‘Egwu Jehova—Nke ahụ Bụ Amamihe’
‘Egwu Jehova—Nke ahụ Bụ Amamihe’
“KA ANYỊ nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.” (Eklisiastis 12:13) Lee nkwubi okwu amamihe dị na ya Eze Solomọn oge ochie ruru na ya site n’ike mmụọ nsọ! Nna ochie bụ́ Job ghọtakwara uru ịtụ egwu Chineke bara n’ihi na o kwuru, sị: “Lee, egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe; ọzọ, isi n’ihe ọjọọ pụta bụ nghọta.”—Job 28:28.
Bible kwuru na ịtụ egwu Jehova dị oké mkpa. Gịnị mere o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya anyị ịzụlite egwu nsọpụrụ Chineke? Olee otú inwe egwu Chineke si abara anyị uru—n’otu n’otu nakwa dị ka ìgwè nke ndị na-efe ezi ofufe? Amaokwu nke 26 ruo 35 nke Ilu isi 14 na-aza ajụjụ ndị a. *
Ebe E Si Enweta “Ntụkwasị Obi Siri Ike”
Solomọn na-ekwu, sị: “N’egwu Jehova ka ntụkwasị obi siri ike dị: ụmụ Ya ga-enwekwa ebe mgbaba.” (Ilu 14:26) Ọ dịghị ebe ọzọ onye na-atụ egwu Chineke si enweta obi ike ma ọ́ bụghị n’aka Chineke nke na-eguzosi ike n’ihe na nke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova. Ka a sịkwa ihe mere onye dị otú ahụ ji eji ntụkwasị obi siri ike echere ihe ga-eme n’ọdịnihu! Ọ ga-ebi ogologo ndụ na nke na-eju afọ.
Otú ọ dị, gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ọdịnihu nke ndị na-atụkwasị ụwa a obi—atụmatụ ya, òtù ya, echiche ya na ihe onwunwe ya? Ọdịnihu ọ bụla ha nwere dị mkpụmkpụ n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “Ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Ya bụrụ otú ahụ, ò nwere ihe mere anyị kwesịrị iji ‘hụ ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya’?—1 Jọn 2:15.
Olee ihe ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke kwesịrị ime iji hụ na ụmụ ha ‘ga-enwe ebe mgbaba.’ Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Bịanụ, ụmụ m, gee m ntị: egwu Jehova ka m ga-ezi unu.” (Abụ Ọma 34:11) Ọ bụrụ na ndị nne na nna ejiri ihe nlereanya nke ha onwe ha na ndụmọdụ ha kụziere ụmụ ha ịtụ egwu Chineke, o yikarịrị ka hà ga-etolite ịghọ ndị ikom na ndị inyom nwere ntụkwasị obi siri ike n’ebe Jehova nọ.—Ilu 22:6.
Solomọn gara n’ihu ikwu, sị: “Egwu Jehova bụ isi iyi nke ndụ, isi n’ọnyà nile nke ọnwụ wezụga onwe gị.” (Ilu 14:27) Egwu Jehova bụ “isi iyi nke ndụ” n’ihi na ezi Chineke ahụ bụ “isi iyi nke mmiri na-enye ndụ.” (Jeremaịa 2:13) Inweta ihe ọmụma banyere Jehova na Jizọs Kraịst pụrụ inye anyị ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ịtụ egwu Chineke na-emekwa ka anyị si n’ọnyà nile nke ọnwụ wezụga onwe anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Ilu 13:14 na-ekwu, sị: “Iwu onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, isi n’ọnyà nile nke ọnwụ wezụga onwe gị.” Mgbe anyị na-atụ egwu Jehova, na-edebe iwu ya ma na-ekwe ka Okwu ya na-eduzi nzọụkwụ anyị, ọ̀ bụ na a dịghị echebe anyị pụọ n’omume na echiche ndị na-emerụ ahụ́, bụ́ ndị pụrụ ime ka anyị nwụchuo ọnwụ?
“Ịma Mma Eze”
N’ihe ka ukwuu n’oge ọchịchị ya, Solomọn bụ eze na-atụ egwu Chineke, nke na-erubere Jehova isi. Nke a so mee ka o nwee ihe ịga nke ọma n’ọchịchị ya. Gịnị na-ekpebi otú ọchịchị eze ga-enweru ihe ịga nke ọma? Ilu 14:28 na-aza, sị: “N’ụba nke ndị ọ bụla ka ịma mma eze dị: ma n’ụkọ mba ọ bụla ka mbibi onyeisi dị.” Ihe e ji ama otú eze nweruru ihe ịga nke ọma bụ otú ihe si agara ndị ọ na-achị. Ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ nwere mmasị ịnọgide n’okpuru ọchịchị ya, nke ahụ na-egosi na ọ ma achị. Solomọn nwere “mmadụ site [n’oké osimiri Uhie] ruo oké osimiri [Mediterenian], sitekwa n’osimiri [Yufretis] ruo nsọtụ nile nke ụwa.” (Abụ Ọma 72:6-8) E ji udo na ọganihu na-enweghị atụ mara ọchịchị ya. (1 Ndị Eze 4:24, 25) Ọchịchị Solomọn gara nke ọma. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ọha na eze enweghị mmasị n’onye ọchịchị, ọ na-egosi na a gaghịzi anabata ọchịchị ya.
A bịa na nke a, gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ebube nke Solomọn ahụ Ka Ukwuu, Eze Mezaịa bụ́ Jizọs Kraịst? Cheedị banyere ndị nọ n’okpuru ya ọbụna taa. Site n’otu nsọtụ ụwa ruo ná nsọtụ ya nke ọzọ, ihe karịrị nde ndị ikom na ndị inyom isii bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke ahọrọlarị ịnọ n’okpuru ọchịchị Kraịst. Ha na-egosipụta okwukwe na Jizọs, e jikọtakwara ha ọnụ n’ezi ofufe nke Chineke ahụ dị ndụ. (Jọn 14:1) Ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ, a ga-akpọlitewo ndị nile nọ ná ncheta Chineke n’ọnwụ. Ndị ezi omume nwere obi ụtọ, bụ́ ndị gosipụtaworo ekele maka Eze ha, ga-ejupụtazi ụwa Paradaịs. Lee otú nke ahụ ga-esi gosi na ọchịchị Kraịst nwere ihe ịga nke ọma! Ka anyị jigidesie olileanya anyị dị ebube nke Alaeze ahụ ike.
Abamuru Ime Mmụọ na Ndị nke Anụ Ahụ́
Ịtụ Chineke egwu nsọpụrụ pụrụ inye anyị udo nke obi na nke mmụọ. Nke a bụ n’ihi na iche echiche nke ọma na nghọta so n’ọtụtụ akụkụ nke amamihe. Ilu 14:29 na-ekwu, sị: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ nwere ọtụtụ nghọta: ma onye nwere obi ọkụ na-ebuli uche gbagọrọ agbagọ.” Nghọta na-enyere anyị aka ịmata na iwe a na-achịkwaghị achịkwa na-emebi ọnọdụ ime mmụọ anyị. “Ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ” socha n’ọrụ ndị pụrụ igbochi anyị ‘iketa alaeze Chineke.’ (Ndị Galeshia 5:19-21) A na-adụ anyị ọdụ ịghara ibu iwe n’obi, ọbụna mgbe e mejọrọ anyị. (Ndị Efesọs 4:26, 27) Enweghị ndidi pụkwara ime ka anyị kwuo ma ọ bụ mee ihe anyị ga-emecha kwaara ụta.
Eze Izrel ahụ kwuru banyere mmetụta ọjọọ iwe pụrụ inwe, sị: “Ndụ nke anụ ahụ́ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ: ma ire ure nke ọkpụkpụ nile ka ekworo bụ.” (Ilu 14:30) Ọrịa ndị iwe na ọnụma na-akpata na-agụnye nsogbu iku ume, ọbara mgbali elu, na ọrịa imeju, ọ na-emekwa ka akụkụ ahụ́ a na-akpọ anyịnya nke na-ewepụta ihe ndị na-agbari nri ghara ịrụ ọrụ nke ọma. Ndị dibịa Bekee na-ekwukwa na iwe na ọnụma na-eme ka ọrịa ndị dị ka ọnyá afọ, ahụ́ mgbakasị, ụkwara ume ọkụ, ọrịa akpụkpọ ahụ́ na nri agbarighị nke ọma kawanye njọ, ma ọ bụ ọbụna na-akpata ọrịa ndị a. N’aka nke ọzọ, “ndụ nke anụ ahụ́ ka obi dị jụụ bụ.” (Ilu 14:30, New International Version) Mgbe ahụ, anyị ga-abụ ndị maara ihe ma anyị “na-achụso ihe ndị na-akpata udo na ihe ndị na-ewuli ibe anyị elu.”—Ndị Rom 14:19.
Egwu Chineke Na-enyere Anyị Aka Ịghara Ịdị Na-ele Mmadụ Anya n’Ihu
Solomọn na-ekwu, sị: “Onye na-emegbu onye na-enweghị ike na-ata Onye keworo ya ụta: ma onye na-asọpụrụ Ya ka onye na-emere ogbenye amara bụ.” (Ilu 14:31) Onye na-atụ egwu Chineke na-aghọta na mmadụ nile nwere otu Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke. N’ihi ya, onye na-enweghị ike bụ mmadụ ibe ya, otú o sikwa emeso onye ahụ ihe na-emetụta Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ. Iji nye Chineke otuto, anyị aghaghị ịdị na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ ziri ezi na n’eleghị anya n’ihu. E kwesịrị ilebara Onye Kraịst dara ogbenye anya n’ụzọ ime mmụọ n’akpaghị ókè. Anyị aghaghị ikwusara ma ndị ogbenye ma ndị ọgaranya ozi ọma Alaeze Chineke.
Mgbe eze ahụ maara ihe na-ekwu banyere uru ọzọ dị n’ịtụ egwu Chineke, o kwuru, sị: “A na-enupụ onye na-emebi iwu n’ihe ọjọọ ya: ma onye nwere ebe mgbaba n’ọnwụ ya ka onye ezi omume bụ.” (Ilu 14:32) Olee otú e si enupụ onye na-emebi iwu? E kwuola na nke a nwere ike ịpụta na o nweghị olileanya inwetaghachi onwe ya mgbe ọdachi kpara ya aka ọjọọ. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, mgbe e nwere nsogbu, ezi omume nke onye na-atụ egwu Chineke na-aghọrọ ya ebe mgbaba. Site n’ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam ọbụna ruo n’ọnwu, ọ na-enwe mkpebi siri ike dị ka Job, bụ́ onye kwuru, sị: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m.”—Job 27:5.
Iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, ọ dị mkpa ka mmadụ na-atụ egwu Chineke ma nwee amamihe. Ma olee ebe a pụrụ ịchọta amamihe? Ilu 14:33 na-aza, sị: “N’obi onye nghọta ka amamihe na-anọgide: ma n’etiti ndị nzuzu ka ọ na-eme ka a mara ya.” Ee, a pụrụ ịchọta amamihe n’obi onye nwere nghọta. Otú ọ dị, olee otú o si eme ka a mara ya n’etiti ndị nzuzu? Dị ka otu akwụkwọ ntụaka si kwuo, “onye nzuzu, n’ịchọsi ike ime onwe ya ka o yie onye maara ihe, na-ekwupụ ihe o chere na ọ bụ amamihe, nke na-emesị bụrụ okwu nzuzu.”
“Na-ebuli Mba”
Eze Izrel dọọrọ uche anyị site n’otú egwu Chineke pụrụ isi baara ndị mmadụ n’otu n’otu uru gaa n’otú o si abara mba uru, o kwuru, sị: “Ezi omume na-ebuli mba: ma ihe ihere nke ndị nile dị iche iche ka mmehie bụ.” (Ilu 14:34) Lee otú e si mee ka ụkpụrụ a doo anya n’okwu metụtara mba Izrel! Ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ dị elu nke Chineke mere ka e bulie Izrel elu karịa mba ndị gbara ya gburugburu. Otú ọ dị, isi Izrel nupụrụ mgbe mgbe dugara ná mmechuihu na ọjụjụ Jehova mechara jụ ha. Ụkpụrụ a metụtakwara ndị Chineke taa. Ọgbakọ Ndị Kraịst dị iche n’ụwa n’ihi na ọ na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke. Ma, iji nọgide n’ọnọdụ ahụ e buliri elu, anyị nile n’otu n’otu aghaghị ịdị na-ebi ndụ dị ọcha. Nanị ihe mmehie na-ewetara anyị bụ mmechuihu, ọ na-ewetakwara Chineke na ọgbakọ ya nkọcha.
Solomọn kwuru ihe na-ewetara eze obi ụtọ, sị: “Ihe ohu nwere uche na-atọ eze ụtọ: ma nrubiga ókè nke iwe Ya ga-adị n’ahụ́ onye na-eweta ihere.” (Ilu 14:35) Ilu 16:13 na-ekwukwa, sị: “Ihe na-atọ ndị eze ụtọ ka egbugbere ọnụ ezi omume bụ; ọ bụkwa onye na-ekwu ihe ziri ezi ka ha na-ahụ n’anya.” Ee, Onye Ndú na Eze anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, na-enwe nnọọ obi ụtọ mgbe anyị ji ezi omume na nghọta na-eme ihe ma jiri ire anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ma na-eme ndị na-eso ụzọ. Mgbe ahụ, ka anyị na-arụsi ọrụ ahụ ike n’ezie ma nweta ngọzi ndị na-abịa site n’ịtụ egwu ezi Chineke ahụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Maka ntụle nke Ilu 14:1-25, lee Ụlọ Nche nke November 15, 2004, peeji nke 26-29, na July 15, 2005, peeji nke 17-20.
[Foto dị na peeji nke 15]
A pụrụ ịkụziri mmadụ ịtụ egwu Chineke