Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgide Na-eje Ije Dị Ka Jizọs Kraịst Jere

Nọgide Na-eje Ije Dị Ka Jizọs Kraịst Jere

Nọgide Na-eje Ije Dị Ka Jizọs Kraịst Jere

“Onye na-asị na ya na [Chineke] nọgidere na-adị n’otu jikwa ụgwọ n’onwe ya ịnọgide na-eje ije kpọmkwem dị ka onye ahụ [Jizọs] jere.”—1 JỌN 2:6.

1, 2. Gịnị ka ilegide Jizọs anya gụnyere?

“PỌL ONYEOZI dere, sị: “Ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ nke e setịpụrụ n’ihu anyị, ka anyị na-elegide anya n’ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ, bụ́ Jizọs.” (Ndị Hibru 12:1, 2) Ikwesị ntụkwasị obi na-achọ ka anyị legide Jizọs Kraịst anya.

2 Okwu Grik oge ochie maka ‘ilegide anya,’ dị ka e si jiri ya mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst pụtara “mmadụ ilegide anya otu ebe n’enweghị ihe ndọpụ uche,” “iwepụ anya n’otu ihe iji nwee ike ịhụ ihe ọzọ,” “ilekwasị nnọọ otu ihe anya.” Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “Ozugbo onye Gris na-agba ọsọ n’ámá egwuregwu wepụrụ anya ya n’ụzọ ahụ ọ na-agba ọsọ na ya nakwa n’ebe ọ na-achọ ịgbaru ma lewe ndị na-ekiri ya anya, ọ gaghịzi na-agbasi ike. Otú ahụ ka ọ dịkwa Onye Kraịst.” Ihe ndọpụ uche pụrụ ibelata ọganihu ime mmụọ anyị. Anyị aghaghị ilegide Jizọs Kraịst anya. Gịnịkwa ka anyị na-achọ ịhụ n’ahụ́ Onye Nnọchiteanya Ukwu ahụ? Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “onye nnọchiteanya ukwu” pụtara “onye ndú bụ́ isi, onye na-edu ndú n’ihe ọ bụla ma si otú ahụ na-esetịpụ ihe nlereanya.” Ilegide Jizọs anya chọrọ anyị ịgbaso ihe nlereanya ya.

3, 4. (a) Ije ije dị ka Jizọs Kraịst jere na-achọ gịnị n’aka anyị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ilebara anya?

3 Bible na-ekwu, sị: “Onye na-asị na ya na [Chineke] nọgidere na-adị n’otu jikwa ụgwọ n’onwe ya ịnọgide na-eje ije kpọmkwem dị ka onye ahụ [Jizọs] jere.” (1 Jọn 2:6) Anyị aghaghị ime ka anyị na Chineke nọgide na-adị n’otu site n’irube isi n’iwu Jizọs dị ka o rubere isi ná ndị nke Nna ya.—Jọn 15:10.

4 N’ihi ya, ije ije dị ka Jizọs jere na-achọ ka anyị legide ya anya dị ka Onye Ndú Bụ́ Isi ma na-agbasochi nzọụkwụ ya anya. Ajụjụ ndị dị mkpa a ga-atụle n’akụkụ a bụ: Olee otú Kraịst si edu anyị taa? Olee otú iṅomi otú o si eje ije kwesịrị isi metụta anyị? Olee uru ndị dị n’ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ Jizọs Kraịst setịpụrụ?

Otú Kraịst Si Edu Ụmụazụ Ya

5. Olee nkwa Jizọs kwere ụmụazụ ya tupu ya arịgoro eluigwe?

5 Tupu ya arịgoro eluigwe, Jizọs Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ mere ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya, o kenyekwara ha ọrụ dị mkpa. O kwuru, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” N’oge ahụ, Onye Ndú ahụ Bụ́ Isi kwekwara nkwa ịnọnyere ha ka ha na-arụ ọrụ a, na-asị: “Lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:19, 20) Olee otú Jizọs Kraịst si anọnyere ụmụazụ ya n’oge ọgwụgwụ usoro ihe a?

6, 7. Olee otú Jizọs si eji mmụọ nsọ edu anyị?

6 Jizọs kwuru, sị: “Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna ahụ ga-ezite n’aha m, nke ahụ ga-akụziri unu ihe nile ma chetara unu ihe nile m gwara unu.” (Jọn 14:26) Mmụọ nsọ, bụ́ nke e zitere n’aha Jizọs, na-eduzi anyị ma na-ewusi anyị ike taa. Ọ na-eme ka anyị na-aghọta ihe ime mmụọ ma na-enyere anyị aka ịghọta “ọbụna ihe ndị miri emi nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 2:10) Ọzọkwa, àgwà nsọpụrụ Chineke ndị dị ka “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye” bụ “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Ndị Galeshia 5:22, 23) Site n’enyemaka nke mmụọ nsọ, anyị pụrụ ịzụlite àgwà ndị a.

7 Ka anyị na-amụ Akwụkwọ Nsọ ma na-agbalị itinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ, mmụọ Jehova na-enyere anyị aka ito eto n’amamihe, nghọta, ihe ọmụma, ikpe na izuzu. (Ilu 2:1-11) Mmụọ nsọ na-enyekwara anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa na ule. (1 Ndị Kọrint 10:13; 2 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Filipaị 4:13) A na-agba Ndị Kraịst ume ‘ka ha sachapụ onwe ha mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ, na-eme ka ịdị nsọ zuo okè.’ (2 Ndị Kọrint 7:1) Ànyị pụrụ n’ezie ibi ndụ dị nsọ, ma ọ bụ nke dị ọcha, bụ́ nke Chineke chọrọ anyị n’aka n’enwetaghị enyemaka nke mmụọ nsọ? Mmụọ nsọ, bụ́ ihe Jehova Chineke nyere Ọkpara ya ikike iji eme ihe, bụ otu n’ime ihe ndị Jizọs ji edu anyị taa.—Matiu 28:18.

8, 9. Olee otú Kraịst si eji “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” edu ndú?

8 Tụlee ihe ọzọ Kraịst ji edu ọgbakọ ya taa. Jizọs kwuru banyere ọnụnọ ya na ọgwụgwụ nke usoro ihe a, sị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, bụ́ onye nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, inye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị? Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ! N’ezie asị m unu, Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe nile o nwere.”—Matiu 24:3, 45-47.

9 ‘Nna ukwu’ ahụ bụ Jizọs Kraịst. “Ohu ahụ” bụ ìgwè Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa. E nyere òtù ohu a ọrụ ilekọta ihe Jizọs ndị dị n’ụwa na inye nri ime mmụọ n’oge ya. Ọ bụ nanị obere ìgwè ndị nlekọta ruru eru bụ́ ndị so ‘n’ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche’ nke ọtụtụ ndị mejupụtara na-eje ozi dị ka Òtù Na-achị Isi, ha na-anọchitekwa anya òtù ohu ahụ. Ha na-eduzi ọrụ nkwusa Alaeze zuru ụwa ọnụ ma na-enye nri ime mmụọ na-edozi ahụ́ n’oge ya. Ya mere, Kraịst ji “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na Òtù Na-achị Isi ya, edu ọgbakọ ya.

10. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị okenye anya, n’ihi gịnịkwa?

10 Ihe ọzọkwa Kraịst ji edu ndú bụ “onyinye n’ụdị mmadụ”—ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta. E nyere ha “iji wee gbazigharịa ndị nsọ, maka ọrụ ije ozi, maka iwuli ahụ́ nke Kraịst ahụ elu.” (Ndị Efesọs 4:8, 11, 12) Ndị Hibru 13:7 na-ekwu banyere ha, sị: “Na-echetanụ ndị na-edu ndú n’etiti unu, bụ́ ndị gwaworo unu okwu Chineke, ka unu na-ahụkwa ihe na-esi n’omume ha apụta, na-eṅominụ okwukwe ha.” Ndị okenye na-edu ndú n’ọgbakọ. Ebe ọ bụ na ha na-eṅomi Kraịst Jizọs, okwukwe ha na-aghọ ihe kwesịrị nṅomi. (1 Ndị Kọrint 11:1) Anyị pụrụ igosi ekele anyị nwere maka ndokwa inwe ndị okenye site n’irube isi na ido onwe anyị n’okpuru ndị a e nyere anyị dị ka “onyinye n’ụdị mmadụ.”—Ndị Hibru 13:17.

11. Olee ihe ndị Kraịst ji edu ụmụazụ ya taa, oleekwa ihe ije ije dị ka o jere gụnyere?

11 Ee, Jizọs Kraịst ji mmụọ nsọ, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na ndị okenye ọgbakọ, edu ụmụazụ ya taa. Anyị ije ije dị ka Kraịst jere na-agụnye ịghọta ihe ndị o ji edu ndú na ido onwe anyị n’okpuru ha. Ọ na-agụnyekwa anyị iṅomi otú o si jee ije. Pita onyeozi dere, sị: “Ọ bụ n’ụzọ a ka a kpọrọ unu, n’ihi na ọbụna Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) Olee otú anyị ịgbaso ihe nlereanya zuru okè nke Jizọs kwesịrị isi metụta anyị?

Jiri Ezi Uche Na-eme Ihe Mgbe I Ji Ikike Gị Eme Ihe

12. Olee ihe nlereanya Kraịst nke kwesịrị ịmasị ndị okenye ọgbakọ karịsịa?

12 Ọ bụ ezie na Jizọs nwetara ikike na-enweghị atụ site n’aka Nna ya, o ji ezi uche jiri ya mee ihe. Mmadụ nile nọ n’ọgbakọ—karịsịa ndị nlekọta—kwesịrị ime ka ‘ezi uche ha bụrụ nke mmadụ nile maara.’ (Ndị Filipaị 4:5; 1 Timoti 3:2, 3) Ebe ọ bụ na ndị okenye nwetụrụ ikike n’ọgbakọ, ọ dị oké mkpa ka ha na-agbaso nzọụkwụ Kraịst n’iji ya eme ihe.

13, 14. Olee ụzọ ndị okenye pụrụ isi ṅomie Kraịst ka ha na-agba ndị ọzọ ume ijere Chineke ozi?

13 Jizọs chebaara erughị eru nke ndị na-eso ụzọ ya echiche. Ọ gwaghị ha mee ihe ha na-agaghị emeli. (Jọn 16:12) N’amanyeghị ha amanye, Jizọs gbara ụmụazụ ya ume ‘itinyesi mgbali ike’ n’ime uche Chineke. (Luk 13:24) O mere nke a site n’ibute ụzọ n’ime ihe ọ chọrọ ka ha mee na ịkpali obi ha. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị okenye taa adịghị amanye ndị ọzọ ijere Chineke ozi site n’imenye ha ihere na ime ka ha nwee obi amamikpe. Kama nke ahụ, ha na-agba ha ume ijere Jehova ozi n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ na nke ha nwere n’ebe Jizọs, nakwa ụmụ mmadụ ibe ha, nọ.—Matiu 22:37-39.

14 Jizọs ejighị ikike e nyere ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi site n’iji ya achịkwa ndụ ndị ọzọ. Ọ dịghị mgbe ọ tụụrụ ha ụkpụrụ ndị ha na-agaghị agbasoli ma ọ bụ nye ha ọtụtụ iwu. Ihe o mere bụ ịkpali ndị ọzọ ime ihe site n’iji ụkpụrụ ndị dị n’iwu ndị ahụ e nyere site n’aka Mozis mee ihe iji ruo n’obi ha. (Matiu 5:27, 28) N’iṅomi Jizọs Kraịst, ndị okenye na-ezere ime iwu aka ike ma ọ bụ na-esi ọnwụ ka a gbasoo echiche nke aka ha. N’okwu ndị metụtara uwe na ejiji ma ọ bụ ntụrụndụ, ndị okenye na-agbalị iru n’obi site n’iji ụkpụrụ ndị sitere n’Okwu Chineke mee ihe, dị ka ndị dị na Maịka 6:8; 1 Ndị Kọrint 10:31-33; na 1 Timoti 2:9, 10.

Na-enwe Ọmịiko n’Ahụ́ Ndị Mmadụ Ma Na-agbaghara Ha

15. Olee otú Jizọs si meghachi omume n’emezighị emezi nke ndị na-eso ụzọ ya?

15 Kraịst hapụụrụ anyị ihe nlereanya ịgbaso n’ụzọ o si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe mgbe ha na-emezighị emezi. Tụlee ihe abụọ mere n’abalị ikpeazụ ọ nọrọ dị ka mmadụ n’ụwa. Mgbe o rutesịrị Getsemeni, Jizọs ‘kpọọrọ Pita na Jems na Jọn tinyere onwe ya’ ma gwa ha ka ha ‘nọgide na-eche nche.’ Mgbe ahụ, “ka ọ gara n’ihu nke nta, ọ dara n’ala wee malite ikpe ekpere.” Mgbe ọ laghachiri, ọ “hụ ha ka ha na-ehi ụra.” Gịnị ka Jizọs mere? Ọ sịrị: “N’ezie, mmụọ na-anụ ọkụ, ma anụ ahụ́ adịghị ike.” (Mak 14:32-38) Kama iji olu ike baara Pita, Jems na Jọn mba, o gosiri ọmịiko! N’otu abalị ahụ, Pita gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ. (Mak 14:66-72) Olee otú Jizọs si meso Pita ihe mgbe nke a gasịrị? “A kpọlitere Onyenwe anyị, ọ pụtakwara n’ihu Saịmọn [Pita]!” (Luk 24:34) Bible na-ekwu, sị: “Ọ pụtakwara n’ihu Sifas, e mesịa n’ihu ndị ozi iri na abụọ ahụ.” (1 Ndị Kọrint 15:5) Kama iburu ya iwe n’obi, Jizọs gbaghaara onyeozi ahụ chegharịrị echegharị ma wusie ya ike. Ka e mesịrị, Jizọs nyere Pita ibu ọrụ ndị buru ibu.—Ọrụ 2:14; 8:14-17; 10:44, 45.

16. Olee otú anyị pụrụ isi jee ije dị ka Jizọs jere mgbe ndị kwere ekwe ibe anyị mechuru anyị ihu ma ọ bụ mejọọ anyị n’ụzọ ụfọdụ?

16 Mgbe ndị kwere ekwe ibe anyị mechuru anyị ihu ma ọ bụ mejọọ anyị n’ụzọ ụfọdụ n’ihi ezughị okè mmadụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghịkwa inwe ọmịiko n’ahụ́ ha ma gbaghara ha dị ka Jizọs mere? Pita gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Ka unu nile nwee otu obi, na-egosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna, na-enwe obi ọmịiko, na-adị umeala n’obi, ghara ịkwụghachi ihe ọjọọ maka ihe ọjọọ, nkwujọ maka nkwujọ, kama, n’ụzọ dị iche, na-agọzi agọzi, n’ihi na a kpọrọ unu n’ụzọ a, ka unu wee keta ngọzi.” (1 Pita 3:8, 9) Gịnị ma ọ bụrụ na onye ọzọ emesoghị anyị ihe otú Jizọs gaara esi emeso anyị, jụ inwe ọmịiko n’ahụ́ anyị ma ọ bụ ịgbaghara anyị? Ya bụrụgodị otú ahụ, iwu ji anyị ịgbalị iṅomi Jizọs na ime ihe ọ gaara eme.—1 Jọn 3:16.

Bute Ihe Ndị Metụtara Alaeze ahụ Ụzọ

17. Gịnị na-egosi na ime uche Chineke bụ ihe kasị mkpa ná ndụ Jizọs?

17 Ọ dịkwa ebe ọzọ ọ dị anyị mkpa ije ije dị ka Jizọs Kraịst jere. Ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke bụ ihe kasị mkpa ná ndụ Jizọs. Mgbe o zichara nwanyị Sameria ozi ọma na nso obodo Saịka dị na Sameria, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche nke onye ahụ zitere m nakwa ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:34) Ime uche Nna ya kwagidere Jizọs; o meziri ya ahụ́, ju ya afọ, nyekwa ya ume ọhụrụ dị ka ihe oriri. Iṅomi Jizọs site n’ịnọgide na-elekwasị anya n’ime uche Chineke ọ́ gaghị nnọọ eme ka anyị bie ndụ nwere nzube na nke na-eju afọ?

18. Olee ngọzi ndị na-abịa site n’ịgba ụmụaka ume ịbanye n’ozi oge nile?

18 Mgbe ndị nne na nna na-agba ụmụ ha ume ije ozi oge nile, ma ha ma ụmụ ha na-enweta ọtụtụ ngọzi. Otu nna nwere ejima nwoke gbara ụmụ ya ume isetịpụ ịsụ ụzọ dị ka ihe mgbaru ọsọ ha site na nwata. Mgbe ha gụchara akwụkwọ, ụmụ ejima ahụ ghọrọ ndị ọsụ ụzọ. Mgbe ọ na-echeta ọṅụ nke a wetawooro ya, nna ụmụ ejima a kwuru, sị: “Ụmụ anyị emechughị anyị ihu. Anyị pụrụ iji obi ekele kwuo, sị, ‘Ihe nketa na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ.’” (Abụ Ọma 127:3) Oleekwa otú ụmụaka si erite uru site n’isetịpụ ozi oge nile dị ka ihe mgbaru ọsọ? Otu nne ji ụmụ ise na-ekwu, sị: “Ịsụ ụzọ enyeworo ụmụ m nile aka ịnọkwu Jehova nso, meziwanye otú ha si enwe ọmụmụ ihe onwe onye, nyere ha aka iji oge ha eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya, nyekwara ha aka ịmụta ibute ihe ime mmụọ ụzọ ná ndụ ha. Ọ bụ ezie na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha na-emeghị ọtụtụ mgbanwe, ọ dịghị nke na-akwa ụta maka ụzọ ha họrọwooro ịgbaso.”

19. Olee ihe amamihe dị na ya nke ndị na-eto eto pụrụ ịtụle ma hà ga-eme atụmatụ ime n’ọdịnihu?

19 Ndị na-eto eto, gịnị ka unu na-eme atụmatụ ime n’ọdịnihu? Ùnu na-achọ ịbụ ọkà n’ọrụ ụfọdụ? Ka ùnu na-agbalịsi ike ime ka ozi oge nile bụrụ ọrụ unu? Pọl dụrụ ọdụ, sị: “Nọrọsienụ ike na nche ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụpụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” Ọ gbakwụnyere, sị: “N’ihi nke a, kwụsịnụ ịbụ ndị na-enweghị ezi uche, kama nọgidenụ na-aghọta ihe uche Jehova bụ.”—Ndị Efesọs 5:15-17.

Na-eguzosi Ike n’Ihe

20, 21. Olee otú Jizọs si guzosie ike n’ihe, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie iguzosi ike n’ihe ya?

20 Ije ije dị ka Jizọs jere na-achọ iṅomi iguzosi ike n’ihe ya. Bible kwuru banyere iguzosi ike n’ihe Jizọs, sị: ‘Ọ bụ ezie na ọ dị adị n’ọdịdị nke Chineke, o cheghị echiche ịnara ihe n’ike, ya bụ, ka o wee hà ka Chineke. Ee e, kama o mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi nke mmadụ. Ọzọkwa, mgbe ọ hụrụ onwe ya n’ọdịdị nke mmadụ, o wedara onwe ya n’ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ.’ Jizọs ji iguzosi ike n’ihe kwado ọbụbụeze Jehova site n’ime ihe Chineke zubere ka o mee. O rubere isi ruo n’ókè nke ịnwụ n’osisi ịta ahụhụ. Anyị aghaghị ime ka ‘ụzọ iche echiche a dịrị n’ime anyị’ ma jiri iguzosi ike n’ihe na-eme uche Chineke.—Ndị Filipaị 2:5-8.

21 Jizọs guzosikwara ike n’ihe n’ebe ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi nọ. N’agbanyeghị adịghị ike na ezughị okè ha, Jizọs hụrụ ha n’anya “ruo ọgwụgwụ.” (Jọn 13:1) N’otu aka ahụ, anyị ekwesịghị ikwe ka ezughị okè ụmụnna anyị mee ka anyị na-elezi ha anya ọjọọ.

Gbasoo Ụkpụrụ Jizọs Tụrụ

22, 23. Olee uru ndị dị n’ịgbaso ụkpụrụ Jizọs setịpụrụ?

22 N’ezie, dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị apụghị ime ihe nile Onye Nlereanya anyị zuru okè mere. Otú ọ dị, anyị pụrụ ịgbalịsi ike ịgbasochi nzọụkwụ ya anya. Ime nke ahụ na-achọ ka anyị ghọta ihe ndị Kraịst ji edu ndú ma na-edo onwe anyị n’okpuru ha ma na-agbasochi ụkpụrụ o setịpụrụ anya.

23 Ịghọ ndị na-eṅomi Kraịst na-eweta ọtụtụ ngọzi. Ndụ anyị na-abụ nke bakwuru uru na nke na-eju afọ karị n’ihi na anyị na-elekwasị anya n’ime uche Chineke kama ịbụ n’ime uche anyị. (Jọn 5:30; 6:38) Anyị na-enwe akọ na uche dị ọcha. Ụzọ anyị si eje ije na-abụ nke kwesịrị nṅomi. Jizọs gwara ndị nile na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu ka ha bịakwute ya ma nwetara mkpụrụ obi ha ume ọhụrụ. (Matiu 11:28-30) Mgbe anyị gbasoro ihe nlereanya Jizọs, anyị onwe anyị kwa na-enwe ike iwetara ndị ọzọ ume ọhụrụ mgbe anyị na ha na-akpakọrịta. N’ihi ya, ka anyị nọgide na-eje ije dị ka Jizọs jere.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú Kraịst si edu ụmụazụ ya taa?

• Olee otú ndị okenye pụrụ isi gbasoo idu ndú Kraịst n’otú ha si eji ikike Chineke nyere ha eme ihe?

• Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs mgbe ndị ọzọ na-emezighị emezi?

• Olee otú ndị ntorobịa pụrụ isi tinye ihe ndị metụtara Alaeze n’ọnọdụ mbụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị okenye na-enyere anyị aka ịgbaso idu ndú Kraịst

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Ndị na-eto eto, olee atụmatụ ndị unu na-eme iji bie ndụ na-akwụghachi ụgwọ dị ka Ndị Kraịst?