Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Chineke Ka Ọ̀ Bụ Mmadụ?

Ọ̀ Bụ Chineke Ka Ọ̀ Bụ Mmadụ?

Ọ̀ Bụ Chineke Ka Ọ̀ Bụ Mmadụ?

“ABỤ M ìhè nke ụwa. Onye na-eso m agaghị eje ije n’ọchịchịrị ma ọlị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” (Jọn 8:12) Ọ bụ Jizọs Kraịst kwuru okwu ndị a. Otu nwoke gụrụ akwụkwọ na narị afọ mbụ kwuru banyere ya, sị: “E ji nlezianya zochie akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nile nke amamihe na nke ihe ọmụma n’ime ya.” (Ndị Kọlọsi 2:3) Ọzọkwa, Bible na-asị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Inwe ezi ihe ọmụma banyere Jizọs dị oké mkpa iji gboo mkpa ime mmụọ anyị.

Ọtụtụ mmadụ n’ụwa nile anụwo banyere Jizọs Kraịst. Onye ọ bụla maara na o metụtawo akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. N’ezie, kalenda e ji eme ihe n’akụkụ ka ukwuu n’ụwa dabeere n’afọ e chere na a mụrụ ya. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-akọwa, sị: “Ọtụtụ na-akpọ oge dị tupu a mụọ ya B.C., ma ọ bụ before Christ [tupu Kraịst]. Ha na-eji A.D., ma ọ bụ anno Domini (n’afọ Onyenwe anyị), eme ihe maka afọ ndị dị mgbe a mụsịrị ya.”

N’agbanyeghị nke ahụ, a ka nwere echiche ndị na-emegiderịta onwe ha banyere onye Jizọs bụ. Nye ụfọdụ ndị, ọ bụ nanị ezigbo mmadụ nke kpara ike n’akụkọ ihe mere eme. Ma ndị ọzọ na-efe ya ofufe dị ka Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Ụfọdụ ndị Hindu ekwuwo na Jizọs Kraịst dị ka chi Hindu bụ́ Krishna, onye ọtụtụ ndị sịrị na ọ bụ chi bịara n’ụdị mmadụ. Jizọs, ọ̀ bụ mmadụ nkịtị ka ọ̀ bụ onye a ga-efe ofufe? Ònye ka ọ bụ kpọmkwem? Ebee ka o si? Ụdị onye dị aṅaa ka ọ bụ? Ebeekwa ka ọ nọ ugbu a? Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, akwụkwọ nwere ihe dị ukwuu ikwu banyere Jizọs na-enye azịza ndị ziri ezi maka ajụjụ ndị a.