À Zụrụ Akọ na Uche Gị Azụ nke Ọma?
À Zụrụ Akọ na Uche Gị Azụ nke Ọma?
Ọ̀ DỊTỤWO mgbe i kwuru, sị, “Amaara m n’ala ala obi m na o zighị ezi,” ma ọ bụ, “Apụghị m ime ihe ị sịrị m mee. Obi m na-agwa m na o zighị ezi”? Nke ahụ bụ “olu” nke akọ na uche gị, ihe ahụ nke na-agwa gị okwu n’ime obi gị, ma ọ bụ ihe ahụ nke na-eme ka ị mara ma ihe ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị ezi, bụ́ nke na-ama mmadụ ikpe ma ọ bụ na-agọpụrụ ya. N’ezie, anyị bu akọ na uche pụta ụwa.
N’agbanyeghị na ụmụ mmadụ nọ n’ọnọdụ kewapụrụ ha n’ebe Chineke nọ, ha ka nwere ikike nke ịma ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Nke a bụ n’ihi na e mere ha n’onyinyo Chineke, nke mere na ha na-egosipụta àgwà Chineke bụ́ amamihe na ezi omume ruo n’ókè ụfọdụ. (Jenesis 1:26, 27) Pọl onyeozi dere n’ike mmụọ nsọ banyere nke a, sị: “Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ, bụ́ ndị na-enweghị iwu, sitere n’ọmụmụ na-eme ihe ndị dị n’iwu, ndị a, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, bụ iwu nye onwe ha. Ha onwe ha bụ kpọmkwem ndị na-egosipụta isi ihe dị n’iwu ahụ ịbụ nke e dere n’obi ha, ebe akọ na uche ha so ha na-agba àmà, n’echiche nke ha kwa, ha bụ ndị a na-ebo ebubo ma ọ bụ ọbụna ndị a na-agọpụ.” *—Ndị Rom 2:14, 15.
Ihe a na-ekpe omume ikpe, bụ́ nke anyị ketara n’aka mmadụ mbụ, bụ́ Adam, na-arụ ọrụ dị ka “iwu,” ma ọ bụ ụkpụrụ omume, n’ime ndị si n’agbụrụ na mba nile. Ọ bụ ikike anyị nwere inyocha onwe anyị ma kpee onwe anyị ikpe. (Ndị Rom 9:1) Adam na Iv gosipụtara na ha nwere ihe a na-ekpe omume ikpe ozugbo ha mebiri iwu Chineke—ha gara zoo onwe ha. (Jenesis 3:7, 8) Ihe atụ ọzọ nke na-egosi otú akọ na uche si arụ ọrụ bụ ụzọ Eze Devid si mee omume mgbe ọ ghọtara na ya emehiewo n’ihi ọnụ ọ gụrụ ndị Izrel. Bible na-ekwu na ‘obi Devid tara ya ụta.’—2 Samuel 24:1-10.
Ikike mmadụ nwere inyocha ihe o mere ma kpebie ma ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị ezi pụrụ ịkpali ya igosipụta nchegharị nke Chineke na-anakwere. Devid dere, sị: “Mgbe m gbara nkịtị, ọkpụkpụ m nile kara nká site n’ọgbụgbọ ụja m ogologo ụbọchị nile. Ana m emerị ka Ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: m sịrị, M ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; Gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.” (Abụ Ọma 32:3, 5) Ya mere, akọ na uche na-arụ ọrụ nke ọma pụrụ ime ka onye mmehie laghachikwuru Chineke, bụ́ nke ga-enyere ya aka ịghọta na ọ dị mkpa ka Chineke gbaghara ya nakwa ka ọ gbasoo ụzọ Ya.—Abụ Ọma 51:1-4, 9, 13-15.
Akọ na uche na-adọkwa anyị aka ná ntị ma ọ bụ na-eduzi anyị mgbe ọ dị mkpa ka anyị mee nhọrọ ma ọ bụ mee mkpebi banyere ihe anyị ga-eme. Ọ pụrụ ịbụ ọrụ a akọ na uche na-arụ nyeere Josef aka ịghọta, ọbụna tupu e nye iwu megidere ya, na idina nwunye onye ọzọ dị njọ ma bụrụ ihe na-ezighị ezi—mmehie megide Chineke. E mesịrị nye iwu megidere ịkwa iko kpọmkwem n’ime Iwu Iri ahụ e nyere ụmụ Izrel. Jenesis 39:1-9; Ọpụpụ 20:14) N’ụzọ doro anya, o yikarịrị ka ànyị ga-erite uru ka ukwuu ma ọ bụrụ na anyị azụọ akọ na uche anyị iduzi anyị kama nanị ịdị na-ekpe anyị ikpe. Akọ na uche gị ọ̀ na-arụ ọrụ otú ahụ?
(Ịzụ Akọ na Uche Ime Mkpebi Ndị Ziri Ezi
N’agbanyeghị na anyị bu akọ na uche pụta ụwa, ọ dị mwute ikwu na ọ bụghị mgbe nile ka onyinye ahụ na-arụ ọrụ nke ọma. Ọ bụ ezie na mmadụ zuru okè mgbe e kere ya, “mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè ma na-emehie emehie, akọ na uche anyị pụrụ ihie ụzọ, e nwere ike ọ gaghịzi na-arụ ọrụ nke ọma otú e meburu ya ka ọ na-arụ. (Ndị Rom 7:18-23) Tụkwasị na nke ahụ, ihe ndị gbara anyị gburugburu pụrụ imetụta akọ na uche anyị. Otú e si zụlite anyị ma ọ bụ omenala, nkwenkwe, na gburugburu ebe anyị bi pụrụ imetụta ya. N’ezie, omume na ụkpụrụ na-adalata adalata nke ụwa agaghị enyere mmadụ aka ịmara ma ò nwere ezi akọ na uche ma ọ bụ na o nweghị.
N’ihi ya, ọ dịkwa Onye Kraịst mkpa inwetakwu nduzi nke ụkpụrụ ndị ziri ezi, na-adịghị agbanwe agbanwe, bụ́ ndị a na-achọta n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ụkpụrụ ndị a pụrụ iduzi akọ na uche anyị ịtụle ihe n’ụzọ ziri ezi ma mee ka anyị mee ihe kwesịrị ekwesị. (2 Timoti 3:16) Mgbe e ji ụkpụrụ Chineke zụọ akọ na uche anyị, ọ pụrụ ịrụ ọrụ n’ụzọ ka mma dị ka ihe nduzi, na-enyere anyị aka “ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:14) Ọ bụrụ na anyị ejighị ụkpụrụ Chineke zụọ akọ na uche anyị, e nwere ike akọ na uche anyị agaghị adọ anyị aka ná ntị mgbe anyị banyere n’ụzọ ọjọọ. “Ụzọ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ,” ka Bible na-ekwu, “ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ.”—Ilu 16:25; 17:20.
N’akụkụ ụfọdụ nke ndụ, Okwu Chineke na-enye ntụziaka na nduzi ndị doro anya, ọ ga-adịkwa mma ka anyị na-agbaso ha. N’aka nke ọzọ, e nwere ọtụtụ ihe ndị a na-enyeghị ntụziaka a kapịrị ọnụ banyere ha n’ime Bible. Ha pụrụ ịgụnye ụdị ọrụ a ga-arụ, ihe ndị metụtara ahụ́ ike, ntụrụndụ, uwe na ejiji, na ihe ndị ọzọ. Ọ dịghị mfe mmadụ ịmara ihe ọ ga-eme na nke ọ bụla n’ihe ndị a ma mee mkpebi ziri ezi. N’ihi nke ahụ, anyị kwesịrị inwe ụdị àgwà Devid nwere, bụ́ onye kpere ekpere, sị: “Mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile. Mee m ka m zọọ ije n’eziokwu Gị, Gị zikwa m ihe; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke nke nzọpụta m.” (Abụ Ọma 25:4, 5) Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe bụ́ echiche na ụzọ Chineke nke ọma, anyị ga-enwekwu ike ịtụle ọnọdụ anyị n’ụzọ ziri ezi ma jiri akọ na uche dị ọcha mee mkpebi.
N’ihi ya, mgbe ọ dị mkpa ka anyị zaa Ndị Kọlọsi 3:18, 20); ịkwụwa aka ọtọ n’ihe nile (Ndị Hibru 13:18); ịkpọ ihe ọjọọ asị (Abụ Ọma 97:10); ime udo (Ndị Rom 14:19); irubere ndị na-edu ndú isi (Matiu 22:21; Ndị Rom 13:1-7); ife nanị Chineke ofufe (Matiu 4:10); abụghị akụkụ nke ụwa (Jọn 17:14); izere mkpakọrịta ọjọọ (1 Ndị Kọrint 15:33); iji ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị (1 Timoti 2:9, 10); na izere ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ (Ndị Filipaị 1:10). Ịmata ụkpụrụ Bible nke kwekọrọ ná mkpebi anyị chọrọ ime pụrụ ime ka akọ na uche anyị dịkwuo nkọ ma nyere anyị aka ime mkpebi ndị ziri ezi.
ajụjụ ma ọ bụ mee mkpebi, anyị kwesịrị ibu ụzọ chee echiche banyere ụkpụrụ Bible ndị pụrụ iduzi anyị. Ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịbụ: nkwanye ùgwù maka ịbụisi (Ṅaa Akọ na Uche Gị Ntị
Anyị aghaghị ige akọ na uche anyị ntị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ na-enyere anyị aka. Ọ bụ nanị mgbe anyị ṅara akọ na uche anyị e ji Bible zụọ ntị ka ọ ga-abara anyị uru. Anyị pụrụ iji akọ na uche a zụrụ azụ tụnyere ọkụ mgbaàmà ndị na-adị n’ebe na-egosi otú ụgbọala si arụ ọrụ. Ka e were ya na otu ọkụ mgbaàmà nwuru iji gosi na mmanụ injin agbadala. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị elebaraghị nke ahụ anya ozugbo ma kwọrọ ụgbọala ahụ na-aga? Anyị pụrụ imebi ụgbọala ahụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, akọ na uche anyị, ma ọ bụ olu dị n’ime obi anyị, pụrụ ịgbara anyị àmà na ihe anyị chọrọ ime ezighị ezi. Mgbe akọ na uche anyị jisịrị ụkpụrụ omume ndị Akwụkwọ Nsọ kwadoro tụnyere ihe anyị na-eme ma ọ bụ ihe anyị na-achọ ime, ọ na-agbara anyị àmà, dị ka ọkụ dị n’ebe na-egosi otú ụgbọala si arụ ọrụ na-eme. Ihe ọma ga-esi n’ige ntị n’ihe mgbaàmà ahụ apụta abụghị nanị na anyị ga-ezere ihe ọjọọ ndị omume ọjọọ ahụ ga-akpata, kamakwa, ọ ga-eme ka akọ na uche anyị nọgide na-arụ ọrụ nke ọma.
Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ ileghara ịdọ aka ná ntị ahụ anya? Ka oge na-aga, akọ na uche ahụ pụrụ ịnwụ. Ọ bụrụ na mmadụ anọgide na-eleghara akọ na uche ya anya, akọ na uche ya pụrụ ịbịa yie ebe e ji ígwè dị ọkụ na-adagide mmadụ n’ahụ́. Ebe ahụ a dara ọkụ, nke ọbara na-adịghịzi eru, agaghịzi enwe mmetụta ọ bụla. (1 Timoti 4:2) Akọ na uche dị otú ahụ agaghịzi ama mmadụ ikpe mgbe onye ahụ mere mmehie, ọ gaghịkwa agbara onye ahụ àmà iji mee ka ọ ghara ime mmehie ahụ ọzọ. Akọ na uche na-adịghịzi enwe mmetụta na-eleghara ụkpụrụ Bible maka ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi anya, n’ihi ya kwa, ọ bụ ajọ akọ na uche. Ọ bụ akọ na uche e merụrụ emerụ, ebe ọ bụ na onye nwe ya “enwekwaghị mmetụta ime omume ọma,” bụrụkwa onye e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. (Ndị Efesọs 4:17-19; Taịtọs 1:15) Nke ahụ na-eweta ọdachi n’ezie!
“Nweenụ Ezi Akọ na Uche”
Ọ chọrọ anyị ịnọgide na-etinye mgbalị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka akọ na uche anyị nọgide na-arụ ọrụ nke ọma. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ana m adọgbu onwe m n’ọrụ mgbe nile ka ọ dịrị n’uche m ịghara imejọ Chineke na mmadụ.” (Ọrụ 24:16) Dị ka Onye Kraịst, Pọl nọgidere na-enyocha ma na-edozi omume ya iji jide n’aka na o mehieghị megide Chineke. Pọl maara na n’ikpeazụ, ọ bụ Chineke ga-ekpebi ma ihe ndị anyị mere hà dị njọ ka hà dị mma. (Ndị Rom 14:10-12; 1 Ndị Kọrint 4:4) Pọl kwuru, sị: “Ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.”—Ndị Hibru 4:13.
Pọl kwukwara banyere ịghara imejọ mmadụ. Otu ihe atụ dabara adaba bụ ndụmọdụ o nyere Ndị Kraịst banyere “iri ihe oriri a chụrụ n’àjà nye arụsị.” Ihe ọ na-ekwu bụ na ọbụna mgbe ihe anyị chọrọ ime na-emegideghị Okwu Chineke, ọ dị oké mkpa ichebara akọ na uche ndị ọzọ echiche. Ọ bụrụ na anyị emeghị otú ahụ, ọ pụrụ ‘ibibi ụmụnna anyị n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ndị Kraịst nwụrụ n’ihi ha.’ Anyị pụkwara ibibi mmekọrịta anyị na Chineke.—1 Ndị Kọrint 8:4, 11-13; 10:23, 24.
Ya mere, nọgide na-azụ akọ na uche gị ma na-enwe ezi akọ na uche. Mgbe ị na-eme mkpebi, chọọ nduzi Chineke. (Jems 1:5) Na-amụ Okwu Chineke, ma kwe ka ụkpụrụ ya na-akpụzi uche na obi gị. (Ilu 2:3-5) Mgbe okwu ndị dị mkpa bilitere, kọọrọ Ndị Kraịst tozuru okè iji jide n’aka na ị ghọtara nke ọma ụkpụrụ Bible ndị e kwesịrị itinye n’ọrụ. (Ilu 12:15; Ndị Rom 14:1; Ndị Galeshia 6:5) Tụlee otú mkpebi gị ga-esi metụta akọ na uche gị, otú ọ ga-esi metụta ndị ọzọ, nakwa, karịsịa, otú ọ ga-esi metụta mmekọrịta gị na Jehova.—1 Timoti 1:5, 18, 19.
Akọ na uche anyị bụ onyinye magburu onwe ya Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova Chineke, nyere anyị. Ọ bụrụ na anyị ejiri ya na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Onye nyere anyị ya, anyị ga-abịarukwu Onye kere anyị nso. Ọ bụrụ na anyị ana-agbalị ‘inwe ezi akọ na uche’ n’ihe nile anyị na-eme, otú ahụ ka anyị ga-egosikwu na e mere anyị n’onyinyo Chineke.—1 Pita 3:16; Ndị Kọlọsi 3:10.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Okwu Grik e ji mee ihe n’ebe a maka akọ na uche pụtara “ihe dị n’ime obi nke na-ekpe omume ikpe” (The Analytical Greek Lexicon Revised, nke Harold K. Moulton dere); “ọ na-ekpebi ma ihe mmadụ mere ò ziri ezi ka ọ bụ na o zighị ezi.”—Greek-English Lexicon, nke J. H. Thayer dere.
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
À zụrụ akọ na uche gị iduzi gị kama nanị ịdị na-ekpe gị ikpe?
[Foto dị na peeji nke 14]
Mmadụ na-enwe akọ na uche a zụrụ nke ọma site n’ịmụ na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Elegharala ịdọ aka ná ntị nke akọ na uche gị anya