Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịghọta Ihe Àmà Bụ Ihe Dị Oké Mkpa!

Ịghọta Ihe Àmà Bụ Ihe Dị Oké Mkpa!

Ịghọta Ihe Àmà Bụ Ihe Dị Oké Mkpa!

“Ná mmalite, echere m na ọ bụ isi ọwụwa nkịtị na-awa nwa anyị nwoke bụ́ Andreas. Ma nri ekweghịzi ya oriri, ahụ́ ọkụ jidekwara ya. Isi ọwụwa ahụ bịara ka njọ, m chịịrị obi n’aka. Mgbe di m lọtara, anyị kpọọrọ Andreas gaa hụ dọkịta. O nyochara ihe mgbaàmà ndị ọ na-enwe ma gwa anyị ka anyị kpọga Andreas n’ụlọ ọgwụ ozugbo. Ihe na-arịa ya karịrị isi ọwụwa. Andreas na-arịa ọrịa mgbaji ekwe. E nyere ya ọgwụ, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ gbakere.”—Gertrud, onye bụ́ nne nke bi na Germany.

MA ELEGHỊ anya, ahụmahụ Gertrud abụghị ihe ọhụrụ nye ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ. Ha na-ahụ ihe àmà ndị na-egosi na o nwere ike bụrụ na ahụ́ adịghị nwa ha. N’agbanyeghị na ọ bụghị ọrịa nile na-adị oké njọ, ndị mụrụ ụmụ ga-atakwute ya ájá ma ha leghara ihe mgbaàmà na-egosi na nwa ha na-arịa ọrịa anya. Ịmata ihe mgbaàmà ndị ahụ na ime ihe kwesịrị ekwesị banyere ha pụrụ ime ka ọnọdụ ka mma. Nke a abụghị ihe a ga-eji gwurie egwu.

Nke a dị mkpa ọbụna ma a bịa n’ihe ndị ọzọ na-emetụtaghị ahụ́ ike. Otu ihe atụ nke a bụ ọdachi tsunami nke mere na December 2004 n’ebe ndị gbara oké osimiri India gburugburu. Ụlọ ọrụ gọọmenti ndị dị n’ebe ndị dị ka Australia na Hawaii chọpụtara nnukwute ala ọma jijiji ahụ n’ebe ugwu Sumatra ma hụ ihe ize ndụ ọ pụrụ ịkpata. Ma, e nweghị ngwá ọrụ ndị dịnụ a pụrụ iji mee ka ndị bi n’ebe ndị ahụ dị ize ndụ nweta ịdọ aka ná ntị ma ọ bụ mee ihe banyere ya. N’ihi ya, ihe karịrị narị puku mmadụ abụọ na iri puku abụọ nwụrụ.

Ihe Ịrịba Ama Ndị Ka Nnọọ Mkpa

Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ọ kụziiri ndị na-ege ya ntị mkpa ọ dị ịghọta ihe ịrịba ama na ime ihe banyere ya. Ọ nọ na-ekwu okwu banyere ihe dị nnọọ mkpa. Bible na-akọ, sị: “Ndị Farisii na ndị Sadusii wee bịakwute ya, iji nwaa ya ọnwụnwa, ha rịọkwara ya ka o gosi ha ihe ịrịba ama sitere n’eluigwe. Ná nzaghachi, ọ sịrị ha: ‘Mgbe o ruru uhuruchi, unu na-asịkarị, “Ihu ígwé gaje ịdị mma, n’ihi na elu na-acha ọbara ọbara”; n’ụtụtụ unu na-asịkwa, “Taa mmiri ga-eruju n’ígwé, oyi ga-adịkwa, n’ihi na elu na-acha ọbara ọbara, ma gbaa ọchịchịrị.” Unu maara otú e si akọwa ọdịdị nke ígwé, ma unu apụghị ịkọwa ihe ịrịba ama nke oge ndị a.’”—Matiu 16:1-3.

Mgbe ọ na-ekwu banyere “ihe ịrịba ama nke oge ndị a,” Jizọs gosiri na ndị Juu nke narị afọ mbụ, bụ́ ndị nọ na-ege ya ntị, kwesịrị ịma na oge ndị ha bi na ha chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa. Ebelebe na-aga igbu ná mba ndị Juu, bụ́ nke ga-emetụta ha nile. Ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ ya, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya banyere ihe ịrịba ama ọzọ—ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya. Ihe o kwuru n’oge ahụ dị oké mkpa nye mmadụ nile taa.