Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Igwu egwuregwu kọmputa ndị a na-eme ihe ike na ha ọ̀ pụrụ imetụta mmekọrịta mmadụ na Jehova?

Eze Devid nke Izrel oge ochie dere, sị: “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) Okwu mbụ a sụgharịrị ịbụ “ịkpọasị” pụrụ ịpụta “onye iro.” N’ihi ya, onye ọ bụla nke na-ahụ ihe ike n’anya na-eme onwe ya onye iro Chineke. Mgbe ahụ, ajụjụ ọ dị anyị mkpa ịtụle bụ: Igwu egwuregwu kọmputa ụfọdụ ọ̀ na-eme ka mmadụ malite ịhụ ihe ike n’anya?

Egwuregwu kọmputa ndị a na-eme ihe ike na ha na-agba ndị mmadụ ume iji ngwá agha eme ihe. Ha na-akụzikarịrị ndị na-egwu ha otú e si alụ agha. Magazin bụ́ The Economist kwuru, sị: “Ndị agha America na-ejikarịzi egwuregwu kọmputa amụ otú e si alụ agha. A na-ere ụfọdụ egwuregwu ndị agha na-eji amụ agha n’ụlọ ahịa.”

N’eziokwu, ndị na-egwu egwuregwu kọmputa a na-eme ihe ike na ha adịghị emerụ ụmụ mmadụ nkịtị ahụ́. Ma gịnị ka ịhọrọ ụdị egwuregwu a na-ekpughe banyere ihe pụrụ ịdị na-eme obi ha? (Matiu 5:21, 22; Luk 6:45) Gịnị ka ị ga-ekwubi banyere onye ịma mmadụ mma, ịgba mmadụ égbè, ịkwarụ mmadụ na igbu mmadụ, na-atọ ụtọ? Ya bụrụkwanụ na onye ahụ ana-eji ọtụtụ awa kwa izu na-eme ihe ike ndị ahụ na-atọ ya ụtọ, nke na ọ fọrọ nke nta ka ụdị egwuregwu ndị ahụ mara ya ahụ́? Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ị ga-ekwubi na ọ na-azụlite ịhụnanya maka ihe ike, dị nnọọ ka onye na-ekiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-azụlite agụụ rụrụ arụ.—Matiu 5:27-29.

Ruo ókè ha aṅaa ka Jehova kpọrọ onye na-ahụ ihe ike n’anya asị? Devid kwuru na Jehova ‘na-akpọ ya asị.’ N’oge Noa, Jehova gosiri ókè ọ kpọruru ndị na-ahụ ihe ike n’anya asị. Jehova gwara Noa, sị: “Ọgwụgwụ anụ ahụ́ nile abịawo n’ihu m; n’ihi na ụwa jupụtara n’ihe ike site na ha; ma, lee, m ga-ebibi ha na ụwa.” (Jenesis 6:13) Ezi Chineke ahụ bibiri ụwa dum nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ihi ime ihe ike ha. Ọ zọpụtara nanị Noa na ezinụlọ ya—mmadụ asatọ bụ́ ndị na-ahụghị ihe ike n’anya.—2 Pita 2:5.

Ndị chọrọ ịbụ enyi Jehova ‘na-akpụgharị mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè.’ Kama ịmụta ịhụ ihe ike n’anya, ha adịghị ‘amụta agha ọzọ.’ (Aịsaịa 2:4) Iji nọgide na-abụ ndị enyi Chineke kama ịbụ ndị iro ya, anyị aghaghị ‘ịgbakụta ihe ọjọọ azụ, meekwa ezi ihe.’ Ọ dị anyị mkpa ‘ịchọ udo, chụsookwa ya.’—1 Pita 3:11.

Gịnị ma ọ bụrụ na anyị amalitelarị igwu egwuregwu vidio ndị a na-eme ihe ike na ha? Mgbe ahụ, ọ dị anyị mkpa ikpebisi ike ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ site n’ịkwụsị ime ihe ọ kpọrọ asị. N’ezie, anyị kwesịrị ikpe ekpere maka enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke iji kwụsị omume a na-emerụ ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. Anyị pụrụ ịkwụsị ya ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka àgwà ndị dị ka udo, ịdị mma na njide onwe onye mee ka anyị bie ndụ nke nsọpụrụ Chineke.—Luk 11:13; Ndị Galeshia 5:22, 23.