Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ihe E Mere nke Mbụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ihe E Mere nke Mbụ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ihe E Mere nke Mbụ

IHE dị ka afọ iri asaa na asaa agafewo kemgbe ndị Juu si Babilọn, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha gaa, lọta. Ụlọ nsọ nke Gọvanọ Zerubabel wughachiri anọwo afọ iri ise na ise ugbu a. Isi ihe mere ndị Juu ji lọta bụ iji maliteghachi ife ezi ofufe na Jeruselem. Otú ọ dị, ndị Izrel adịghịzi anụ ọkụ n’obi n’ofufe Jehova. Agbamume dị ha ezigbo mkpa, nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe akwụkwọ Bible bụ́ Ihe E Mere nke Mbụ nyere ha.

Ihe E Mere nke Mbụ abụghị nanị ihe ndekọ usoro ọmụmụ kamakwa ọ bụ ndekọ nke ihe ndị mere n’ime ihe dị ka afọ iri anọ, site n’oge Eze Sọl nwụrụ ruo n’oge Eze Devid nwụrụ. E kwuru na ọ bụ onye nchụàjà bụ́ Ezra dere akwụkwọ a n’afọ 460 T.O.A. Ihe E Mere nke Mbụ na-adọrọ mmasị anyị n’ihi na ọ na-akọwa otú e si fee ofufe n’ụlọ nsọ ahụ ma na-enye nkọwa zuru ezu banyere usoro ọmụmụ nke Mezaịa ahụ. Dị ka ihe so n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, ozi dị n’ime ya na-ewusi okwukwe anyị ike ma na-eme ka anyị ghọtakwuo Bible.—Ndị Hibru 4:12.

IHE NDEKỌ DỊ MKPA NKE AHA NDỊ MMADỤ

(1 Ihe E Mere 1:1–9:44)

Ihe ndekọ zuru ezu nke usoro ọmụmụ, bụ́ nke Ezra dere, dị mkpa maka, ma ọ dịkarịa ala, ihe atọ: iji hụ na ọ bụ nanị ndị ikom kwesịrị ekwesị na-eje ozi dị ka ndị nchụàjà, iji nye aka n’ikere agbụrụ dị iche iche ihe onwunwe, na iji chekwaa ihe ndekọ banyere usoro ọmụmụ nke Mezaịa ahụ ga-esite na ya. N’ihe ndekọ ahụ, e dekọrọ akụkọ usoro ọmụmụ ndị Juu laa azụ ruo na nwoke mbụ. E nwere ọgbọ iri site n’Adam ruo na Noa, nweekwa ọgbọ iri ọzọ site na Noa ruo n’Ebreham. Mgbe e depụtasịrị aha ụmụ Ishmel, ụmụ iko Ebreham bụ́ Ketura, na ụmụ Ịsọ n’ihe ndekọ ahụ, e dewaziri ihe banyere usoro ọmụmụ nke ụmụ iri na abụọ nke Izrel.—1 Ihe E Mere 2:1.

E nyere nkọwa sara mbara banyere agbụrụ Juda n’ihi na ọ bụ n’agbụrụ a ka e nwere usoro ndị eze sitere n’agbụrụ Eze Devid. E nwere ọgbọ iri na anọ site n’Ebreham ruo na Devid, nweekwa ọgbọ iri na anọ ọzọ site na Devid ruo mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babilọn. (1 Ihe E Mere 1:27, 34; 2:1-15; 3:1-17; Matiu 1:17) Ezra depụtaziri aha ndị agbụrụ ndị nke bi n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Jọdan. Ihe ọzọ o dere bụ banyere usoro ọmụmụ nke ụmụ Livaị. (1 Ihe E Mere 5:1-24; 6:1) Mgbe nke ahụ gasịrị, o dere ihe ole na ole dị mkpa banyere agbụrụ ụfọdụ ndị ọzọ dị n’ebe ọdịda anyanwụ nke Osimiri Jọdan ma dezie ihe banyere agbụrụ Benjamin n’ụzọ zuru ezu. (1 Ihe E Mere 8:1) E dekwara aha ndị mbụ biri na Jeruselem mgbe ha si ná ndọrọ n’agha na Babilọn lọta.—1 Ihe E Mere 9:1-16.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:18Ònye bụ nna Shelaọ̀ bụ Kaịnan ka ọ̀ bụ Apakshad? (Luk 3:35, 36) Ọ bụ Apakshad bụ nna Shela. (Jenesis 10:24; 11:12) Aha ahụ bụ́ “Kaịnan” nke dị na Luk 3:36 pụrụ ịbụ ụdị a kpọjọrọ akpọjọ nke aha Bekee bụ́ “Chaldeans” (ndị Kaldia). Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ na otú e si dee ya mbụ bụ “nwa onye Kaldia bụ́ Apakshad.” Ma ọ bụkwanụ, ọ pụrụ ịbụ na aha ahụ bụ́ Kaịnan na Apakshad na-ezo aka n’otu onye. Ihe ọzọ e kwesịrị ịrịba ama bụ na okwu bụ́ “nwa Kaịnan” adịghị n’ihe odide ochie ụfọdụ.

2:15—Devid ọ̀ bụ nwa nke asaa nke Jesi? Ee e. Jesi nwere ụmụ asatọ, Devid bụkwa ọdụdụ nwa ya. (1 Samuel 16:10, 11; 17:12) Ihe àmà na-egosi na otu n’ime ụmụ Jesi nwụrụ n’amụtaghị nwa ọ bụla. Ebe ọ bụ na e nweghị uru ọ bụla nwa ahụ ga-aba n’usoro ọmụmụ ahụ, Ezra edeghị aha ya.

3:17—N’ihi gịnị ka Luk 3:27 ji kwuo na nwa Jekonaịa bụ́ Sheltiel bụ nwa Niraị? Jekonaịa bụ nna Sheltiel. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na Niraị nyere Sheltiel nwa ya nwanyị ka ọ lụọ. Luk zoro aka n’ebe di nwa Niraị nọ dị ka nwa Niraị dị nnọọ ka o mere n’ihe banyere Josef mgbe ọ kpọrọ ya nwa Heli, bụ́ nna Meri.—Luk 3:23.

3:17-19—Olee ihe jikọrọ Zerubabel, Pedaịa, na Sheltiel? Zerubabel bụ nwa Pedaịa, onye bụ́ nwanne Sheltiel. Ma, mgbe ụfọdụ Bible na-akpọ Zerubabel nwa Sheltiel. (Matiu 1:12; Luk 3:27) Nke a nwere ike ịbụ n’ihi na Pedaịa nwụrụ, Sheltiel azụlitezie Zerubabel. Ma ọ bụkwanụ, ebe ọ bụ na Sheltiel nwụrụ n’amụtaghị nwa, Pedaịa lụghaara nwunye ya, Zerubabel bụkwa nwa mbụ ha mụtara.—Deuterọnọmi 25:5-10.

5:1, 2Gịnị ka Josef inweta ókè nke diọkpara pụtara? Ọ pụtara na Josef nwetara òkè abụọ nke ihe nketa ha. (Deuterọnọmi 21:17) N’ụzọ dị otú a, ọ ghọrọ nna nke ebo abụọ—Ifrem na Manase. Nke ọ bụlazi n’ime ụmụ ndị ọzọ nke Izrel mụtara nanị otu ebo.

Ihe Mmụta Dịịrị Anyị:

1:1-9:44. Ndekọ nke usoro ọmụmụ nke ndị dịrị adị n’ezie na-egosi na nhazi nile e mere maka ezi ofufe dabeere n’ihe mere eme, ọ bụghị n’akụkọ ifo.

4:9, 10. Jehova zara ekpere Jebez kpesiri ike, bụ́ nke ọ nọ na ya rịọ ka ókèala ya gbasaa iji nwee ike ịbatakwu ndị na-atụ egwu Chineke, n’adịghịdị mkpa ka ya lụọ agha tupu nke ahụ emee. Anyị onwe anyị kwesịkwara ikpe ekpere sitere n’ala ala obi maka mmụba ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ.

5:10, 18-22. N’ụbọchị Eze Sọl, agbụrụ ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan meriri ndị Hagrit n’agbanyeghị na ndị a ji ihe karịrị okpukpu abụọ karịa ha. Agbụrụ ndị a meriri n’ihi na ndị dike ha tụkwasịrị Jehova obi ma legara ya anya maka enyemaka. Ka anyị tụkwasị Jehova obi kpamkpam ka anyị na-ebu agha ime mmụọ megide ndị iro karịrị anyị.—Ndị Efesọs 6:10-17.

9:26, 27. Ndị Livaị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá na-arụ ọrụ chọrọ nnọọ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi. E nyere ha mkpịsị igodi nke ebe e si abanye ebe ndị dị nsọ n’ụlọ nsọ ahụ. Ọ dịghị ụbọchị ha chezọrọ imeghe ọnụ ụzọ ámá. E nyewo anyị ibu ọrụ nke ịgakwuru ndị nọ n’ókèala anyị na inyere ha aka ịbịa fee Jehova ofufe. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị igosipụta na anyị bụ ndị dị uchu na ndị a pụrụ ịtụkwasị obi dị ka ndị Livaị ahụ na-emeghe ọnụ ụzọ ámá?

DEVID ACHỊWA DỊ KA EZE

(1 Ihe E Mere 10:1-29:30)

Ihe ndekọ ahụ ji akụkọ banyere ọnwụ Eze Sọl na ụmụ ya atọ nwụrụ n’agha ha buru megide ndị Filistia n’Ugwu Gilboa, malite. E mere Devid, bụ́ nwa Jesi, eze nke ebo Juda. Ndị ikom sitere n’ebo nile abịa na Hebrọn ma mee ya eze Izrel nile. (1 Ihe E Mere 1:1-3) N’oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, ya emerie Jeruselem. Ka e mesịrị, ndị Izrel ‘weere iti mkpu, werekwa olu opi ike, chịrịkwa opi, une na ụbọ akwara’ bubata igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jeruselem.—1 Ihe E Mere 15:28.

Devid kwupụtara ọchịchọ ya iwuru ezi Chineke ahụ ụlọ. Jehova agwa ya na ọ bụ Solomọn ga-enwe ihe ùgwù nke iwuru ya ụlọ, ma o so Devid gbaa ndụ inye ya Alaeze. Ka Devid na-ebu agha megide ndị iro Izrel, Jehova mere ka o nwee ọtụtụ mmeri. Ọnụ ọ gụrụ ndị Izrel n’ụzọ iwu na-akwadoghị akpata ọnwụ nke iri puku mmadụ asaa. Mgbe ọ natasịrị ntụziaka site n’aka mmụọ ozi ka o wuoro Jehova ebe ịchụàjà, Devid azụrụ ala n’aka Ọnan onye Jebus. Devid malitere ‘idozi ihe hie nne’ maka iwu ụlọ nke ‘ga-adị ukwuu kachasị ụlọ nile.’ (1 Ihe E Mere 22:5) Devid ahazie ọrụ ndị Livaị, bụ́ nke a kọwara n’ụzọ zuru ezu n’ebe a karịa n’ebe ọ bụla ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ. Eze na ndị Izrel enye onyinye n’ụba maka ụlọ nsọ ahụ. Mgbe Devid chịsịrị ruo afọ iri anọ, ya anwụọ, “ụbọchị nile nke ndụ ya na akụ̀ na nsọpụrụ jukwara ya afọ; Solomọn nwa ya wee bụrụ eze n’ọnọdụ ya.”—1 Ihe E Mere 29:28.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

11:11—Gịnị mere e ji kwuo n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na ndị e gburu dị narị mmadụ atọ kama ịbụ narị mmadụ asatọ dị ka e kwuru n’ihe ndekọ yiri ya nke dị na 2 Samuel 23:8? Onyeisi nke mmadụ atọ kasị bụrụ dike n’etiti ndị ikom Devid bụ Jashobiam, ma ọ bụ Josheb-bashibet. Ndị ikom abụọ ndị nke ọzọ bụ́ ndị dike bụ Elieza na Shama. (2 Samuel 23:8-11) Ihe mere ihe ndekọ abụọ ahụ ji dị iche pụrụ ịbụ na ha na-ekwu banyere ihe ndị dịrịtara iche otu onye ahụ mere.

11:20, 21—Gịnị bụ ọkwá Abishaị ma e jiri ya tụnyere nke ndị ikom atọ ahụ kasị bụrụ dike n’etiti ndị ikom Devid? Abishaị esoghị ná ndị dimkpa atọ ahụ bụ́ dike, bụ́ ndị jeere Devid ozi. Otú ọ dị, dị ka e kwuru na 2 Samuel 23:18, 19, ọ bụ onyeisi ndị agha iri atọ, ọkwá ya karịkwara nke ndị agha ahụ. Aha Abishaị dere ude ka nke ndị ikom atọ ahụ kasị bụrụ dike n’ihi na ọ kpara ike dị ka Jashobiam.

12:8—N’echiche dị aṅaa ka ihu ndị agha bụ́ ndị Gad dị ka “ihu ọdụm”? Ndị ikom a bụ́ dimkpa nọ n’akụkụ Devid n’ọzara. Ntutu ha etowo ogologo. Afụ ọnụ ha nke juru eju mere ka ha dị egwu n’ile anya dị ka ọdụm.

13:5—Gịnị bụ “Shaihoa nke Ijipt”? Ebe ọ bụ na “Shaihoa” pụtara n’ụzọ bụ́ isi “osimiri” n’asụsụ Hibru, ụfọdụ chere na okwu a na-ezo aka n’otu akụkụ nke Osimiri Naịl. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ghọtara na ihe a na-ekwu okwu ya bụ “mmiri iyi Ijipt”—ogologo ọwa mmiri nke bụ́ ókè Ala Nkwa ahụ nke dị na ndịda ebe ọdịda anyanwụ.—Ọnụ Ọgụgụ 34:2, 5; Jenesis 15:18.

16:30—Gịnị ka okwu bụ́ ‘igbu mgbu’ site n’ihu Jehova pụtara? E ji okwu bụ́ ‘igbu mgbu’ mee ihe n’ebe a n’ụzọ ihe atụ iji zoo aka n’egwu nsọpụrụ a na-atụ Jehova na ùgwù miri emi a na-akwanyere ya.

16:1, 37-40; 21:29, 30; 22:19—Ndokwa dị aṅaa e mere maka ofufe nọgidere na-adị irè n’Izrel site n’oge e bubatara Igbe ahụ na Jeruselem ruo mgbe e wuru ụlọ nsọ ahụ? Igbe ahụ anọbeghị ọtụtụ afọ n’ụlọikwuu ahụ mgbe Devid bubatara ya na Jeruselem ma dọba ya n’ụlọ ntu nke ọ rụrụ. Mgbe e bubatasịrị Igbe ahụ na Jeruselem, ọ nọgidere n’ụlọ ntu dị n’ebe ahụ. Ụlọikwuu ahụ dị na Gibiọn, bụ́ ebe Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Zedọk na ụmụnne ya na-anọ achụ àjà dị ka Iwu ahụ kwuru. Ndokwa a dịgidere irè ruo mgbe e wusịrị ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem. Mgbe e wusịrị ụlọ nsọ ahụ, e si na Gibiọn bute ụlọikwuu ahụ na Jeruselem, a dọbakwara Igbe ahụ n’Ebe Nsọ Kasị Ebe Nsọ nke ụlọ nsọ ahụ.—1 Ndị Eze 8:4, 6.

Ihe Mmụta Dịịrị Anyị:

13:11. Kama iwewa iwe na ịtawa Jehova ụta mgbe mgbalị anyị kụrụ afọ n’ala, anyị aghaghị ịtụle ọnọdụ ahụ ma gbalịa ịchọpụta ihe kpatara ọdịda ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Devid mere otú ahụ. Ọ mụtara ihe site n’ihie ụzọ ya ma mesịa bubata Igbe ahụ na Jeruselem, site n’iji usoro kwesịrị ekwesị eme ihe. *

14:10, 13-16; 22:17-19. Anyị kwesịrị ijekwuru Jehova n’ekpere mgbe nile ma chọọ nduzi ya tupu anyị emewe ihe ọ bụla nke pụrụ imetụta ọnọdụ ime mmụọ anyị.

16:23-29. Ofufe Jehova kwesịrị ịbụ ihe mbụ ná ndụ anyị.

18:3. Jehova bụ Onye na-emezu nkwa ya. Site n’aka Devid, o mezuru nkwa o kwere inye mkpụrụ Ebreham ala Kenan nile, nke sitere “n’osimiri Ijipt ruo osimiri ukwu ahụ, bụ́ osimiri Yufretis.”—Jenesis 15:18; 1 Ihe E Mere 13:5.

21:13-15. Jehova gwara mmụọ ozi na-eti ndị ya ihe otiti ka ọ kwụsị ime otú ahụ n’ihi na ahụhụ ndị ya na-ata metụrụ Ya n’ahụ́. N’ezie, “obi ebere ya bara ụba.” *

22:5, 9; 29:3-5, 14-16. Ọ bụ ezie na e nyeghị ya ọrụ iwu ụlọ nsọ Jehova, Devid gosipụtara mmụọ mmesapụ aka. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ghọtara na ihe nile o nwere bụ n’ihi ịdị umeala n’obi Jehova. Inwe ekele dị otú ahụ kwesịrị ịkpali anyị igosipụta mmụọ mmesapụ aka.

24:7-18. Ndokwa nke inwe òtù ndị nchụàjà iri abụọ na anọ nke Devid hiwere malitere ịdị irè mgbe mmụọ ozi Jehova bịakwutere Zekaraịa, nna Jọn Onye Na-eme Baptizim, ma maa ọkwa ọmụmụ a gaje ịmụ Jọn. Dị ka onye so “n’ìgwè nke Abaịja,” Zekaraịa nọ mgbe ahụ na-eje ozi nke ya n’ụlọ nsọ ahụ. (Luk 1:5, 8, 9) Ndị keere òkè n’ezi ofufe bụ ndị dịrị adị n’ezie, ọ bụghị ndị a kọrọ n’akụkọ ifo. Ịnọgide na-akwado “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” n’ihe metụtara ofufe a na-efe Jehova taa n’ụzọ a haziri ahazi, ga-ewetara anyị ọtụtụ ngọzi.—Matiu 24:45.

Were “Mkpụrụ Obi Ọ Na-atọ Ụtọ” Fee Jehova

Ihe E Mere nke Mbụ abụghị nanị ihe ndekọ usoro ọmụmụ. Ọ bụkwa akụkọ banyere otú Devid si bubata igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jeruselem. Ọ na-akọkwa banyere oké mmeri ndị o nwere, na-akọ banyere nkwadebe maka owuwu nke ụlọ nsọ ahụ, nakwa banyere nguzobe e guzobere òtù ndị nchụàjà na-eje ozi. Ọ ghaghị ịbụ na ihe nile Ezra kọrọ n’Ihe E Mere nke Mbụ baara ndị Izrel uru, na-enyere ha aka ijirighachi ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova n’ụlọ nsọ ahụ.

Lee ezi ihe nlereanya nke Devid setịpụrụ n’ibute ofufe Jehova ụzọ ná ndụ ya! Kama ịchọwara onwe ya ihe ùgwù ndị pụrụ iche, Devid chọrọ ime uche Chineke. A na-agba anyị ume itinye n’ọrụ ndụmọdụ ya bụ́ ka e jiri “obi zuru okè, werekwa mkpụrụ obi ọ na-atọ ụtọ” na-ejere Jehova ozi.—1 Ihe E Mere 28:9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 32 Iji gụọ ihe mmụta ndị ọzọ dị ná mgbalị Devid mere iji ụgbọ ịnyịnya bubata Igbe ahụ na Jeruselem, lee Ụlọ Nche nke May 15, 2005, peeji nke 16-19.

^ par. 36 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ọnụ Devid gụrụ ụmụ Izrel bụ́ nke iwu na-akwadoghị, lee Ụlọ Nche nke May 15, 2005, peeji 16-19.

[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 8-11]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

4026 T.O.A. Adam Ọgbọ ndị e nwere site n’Adam ruo na

Noa (afọ 1,056)

130 afọ ⇩

 

Set

 

105 ⇩

 

Ịnọsh

 

90 ⇩

 

Kenan

 

70 ⇩

 

Mahalalel

 

65 ⇩

 

Jered

 

162 ⇩

 

Ịnọk

 

65 ⇩

 

Metusela

 

187 ⇩

 

Lemek

182 ⇩

 

2970 T.O.A. Noa 2970 T.O.A. a mụọ NOA

Ọgbọ ndi e nwere site na Noa ruo

afọ 502 ⇩ n’Ebreham (afọ 952)

 

Shem

IJU MMIRI AHỤ 2370 T.O.A.

100 ⇩

 

Apakshad

 

35 ⇩

 

Shila

 

30 ⇩

 

Iba

 

34 ⇩

 

Pileg

 

30 ⇩

 

Riu

 

32 ⇩

 

Sirig

 

30 ⇩

 

Nehọ

 

29 ⇩

 

Tira

 

130 ⇩

 

2018 T.O.A. Ebreham 2018 T.O.A. a mụọ EBREHAM

Site n’Ebreham ruo na Devid:

100 afọ ọgbọ iri na anọ (afọ 911)

 

Aịzik

 

60 ⇩

Jekọb

 

ihe dị ka ⇩

n’afọ 88

Juda

 

 

Pirez

 

 

Hezrọn

 

 

Ram

 

 

Aminadab

 

 

Nashọn

 

 

Salmọn

 

 

Boaz

 

 

Obed

 

 

Jesi

 

 

1107 T.O.A. a mụọ DEVID