Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Pọntiọs Paịlet?

Ònye Bụ Pọntiọs Paịlet?

Ònye Bụ Pọntiọs Paịlet?

“PAỊLET, onye na-eweda mmadụ ala na onye na-enwe obi abụọ, bụ onye a kọrọ banyere ya n’akụkọ ihe mere eme, bụ́ onye na-ekwebeghị anyị nghọta. Nye ụfọdụ ndị, ọ bụ onye senti, nye ndị ọzọ, ọ bụ onye na-enwetụghị nnọọ obi ike, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke dị njikere igbu otu nwoke ka udo wee dị.”—Akwụkwọ bụ́ Pontius Pilate, nke Ann Wroe dere.

Ma ì nwere nke ọ bụla n’echiche ndị ahụ e kwuru n’elu ma ọ bụ na i nweghị, Pọntiọs Paịlet meere onwe ya aha n’ihi otú o si mesoo Jizọs Kraịst ihe. Ònye bụ Paịlet? Gịnị ka a maara banyere ya? Ịghọta ọkwá ya nke ọma karị ga-eme ka anyị ghọtakwuo ihe omume ndị kasị mkpa metụrụla n’ụwa.

Ọkwá, Ọrụ na Ikike Ya

Eze Ukwu Taịbiriọs nke Rom họpụtara Paịlet dị ka gọvanọ nke ógbè Judia n’afọ 26 O.A. Ndị isi dị otú ahụ so ná ndị a na-akpọ òtù ndị ọgba ịnyịnya—òtù ndị a ma ama dị ala karịa òtù ndị oké ozu, nke ndị omeiwu mejupụtara. O yiri ka Paịlet ò sonyeere òtù ndị agha dị ka onye agha na-echebe ndị nkịtị, ma ọ bụ ọchịagha ọkwá ya dị ala, mesịa nweta ọkwá dị iche iche mgbe ọ gasịrị ọrụ n’ebe dị iche iche; a họpụtakwa ya ịbụ gọvanọ tupu ya eruo afọ 30.

Mgbe Paịlet jiri ejiji agha, ọ ga-abụ na ọ na-eyi uwe akpụkpọ ma gboro ihe mgbochi obi e ji ígwè mee. Uwe ọ na-eyi n’ihu ọha bụ ákwà mgbokwasị ọcha nke nwere ihe odo odo n’ọnụ ya. Ọ ga-abụ na o nweghị ogologo ntutu, na-akpụkwa afụ ọnụ ya nke ọma. Ọ bụ ezie na ụfọdụ sị na ọ bụ onye Spen, aha ya na-egosi na ọ pụrụ ịbụ na o si n’agbụrụ ndị Pontii—ndị a ma ama si n’obodo Samnium nke dị n’ebe ndịda Ịtali.

A na-ezigakarị ndị isi ha na Paịlet hà n’ọkwá n’ebe ndị na-emepeghị emepe. Ndị Rom weere Judia dị ka ebe na-emepeghị emepe. Tụkwasị n’ịhụ na udo dị, Paịlet hụrụ na a nakọtara ụtụ isi ndị dị ka ndị a na-ana ná ngwá ahịa na ụtụ isi a na-ana ụmụ amaala ndị torurula ogo mmadụ. Ụlọikpe ndị Juu na-ekpe ndị dara obere iwu ikpe kwa ụbọchị, ma ihe àmà na-egosi na a na-ewegara gọvanọ, onye bụ́ o kwusịa o bie n’ihe metụtara ikpe, okwu ndị ga-achọ ka a maa mmadụ ikpe ọnwụ.

Paịlet na nwunye ya, tinyere ụfọdụ ndị odeakwụkwọ, ndị enyi na ndị oje ozi ya, bi na Sesaria, bụ́ obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri. Paịlet na-achịkwa ìgwè ndị agha ụkwụ ise, ìgwè nke ọ bụla n’ime ha pụkwara inwe narị ndị agha ise ma ọ bụ nweruo otu puku, ọ na-achịkwakwa otu ìgwè ndị agha ịnyịnya, bụ́ ndị o yiri ka hà dị narị ndị agha ise. Ndị agha ya na-akpọgbu ndị mebiri iwu mgbe nile. N’oge udo, a na-ekpetụ ndị dara iwu ikpe tupu e gbuo ha, ma n’oge ọgba aghara, a na-egbu ndị nnupụisi ozugbo nakwa n’ìgwè. Dị ka ihe atụ, ndị Rom kpọgburu puku ndị ohu isii iji kwụsị nnupụisi nke Spartacus nọ n’isi ya. Ọ bụrụ na o yie ka nsogbu ọ̀ ga-ada na Judia, gọvanọ pụrụ ịgakwuru onye nnọchianya eze ukwu bi na Siria, bụ́ onye ọtụtụ ìgwè ndị agha nọ n’okpuru ya. Otú ọ dị, n’ihe ka ukwuu n’oge ọchịchị Paịlet, onye nnọchianya ahụ anọghị n’ụlọ, Paịlet aghaghịkwa ịkwụsị nsogbu ndị e nwere n’egbughị oge.

Ndị gọvanọ na-akọrọ eze ukwu ihe na-emenụ mgbe nile. E kwesịrị ịkọrọ ya ihe ọ bụla metụtara ùgwù ya ma ọ bụ ihe ọ bụla na-eyi ọchịchị Rom egwu, eze ukwu ga-ekwukwa ihe a ga-eme. Gọvanọ pụrụ ịchọ ịkọrọ eze ukwu otú ihe si mee n’ógbè ya n’onwe ya tupu ndị ọzọ emee mkpesa. Ebe nsogbu na-eselite isi na Judia, ihe ndị dị otú ahụ na-enye nnọọ Paịlet nsogbu n’obi.

E wezụga ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ, ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus na Philo bụ ndị bụ́ isi kọrọ banyere Paịlet. Tacitus bụ́ onye Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme kwukwara na Paịlet gburu Christus, bụ́ onye Ndị Kraịst si n’aka ya nweta aha ha.

A Kpasuo Ndị Juu Iwe

Josephus kwuru na ndị gọvanọ Rom zeere ibu ọkọlọtọ ndị e sere eze ukwu na ha aba na Jeruselem n’ihi na ndị Juu adịghị anabata ihe oyiyi. N’ihi na Paịlet emeghị otú ahụ, ndị Juu iwe ji nubara na Sesaria ịga mee mkpesa. Ruo ụbọchị ise, ọ dịghị ihe Paịlet mere. N’ụbọchị nke isii, o nyere ndị agha ya iwu ka ha gbaa ndị ahụ bịara ime mkpesa gburugburu ma menye ha ụjọ site n’ịgwa ha na a ga-egbu ha ma ọ bụrụ na ha agbasasịghị. Mgbe ndị Juu kwuru na ọ ga-akara ha mma ịnwụ kama ịhụ ka a na-emebi Iwu ha, Paịlet gere ha ntị ma nye iwu ka e wepụ ihe oyiyi ndị ahụ.

Paịlet pụrụ iji ike mee ihe. N’otu ihe merenụ nke Josephus dekọrọ, onye ọchịchị ahụ malitere ịwa ọwa mmiri iji webata mmiri na Jeruselem ma were ego site n’ihe ntụnye ego ụlọ nsọ iji kwado ọrụ ahụ. Paịlet ewereghị nnọọ ego ahụ n’ike, n’ihi na ọ maara na iwere ihe n’ike n’ụlọ nsọ bụ arụ, nke ahụ gakwaara eme ka ndị Juu iwe ji gwa Taịbiriọs ka o wepụ ya. Ya mere, o yiri ka ndị isi ụlọ nsọ ahụ hà nyere Paịlet ikike iwere ego ahụ. A pụrụ iji ego ndị a raara nye, bụ́ ndị a na-akpọ “kọban,” rụọ ọrụ ndị ga-abara ọha na eze uru. Ma ọtụtụ puku ndị Juu gbakọtara iji gosi na obi adịghị ha mma.

Paịlet mere ka ìgwè ndị agha banye n’etiti ìgwè mmadụ ahụ, ọ gwakwara ha ka ha ghara iji mma agha mee ihe kama ka ha jiri okpiri kụsasịa ndị ahụ bịara ime mkpesa. Ọ pụrụ ịbụ na ọ chọrọ ịchụsasị ìgwè ahụ n’egbughị ọtụtụ mmadụ. Atụmatụ a yiri ka ọ̀ gara nke ọma, ọ bụ ezie na ụfọdụ mmadụ nwụrụ. Ọ pụrụ ịbụ na ndị kpesaara Jizọs na Paịlet ji ọbara ndị Galili gwakọta n’àjà ha nọ na-ezo aka n’ihe omume a.—Luk 13:1.

“Gịnị Bụ Eziokwu?”

Ọ bụ nnyocha o nyochara ebubo ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu boro Jizọs na ọ na-ekwu na ya bụ Eze nyere Paịlet aha ọjọọ. Mgbe ọ nụrụ na ọrụ Jizọs bụ ịgbara eziokwu ahụ àmà, Paịlet hụrụ na onye mkpọrọ ahụ abụghịrị ndị Rom ihe iyi egwu. Ọ jụrụ, sị: “Gịnị bụ eziokwu ahụ,” eleghị anya na-eche na eziokwu siri nnọọ ike nghọta nke na e kwesịghị ilebachara ya anya. Gịnị bụ nkwubi okwu ya? “Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla n’ime nwoke a.”—Jọn 18:37, 38; Luk 23:4.

Ikpe Jizọs gaara ebi ebe ahụ, ma ndị Juu siri ọnwụ na ọ na-eduhie mba ahụ. Ọ bụ anyaụfụ mere ndị isi nchụàjà ji kpụta Jizọs, Paịlet makwaara nke a. Ọ makwaara na ịtọhapụ Jizọs ga-akpata nsogbu, nke bụ́ ihe ọ chọrọ izere. E nweelarị ọtụtụ nsogbu enwee n’ihi na a tụọla Barabas na ndị ọzọ mkpọrọ n’ihi ịgba ọchịchị mgba okpuru na n’ihi ịgbụ ọchụ. (Mak 15:7, 10; Luk 23:2) Ọzọkwa, nsogbu ndị mbụ Paịlet na ndị Juu nwere emebiela aha ọma ya n’ihu Taịbiriọs, bụ́ onye a maara nke ọma dị ka onye na-enye ndị gọvanọ ọjọọ ntaramahụhụ siri ike. N’agbanyeghị nke ahụ, ya ikwenyere ndị Juu ga-egosi na ọ dịghị ike. Ya mere, Paịlet nọ ná nsogbu.

Mgbe Paịlet nụrụ ebe Jizọs siri bịa, ọ nwara ibugara Herọd Antipas, onye bụ́ onye na-achị ógbè Galili, okwu ahụ. Mgbe nke ahụ na-enweghị isi, Paịlet nwara ime ka ndị ahụ gbakọtara n’obí ya rịọ ka a tọhapụ Jizọs n’ikwekọ n’omenala nke ịtọhapụ otu onye mkpọrọ n’ụbọchị ememe Ngabiga. Ìgwè mmadụ ahụ tiri mkpu ka a tọhapụ Barabas.—Luk 23:5-19.

Ọ pụrụ ịbụ na Paịlet chọrọ ime ihe ọma, ma ọ chọkwara ichebe ọkwá ya na ime ihe ga-amasị ìgwè ahụ. N’ikpeazụ, o butere ọkwá ya ụzọ karịa akọ na uche ya na ikpe ziri ezi. O kwuru ka e nye ya mmiri, ya ejirikwa ya kwọọ aka ya, na-azọrọ na aka ya dị ọcha n’ọnwụ nke onye o nyere iwu ka e gbuo. * Ọ bụ ezie na Paịlet kweere na aka Jizọs dị ọcha, o kwuru ka a pịa ya ihe, kwekwa ka ndị agha mee ya ihe ọchị, tie ya ihe ma gbụọ ya ọnụ mmiri.—Matiu 27:24-31.

Paịlet mere mgbalị ikpeazụ ịtọhapụ Jizọs, ma ìgwè ahụ tiri mkpu na ọ bụrụ na o mee ya, ọ bụghị enyi Siza. (Jọn 19:12) Mgbe ọ nụrụ nke ahụ, Paịlet mere ihe ha kwuru. Otu onye ọkà mmụta kwuru banyere mkpebi ahụ Paịlet mere, sị: “Ihe ọ ga-eme dị mfe: gbuo nwoke ahụ. Nanị ihe ga-efunụ bụ ndụ otu onye Juu nke yiri onye na-enweghị uru ọ bara; ọ ga-abụ ihe nzuzu ikwe ka e nwee nsogbu n’ihi ya.”

Gịnị Mere Paịlet?

Ihe omume ikpeazụ e dekọrọ banyere Paịlet bụ ọgba aghara ọzọ. Josephus kwuru na otu ìgwè ndị Sameria ji ngwá agha gbakọtara n’Ugwu Gerizim, na-enwe olileanya igwupụta akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa, bụ́ ndị ha kweere na Mozis liri n’ebe ahụ. Paịlet mere ihe maka ya, ndị agha ya gbukwara ọtụtụ mmadụ n’ìgwè ahụ. Ndị Sameria kpesaara onye ka Paịlet n’ọkwá, bụ́ Lucius Vitellius, bụ́ gọvanọ nke Siria. E kwughị ma Vitellius ò chere na Paịlet emebigala ihe ókè ma ọ bụ na o cheghị otú ahụ. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ọ gwara Paịlet ka ọ gaa Rom iji zaa eze ukwu ajụjụ banyere ihe ndị o mere. Otú ọ dị, tupu ya agaruo, Taịbiriọs anwụọla.

Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ọ bụ n’oge ahụ ka akụkọ banyere Paịlet si n’akụkọ ihe mere eme banye n’akụkọ ifo.” Ma ọtụtụ ndị anwaala ịkọ ihe ndị ọzọ o mere bụ́ ndị na-adịghị n’akụkọ ihe mere eme. A kọọla na Paịlet ghọrọ Onye Kraịst. Ndị Etiopia bụ́ “Ndị Kraịst” chiri ya “senti.” Eusebius, bụ́ onye edemede nke ngwụsị narị afọ nke atọ na mmalite nke narị afọ nke anọ, bụ onye mbụ n’ime ọtụtụ ndị kwuru na Paịlet gburu onwe ya, dị ka Judas Iskarịọt mere. Otú ọ dị, o nweghị onye maara nnọọ ihe mechara mee Paịlet.

Paịlet pụrụ ịbụ onye kpọrọ ekwe nkụ, onye na-adịghị eji ihe akpọrọ ihe na onye obi ọjọọ. Ma ọ nọrọ n’ọchịchị ruo afọ iri, ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị isi nke Judia na-anọteghị aka. Ya mere, site n’otú ndị Rom si ele ihe anya, Paịlet bụ ezigbo onye ọchịchị. A na-akpọ ya onye ụjọ nke ụta dịịrị n’ihi ịta Jizọs ahụhụ na igbu ya iji chebe onwe ya. Ndị ọzọ na-arụ ụka na ọrụ Paịlet abụchaghị ịhụ na e nwere ikpe ziri ezi, kama ọ bụ ịhụ na e nwere udo nakwa na e chebere ihe metụtara ndị Rom.

Oge Paịlet dị nnọọ iche na nke anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị ọkàikpe nke pụrụ izi ezi ịma onye o lere anya dị ka onye aka ya dị ọcha ikpe. E wezụga ihe metụtara Jizọs, Pọntiọs Paịlet agaraghị abụ onye a ma ama n’akụkọ ihe mere eme.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 Ịkwọ aka bụ ụzọ ndị Juu si egosi na aka ha adịghị n’ịkwafu ọbara, ndị Rom adịghị eme otú ahụ.—Deuterọnọmi 21:6, 7.

[Foto dị na peeji nke 11]

A chọtara ihe odide a nke na-ekwu na Pọntiọs Paịlet bụ onyeisi nke Judia na Sesaria