu kwuru,” ka otu n’ime ndị isi ezinụlọ ahụ kwuru. “Ndị ahụ bịara ịkụziri anyị Bible.” Oleezi ihe ndị isi chọọchị ahụ mere? Ha chụrụ ha n’ógbè ahụ maka ịmụ Bible! Nke ahụ kpara ha aka ọjọọ n’ezie. Ndị na-emepụta cheese n’ógbè ahụ gbafere n’ụlọ otu ezinụlọ n’eburughị mmiri ara ehi ha, si otú ahụ mechiere ha nanị otu ụzọ ha si akpata ego. A chụrụ otu onye nke bụ́ onyeisi ezinụlọ n’ọrụ. Onye ọzọ ka a jụrụ iresị ihe n’ụlọ ahịa dị n’ógbè ahụ, a chụkwara nwa ya nwanyị dị afọ iri n’ụlọ akwụkwọ. Ndị agbata obi gbara otu ụlọ gburugburu iji kpọrọ nwunye otu n’ime ụmụ okorobịa ahụ, na-ekwu na ọ pụghị iso di ya a chụrụ achụ biri. N’agbanyeghị ihe a nile, ezinụlọ ndị nke na-amụ Bible alaghị azụ n’ọchịchọ ha na-achọ eziokwu ahụ.

Ndị ozi ala ọzọ ahụ nọgidere jiri ụgbọala na-eme ogologo njem ahụ kwa izu iji duzie ọmụmụ Bible. Ezinụlọ ndị ahụ hụtara nnọọ na ọmụmụ ihe ndị ahụ na-ewuli nnọọ elu! Ndị ezinụlọ ụfọdụ na-eji ịnyịnya ma ọ bụ ụgbọ ịnyịnya eme njem iji bịa soro n’ọmụmụ ihe ahụ. Ọ bụ oge na-akpali akpali bụ́ mgbe mbụ ezinụlọ ndị ahụ gwara otu n’ime ndị ozi ala ọzọ ahụ ka o kpee ekpere. N’ógbè ndị a, ndị Mennonite ekpetụbeghị ekpere ebe a ga-anụ ya, n’ihi ya, ha anụtụbeghị ebe mmadụ kpeere ha ekpere. Anya mmiri gbara ndị ikom ahụ. Bịazienụ hụ ụdị ịtụnanya ha nwere mgbe ndị ozi ala ọzọ ahụ wetara redio e ji akpọ teepụ! E kwetụbeghị ka a kpọọ egwú n’ógbè ha. Ọmarịcha Abụ Alaeze ndị a kpọrọ tọrọ ha ụtọ nke ukwuu nke na ha kpebiri ịdị na-abụ abụ Alaeze mgbe ọ bụla e nwesịrị ọmụmụ ihe nke ọ bụla! Ka o sina dị, ajụjụ ka bụkwa, Olee otú ha pụrụ isi nagide ọnọdụ ọhụrụ a ha nọ na ya?

Ịchọta Òtù Ụmụnna Na-ahụ n’Anya

Ebe ọ bụ na ndị ógbè ha akpapụla ha iche, ezinụlọ ndị ahụ malitere ime cheese nke ha. Ndị ozi ala ọzọ ahụ nyeere ha aka ịchọta ndị ahịa. Otu Onyeàmà nọ n’Ebe Ugwu America, bụ́ onye toro n’otu ógbè ndị Mennonite dị n’Ebe Ndịda America, nụrụ banyere ọnọdụ ezinụlọ ndị ahụ nọ na ya. O nwere ọchịchọ pụrụ iche inyere ha aka. Tupu otu izu agasịa, ọ gbara ụgbọelu gaa Bolivia iji leta ha. E wezụga agbamume ime mmụọ dị ukwuu o nyere ha, o nyeere ezinụlọ ndị ahụ aka ịzụta ụgbọala pikọpụ nke ha iji nwee ike ịdị na-aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa iji na-eburu ihe ha wetara n’ubi aga ahịa.

“Ihe siiri anyị ike mgbe a chụsịrị anyị n’ógbè ahụ. Anyị na-eji ihu mgbarụ aga Ụlọ Nzukọ Alaeze,” ka otu onye na-ekwu, “ma anyị na-eji ọṅụ alọta.” N’ezie, Ndịàmà bi n’ógbè ahụ gbalịrị n’ụzọ dị ukwuu ma kwadoo ha. Ụfọdụ n’ime ha mụrụ asụsụ German, ọtụtụ Ndịàmà na-asụ German si Europe bịa na Bolivia iji nye aka iduzi nzukọ Ndị Kraịst n’asụsụ German. N’oge na-adịghị anya, mmadụ iri na anọ ndị sitere n’ógbè ahụ malitere ikwusara ndị ọzọ ozi ọma nke Alaeze ahụ.

N’October 12, 2001, ihe na-erughị otu afọ kemgbe ha gasịrị n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ ahụ, e mere mmadụ iri na otu n’ime ndị a bụbu ndị Anabaptist baptizim ọzọ iji gosipụta na ha ararawo onwe ha nye Jehova. Kemgbe ahụ, e mewo ọtụtụ ndị ọzọ baptizim. Otu n’ime ha mesịrị kwuo, sị: “Kemgbe anyị mụtara eziokwu ahụ dị n’ime Bible, ọ dị anyị ka ànyị bụ ndị ohu e mere ka ha nwere onwe ha.” Onye ọzọ sịrị: “Ọtụtụ ndị Mennonite na-eme mkpesa na ịhụnanya adịghị n’ógbè ha. Ma, Ndịàmà Jehova na-egosipụta mmasị n’ebe ibe ha nọ. Obi ruru m ala n’etiti ha.” Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọta eziokwu sitere na Bible nke ọma karị, gị onwe gị kwa pụrụ inweta ihe isi ike. Ma, ọ bụrụ na ị chọọ enyemaka Jehova, ma gosipụta okwukwe na obi ike dị ka ezinụlọ ndị a mere, ị ga-enwetakwa ihe ịga nke ọma na obi ụtọ dị ka ha nwetara.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 25]

Obi tọrọ ha ụtọ maka inweta akwụkwọ e ji amụ Bible n’asụsụ German

[Foto dị na peeji nke 26]

N’agbanyeghị na egwú nọgidere bụrụ ihe a machibidoro iwu, ha na-abụ abụ ugbu a mgbe ọ bụla ha nwesịrị ọmụmụ Bible