Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Ga-enyere Anyị Aka Ịchịkwa Mmetụta Anyị

Ihe Ndị Ga-enyere Anyị Aka Ịchịkwa Mmetụta Anyị

Ihe Ndị Ga-enyere Anyị Aka Ịchịkwa Mmetụta Anyị

Ò YIRI ka mmetụta ndị na-adịghị mma hà na-achịkwa ndụ gị mgbe ụfọdụ? Ị̀ na-ewe iwe ọsọ ọsọ ma ọ bụ na-enwe nkụda mmụọ? Nchegbu nke ndụ ò yiri ka ọ̀ na-akụda gị mmụọ? Gịnị ga-enyere gị aka?

Iji mmetụta emeghachi omume n’ihe bụ otu ihe e ji mara ụmụ mmadụ. Mgbe a chịkwara mmetụta nke ọma, ọ na-eme ka ndụ tọkwuo ụtọ. Otú ọ dị, Bible na-ekwu na “mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu.” (Eklisiastis 7:7) N’ụwa nke ihe ike na ihe mberede na-eme mgbe mgbe, ò nwere onye ihe ndị na-eme gburugburu ya na-adịghị emetụ n’ahụ́? Otú ọ dị, Akwụkwọ Nsọ na-ekwukwa, sị: “Ọ dịghị ihe dị mma karịa ka mmadụ na-aṅụrị n’ọrụ ya.” (Eklisiastis 3:22) Ya mere, iji mee ka ndụ tọkwuo ụtọ, ọ dị anyị mkpa ịmụta ịdị na-aṅụrị ọṅụ site n’ịdị na-enwe mmetụta ndị ziri ezi. Olee otú anyị pụrụ isi zụlite mmetụta ndị na-aba uru ma zere ndị na-emebi ihe?

Ime ihe banyere nsogbu anyị na-ebelatakarị mmetụta na-ezighị ezi ndị anyị na-enwe. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị anyị na-apụghị ịgbanwe, ọ́ kaghị mma ịgbanwe usoro ihe omume anyị ma ọ bụ ebe anyị bi ma ọ bụ ebe anyị na-arụ ọrụ kama ịnọgide na-echegbu onwe anyị? Ịkpagharị akpagharị, ige egwú na-atọ ụtọ, inwe mmega ahụ́ siri ike, ma ọ bụ imere onye nọ ná mkpa ihe ọma pụrụ ibelatatụ nchegbu anyị ma mee ka anyị nwetụ obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.

Otú ọ dị, ụzọ kasị mma isi wepụ echiche na-ezighị ezi bụ ịtụkwasị Onye Okike anyị obi. Mgbe echiche na-ezighị ezi na-achọghị ịpụ, ọ dị anyị mkpa ‘ịtụkwasị Chineke nchegbu nile anyị’ site n’ekpere. (1 Pita 5:6, 7) Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa . . . Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.” (Abụ Ọma 34:18, 19) Olee otú anyị pụrụ isi nwee obi ike na Chineke pụrụ ịbụ ‘Onye inyeaka anyị na Onye na-eme ka anyị gbapụ’? (Abụ Ọma 40:17) Anyị pụrụ ime otú ahụ site n’ịmụ Bible na ịtụgharị uche n’ihe atụ ya ndị mere eme bụ́ ndị na-eme ka mmasị Chineke nwere n’ebe ọdịmma nke ndị ohu ya nọ pụta ìhè.