Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Guzogide Echiche Na-ezighị Ezi!

Guzogide Echiche Na-ezighị Ezi!

Guzogide Echiche Na-ezighị Ezi!

MGBE ọdachi dakwasịrị nna ochie bụ́ Job, ndị enyi ya atọ bụ́ Elifaz, Bildad na Zofa bịara ileta ya. Ha bịara imetere ya ebere na ịkasi ya obi. (Job 2:11) Onye nke kasị nwee nkwuwa okwu n’ime ha, nke ọ pụkwara ịbụ ya tọrọ abụọ ndị nke ọzọ bụ Elifaz. Ọ bụ ya bu ụzọ kwuo okwu, ọ bụkwa ya kwukarịchara ndị ọzọ. Echiche dị aṅaa ka Elifaz gosipụtara ugboro atọ o kwuru okwu?

Ka Elifaz chetara ihe sitere n’ikike karịrị nke mmadụ ọ hụrụ otu mgbe, o kwuru, sị: “Otu mmụọ wee gabiga n’ihu m; Ajị anụ ahụ́ m wee guzo ọtọ. Ọ na-eguzo eguzo, ma amataghị m otú ọ dị n’ile ya anya; otu ụdị dị n’ihu anya m: idebe ọnụ duu dị, ma olu ka m na-anụ, sị.” (Job 4:15, 16) Olee ụdị mmụọ metụtara echiche Elifaz? Okwu ọjọọ mmụọ ahụ kwuziri na-egosi na ọ bụghị otu n’ime ezi ndị mmụọ ozi Chineke ka ọ hụrụ. (Job 4:17, 18) Ọ bụ ajọ mmụọ. Ma ọ́ bụghị ya, gịnị mere Jehova ga-eji baara Elifaz na ndị enyi ya abụọ mba n’ihi ịgha ụgha? (Job 42:7) Ee, mmụọ ọjọọ metụtara Elifaz. Ihe ndị o kwuru gosipụtara echiche nke onye na-amaghị Chineke.

Echiche ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịhụ n’okwu Elifaz? Gịnị mere o ji dị anyị mkpa ịnọ na nche megide echiche na-ezighị ezi? Oleekwa ihe ndị anyị pụrụ ime iji guzogide ya?

“Ndị Ohu Ya Ka Ọ Na-adịghị Atụkwasị Obi”

Ugboro atọ o kwuru okwu, Elifaz nyere echiche na Chineke na-achọ ihe karịrị akarị n’aka ndị ohu ya, nakwa na ọ dịghị ihe ha na-eme na-adị ya mma. Elifaz gwara Job, sị: “Lee ọbụna ndị ohu Ya ka ọ na-adịghị atụkwasị obi; ndị mmụọ ozi Ya ka Ọ na-ebo ebubo na ha bụ ndị mmehie.” (Job 4:18) Elifaz mechara kwuo banyere Chineke, sị: “Ọbụna ndị nsọ Ya ka Ọ na-adịghị atụkwasị obi; ọzọ, eluigwe adịghị ọcha n’anya Ya.” (Job 15:15) Ọ jụkwara, sị: “Ọ̀ na-atọ Onye pụrụ ime ihe nile ụtọ na ị bụ onye ezi omume?” (Job 25:5) Bildad kwenyeere echiche a, n’ihi na o kwuru, sị: “Ọbụna ọnwa adịghị eti, ọzọ, kpakpando adịghị ọcha n’anya [Chineke].”—Job 25:5.

Anyị aghaghị ịnọ na nche ka echiche dị otú ahụ ghara imetụta anyị. Ọ pụrụ ime ka anyị chee na Chineke na-achọ ihe karịrị akarị n’aka anyị. Echiche a na-emegide nnọọ mmekọrịta anyị na Jehova. Ọzọkwa, ọ bụrụ na echiche dị otú a emetụta anyị, olee otú anyị ga-esi meghachi omume mgbe e nyere anyị ịdọ aka ná ntị dị anyị mkpa? Kama iji obi umeala nabata mgbazi ahụ, ‘obi anyị pụrụ ịdị ọkụ megide Jehova,’ anyị pụkwara ibuwere ya iwe n’obi. (Ilu 19:3) Lee ọdachi ime mmụọ nke ahụ ga-ewetara anyị!

“Ọ̀ Bụ Chineke Ka Mmadụ Na-abara n’Ihe?”

Echiche bụ́ na Chineke na-achọ ihe karịrị akarị n’aka mmadụ na echiche bụ́ na ọ na-ele ụmụ mmadụ anya dị ka ndị na-abaghị n’ihe nwere njikọ chiri anya. N’okwu nke atọ Elifaz kwuru, ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ Chineke ka mmadụ na-abara n’ihe? Ee e, kama onye nwere uche na-abara onwe ya n’ihe.” (Job 22:2) Elifaz nọ na-enye echiche na mmadụ abaghị n’ihe n’anya Chineke. N’ụzọ yiri nke ahụ, Bildad rụrụ ụka, sị: “Mmadụ ga-esikwa aṅaa bụrụ onye ezi omume n’ihu Chineke? ma ọ bụ, ọ̀ ga-esi aṅaa dị ọcha n’obi, bụ́ onye nwanyị mụrụ?” (Job 25:4) Ọ bụrụ na e jiri echiche a lee ya anya, olee otú Job, bụ́ mmadụ nkịtị, pụrụ isi chee na ọ ga-abụ onye ezi omume n’anya Chineke?

Ụfọdụ mmadụ taa nwere echiche na-ezighị ezi banyere onwe ha. Ihe ndị dị ka ezinụlọ a zụlitere mmadụ, nrụgide nke ndụ, ma ọ bụ isi n’agbụrụ ma ọ bụ ebo a kpọrọ asị pụrụ iso n’ihe ndị kpatara nke a. Ma Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-enwekwa obi ụtọ ịkụda ndị mmadụ mmụọ. Ọ bụrụ na ha enwee ike ime ka mmadụ chee na ọ dịghị ihe ọ ga-eme ga-adị Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile mma, ọ ga-adị mfe karị onye ahụ inwe nkụda mmụọ. Ka oge na-aga, onye dị otú ahụ pụrụ ịkpafu, ọbụna si n’ebe Chineke dị ndụ nọ wezụga onwe ya.—Ndị Hibru 2:1; 3:12.

Ime agadi na nsogbu ahụ́ ike pụrụ ịkpara ihe ndị anyị na-eme ókè. Ihe anyị na-eme n’ozi Alaeze ahụ pụrụ iyi nnọọ ihe dị nta ma e jiri ya tụnyere ihe ndị anyị mere mgbe anyị na-akatachabeghị ahụ́, mgbe anyị nwere ahụ́ ike karị na mgbe anyị gbasiri ike karị. Lee ka o si dị mkpa anyị ịghọta na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-achọ ka anyị chee na ihe anyị na-eme adịghị adị Chineke mma! Anyị aghaghị iguzogide echiche dị otú ahụ.

Ụzọ Isi Guzogide Echiche Na-ezighị Ezi

N’agbanyeghị ahụhụ Setan bụ́ Ekwensu wetaara ya, Job kwuru, sị: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m [ma ọ bụ, iguzosi ike n’ezi ihe].” (Job 27:5) N’ihi na ọ hụrụ Chineke n’anya, Job kpebiri ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, ọ dịghịkwa ihe ga-agbanwe nke ahụ. Nke a bụ ihe dị mkpa pụrụ inyere anyị aka iguzogide echiche na-ezighị ezi. Anyị aghaghị ịghọta ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ nke ọma ma zụlite ekele sitere n’obi maka ya. Ọ dịkwa anyị mkpa ime ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ mikwuo emie. A na-enweta nke a site n’ịmụchi Okwu Chineke anya na iji ekpere na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị na-amụta.

Dị ka ihe atụ, Jọn 3:16 na-ekwu, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya.” Jehova nwere ịhụnanya miri emi maka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ, otú o sikwa emeso ụmụ mmadụ ihe ruo ogologo oge egosipụtawo ịhụnanya ahụ. Ịtụgharị uche n’ihe atụ ndị sitere n’oge ndị gara aga kwesịrị ime ka anyị na-ekelekwu Jehova ma na-ahụkwu ya n’anya, nke a ga-enyekwara anyị aka iguzogide echiche na-ezighị ezi.

Tụlee otú Jehova si mesoo Ebreham ihe ka mbibi Sọdọm na Gọmọra na-eru nso. Ebreham jụrụ Jehova ugboro atọ banyere ikpe Ya. Ọ dịtụghị mgbe Jehova nwere mgbakasị ahụ́ ma ọ bụ wee iwe. Kama nke ahụ, ihe ọ zara mesiri Ebreham obi ike ma kasie ya obi. (Jenesis 18:22-33) Mgbe Chineke mesịrị napụta Lọt na ezinụlọ ya site na Sọdọm, Lọt rịọrọ ka ya gbaga n’obodo dịdebere ebe ahụ kama ịgbaga n’ugwu. Jehova zara ya, sị: “Lee, m hụwokwa gị ihu ọma n’okwu a, na m gaghị akwatu obodo a nke i kwuworo okwu banyere ya.” (Jenesis 19:18-22) Ihe ndekọ ndị a hà na-egosi na Jehova bụ onye ọchịchị na-achọ ihe karịrị akarị, nke na-adịghị ahụ n’anya na nke dị aka ike? Mba. Ha na-egosi onye ọ bụ n’ezie—Onye Ọchịchị na-ahụ n’anya, nke nwere obiọma, onye na-eme ebere na onye nwere nghọta.

Ihe atụ nke Erọn, Devid na Manase nke Izrel oge ochie na-agbagha echiche ahụ bụ́ na Chineke bụ onye na-ahụtakarị mmejọ na onye a na-apụghị imeta mma. Erọn mere oké mmehie atọ. Ọ kpụrụ nwa ehi ọlaedo, sonyere nwanne ya nwanyị bụ́ Miriam n’ikwugide Mozis, gharakwa ido Chineke nsọ na ịsọpụrụ ya na Meriba. Ka o sina dị, Jehova hụrụ ihe ọma n’ime ya ma nye ya ohere ịnọgide na-eje ozi dị ka nnukwu onye nchụàjà ruo mgbe ọ nwụrụ.—Ọpụpụ 32:3, 4; Ọnụ Ọgụgụ 12:1, 2; 20:9-13.

Eze Devid mere mmehie ndị dị oké njọ n’oge ọchịchị ya. Ha gụnyere ịkwa iko, ịkpa nkata igbu onye aka ya dị ọcha, na ịgụ ndị obodo ya ọnụ mgbe Jehova na-agwaghị ya mee otú ahụ. Otú ọ dị, Jehova hụrụ nchegharị Devid ma jiri iguzosi ike n’ihe mezuo ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ site n’ikwe ka ọ bụrụ eze ruo ọnwụ ya.—2 Samuel 12:9; 1 Ihe E Mere 21:1-7.

Eze Manase nke Juda wuuru Bel ebe ịchụàjà, mee ka ụmụ ya ndị ikom gabiga n’ime ọkụ, kwalite mgbaasị ma wuoro okpukpe ụgha dị iche iche ebe ịchụàjà n’ogige ụlọ nsọ ahụ. Mgbe o gosipụtasịrị nchegharị sitere n’obi, Jehova gbaghaara ya, mee ka ọ lọta ná ndọrọ n’agha ma nyeghachi ya ọchịchị ya. (2 Ihe E Mere 33:1-13) Ihe ndị a ọ̀ bụ ihe Chineke a na-apụghị imeta mma na-eme? Mbanụ!

Onye ahụ Na-ebo Ebubo Ụgha Na-eme Ihe ahụ Ọ Na-ebo Onye Ọzọ Ebubo Ya

O kwesịghị iju anyị anya na àgwà ọjọọ ndị ahụ Setan na-ebo Jehova ebubo na o nwere zuru Setan ahụ́. Setan dị aka ike, a pụghịkwa imeta ya mma. A pụrụ ịhụ nke a nke ọma n’omume nke iji ụmụaka achụ àjà bụ́ nke e jikọtara ya na okpukpe ụgha n’oge ndị gara aga. Ụmụ Izrel si n’ezi ofufe dapụ na-esure ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom n’ọkụ—ihe na-abatatụghị Jehova n’obi.—Jeremaịa 7:31.

Ọ bụ Setan bụ onye na-ahụtakarị mmejọ ọ bụghị Jehova. Mkpughe 12:10 na-ezo aka n’ebe Setan nọ dị ka “onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, bụ́ onye na-ebo ha ebubo ehihie na abalị n’ihu Chineke anyị!” N’aka nke ọzọ, ọbụ abụ ahụ bụrụ banyere Jehova, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo? Ma n’aka Gị ka mgbaghara dị.”—Abụ Ọma 130:3, 4.

Mgbe Echiche Na-ezighị Ezi Na-agakwaghị Adị

Lee ahụ́ efe ndị mmụọ ozi na-aghaghị inwewo mgbe a chụpụrụ Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe! (Mkpughe 12:7-9) Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị ajọ mmụọ a apụghịzi imetụta ọrụ ezinụlọ Jehova dị n’eluigwe nke ndị mmụọ ozi mejupụtara.—Daniel 10:13.

Ndị bi n’ụwa ga-aṅụrị ọṅụ n’isi nso. N’oge na-adịghị anya, mmụọ ozi nke si n’eluigwe na-arịda ma jiri mkpịsị ugodi nke abis na nnukwu agbụ ígwè n’aka ya ga-ejichi Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ma tụba ha n’ime abis nke arụghị ọrụ. (Mkpughe 20:1-3) Lee ahụ́ efe anyị ga-enwe mgbe nke a mere!

Ka ọ dịgodị, anyị aghaghị ịnọ na nche megide echiche na-ezighị ezi. Mgbe ọ bụla anyị chọpụtara na echiche ndị na-ezighị ezi egbebatawala anyị n’uche, ọ dị anyị mkpa iguzogide ha site n’ịtụgharị uche n’ịhụnanya Jehova. Mgbe ahụ, ‘udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi anyị na ike iche echiche anyị nche.’—Ndị Filipaị 4:6, 7.

[Foto dị na peeji nke 26]

Job guzogidere echiche na-ezighị ezi

[Foto dị na peeji nke 28]

Lọt mụtara na Jehova bụ Onye Ọchịchị nwere nghọta