Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Nlereanya nke Nne na Nna M Wusikwuru M Ike

Ihe Nlereanya nke Nne na Nna M Wusikwuru M Ike

Akụkọ Ndụ

Ihe Nlereanya nke Nne na Nna M Wusikwuru M Ike

DỊ KA JANEZ REKELJ SI KỌỌ

N’afọ 1958, mụ na nwunye m, bụ́ Stanka, nọ n’elu elu ugwu Alp nke Karawanken dị n’ókè Yugoslavia na Austria, na-agbalị ịgbaga Austria. Nke a dị ize ndụ, n’ihi na ndị nche bu égbè n’ókè Yugoslavia siri ọnwụ igbochi onye ọ bụla ịgafe. Ka anyị na-aga, anyị rutere n’ebe ugwu ahụ kpọnyere nnọọ ọnụ n’ala. Mụ na Stanka ahụtụbeghị akụkụ ugwu ahụ nke chere ihu n’Austria. Anyị tinyere isi n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo mgbe anyị rutere ebe kpọdara akpọda nke jupụtara n’okwute na ajịrịja. Anyị jiri tapolin anyị bu kee onwe anyị, ma dara daruo na ndagwurugwu ahụ n’amaghị ihe echi ga-eweta.

KA M kọọ otú anyị si banye n’ọnọdụ dị otú ahụ na otú ihe nlereanya nke nne na nna m setịpụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi si kwalie m ịnọgidesi ike n’akụkụ Jehova n’oge ihe tara akpụ.

Etolitere m na Slovenia, nke bụ́ taa obere mba nke dị na Central Europe. Ọ dị n’ugwu Alp ndị dị na Europe. Austria dị ya n’ebe ugwu, Ịtali dị ya n’ebe ọdịda anyanwụ, Croatia dị ya n’ebe ndịda, Hungary dịkwa ya n’ebe ọwụwa anyanwụ. Otú ọ dị, mgbe a mụrụ nne na nna m bụ́ Franc na Rozalija Rekelj, Slovenia bụ akụkụ Alaeze Ukwu Australia na Hungary. Mgbe Agha Ụwa Mbụ biri, Slovenia ghọrọ akụkụ nke mba ọhụrụ a kpọrọ Alaeze ndị Serbia, ndị Croatia, na ndị Slovenia. N’afọ 1929, a gbanwere aha mba ahụ ịbụ Yugoslavia, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “Ebe Ndịda Slavia.” A mụrụ m na January 9 n’afọ ahụ, n’ime obodo nta bụ́ Podhom, nke dị nso n’Ọdọ Mmiri Bled nke mara ezigbo mma.

A zụlitere mama m n’ezinụlọ bu Katọlik n’isi. Otu n’ime ụmụnne papa ya ndị nwoke bụ onye ụkọchukwu, mmadụ atọ n’ime ụmụnne papa ya ndị nwanyị bụkwa ndị nọn. O nwere ọchịchọ siri ike inwe Bible, ịgụ ya, na ịghọta ya. Otú ọ dị, papa m enwechaghị mmasị n’okpukpe. Òkè okpukpe keere n’Agha Ukwu ahụ a lụrụ n’afọ 1914 ruo afọ 1918 na-arụ ya afọ.

Ịnata Eziokwu

Mgbe agha ahụ biri, nwa nwanne nna mama m, bụ́ Janez Brajec, na nwunye ya, bụ́ Ančka, ghọrọ Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. N’oge ahụ, ha bi n’Austria. Malite n’ihe dị ka afọ 1936 gawa, Ančka na-abịa eleta mama m ugboro ugboro. O nyere mama m Bible, magazin Ụlọ Nche na akwụkwọ ndị ọzọ dabeere na Bible bụ́ ndị e dere n’asụsụ Slovenian, mama m gụkwara ha ngwa ngwa. N’ikpeazụ, n’ihi mweghara Hitler weghaara Austria n’afọ 1938, Janez na Ančka laghachiri Slovenia. Ana m echeta na ha bụ di na nwunye gụrụ akwụkwọ, maara ihe, ma nwee ezi ịhụnanya n’ebe Jehova nọ. Ha na-esokarị mama m ekwurịta eziokwu Bible bụ́ nke mere ka mama m rara ndụ ya nye Jehova. E mere ya baptizim n’afọ 1938.

Ọ ghọrọ ihe akụkọ n’ógbè ahụ mgbe mama m kwụsịrị ime omenala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, dị ka ịgba Krismas; mgbe ọ kwụsịrị iri ngwọngwọ ọbara; nakwa karịsịa mgbe ọ chịịrị ihe oyiyi nile anyị nwere ma kpọọ ha ọkụ. N’egbughị oge, a malitere imegide ya. Ụmụnne nna mama m, ndị nke bụ́ ndị nọn, wepụtara nnọọ oge na-edere ya akwụkwọ ozi, na-anwa ime ka o kweta ịlaghachikwute Meri na chọọchị Katọlik. Otú ọ dị, mgbe mama m deere ha akwụkwọ ozi ma rịọ ha ka ha zaa ya ajụjụ ụfọdụ dabeere na Bible, ha azaghachighị ya. Nna mama m megidekwara ya n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ọ bụghị ajọ mmadụ, ma ndị ikwu anyị na ndị obodo anyị kwanyere ya ọkụ n’ahụ́. N’ihi ya, ọtụtụ oge, o bibiri akwụkwọ ndị mama m ji amụ Bible, ma ọ dịghị mgbe o metụrụ Bible ya aka. O gburu ikpere n’ala na-arịọ mama m ka ọ laghachite na chọọchị Katọlik. Ọbụna o ruru n’ókè nke iji mma yie mama m egwu. Otú ọ dị, papa m gwara nna mama m hoo haa na a gaghị anabata àgwà dị otú ahụ.

Papa m nọgidere na-akwado oruru o ruuru mama m ịgụ Bible na ịhọrọ okpukpe ọ chọrọ ikpe. N’afọ 1946, e mekwara papa m baptizim. Ịhụ otú Jehova si wusie mama m ike ịkwụsi ike n’akụkụ nke eziokwu ahụ n’agbanyeghị mmegide nakwa otú Jehova si kwụghachi ya ụgwọ maka okwukwe ya, kpaliri m ịmalite iso Chineke na-akpakọrịta. Ọgụgụ mama m nọ na-agụrụ m Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bakwaara m uru nke ukwuu.

Mama m nọkwa na-eso nwanne ya nwanyị, bụ́ Marija Repe, na-enwe nkwurịta okwu ndị dị ogologo banyere Bible, e mesịakwa, e mere mụ na Daa Marija baptizim n’otu ụbọchị n’etiti ọnwa July n’afọ 1942. Otu nwanna nwoke bịara kwuo okwu dị mkpirikpi, e mekwara anyị baptizim n’ebe obibi anyị n’ime otu nnukwu ihe anyị na-agbanye mmiri bụ́ nke e ji osisi rụọ.

Ịrụ Ọrụ Mmanye n’Oge Agha Ụwa nke Abụọ

N’afọ 1942, ka Agha Ụwa nke Abụọ na-aga n’ihu, Germany na Ịtali wabanyere na Slovenia, ha na Hungary keziri ya n’etiti onwe ha. Nne na nna m jụrụ isonyere Volksbund, bụ́ òtù ndị Nazi hiwere. Ajụrụ m ịsị “Heil Hitler” n’ụlọ akwụkwọ. O yiri ka onye nkụzi anyị ọ̀ gwara ndị ọchịchị banyere ya.

E tinyere anyị n’ụgbọ okporo ígwè na-aga n’otu ụlọ a gbara ogige nke dịdewere obodo nta bụ́ Hüttenbach, Bavaria, bụ́ ebe e ji mere ogige a na-arụ ọrụ mmanye. Papa m mere ndokwa ka m gaa binyere otu nwoke na-eme bred na ezinụlọ ya ma na-arụrụ ya ọrụ. Ọ bụ n’oge a ka m mụtara ime bred, bụ́ nke mesịrị baara m ezigbo uru. Ka oge na-aga, a kpọgara ndị ezinụlọ anyị ndị ọzọ (gụnyere Daa Marija na ezinụlọ ya) n’ogige dị na Gunzenhausen.

Mgbe agha ahụ biri, achọwara m iso otu ìgwè mee njem iji gaa n’ebe papa m na mama m nọ. N’uhuruchi tupu m gawa, papa m bịara, bụ́ nke m na-atụghị anya ya. Amaghị m ihe gaara eme m ma a sị na m sooro ìgwè ahụ, n’ihi na a na-enyo àgwà ha enyo. Ọzọkwa, o metụrụ m n’ahụ́ na Jehova ji ịhụnanya na-elekọta m ebe o ji nne na nna m na-echebe ma na-azụ m. Mụ na papa m gara ije ruo ụbọchị atọ iji gaa n’ebe ezinụlọ anyị nọ. Ka ọ na-erula na June n’afọ 1945, anyị nile alọrutachaala n’ụlọ anyị.

Mgbe agha ahụ biri, òtù Kọmunist, nke President Josip Broz Tito bụ onyeisi ya, malitere ịchị Yugoslavia. N’ihi ya, ihe nọgidere na-esiri Ndịàmà Jehova ike.

N’afọ 1948, otu nwanna nwoke si Austria bịa, o rikwara nri anyị nyere ya. Ebe ọ bụla ọ gara, ndị uwe ojii sooro ya n’azụ ma jide ụmụnna ndị ọ gara na nke ha. E jidekwara papa m maka ile ya ọbịa kama ịgwa ndị uwe ojii na ọ nọ ya, n’ihi nke ahụkwa, papa m nọrọ mkpọrọ afọ abụọ. Oge a siiri mama m ike, ọ bụghị nanị n’ihi na papa m anọghị ya, kamakwa, n’ihi na ọ maara na mụ na nwanne m nwoke nke m tọrọ ga-enweta ule n’ihi ịnọpụ iche.

Ịga Mkpọrọ na Masedonia

N’ọnwa November n’afọ 1949, a kpọrọ m ije agha. Agara m n’ihu ha iji kọwaara ha na ihe mere m gaghị aga agha bụ n’ihi akọ na uche m. Ndị agha ahụ egeghị m ntị, ha tinyekọtara mụ na ndị ọzọ a kpọrọ ije agha n’ụgbọ okporo ígwè na-aga Masedonia, bụ́ nke dị n’akụkụ nke ọzọ nke Yugoslavia.

E debere m n’ebe m na-ahụghị ndị ezinụlọ m na ụmụnna m ruo afọ atọ, ọ dịghịkwa akwụkwọ ma ọ bụ ọbụna Bible ọ bụla m nwere. Ihe siiri m nnọọ ike. Ihe mere ka m sie ike n’okwukwe bụ ntụgharị uche m nọ na-atụgharị banyere Jehova na ihe nlereanya nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Ihe nlereanya nne na nna m wusikwara m ike. Tụkwasị na nke ahụ, ịnọgide na-ekpe ekpere ka Jehova nye m ume mere ka m ghara ịda mbà n’obi.

Ka oge na-aga, a kpọgara m n’ụlọ mkpọrọ dị n’Idrizovo, nke dị nso na Skopje. N’ụlọ mkpọrọ a, ndị mkpọrọ na-arụ ọrụ dịgasị iche iche. Ná mmalite, arụrụ m ọrụ dị ka onye na-ehicha ọfịs na onye na-ewega akwụkwọ ozi site n’otu ọfịs gaa n’ọzọ. N’agbanyeghị na otu onye mkpọrọ, nke sobu ná ndị uwe ojii nzuzo, na-amajakarị m, mụ na ndị ọzọ nile—ndị nche, ndị mkpọrọ, na ọbụna manịja nke na-elekọta ụlọ ọrụ na-emepụta ihe n’ụlọ mkpọrọ ahụ—dị ná mma.

Mgbe e mesịrị, anụrụ m na a chọrọ onye maara eme bred n’ebe a na-eme bred n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Ụbọchị ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, manịja ahụ bịara mgbe a na-akpọpụta aha ndị mkpọrọ e dere n’akwụkwọ. O jeere rute n’ebe m nọ, ma jụọ m, sị, “Ị̀ ma eme bred?” “Ee, ọga,” ka m kwuru. “Bịa n’ebe a na-eme bred echi,” ka o kwuziri. Onye mkpọrọ ahụ nke nọ na-amaja m si n’ebe ahụ a na-eme bred gafere ọtụtụ mgbe, ma ọ dịghịzi ihe ọ bụla ọ pụrụ ime m n’ebe ahụ. Arụrụ m ọrụ n’ebe ahụ malite na February ruo July n’afọ 1950.

A kpọgaziri m n’ogige ndị agha a na-akpọ Volkoderi, nke dị n’ebe ndịda Masedonia, na nso Ọdọ Mmiri Prespa. Esi m n’Otešovo nke dị nso na-edegara ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ ozi. Eso m ná ndị mkpọrọ na-arụ ọrụ ụzọ, ma ọtụtụ mgbe, arụrụ m ọrụ n’ebe a na-eme bred, bụ́ nke mere ka ihe dịrị m mfe karị. A tọhapụrụ m n’ọnwa November afọ 1952.

N’oge ahụ m na-anọghị na Podhom, e guzobere ọgbakọ n’ógbè ahụ. Na mbụ, ọgbakọ ahụ nọ na-ezukọ n’otu obere họtel dị na Spodnje Gorje. E mesịa, papa m wepụtara otu ụlọ n’ebe obibi anyị ka ọgbakọ na-ezukọ na ya. Obi tọrọ m ụtọ isonyere ha mgbe m si Masedonia lọta. Mụ na Stanka, bụ́ onye m zutere tupu m gaa mkpọrọ, maliteghachiri ịkpa. Anyị lụrụ n’April 24, n’afọ 1954. Otú ọ dị, nnwere onwe m na-aga ijedebe n’oge na-adịghị anya.

Ịga Mkpọrọ na Maribor

N’ọnwa September afọ 1954, a kpọrọ m ọzọ ije agha. Na nke ugbu a, a tụrụ m mkpọrọ ịnọ ihe karịrị afọ atọ na ọkara n’ụlọ mkpọrọ dị na Maribor, bụ́ nke dị ná ngwụsị ebe ugwu Slovenia. Ozugbo o kwere m mee, azụtara m akwụkwọ na pensịl. Amalitere m idetu ihe ọ bụla m chetara—akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche, ihe ndị e kwuru n’Ụlọ Nche, ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ Ndị Kraịst ndị ọzọ. Ana m agụ ihe ndị m deturu n’akwụkwọ m ma na-edenyekwa ihe ndị ọzọ mgbe ọ bụla m chetara ihe ọ bụla. Akwụkwọ ahụ mesịrị ju, nke a mekwara ka m nwee ike itinye uche n’eziokwu ahụ ma kwụsie ike n’ụzọ ime mmụọ. Ekpere na ntụgharị uche nyekwaara m aka n’ụzọ dị ukwuu ịkwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ, na-eme ka m jirikwuo obi ike na-agwa ndị ọzọ eziokwu ahụ.

N’oge ahụ, e kwere ka m na-enweta otu akwụkwọ ozi kwa ọnwa, e kwekwara ka otu onye na-eleta m ruo minit iri na ise kwa ọnwa. Stanka na-eme njem abalị n’ụgbọ okporo ígwè iji rute n’ụlọ mkpọrọ ahụ n’ụtụtụ iji leta m, e mesịakwa, ọ na-alaghachi n’otu ụbọchị ahụ. Nleta ndị a gbara m nnọọ ume. Emewaziri m atụmatụ otú m ga-esi nweta Bible. Mụ na Stanka nọdụrụ n’otu tebụl ma chee onwe anyị ihu. A gwakwara otu onye nche ka o legide anyị anya. Mgbe onye nche ahụ lefuru anya, ezonyere m otu akwụkwọ ozi n’ime akpa Stanka, bụ́ ebe m dere ka o tinye Bible n’akpa ya n’oge ọzọ ọ ga-abịa ileta m.

Stanka na ndị mụrụ m chere na nke a dị nnọọ ize ndụ, ha dọpụtasịrị peeji ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ma tinye ha n’ime bred. Ọ bụ n’ụzọ dị otú a ka m si nweta Bible dị m mkpa. Ọ bụkwa n’otu ụzọ ahụ ka m si nweta Ụlọ Nche ụfọdụ, bụ́ ndị Stanka ji aka ya depụtaghachi. Ọ na-abụ ozugbo m nwetara ha, m na-ejizi aka m depụtaghachi ha ma bibizie nke ahụ Stanka wetara nke ọ ga-abụ ya dị onye hụrụ ya, onye ahụ agaghị ama ebe m si nweta ha.

N’ihi àmà m nọgidere na-agba, ndị mkpọrọ ibe m kwuru na m ga-abanyerịrị ná nsogbu. N’otu oge, mụ na onye mkpọrọ ibe m nọ nnọọ na-ekwurịta banyere Bible. Anyị nụrụ ka e ji mkpịsị ugodi na-akpọghe ọnụ ụzọ ebe anyị nọ, otu onye nche wee bata. Echere m ozugbo na a ga-etinye m n’ụlọ mkpọrọ ebe nanị m ga-anọ. Ma nke ahụ abụghị ihe onye nche ahụ bu n’uche. Ọ nụrụ mkparịta ụka anyị na-enwe wee bịa isonyere anyị. Mgbe afọ juru ya n’ihi otú m si zaa ajụjụ ndị ọ jụrụ, ọ pụrụ ma kpọchiekwa ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ.

N’ọnwa nke ikpeazụ m ga-anọ mkpọrọ, onye kọmishọna na-ahụ maka ịgbazigharị ndị mkpọrọ jara m mma maka otú m si kwụsie ike n’akụkụ eziokwu ahụ. Abịara m ghọta na nke a bụ ụgwọ ọrụ dị mma maka mgbalị ndị m mere n’ime ka a mara aha Jehova. N’ọnwa May afọ 1958, a tọhapụrụ m ọzọ na nga.

Ịgbaga n’Austria, Mesịa Gaa Australia

N’August afọ 1958, mama m nwụrụ. Ọ rịara ọrịa ruo oge ụfọdụ. E mesịa, n’ọnwa September afọ 1958, a kpọrọ m nke ugboro atọ ije agha. Ná mgbede ahụ, mụ na Stanka mere mkpebi ahụ siri ike nke dugara anyị na njem ahụ m kwuru okwu ya n’elu, bụ́ nke anyị si Yugoslavia gafee Austria. N’agwaghị onye ọ bụla, anyị kwakọtara ihe ole na ole na otu tapolin ma si na windo pụọ, tinye isi n’ókè Austria nke dị nnọọ n’ebe ọdịda anyanwụ Ugwu Stol. O yiri ka Jehova megheere anyị ụzọ ahụ isi gbapụ n’oge ọ maara na ọ dịla anyị mkpa inweretụ onwe anyị.

Ndị ọchịchị Austria kpọgara anyị n’otu ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke dị na Salzburg. N’ime ọnwa isii anyị nọrọ n’ebe ahụ, ọ bụ anyị na Ndịàmà bi n’ógbè ahụ nọrọ n’oge ka ukwuu, ya mere, oge anyị nọrọ n’ogige ahụ dị nnọọ ntakịrị. Ọ tụrụ ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ogige ahụ n’anya ịhụ ka anyị si meta nnọọ ndị enyi ngwa ngwa. Ọ bụ n’oge a ka anyị gara mgbakọ mbụ anyị. Ọ bụkwa n’oge a bụ mgbe mbụ anyị mere nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’enweghị ihe mgbochi. O wutere anyị nnọọ ịhapụ ezigbo ndị enyi anyị ndị a mgbe oge ruru ka anyị laa.

Ndị ọchịchị Austria nyere anyị ohere ịkwaga n’Australia. Anyị arọtatụghịdị ná nrọ na anyị ga-agate aka otú ahụ. Anyị ji ụgbọ okporo ígwè gaa Genoa, nke dị n’Ịtali, wee banyezie ụgbọ mmiri na-aga Australia. Anyị mesịrị biri n’obodo ukwu bụ́ Wollongong, New South Wales. Ọ bụ n’ebe a ka a mụrụ nwa anyị nwoke, bụ́ Philip, na March 30, afọ 1965.

Ibi n’Australia emegheworo anyị ohere dị iche iche ije ozi, gụnyere ohere nke ikwusara ndị si n’ebe ndị a mabu dị ka Yugoslavia kwabata n’Australia. Anyị na-ekele Jehova maka otú o si gọzie anyị, bụ́ nke gụnyere anyị inwe ike ijere ya ozi dị ka otu ezinụlọ dị n’otu. Philip na nwunye ya, bụ́ Susie, nwere ihe ùgwù nke ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Australia, ọbụna ha nwekwara ihe ùgwù ịnọ afọ abụọ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Slovenia.

N’agbanyeghị ihe ịma aka ndị ịka nká na nsogbu ahụ́ ike wetaworo, mụ na nwunye m anọgidewo na-anụ ụtọ ozi anyị na-ejere Jehova. Enwere m nnọọ ekele maka ezi ihe nlereanya nke nne na nna m! Ọ ka na-ewusikwu m ike, na-enyere m aka ime ihe Pọl onyeozi kwuru: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’olileanya ahụ. Na-atachinụ obi n’ime mkpagbu. Nọgidesienụ ike n’ekpere.”—Ndị Rom 12:12.

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Nne na nna m ná ngwụsị afọ ndị 1920

[Foto dị na peeji nke 17]

Mama m nọ n’isi isi aka nri, ya na Ančka, bụ́ onye kụziiri ya eziokwu ahụ

[Foto dị na peeji nke 18]

Mụ na nwunye m, bụ́ Stanka, obere oge anyị lụsịrị

[Foto dị na peeji nke 19]

Ọgbakọ nke nọ na-ezukọ n’ụlọ anyị n’afọ 1955

[Foto dị na peeji nke 20]

Mụ na nwunye m, nwa anyị nwoke, bụ́ Philip, na nwunye ya, bụ́ Susie