Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Bụ “Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ”?

Ị̀ Bụ “Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ”?

Ị̀ Bụ “Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ”?

N’IME ọtụtụ ihe atụ ndị Jizọs Kraịst ji mee ihe, bụ́ ndị na-akpali mmadụ iche echiche, e nwere nke bụ́ banyere otu ọgaranya nke nwere ala. Iji kwadebe maka ọdịnihu, nwoke ahụ mere atụmatụ iwu ebe nkwakọba ihe nke ka nke o nweburu enwe. Ma, n’ihe atụ Jizọs ahụ, a kpọrọ nwoke ahụ “onye na-enweghị ezi uche.” (Luk 12:16-21) Ọbụna nsụgharị Bible ụfọdụ kpọrọ ya “onye iberibe.” Gịnị mere e ji jiri okwu dị njọ otú a kọwaa nwoke ahụ?

Ihe àmà na-egosi na ọgaranya a echetaghị Chineke mgbe ọ na-eme atụmatụ ya; o nyeghịkwa Chineke ekele maka ala ya nke mepụtara ihe. (Matiu 5:45) Kama nke ahụ, o turu ọnụ, sị: “Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ezi ihe a kpakọbara maka ọtụtụ afọ; tụsara ahụ́, rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ, mee onwe gị obi ụtọ.” O chere nnọọ na ihe ọ rụpụtara ga-abụrụ ya “mgbidi dị elu.”—Ilu 18:11.

Mgbe Jems onye na-eso ụzọ na-adọ aka ná ntị megide mmụọ mpako dị otú ahụ, o dere, sị: “Ugbu a, bịanụ, unu ndị na-asị: ‘Taa ma ọ bụ echi anyị ga-eje obodo a, nọọkwa otu afọ n’ebe ahụ, anyị ga-azụkwa ahịa, ritekwa uru,’ ma unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi. N’ihi na unu bụ alụlụ nke na-apụta ruo nwa oge ma na-apụkwa n’anya.”—Jems 4:13, 14.

Dị nnọọ ka ihe Jems kwuru si dị, a gwara ọgaranya ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ Jizọs ji mee ihe, sị: “Onye na-enweghị ezi uche, n’abalị a ka ha na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị. Ònye ga-enwezi ihe ndị ị kwakọbara?” Dị ka alụlụ nke na-apụ n’anya, nwoke ahụ bara ọgaranya ga-anwụ tupu nrọ ya emezuo. Ànyị ghọtara ihe mmụta dị n’ilu a? Jizọs kwuru, sị: “Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” Ị̀ bụ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ”?