Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-aghọta Ihe Ịrịba Ama nke Ọnụnọ Jizọs?

Ị̀ Na-aghọta Ihe Ịrịba Ama nke Ọnụnọ Jizọs?

Ị̀ Na-aghọta Ihe Ịrịba Ama nke Ọnụnọ Jizọs?

Ọ DỊGHỊ onye ga-achọ ịda ezigbo ọrịa ma ọ bụ chọọ ka ihe ọjọọ dakwasị ya. Iji zere ọdachi ndị dị otú ahụ, onye maara ihe na-adị nkọ ịmata ihe mgbaàmà na-egosi na e nwere ihe ize ndụ ma mee ihe iji zere ya. Jizọs Kraịst kọwara otu ihe ịrịba ama nke ọ dị mkpa ka anyị ghọta. Ihe ọ nọ na-ekwu ga-emetụta ụwa nile nakwa ihe nile a kpọrọ mmadụ. Nke ahụ na-agụnye gị na ezinụlọ gị.

Jizọs kwuru okwu banyere Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-ewepụ ajọ omume ma mee ka ụwa ghọọ paradaịs. Ndị na-eso ụzọ ya chọrọ nnọọ ịmata mgbe Alaeze ahụ ga-abịa. Ha jụrụ ya, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a?”—Matiu 24:3.

Jizọs maara na mgbe e gbusịrị ya nakwa mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, ọtụtụ narị afọ ga-agafe tupu e mee ka ọ nọkwasị n’ocheeze n’eluigwe dị ka Eze Mezaịa iji chịa ihe a kpọrọ mmadụ. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ agaghị ahụ ya anya mgbe ọ nọkwasịrị n’ocheeze, Jizọs nyere ihe ịrịba ama nke ga-enyere ụmụazụ ya aka ịmata oge “ọnụnọ” ya nakwa nke “ngwụsị nke usoro ihe a.” Ihe ịrịba ama a nwere ọtụtụ akụkụ, bụ́ ndị jikọrọ aka na-egosi na a nọ n’oge ọnụnọ Jizọs.

Ndị so dee oziọma ahụ, bụ́ Matiu, Mak, na Luk jiri nlezianya dekọọ ihe Jizọs zara. (Matiu, isi 24 na 25; Mak, isi 13; Luk, isi 21) Ndị ọzọ so dee Bible kwuru ihe ndị ọzọ so n’ihe ịrịba ama ahụ. (2 Timoti 3:1-5; 2 Pita 3:3, 4; Mkpughe 6:1-8; 11:18) Ohere e nwere n’ebe a agaghị ezu iji tụlee ihe ndị mejupụtara ihe ịrịba ama ahụ n’ụzọ zuru ezu, ma anyị ga-atụle ihe ịrịba ama ise bụ́ isi, ndị so n’ihe ịrịba ama ndị Jizọs kpọtụrụ aha. Ị ga-achọpụta na ọ dị mkpa ịtụle akụkụ dị iche iche nke ihe ịrịba ama a nakwa na ọ ga-abara gị uru ime otú ahụ.—Lee igbe dị na peeji nke 6.

“Mgbanwe nke Wetara Ọgbọ Ọhụrụ”

“Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze.” (Matiu 24:7) Magazin a na-ebipụta na Germany bụ́ Der Spiegel kwuru na tupu afọ 1914, ndị mmadụ “chere na ihe ga-adị nnọọ mma n’ọdịnihu, bụ́ mgbe ndị mmadụ ga-enwerekwu onwe ha, nwee ọganihu, na ihe ịga nke ọma.” Na mberede, ihe gbanwere. “Agha ahụ nke tiwapụrụ n’August 1914 ma bie na November 1918 bụ ihe omume tụrụ ndị mmadụ n’anya. Ọ gbanwere akụkọ ihe mere eme nke mmadụ n’ike, o mekwara ka e nwee ọdịiche n’ọgbọ ochie na nke ọhụrụ,” ka magazin bụ́ GEO na-ekwu. Ihe karịrị nde ndị agha iri isii, bụ́ ndị sitere ná mpaghara ụwa ise, so lụọ agha nke tara isi ọtụtụ mmadụ. E gburu ihe dị ka puku ndị agha isii kwa ụbọchị. Kemgbe ahụ, ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme n’ọgbọ nke ọ bụla nakwa ndị nwere echiche dịgasị iche iche banyere ọchịchị, elewo “afọ 1914 ruo afọ 1918 anya dị ka oge e nwere mgbanwe nke wetara ọgbọ ọhụrụ.”

Agha Ụwa Mbụ kpatara mgbanwe ndị na-adịgide adịgide n’ụwa ma mee ka ihe a kpọrọ mmadụ banye na mgbe ikpeazụ nke usoro ihe a. Ihe jupụtara n’oge fọdụrụ na narị afọ ahụ bụ agha, ọgba aghara, na iyi ọha egwu. Ihe akabeghị mma ná mmalite nke narị afọ a. Ọ bụghị nanị agha ka a na-ahụ, kama a na-ahụkwa ihe ndị ọzọ mejupụtara ihe ịrịba ama ahụ.

Ụnwụ Nri, Ọrịa Na-efe Efe, na Ala Ọma Jijiji

“A ga-enwekwa ụkọ nri.” (Matiu 24:7) Agụụ kpara Europe aka ọjọọ n’oge a na-alụ agha ụwa mbụ, ụnwụ nri anọgidewokwa na-anyụ ihe a kpọrọ mmadụ anya kemgbe ahụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Alan Bullock, dere banyere ọnọdụ e nwere na Russia nakwa na Ukraine n’afọ 1933, na-ekwu na “ọtụtụ ndị agụụ na-agụgbu chọọrọ nri gawa n’ime obodo . . . Ozu ndị mmadụ tọgbọgasịrị n’akụkụ ụzọ.” N’afọ 1943, odeakụkọ bụ́ T. H. White hụrụ ndị agụụ na-agụgbu n’ógbè Henan dị na China. O dere, sị: “Mgbe e nwere ụnwụ nri, ọ na-afọ nke nta ka ihe ọ bụla bụrụ ihe oriri, a na-egwe ụfọdụ egwe, rie ụfọdụ otú ahụ, ahụ́ na-agbarikwa ha iji nwee ume. Ma, ọ bụ nanị mgbe ọnwụ chere mmadụ ihu ka ọ na-echewa echiche iri ihe a na-anaghị eribu eri.” Ọ dị mwute ikwu na ụnwụ nri ejupụtawo ọtụtụ ebe n’Africa kemgbe iri afọ ndị na-adịbeghị anya. N’agbanyeghị na ụwa na-emepụta nri ga-ezu mmadụ nile, Òtù UN Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo kwuru na ihe dị ka narị nde mmadụ asatọ na iri nde anọ n’ụwa nile anaghị eriju afọ.

‘Ọrịa na-efe efe ga-adị site n’otu ebe ruo ebe ọzọ.’ (Luk 21:11) Akwụkwọ akụkọ bụ́ Süddeutsche Zeitung kọrọ, sị: “Oké ahụ́ ọkụ Spen gburu ihe dị ka nde mmadụ iri abụọ ruo nde mmadụ iri ise n’afọ 1918, bụ́ nke karịrị ihe ọnwụ ojii ma ọ bụ agha ụwa mbụ gburu.” Kemgbe ahụ, ọrịa ndị dị ka ịba, kịtịkpa, ụkwara nta, polio, na ọgbụgbọ na ọnyụnyụ akpawo ọtụtụ ndị mmadụ aka ọjọọ. Ụwa na-ekporopụkwa nnọọ anya na-ele ka ọrịa AIDS na-agbasa n’ụzọ na-ekweghị nchịkwa. Ugbu a, ọ bụ ihe na-atụ n’anya na ọrịa nọgidere na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ n’agbanyeghị ọganihu dị ịrịba ama a na-enwe na nkà ọgwụ na ahụ́ ike. Ọnọdụ a dị ịtụnanya, bụ́ nke ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụtụbeghị mbụ, na-egosi n’ụzọ doro anya na anyị na-ebi n’oge pụrụ iche.

“Ala ọma jijiji.” (Matiu 24:7) N’ime narị afọ gara aga, ala ọma jijiji egbuwo ọtụtụ narị puku mmadụ. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, kemgbe afọ 1914, kwa afọ, a na-enwe ala ọma jijiji 18 ndị pụrụ ibibi ụlọ ma gbawaa ala. Ihe dị ka otu ugbo n’afọ, a na-enwe ala ọma jijiji ndị dị njọ karị, bụ́ ndị nwere ike ịkwatu ụlọ. N’agbanyeghị ọganihu ndị a na-enwe na nkà na ụzụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’ihi ala ọma jijiji anọgidewo na-arị elu n’ihi na ọtụtụ obodo ukwu ndị ụbara mmadụ bi na ha dị n’ebe ndị ala ọma jijiji na-emekarị.

Ozi Obi Ụtọ!

Ọtụtụ n’ime ihe ndị mejupụtara ihe ịrịba ama nke mgbe ikpeazụ na-agbawa obi. Ma, Jizọs kwukwara okwu banyere ozi obi ụtọ.

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14) Ọrụ ahụ Jizọs n’onwe ya malitere—ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ—ga-eru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’ụbọchị ikpeazụ. Nke a emewo n’ezie. Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi Bible, ha na-akụzikwara ndị obi ha ziri ezi itinye ihe ha na-amụta n’ọrụ ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị. Ugbu a, ihe karịrị nde Ndịàmà isii na-eme nkwusa n’ala 235 nakwa n’ihe karịrị narị asụsụ anọ.

Rịba ama na Jizọs ekwughị na ihe omume nile a na-eme ná ndụ ga-akwụsị n’ihi nsogbu e nwere n’ụwa. O kwughịkwa na ọ bụ nanị otu akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ ga-emetụta ụwa nile. Kama o kwuru banyere ọtụtụ ihe omume bụ́ ndị ga-ejikọ aka ghọọ ihe àmà a ga-amata n’ebe ọ bụla n’ụwa.

Kama ilewe ihe omume nke ọ bụla anya dị ka ihe na-eme n’otu ebe, ị́ dịghị ahụ ya dị ka ihe so n’usoro ihe omume, bụ́ ihe ịrịba ama nwere ọtụtụ akụkụ, nke nwere ihe ọ pụtara n’ụwa nile? Ihe na-eme n’ụwa na-emetụta gị na ezinụlọ gị. Anyị pụrụ ịjụ ihe mere o ji bụrụ nanị mmadụ ole na ole na-aghọta ya?

Ibute Mmasị Onwe Onye Ụzọ

“Egwula Mmiri Ebe A!,” “Agafela Ebe A!,” “Jiri Nwayọọ Na-agba.” Ndị a bụ ụfọdụ n’ime ịdọ aka ná ntị ndị anyị na-ahụ, ma a na-elegharakarị ha anya. N’ihi gịnị? Ọ na-adị mfe ime ihe anyị lere anya dị ka ihe ga-akasị baara anyị uru. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-anya ụgbọala, anyị pụrụ ịchọ ịgbasi ike karịa otú iwu kwuru, ma ọ bụ anyị pụrụ inwe ọchịchọ siri ike igwu mmiri n’ebe a machibidoro iwu. Ma, amamihe adịghị n’ileghara ịdọ aka ná ntị anya.

Dị ka ihe atụ, kwa afọ, na Nigeria, ihe mberede okporo ụzọ na-ata isi ọtụtụ puku mmadụ, ọ na-akwarụkwa imerime mmadụ. Dị ka otu akwụkwọ nta si kwuo, ọtụtụ ihe mberede dị otú ahụ́ na-eme n’ihi na ndị mmadụ na-eleghara ntụziaka ndị dị n’okporo ụzọ anya ma ọ bụ na-ada iwu ndị na-achịkwa okporo ụzọ.

Olee ihe mere ndị mmadụ ji eleghara ihe àmà ndị Jizọs kwuru okwu ha anya? Ọ pụrụ ịbụ oké ọchịchọ ịba ọgaranya, omume nke achọghị ịma, amaghị ihe a ga-eme eme, enweghị ohere, na ịtụ egwu na ha nwere ike ree ùgwù ha. Ọ̀ ga-abụ na ọ dị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nke na-eme ka ị na-eleghara ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jizọs anya? Ọ́ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya karị ịmata ihe ịrịba ama ahụ ma mee ihe banyere ya?

Ndụ n’Ime Paradaịs Elu Ala

Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ na-amata ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jizọs. Kristian, bụ́ nwa okorobịa lụworo nwanyị nke bi na Germany, dere, sị: “Oge ndị a dị oké njọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị bi ‘n’ụbọchị ikpeazụ.’” Ya na nwunye ya na-etinye oge buru ibu n’ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Mezaịa. Frank bikwa ná mba ahụ. Ya na nwunye ya na-eji ozi ọma sitere na Bible agba ndị ọzọ ume. Frank kwuru, sị: “N’ihi ọnọdụ e nwere n’ụwa, ọtụtụ ndị taa na-echegbu onwe ha banyere ọdịnihu. Anyị na-agbalị iji amụma ndị Bible buru banyere ụwa paradaịs gbaa ha ume.” Kristian na Frank si otú a enye aka n’imezu otu n’ime ihe ndị mejupụtara ihe ịrịba ama ahụ Jizọs nyere—ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ.—Matiu 24:14.

Ka ụbọchị ikpeazụ na-abịa ná njedebe, Jizọs ga-ebibi usoro ihe ochie a na ndị na-akwado ya. Alaeze Mezaịa ahụ ga-elekọtawazi ihe ndị a na-eme n’ụwa, bụ́ nke a ga-eme ka ọ ghọọ Paradaịs ahụ e buru n’amụma. Ụmụ mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ n’ọrịa na ọnwụ, a ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ ịbịa bie ndụ n’ụwa. Ihe ndị a bụ ihe ndị magburu onwe ha na-echere ndị na-aghọta ihe ịrịba ama nke oge a. Ọ́ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya ịmụtakwu banyere ihe ịrịba ama ahụ na ihe mmadụ na-aghaghị ime iji lanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe a? N’ezie, nke a kwesịrị ịdị onye ọ bụla oké mkpa.—Jọn 17:3.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

Jizọs buru amụma na a ga-enwe ọtụtụ ihe ga-emenụ bụ́ ndị ga-ejikọ aka mejupụta ihe ịrịba ama nke a ga-amata n’ebe ọ bụla n’ụwa

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ị̀ na-ahụ usoro ihe omume, bụ́ ihe ịrịba ama nwere ọtụtụ akụkụ, nke nwere ihe ọ pụtara n’ụwa nile?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6]

IHE NDỊ E JI AMATA ỤBỌCHỊ IKPEAZỤ

Agha a na-ahụtụbeghị ihe dị ka ya mbụ.—Matiu 24:7; Mkpughe 6:4

Ụnwụ nri.—Matiu 24:7; Mkpughe 6:5, 6, 8

Ọrịa na-efe efe.—Luk 21:11; Mkpughe 6:8

Ịba ụba nke mmebi iwu.—Matiu 24:12

Ala ọma jijiji.—Matiu 24:7

Oge pụrụ iche nke siri ike obibi.—2 Timoti 3:1

Ịhụ ego n’anya gabiga ókè.—2 Timoti 3:2

Mmadụ inupụrụ ndị mụrụ ya isi.—2 Timoti 3:2

Enweghị obi mmadụ.—2 Timoti 3:3

Ịhụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.—2 Timoti 3:4

Enweghị njide onwe onye.—2 Timoti 3:3

Enweghị ịhụnanya maka ezi ihe.—2 Timoti 3:3

Amaghị banyere ihe ize ndụ na-abịanụ.—Matiu 24:39

Ndị na-akwa emo bụ́ ndị na-adịghị anabata ihe àmà ndị na-egosi na anyị bi n’ụbọchị ikpeazụ.—2 Pita 3:3, 4

Ikwusa Alaeze Chineke n’ụwa nile.—Matiu 24:14

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi dị na peeji 5]

Ndị soja WWI: E nwetara ya site n’akwụkwọ bụ́ The World War—A Pictorial History, 1919; ezinụlọ dara ogbenye: AP Photo/Aijaz Rahi; Onye na-arịa ụkwara nta: Photo: WHO/Thierry Falise