Ihe Ndị Ọzọ Na-eche Banyere Anyị—Ọ̀ Dị Mkpa?
Ihe Ndị Ọzọ Na-eche Banyere Anyị—Ọ̀ Dị Mkpa?
Ọ FỌRỌ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-achọ ka e too ha. Okwu ịja mma pụrụ ime ka obi dị anyị mma, mee ka anyị chee na anyị mere nke ọma. Ịma na ndị ọzọ na-ele anyị anya ọma pụrụ ọbụna ime ka anyị chọọ imekwu nke ọma. Ma mgbe anyị chọpụtara na ihe anyị mere amasịghị ụfọdụ ndị, anyị na-enwe nkụda mmụọ. Egosighị mmasị ma ọ bụ nkatọ pụrụ igbu mmụọ anyị. Ihe ndị ọzọ na-eche banyere anyị nwere ike inwe mmetụta dị ukwuu n’otú anyị si ele onwe anyị anya.
Ọ ga-abụ ihie ụzọ ịghara ịchọ ịma ihe ndị ọzọ na-eche banyere anyị. Anyị pụrụ irite uru n’ezie ma anyị gwa ndị ọzọ ka ha nyochaa àgwà anyị. Mgbe nke ahụ dabeere n’ụkpụrụ omume ndị dị elu, ihe ndị ọzọ na-eche banyere anyị pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ahụ́ anyị ma mee ka anyị na-akpa ezi àgwà. (1 Ndị Kọrint 10:31-33) Otú ọ dị, echiche ọha na eze adịghị ezikarị ezi. Chee banyere echiche na-ezighị ezi ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ nwere banyere Jizọs Kraịst mgbe ha ‘malitere iti mkpu, na-asị: “Kpọgide ya n’osisi! Kpọgide ya n’osisi!”’ (Luk 23:13, 21-25) Anyị pụrụ nnọọ ịhapụ ichegbu onwe anyị banyere echiche ndị mmadụ nwere banyere anyị n’ihi ihe ndị na-abụghị eziokwu ha nụrụ banyere anyị, n’ihi anyaụfụ ma ọ bụ mkpọrọmasị ha nwere n’ebe anyị nọ. Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịdị na-eji ezi uche na amamihe eme ihe banyere ihe ndị ọzọ na-eche banyere anyị.
Olee Ndị Ihe Ha Na-eche Banyere Anyị Dị Mkpa?
Anyị na-achọ ka ndị anyị na ha na-akpachi anya n’ezi ofufe na-ele anyị anya ọma. Ndị a na-agụnye ndị òtù ezinụlọ anyị bụ́ ndị nọ n’eziokwu ahụ, na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị. (Ndị Rom 15:2; Ndị Kọlọsi 3:18-21) Ịhụnanya na nkwanye ùgwù nke ndị kwere ekwe ibe anyị na ‘mgbarịta ume anyị na ha’ dị anyị ezigbo mkpa. (Ndị Rom 1:11, 12) Site ‘n’ịdị nwayọọ n’obi, anyị na-ewere ya na ndị ọzọ ka anyị mma.’ (Ndị Filipaị 2:2-4) Ọzọkwa, anyị na-achọ ka “ndị na-edu ndu” n’etiti anyị—ndị okenye ọgbakọ—na-ele anyị anya ọma, anyị na-ejikwa nke a akpọrọ ihe.—Ndị Hibru 13:17.
Ihe ọzọ anyị na-achọsikwa ike bụ “ịbụ onye ndị nọ n’èzí na-agbara ezi akaebe.” (1 Timoti 3:7) Lee otú ọ ga-esi dị mma mgbe ndị ikwu anyị na-ekweghị ekwe, ndị ọrụ ibe anyị na ndị agbata obi anyị na-akwanyere anyị ùgwù! Ọ̀ bụkwa na anyị adịghị agbalị ịdị na-akpa ezi àgwà n’ebe ndị anyị na-ekwusara ozi ọma nọ ka ha wee nwee mmasị n’ebe ozi Alaeze ahụ dị? Anyị ịbụ ndị a maara n’ógbè anyị dị ka ndị dị ọcha n’omume, na ndị na-akwụwa aka ọtọ na-ewetara Chineke otuto. (1 Pita 2:12) Otú ọ dị, anyị apụghị imebi ụkpụrụ Bible iji nweta ihu ọma nke ndị ọzọ; anyị apụghịkwa ịdị na-eme ihu abụọ iji mee ka ha nwee mmasị n’ebe anyị nọ. Anyị aghaghị ịghọta na anyị apụghị ime ihe ga-amasị mmadụ nile. Jizọs kwuru, sị: “A sị na unu bụ akụkụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị akụkụ nke ụwa, kama ahọpụtawo m unu n’ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.” (Jọn 15:19) Ọ̀ dị ihe anyị pụrụ ime ka ndị na-emegide anyị wee na-akwanyere anyị ùgwù?
Otú Anyị Ga-esi Nweta Nkwanye Ùgwù nke Ndị Na-emegide Anyị
Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m; ma onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.” Matiu 10:22) Mkpọrọmasị dị otú a na-akpata ebubo obi ọjọọ mgbe ụfọdụ. Ndị ọchịchị obi ha na-adịghị ọcha n’ebe anyị nọ pụrụ ịkpọ anyị ndị “na-agba ọchịchị mgba okpuru” ma ọ bụ “ndị nduhie.” Ndị mmegide ọnụ na-aghọ nkọ pụrụ ibo anyị ebubo na anyị bụ ịrọ òtù na-enye nsogbu bụ́ ndị a na-aghaghị igbochi. (Ọrụ 28:22) Anyị pụrụ ịgbagha ebubo ụgha ndị a mgbe ụfọdụ. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịgbaso ndụmọdụ Pita onyeozi bụ́: “[Dịnụ] njikere mgbe nile ime ngọpụ n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ dị n’ime unu, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi na-eme nke ahụ.” (1 Pita 3:15) Ọzọkwa, anyị kwesịrị ịdị na-eji “okwu dị ọcha nke a na-apụghị ịkatọ akatọ” na-eme ihe “ka ihere wee mee onye nọ n’akụkụ na-emegide emegide, n’enweghị ihe ọjọọ ikwu banyere anyị.”—Taịtọs 2:8.
(Ka anyị na-agbalị iwepụ aha anyị n’ụta, anyị ekwesịghị ịda mbà n’obi mgbe a na-ekwutọ anyị n’ụzọ obi ọjọọ. E boro Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke zuru okè, ebubo na ọ bụ onye nkwulu, onye na-agba ọchịchị mgba okpuru, na ọbụna onye mgbaasị. (Matiu 9:3; Mak 3:22; Jọn 19:12) E kwutọrọ Pọl onyeozi. (1 Ndị Kọrint 4:13) Ma Jizọs ma Pọl leghachaara nkwutọ ndị ahụ anya ma nọgidesie ike n’ọrụ ha. (Matiu 15:14) Ha maara na ọ dịghị ihe ha ga-eme ga-atọ ndị iro ha ụtọ, ebe ọ bụ na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Taa, anyị na-eche otu ihe ịma aka ahụ ihu. Anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ mgbe ndị mmegide bụ́ ndị kpọrọ anyị asị na-agbasa ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere anyị.—Matiu 5:11.
Ndị Ihe Ha Na-eche Banyere Anyị Dị Mkpa n’Ezie
Ihe ndị mmadụ na-eche banyere anyị dịgasị nnọọ iche, na-adabere n’ebumnobi ha na ihe ha nụrụ banyere anyị. Ụfọdụ na-eto anyị ma na-akwanyere anyị ùgwù, ebe ndị ọzọ na-ekwutọ anyị ma kpọọ anyị asị. Otu ọ dị, ọ bụrụhaala na ụkpụrụ Bible na-eduzi anyị, anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji nwee obi ụtọ ma nọrọ n’udo.
Pọl onyeozi dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Anyị na-enweta ihu ọma Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst site n’iji obi ekele na-ekwe ka Okwu Chineke na-eduzi anyị n’ihe nile. N’ikpeazụ, ndị ihe ha na-eche banyere anyị kasị mkpa bụ Jehova na Ọkpara ya. Ihe ha na-eche banyere anyị bụ nnọọ otú anyị dị. Karịsịa, ndụ anyị dabeere ná nnwapụta ha.—Jọn 5:27; Jems 1:12.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]
“Otuto na-eme m ihere, maka na m na-arịọ otuto na nzuzo.”—ONYE INDIA NA-EDE URI BỤ́ RABINDRANATH TAGORE
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Ihe ndị kwere ekwe ibe anyị na-eche banyere anyị dị mkpa
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 30]
Culver Pictures