Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Kraịst Ònye Ka Ọ Bụ?

Jizọs Kraịst Ònye Ka Ọ Bụ?

Jizọs Kraịst Ònye Ka Ọ Bụ?

CHEEDỊ ụdị obi ụtọ otu nwa okorobịa onye Juu aha ya bụ Andru na-aghaghị inwewo mgbe mbụ ọ nụrụ okwu Jizọs onye Nazaret! Bible na-ekwu na Andru ji ọsọ gbakwuru nwanne ya nwoke ma gwa ya, sị: “Anyị ahụwo Mezaịa [ma ọ bụ, Kraịst] ahụ.” (Jọn 1:41) N’asụsụ Hibru na Grik, okwu ndị a na-asụgharịkarị ịbụ “Mezaịa” na “Kraịst” pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” Jizọs bụ Onye E Tere Mmanụ, ma ọ bụ Onye Chineke Họpụtara—Onye Ndú e kwere ná nkwa. (Aịsaịa 55:4) Amụma ndị e buru banyere ya dị n’Akwụkwọ Nsọ, ndị Juu dị ndụ n’oge ahụ nọkwa na-atụ anya ya.—Luk 3:15.

Olee otú anyị si mara na Jizọs bụ n’ezie Onye Chineke Họpụtara? Ka anyị tụlee ihe mere n’afọ 29 O.A. mgbe Jizọs dị afọ 30. Ọ gakwuuru Jọn Onye Na-eme Baptizim ka o mee ya baptizim n’Osimiri Jọdan. Bible na-ekwu, sị: “Mgbe e mesịrị ya baptizim, Jizọs siri na mmiri ahụ pụta ozugbo; ma, lee! eluigwe meghere, o wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata dị ka nduru na-abịakwasị ya. Lee! E nwekwara olu sitere n’eluigwe nke sịrị: ‘Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.’” (Matiu 3:16, 17) Mgbe Jọn nụsịrị okwu ndị ahụ na-egosi na Chineke nwapụtara Jizọs, Jọn ọ̀ pụrụ inwe obi abụọ ọ bụla na Jizọs bụ Onye Chineke Họpụtara? Site n’ịwụsa Jizọs mmụọ nsọ Ya, Jehova Chineke tere ya mmanụ, ma ọ bụ họpụta ya, ịbụ Eze nke Alaeze Ya na-abịanụ. Jizọs si otú ahụ, ghọọ Jizọs Kraịst, ma ọ bụ Jizọs Onye E Tere Mmanụ. Otú ọ dị, n’ụzọ dị aṅaa ka Jizọs si bụrụ Ọkpara Chineke? Olee otú o si malite?

Ọ Malitere “na Mgbe Ochie”

A pụrụ ikwu na ndụ Jizọs nwere agba atọ. Agba nke mbụ malitere ogologo oge tupu a mụọ ya dị ka mmadụ. Maịka 5:2 na-ekwu na ọ malitere “na mgbe ochie, site n’ụbọchị nile nke mgbe ebighị ebi gara aga.” Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Esi m n’ógbè dị n’elu”—ya bụ, n’eluigwe. (Jọn 8:23) O biela n’eluigwe dị ka mmụọ dị ike tupu mgbe ahụ.

Ebe ọ bụ na ihe nile e kere eke nwechara oge ha malitere, o nwere mgbe Chineke nọ nanị ya. Otú ọ dị, ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ gara aga, Chineke ghọrọ Onye Okike. Ònye bụ onye mbụ o kere? Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible kọwara Jizọs dị ka “mmalite nke ihe Chineke kere.” (Mkpughe 3:14) Jizọs bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke.” Nke a dị otú a “n’ihi na e sitere n’aka ya kee ihe ndị ọzọ nile n’eluigwe na n’elu ụwa, ihe ndị a pụrụ ịhụ anya na ihe ndị a na-apụghị ịhụ anya.” (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Ee, Jizọs bụ nanị onye Chineke ji aka ya kee. N’ihi ya, a na-akpọ ya “Ọkpara [Chineke] mụrụ nanị ya.” (Jọn 3:16) Ọkpara ahụ nwere utu aha bụ́ “Okwu ahụ.” (Jọn 1:14) N’ihi gịnị? N’ihi na tupu a mụọ ya n’ụwa dị ka mmadụ, ọ rụrụ ọrụ n’eluigwe dị ka ọnụ na-ekwuru Chineke.

“Okwu ahụ” na Jehova Chineke nọ “ná mmalite,” mgbe e kere “eluigwe na ụwa.” Ọ bụ ya bụ onye Chineke gwara, sị: “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị.” (Jọn 1:1; Jenesis 1:1, 26) Ọkpara Jehova nọ n’akụkụ Nna ya, jiri ịnụ ọkụ n’obi soro ya na-arụ ọrụ. N’Ilu 8:22-31, a kọwara ya dị ka onye na-ekwu, sị: “Anọkwa m n’akụkụ [Onye Okike], dị ka onye ọkà: M wee bụrụ ihe na-atọ Ya ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwú n’ihu Ya mgbe nile.”

Lee otú Jehova Chineke na Ọkpara ọ mụrụ nanị ya na-aghaghị isiwo mara onwe ha nke ọma ka ha na-arụkọ ọrụ ọnụ! Mmekọrịta ahụ chiri anya ya na Jehova nwere ruo ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ metụtara Ọkpara Chineke nke ukwuu. Ọkpara a na-erube isi bịara dịrị nnọọ ka Nna ya, bụ́ Jehova. N’ezie, Ndị Kọlọsi 1:15 kpọrọ Jizọs “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya.” Nke a bụ otu ihe mere o ji dị anyị ezigbo mkpa inweta ihe ọmụma banyere Jizọs iji gboo mkpa ime mmụọ anyị na agụụ anyị bu pụta ụwa nke ịmata Chineke. Ihe nile Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa bụ kpọmkwem ihe Jehova chọrọ ka o mee. N’ihi ya, ịmara Jizọs pụtakwara ịmụba ihe ọmụma anyị banyere Jehova. (Jọn 8:28; 14:8-10) Ma olee otú Jizọs si bịa n’ụwa?

Ndụ Ya Dị Ka Mmadụ

Agba nke abụọ nke ndụ Jizọs malitere mgbe Chineke zitere Ọkpara ya n’ụwa. Jehova mere nke a site n’ibufe ndụ Jizọs n’ụzọ ọrụ ebube site n’eluigwe gaa n’akpa nwa nke otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ onye Juu aha ya bụ Meri. Jizọs eketaghị ezughị okè n’ihi na o nweghị nna bụ́ mmadụ. Mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike Jehova nọ n’ọrụ, bịakwasịrị Meri, ikike ya ‘kpuchikwara’ ya, mee ka ọ dị ime n’ụzọ ọrụ ebube. (Luk 1:34, 35) N’ihi ya, Meri mụrụ nwa zuru okè. Dị ka nwa nkuchi nke ọkwa nkà bụ́ Josef, a zụlitere ya n’ezinụlọ na-abaghị ọgaranya, ọ bụkwa nwa mbụ n’ezinụlọ ebe e nwere ụmụ ndị ọzọ.—Aịsaịa 7:14; Matiu 1:22, 23; Mak 6:3.

A maghị ihe dị ukwuu banyere oge Jizọs bụ nwata, ma a maara otu ihe mere mgbe ahụ nke ọma. Mgbe Jizọs dị afọ 12, ndị mụrụ ya kpọọrọ ya gaa Jeruselem maka ememe Ngabiga nke ha na-aga kwa afọ. Mgbe ọ nọ ebe ahụ, ọ nọtere aka n’ụlọ nsọ ahụ, ‘nọrọ ọdụ n’etiti ndị nkụzi, na-egekwa ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ.’ Ọzọkwa, “nghọta ya na azịza ya nọgidere na-eju ndị nile na-ege ya ntị anya.” Ee, ọ bụghị nanị na Jizọs ahụ ka na-eto eto pụrụ ịjụ ajụjụ ndị na-akpali iche echiche na ndị dabeere n’ihe ime mmụọ, kama ọ pụkwara inye azịza amamihe dị na ha bụ́ ndị na-eju ndị ọzọ anya. (Luk 2:41-50) Ka ọ na-etolite n’obodo Nazaret, ọ mụrụ ọrụ ịkwa nkà, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ bụ nna nkụchi ya, bụ́ Josef, kụziiri ya ọrụ ahụ.—Matiu 13:55.

Jizọs biri na Nazaret ruo mgbe ọ gbara afọ 30. Ọ gakwuziiri Jọn ka o mee ya baptizim. Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, ọ malitere ozi ya siri ike. O ji afọ atọ na ọkara jezuo ebe nile n’obodo ya, na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. O nyere ihe àmà gosiri na ọ bụ Chineke zitere ya. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịrụ ọtụtụ ọrụ ebube—ọrụ ndị dị ike a na-apụghị iji ike mmadụ rụọ.—Matiu 4:17; Luk 19:37, 38.

Jizọs bụ onye na-emeso ndị mmadụ ihe n’ụzọ dị nro na onye nwere mmetụta miri emi. Ịdị nro ya pụtara ìhè karịsịa n’otú o si lee ndị ọzọ anya ma meso ha ihe. Ndị mmadụ nwere mmasị ijekwuru Jizọs n’ihi na ọ bụ onye dị mfe njekwuru na onye nwere obiọma. Ahụ́ na-eru ọbụna ụmụaka ala ma ha na ya nọrọ. (Mak 10:13-16) Jizọs kwanyeere ụmụ nwanyị ùgwù, n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị n’oge ya ledara ha anya. (Jọn 4:9, 27) O nyeere ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu aka ‘inwetara mkpụrụ obi ha ume ọhụrụ.’ (Matiu 11:28-30) Ọ kụziri ihe n’ụzọ doro anya, n’ụzọ dị mfe nghọta na n’ụzọ dị irè. Ihe ndị ọ kụziri gosipụtakwara ezi ọchịchọ o nwere ime ka ndị na-ege ya ntị mata ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.—Jọn 17:6-8.

Site n’iji mmụọ nsọ Chineke rụọ ọtụtụ ọrụ ebube, Jizọs ji ọmịiko gwọọ ndị ọrịa na ndị e wedara n’ala. (Matiu 15:30, 31) Dị ka ihe atụ, otu onye ekpenta bịakwutere ya ma gwa ya, sị: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Gịnị ka Jizọs mere? Ọ matịrị aka ya ma bitụ nwoke ahụ aka, na-asị ya: “Achọrọ m. Ka e mee ka ị dị ọcha.” Nwoke ahụ na-arịa ọrịa gbakere!—Matiu 8:2-4.

Tụleekwa ihe merenụ n’otu oge mgbe otu ìgwè mmadụ bụ́ ndị bịakwutere Jizọs nọrọ ụbọchị atọ n’enweghị ihe ha ga-eri. O nwere ọmịiko n’ahụ́ ha ma site n’ụzọ ọrụ ebube nye “puku ndị ikom anọ, ma e wezụga ndị inyom na ụmụntakịrị” nri. (Matiu 15:32-38) N’oge ọzọ, Jizọs mere ka oké ifufe nke yiri ndụ ndị enyi ya egwu dajụọ. (Mak 4:37-39) Ọ kpọlitere ma ọ bụ weghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ. * (Luk 7:22; Jọn 11:43, 44) Jizọs jidị ọchịchọ obi nye ndụ ya zuru okè ka ihe a kpọrọ mmadụ na-ezughị okè wee nwee olileanya maka ọdịnihu. Lee ịhụnanya dị ukwuu Jizọs nwere maka ụmụ mmadụ!

Ebee Ka Jizọs Nọ Ugbu A?

Jizọs nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ mgbe ọ dị afọ iri atọ na atọ na ọkara. * Ma ọnwụ abụghị njedebe nke ndụ ya. Agba nke atọ nke ndụ ya malitere mgbe ihe dị ka ụbọchị atọ gasịrị mgbe Jehova Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ dị ka onye bụ́ mmụọ. Mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, o mere ka ọtụtụ narị ndị dị ndụ na narị afọ mbụ O.A., hụ ya anya. (1 Ndị Kọrint 15:3-8) Mgbe nke a gasịrị, ọ ‘nọdụrụ ala n’aka nri Chineke’ ma chere ka e nye ya ikike ịchị dị ka eze. (Ndị Hibru 10:12, 13) Mgbe oge ruru, Jizọs malitere ịchị dị ka Eze. N’ihi ya, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele Jizọs anya ugbu a? Ànyị kwesịrị ile ya anya dị ka onye a na-egbu egbu nke na-ata ahụhụ? Ka ànyị kwesịrị iwere ya dị ka onye a ga-efe ofufe? Jizọs abụghịzi mmadụ, ọ bụghịkwanụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Kama nke ahụ, ọ bụ mmụọ siri ike, Eze na-achị achị. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-achịru ọchịchị ya n’ụwa anyị a nọ ná nsogbu.

N’iji ihe atụ mee ihe, Mkpughe 19:11-16 na-akọwa Jizọs Kraịst dị ka eze nke nọ n’elu ịnyịnya ọcha ma na-abịa ikpe ikpe na ibu agha n’ezi omume. O nwere “otu ogologo mma agha dị nkọ, ka o wee jiri ya tigbuo mba nile.” Ee, Jizọs ga-eji ike ya dị ukwuu bibie ndị ajọ omume. Ma gịnị banyere ndị na-agbalị ịgbaso ihe nlereanya o setịpụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa? (1 Pita 2:21) Ya na Nna ya ga-echebe ha gabiga ‘agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile’ nke na-abịanụ—nke a na-akpọkarị Amagedọn—ka ha wee nwee ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi dị ka ndị nọ n’ụwa bụ́ ndị Alaeze eluigwe nke Chineke na-achị.—Mkpughe 7:9, 14; 16:14, 16; 21:3, 4.

Lee ọrụ ebube Jizọs ga-arụrụ ihe nile a kpọrọ mmadụ mgbe ọ ga-achị ọchịchị udo ya! (Aịsaịa 9:6, 7; 11:1-10) Ọ ga-agwọ ọrịa ma mee ka ọnwụ gharazie ịdị. Chineke ga-eji Jizọs mee ihe ịkpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ n’ọnwụ, na-enye ha ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala. (Jọn 5:28, 29) Anyị apụdịghị ichetụ n’echiche otú ndụ ga-esi tọọ anyị ụtọ n’oge ọchịchị Alaeze. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị nọgide na-enweta ihe ọmụma Bible ma na-amatakwu banyere Jizọs Kraịst.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 A maara ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ nke ọma. Ọbụna ndị iro Jizọs kwetara na ‘o mere ọtụtụ ihe ịrịba ama.’—Jọn 11:47, 48.

^ par. 17 Maka nkọwa banyere ma Kraịst ọ̀ nwụrụ n’elu osisi ka ọ̀ bụ n’elu obe, lee peeji nke 89-90 nke akwụkwọ bụ́ Reasoning From the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 7]

JIZỌS Ọ̀ BỤ CHINEKE PỤRỤ IME IHE NILE?

Ọtụtụ ndị okpukpe na-asị na Jizọs bụ Chineke. Ụfọdụ na-azọrọ na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Dị ka ozizi a si kwuo, “Nna ahụ bụ Chineke, Ọkpara ahụ bụ Chineke, Mmụọ Nsọ bụ Chineke, ma otú ọ dị, e nweghị Chineke atọ kama ọ bụ otu Chineke.” E kweere na ha atọ “na-adịru ebighị ebi, harakwa nhata.” (The Catholic Encyclopedia) Echiche ndị dị otú ahụ hà ziri ezi?

Jehova Chineke bụ Onye Okike. (Mkpughe 4:11) O nweghị mmalite ma ọ bụ ọgwụgwụ, ọ bụkwa onye pụrụ ime ihe nile. (Abụ Ọma 90:2) N’aka nke ọzọ, Jizọs nwere mmalite. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Mgbe ọ na-ekwu banyere Chineke dị ka Nna ya, Jizọs kwuru, sị: “Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28) Jizọs kọwakwara na o nwere ihe ndị ya na ndị mmụọ ozi na-amaghị kama ndị ọ bụ nanị Nna ya ma.—Mak 13:32.

Ọzọkwa, Jizọs kpegaara Nna ya ekpere, sị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.” (Luk 22:42) Ònye ka Jizọs nọ na-ekpegara ekpere ma ọ́ bụghị Onye ka ya elu? Ọzọkwa, ọ bụ Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ bụghị Jizọs kpọlitere onwe ya. (Ọrụ 2:32) O doro anya na Nna ahụ na Ọkpara ya ahaghị nhata tupu Jizọs abịa n’ụwa ma ọ bụ n’oge ọ nọ n’ụwa. Gịnị banyere mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ gaa n’eluigwe? Ndị Kọrint nke Mbụ 11:3 na-ekwu, sị: “Isi nke Kraịst ahụ bụ Chineke.” N’ezie, Ọkpara ahụ ga-anọ n’okpuru Chineke mgbe nile. (1 Ndị Kọrint 15:28) Ya mere, Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Jizọs abụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Kama, ọ bụ Ọkpara Chineke.

Ihe a sị na ọ bụ onye nke atọ n’Atọ n’Ime Otu—mmụọ nsọ—abụghị onye. N’ikpegara Chineke ekpere, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ị na-ezipụ mmụọ Gị, e kee ha.” (Abụ Ọma 104:30) Mmụọ a abụghị Chineke n’onwe ya; ọ bụ ike ọrụ ọ na-ezipụ ma ọ bụ nke ọ na-eji emezu ihe ọ bụla ọ chọrọ. Chineke ji ya kee mbara igwe, ụwa, na ihe nile dị ndụ. (Jenesis 1:2; Abụ Ọma 33:6) Chineke nyere ndị ikom dere Bible mmụọ ya. (2 Pita 1:20, 21) Ya mere, Atọ n’Ime Otu abụghị ozizi sitere n’Akwụkwọ Nsọ. * Bible kwuru, sị: “Jehova bụ Chineke anyị, Jehova bụ otu.”—Deuterọnọmi 6:4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Iji nwetakwuo nkọwa banyere ya, Lee broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 5]

Mgbe e mere Jizọs baptizim ọ ghọrọ Onye Chineke E Tere Mmanụ

[Foto dị na peeji nke 7]

Jizọs tinyere ike ya n’ọrụ Chineke nyere ya

[Foto dị na peeji nke 7]

Taa, Jizọs bụ Eze dị ike