Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nọrọnụ Na Nche”—Oge Awa nke Ikpe Eruwo!

“Nọrọnụ Na Nche”—Oge Awa nke Ikpe Eruwo!

“Nọrọnụ Na Nche”—Oge Awa nke Ikpe Eruwo!

Ihe dị n’ihe ọmụmụ a dabeere na broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! bụ́ nke e wepụtara ná mgbakọ distrikti e nwere n’ụwa nile n’afọ 2004/2005.

“Nọrọnụ na nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”—MATIU 24:42.

1, 2. Olee ihe dabara adaba Jizọs ji tụnyere ọbịbịa ya?

GỊNỊ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị maara na onye ohi na-awagharị n’obodo, na-etipu ụlọ ndị agbata obi gị ma na-ezuru ihe ha? Iji chebe ndị ị hụrụ n’anya na ihe onwunwe gị, ị ga-anọ na nche. A sị kwuwe, onye ohi adịghị ezi ozi na ya na-abịa. Kama nke ahụ, ọ na-ezoro ezoro abịa ná mberede.

2 Jizọs ji otú onye ohi si akpa àgwà mee ihe atụ ihe karịrị otu ugbo. (Luk 10:30; Jọn 10:10) Banyere ihe ndị ga-eme na mgbe ọgwụgwụ a na ihe ndị ga-eduga n’ọbịbịa ọ ga-abịa imezu ihe e kpere n’ikpe, Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Nọrọnụ na nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. Ma maranụ otu ihe, na a sị na onyeisi ezinụlọ maararị oge nche nke onye ohi ji abịa, ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka a wabanye n’ụlọ ya.” (Matiu 24:42, 43) Ị̀ hụla, Jizọs ji ọbịbịa ya tụnyere otú onye ohi si abịa—na mberede?

3, 4. (a) Olee ihe ndị ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs banyere ọbịbịa ya gụnyere? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilite?

3 Ihe atụ ahụ dabara nnọọ adaba n’ihi na ọ dịghị onye ga-ama kpọmkwem ụbọchị Jizọs ga-abịa. Ná mmalite nke amụma ahụ, Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye maara banyere ụbọchị na awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama nanị Nna m maara.” (Matiu 24:36) N’ihi ya, Jizọs gbara ndị na-ege ya ntị ume, sị: “Gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere.” (Matiu 24:44) Ndị na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs ga-adị njikere, na-akpa àgwà dị mma, n’agbanyeghị mgbe ọ bụla ọ ga-abịa imezu ihe Jehova kpere n’ikpe.

4 Ajụjụ ụfọdụ dị mkpa na-ebilite: Ịdọ aka ná ntị Jizọs ọ̀ bụ nanị maka ndị ụwa, ka ọ̀ dịkwa ezi Ndị Kraịst mkpa ‘ịnọ na nche’? N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka a ‘nọrọ na nche,’ gịnịkwa ka nke a gụnyere?

Ịdọ Aka ná Ntị Dịịrị Ole Ndị?

5. Olee otú anyị si mara na ọ bụ ezi Ndị Kraịst ka a dọrọ aka ná ntị, sị, “nọrọnụ na nche”?

5 A naghị agbagha ya agbagha na ọ bụ dị ka onye ohi si abịa ka Onyenwe anyị ga-abịakwute ndị bi n’ụwa, bụ́ ndị na-adịghị aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị banyere ọdachi na-abịanụ. (2 Pita 3:3-7) Otú ọ dị, gịnị banyere ezi Ndị Kraịst? Pọl onyeozi degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ, sị: “Unu onwe unu maara nnọọ nke ọma na ụbọchị Jehova na-abịa kpọmkwem dị ka onye ohi n’abalị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:2) Anyị enweghị obi abụọ ọ bụla na “ụbọchị Jehova na-abịa.” Ma nke ahụ ò mere ka ọ ghara ịdịcha mkpa ịnọ na nche? Rịba ama na ọ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka Jizọs gwara, sị: “N’awa unu na-echeghị na ọ gaje ịbụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Matiu 24:44) Tupu Jizọs ekwuo nke ahụ, ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị mgbe ọ na-agba ha ume ịnọgide na-achọ Alaeze ahụ, sị: “Dịrịnụ njikere, n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị na ọ pụrụ ịbụ ka Nwa nke mmadụ na-abịa.” (Luk 12:31, 40) Nke a ọ́ dịghị egosi n’ụzọ doro anya na ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya ka Jizọs na-agwa okwu mgbe ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Nọrọnụ na nche”?

6. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị ‘nọrọ na nche’?

6 Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ‘nọrọ na nche’ ma ‘dịrị njikere’? Jizọs na-akọwa, sị: “Ndị ikom abụọ ga-anọ n’ubi: a ga-akpọrọ otu ma gbahapụ onye nke ọzọ; ndị inyom abụọ ga na-egwe nri n’ihe igwe nri: a ga-akpọrọ otu ma gbahapụ onye nke ọzọ.” (Matiu 24:40, 41) “A ga-akpọrọ,” ma ọ bụ zọpụta, ndị dị njikere n’oge a ga-ebibi ụwa a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke. A ‘ga-agbahapụ,’ ma ọ bụ bibie, ndị ọzọ n’ihi na ha na-achụso ihe ga-adịrị nanị onwe ha mma. Ndị a a ga-ebibi pụrụ ịgụnye ndị e ziworo ihe ma ha anọgideghị na nche.

7. Gịnị ka amaghị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa na-enye anyị ohere ime?

7 Ọmụma anyị na-amaghị kpọmkwem ụbọchị usoro ihe ochie a ga-abịa ná njedebe na-enye anyị ohere igosipụta na anyị ji ezi obi na-ejere Chineke ozi. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ pụrụ iyi ka ọgwụgwụ ahụ ò gbuola oge ịbịa. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ Ndị Kraịst, bụ́ ndị chere otú ahụ, akwụsịla iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi. Ma, site n’ịrara onwe anyị nye Jehova, anyị nyere ya onwe anyị kpamkpam ijere ya ozi. Ndị maara onye Jehova bụ maara na ịnụ ọkụ n’obi mmadụ gosipụtara mgbe ọ hụrụ na oge agwụwala adịghị amasị ya. Ọ maara ihe dị n’obi.— 1 Samuel 16:7.

8. Olee otú ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ si akpali anyị ịnọ na nche?

8 Ebe ọ bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya n’ezie, ọ na-atọ anyị ụtọ nke ukwuu ime uche ya. (Abụ Ọma 40:8; Matiu 26:39) Anyị chọkwara ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi. Eziokwu ahụ bụ́ na anyị aghaghị ichetụkwu karịa ka anyị tụrụ anya ya adịghị eme ka ihe ùgwù ahụ bụrụzie ihe na-adịchaghị oké ọnụ ahịa. Karịsịa, anyị na-anọ na nche n’ihi na anyị na-atụ nnọọ anya na ọ bụ ụbọchị Jehova ka Jehova ga-eji mezuo nzube ya. Ọchịchọ siri ike anyị nwere ime ihe na-atọ Chineke ụtọ na-akpali anyị itinye ndụmọdụ dị n’Okwu ya n’ọrụ na ibute Alaeze ya ụzọ ná ndụ anyị. (Matiu 6:33; 1 Jọn 5:3) Ka anyị tụlee otú ịnọ na nche kwesịrị isi metụta mkpebi ndị anyị na-eme nakwa otú anyị si ebi ndụ anyị kwa ụbọchị.

Ebee Ka Ndụ Gị Na-eche Ihu?

9. Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka ndị bi n’ụwa ghọta oge anyị bi na ya?

9 Ọtụtụ ndị na-achọpụta na nsogbu ndị tara akpụ na ihe omume ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ aghọọla ihe a na-ahụ kwa ụbọchị, ọ pụkwara ịbụ na ebe ndụ ha chere ihu adịghị eme ha obi ụtọ. Otú ọ dị, hà maara ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara n’ezie? Hà ghọtara na anyị na-ebi ná “ngwụsị nke usoro ihe a?” (Matiu 24:3) Hà ghọtara na omume ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ime ihe ike, na àgwà asọpụrụghị Chineke ndị juru ebe nile na-egosi na ụbọchị ndị a bụ ‘ụbọchị ikpeazụ’? (2 Timoti 3:1-5) Ọ dị oké mkpa ka ha ghọta ihe ihe a nile pụtara ma mara ebe ndụ ha chere ihu.

10. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji hụ na anyị nọ na nche?

10 Gịnị banyere anyị? Kwa ụbọchị, anyị na-enwe mkpebi ime bụ́ ndị metụtara ọrụ anyị, ahụ́ ike anyị, ezinụlọ anyị, na ofufe anyị na-efe Jehova. Anyị maara ihe Bible na-ekwu, anyị na-agbalịsikwa ike itinye ha n’ọrụ. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ma anyị jụọ onwe anyị, sị: ‘Èkwewo m ka nchegbu nke ndụ mee ka m gharazie iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe? Àna m ekwe ka nkà ihe ọmụma ụwa, echiche ya, na-ekpebiri m ihe ndị m ga na-ahọrọ?’ (Luk 21:34-36; Ndị Kọlọsi 2:8) Ọ dị mkpa ka anyị nọgide na-egosipụta na anyị tụkwasịrị Jehova obi kpamkpam ma ghara ịdabere ná nghọta anyị. (Ilu 3:5) N’ụzọ dị otú a, anyị ‘ga-ejidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie’—ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.—1 Timoti 6:12, 19.

11-13. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe mere (a) n’ụbọchị Noa? (b) n’ụbọchị Lọt?

11 E nwere ọtụtụ ihe atụ ndị na-adọ aka ná ntị n’ime Bible, bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka ịnọ na nche. Tụlee ihe mere n’ụbọchị Noa. Ogologo oge tupu Chineke emee ihe, o mere ka a dọọ ndị mmadụ aka ná ntị. Ma, e wezụga Noa na ezinụlọ ya, ndị mmadụ amaghị oge ha nọ na ya. (2 Pita 2:5) Banyere nke a, Jizọs kwuru, sị: “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị bu iju mmiri ahụ ụzọ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Matiu 24:37-39) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta na nke a? Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị na-ekwe ka ihe nke ụwa—ọbụna ihe ndị a na-eme ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị—mee ka ihe ime mmụọ, bụ́ ndị Chineke gbara anyị ume ibute ụzọ, nọrọ n’ọnọdụ nke abụọ, o kwesịrị ichebara ọnọdụ ya echiche.—Ndị Rom 14:17.

12 Cheekwa echiche banyere ụbọchị Lọt. Obodo Sọdọm, bụ́ ebe Lọt na ezinụlọ ya bi, bara ọgaranya, ma omume rụrụ arụ jupụtara na ya. Jehova zigara ndị mmụọ ozi ya ibibi obodo ahụ. Ndị mmụọ ozi ahụ gbara Lọt na ezinụlọ ya ume ka ha si na Sọdọm gbapụ ma ghara ile anya n’azụ. Site n’agbamume nke ndị mmụọ ozi, ha hapụrụ obodo ahụ. Otú ọ dị, ihe àmà na-egosi na obi ekweghị nwunye Lọt chefuo ụlọ ya dị na Sọdọm. O nupụrụ isi ma lee anya n’azụ, nke ahụ takwara isi ya. (Jenesis 19:15-26) Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị banyere ọdịnihu, sị: “Chetanụ nwunye Lọt.” Ànyị na-agbaso ịdọ aka ná ntị ahụ?—Luk 17:32.

13 E chebere ndị ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Chineke. Nke ahụ mezuru n’ahụ́ Noa na ezinụlọ ya nakwa n’ahụ́ Lọt na ụmụ ya ndị nwanyị abụọ. (2 Pita 2:9) Ka anyị na-atụgharị uche n’ịdọ aka ná ntị dị n’ihe atụ ndị a, anyị na-enweta agbamume site n’ozi nzọpụta dị n’ime ha, nke bụ́ maka ndị hụrụ ezi omume n’anya. Nke ahụ na-eme ka anyị nwee olileanya siri ike na nkwa Chineke kwere iweta “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” bụ́ ndị “ezi omume gajekwa ibi n’ime ha,” ga-emezu.—2 Pita 3:13.

‘Oge Awa nke Ikpe Abịawo’!

14, 15. (a) Gịnị ka “oge awa” nke ikpe gụnyere? (b) Gịnị ka ‘ịtụ Chineke egwu na inye ya otuto’ gụnyere?

14 Ka anyị na-anọ na nche, gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya? N’akwụkwọ Mkpughe, e depụtara usoro nzube Chineke ga-esi mezuo. Ime ihe kwekọrọ n’ihe akwụkwọ ahụ kwuru dị oké mkpa iji gosipụta na anyị dị njikere. Amụma ahụ kọwara n’ụzọ doro anya ihe ndị ga-eme “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” bụ́ nke malitere mgbe e chiri Kraịst eze n’eluigwe n’afọ 1914. (Mkpughe 1:10) Mkpughe na-agwa anyị banyere otu mmụọ ozi nke e nyere “ozi ọma ebighị ebi ịkpọsa.” O ji oké olu na-ekwu, sị: “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe sitere n’aka ya abịawo.” (Mkpughe 14:6, 7) “Oge awa” nke ikpe ahụ dị mkpụmkpụ; ọ gụnyere ma oge a ga-eji kpọsaa ikpe ahụ ma oge a ga-eji mezuo ihe e kpere n’ikpe nke e kwuru okwu ya n’amụma ahụ. Anyị na-ebi n’oge ahụ ugbu a.

15 Ugbu a, tupu oge awa nke ikpe ahụ abịa ná njedebe, a na-agba anyị ume, sị: “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto.” Gịnị ka nke a gụnyere? Ịtụ Chineke egwu ziri ezi kwesịrị ịkpali anyị isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe anyị. (Ilu 8:13) Ọ bụrụ na anyị na-asọpụrụ Chineke, anyị ga-eji nkwanye ùgwù miri emi na-ege ya ntị. Anyị agaghị eji nnọọ ọrụ n’aka ruo n’ókè nke na anyị agaghị na-agụchi Okwu ya, bụ́ Bible, anya. Anyị agaghị eleghara ndụmọdụ o nyere anya, bụ́ ka anyị na-aga nzukọ Ndị Kraịst. (Ndị Hibru 10:24, 25) Anyị ga-eji ihe ùgwù nke ịkpọsa ozi ọma nke Alaeze Mezaịa nke Chineke kpọrọ ihe ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ya. Anyị ga na-atụkwasịkwa Jehova obi kpamkpam mgbe nile. (Abụ Ọma 62:8) Ebe anyị maara na ọ bụ Jehova bụ Eze Eluigwe na Ala, anyị na-asọpụrụ ya site n’iji obi anyị dum na-edo onwe anyị n’okpuru ya dị ka Onye na-achị anyị. Ị̀ na-atụ Chineke egwu n’ezie ma na-enye ya otuto n’ụzọ ndị a nile?

16. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na e mezuolarị ihe e kpere n’ikpe, bụ́ nke e dekọrọ ná Mkpughe 14:8, megide Babilọn Ukwu ahụ?

16 Mkpughe isi 14 gara n’ihu ịkọwa ihe ndị ga-eme n’oge awa nke ikpe. E bu ụzọ kwuo banyere Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, sị: “Mmụọ ozi ọzọ, bụ́ nke abụọ wee sochie, na-asị: ‘Ọ dawo! Babilọn Ukwu ahụ adawo!’” (Mkpughe 14:8) Ee, n’anya Chineke, Babilọn Ukwu ahụ adaalarị ada. N’afọ 1919, e mere ka ndị ohu Jehova e tere mmanụ nwere onwe ha pụọ n’ozizi na omume Babilọn, bụ́ nke duhieworo ndị mmadụ na mba dị iche iche ruo ọtụtụ puku afọ. (Mkpughe 17:1, 15) Site mgbe ahụ gaa n’ihu, ha lekwasịrị anya n’ịkwalite ezi ofufe. Kemgbe ahụ, a nọwo na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa dum.—Matiu 24:14.

17. Gịnị ka isi na Babilọn Ukwu ahụ pụta gụnyere?

17 Ọ bụghị ebe ahụ ka ikpe Chineke megide Babilọn Ukwu ahụ biri. Mbibi ikpeazụ ya na-abịa n’isi nso. (Mkpughe 18:21) E nwere ezi ihe mere Bible ji na-agba ndị mmadụ n’ebe nile ume, sị: “Sinụ n’ime ya [Babilọn Ukwu ahụ] pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya.” (Mkpughe 18:4, 5) Olee otú anyị pụrụ isi si na Babilọn Ukwu ahụ pụta? Nke a gụnyere ihe karịrị igbubi ihe nile jikọrọ anyị na okpukpe ụgha. A na-ahụ ihe e ji amata Babilọn n’ọtụtụ ememe na omenala ndị na-ewu ewu, n’omume ịkwa iko juru n’ụwa, n’otú e si akwalite ihe ntụrụndụ ndị gụnyere mgbaasị, nakwa n’ihe ndị ọzọ. Iji nọrọ na nche, ọ dị mkpa ka anyị gosipụta, site n’ọchịchọ na n’omume anyị, na anyị dị iche n’ezie n’ụzọ ọ bụla n’ebe Babilọn Ukwu ahụ nọ.

18. N’ihi ihe a kọwara ná Mkpughe 14:9, 10, gịnị ka Ndị Kraịst mụ anya na-agbalịsi ike izere?

18 Mkpughe 14:9, 10, a kọwara akụkụ ọzọ nke “oge awa nke ikpe” ahụ. Mmụọ ozi ọzọ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla efee anụ ọhịa ahụ na onyinyo ya, ma nata akara n’egedege ihu ya ma ọ bụ n’aka ya, ọ ga-aṅụkwa mmanya nke iwe Chineke.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “anụ ọhịa ahụ na onyinyo ya” na-anọchi anya ọchịchị ụmụ mmadụ, bụ́ nke na-adịghị akwanyere ọbụbụeze Jehova ùgwù. Ndị Kraịst mụ anya na-elezi anya ịghara ịkpa àgwà ma ọ bụ ime omume n’ụzọ na-egosi na ha bụ ohu nke ndị jụrụ ịkwanyere ọbụbụeze nke ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova ùgwù. Ndị Kraịst maara na e guzobeworị Alaeze Chineke n’eluigwe, ha makwa na ọ ga-eweta ịchịisi nile nke ụmụ mmadụ ná njedebe, nakwa na ọ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.—Daniel 2:44.

Echefula na Oge A Chọrọ Ka E Mee Ihe Ngwa Ngwa!

19, 20. (a) Ka ụbọchị ikpeazụ a na-eru ná njedebe, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka na Setan ga-agbalị ime? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

19 Ka ụbọchị ikpeazụ a na-eru ná njedebe, nrụgide na ọnwụnwa ga-akawanye njọ. Ebe anyị ka bi n’usoro ihe a ma bụrụ ndị ezughị okè na-akpa ike n’ahụ́ ha, anyị na-enwe nsogbu ahụ́ ike, na-aka nká, ndị anyị hụrụ n’anya na-anwụnahụkwa anyị. Anyị na-enwekwa mwute, na-enwekwa nkụda mmụọ mgbe ndị ụfọdụ na-egosighị mmasị ná mgbalị anyị na-eme ikwusa Okwu Chineke, nakwa n’ihi ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ya adịla mgbe ị ga-echefu na ọ dịghị ihe ga-amasị Setan karịa iji nrụgide ndị anyị na-enwe mee ka anyị daa mbà, ya bụ kwụsị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ kwụsị ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke. (Ndị Efesọs 6:11-13) Ugbu a abụghị oge ichefu na oge anyị bi na ya chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa!

20 Jizọs maara na anyị ga-enwe nnukwu nrụgide nke ga-anwa ime ka anyị daa mbà. N’ihi nke a, ọ dụrụ anyị ọdụ, sị: “Nọrọnụ na nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” (Matiu 24:42) Ya mere, ka anyị buru oge nke anyị nọ na ya ugbu a n’uche mgbe nile. Ka anyị nọrọ na nche megide aghụghọ Setan bụ́ nke pụrụ ime ka anyị kwụsịtụ ma ọ bụ kwụsịchaa ozi anyị na-ejere Jehova. Ka anyị kpebisie ike iji ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu na ọchịchọ siri ike na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. N’agbanyeghị ihe anyị pụrụ izute, ka anyị ghara ichefu na oge anyị bi na ya chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa ka anyị na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs bụ́: “Nọrọnụ na nche.” Ọ bụrụ na anyị emee nke a, anyị ga-ewetara Jehova otuto ma soro ná ndị ga-enweta ngọzi ebighị ebi.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú anyị si mara na ọ bụ ezi Ndị Kraịst ka Jizọs dọrọ aka ná ntị ‘ịnọrọ na nche’?

• Ihe atụ ndị dị aṅaa nke na-adọ aka ná ntị, bụ́ ndị dị na Bible, pụrụ inyere anyị aka ‘ịnọrọ na nche’?

• Gịnị bụ oge awa nke ikpe, gịnịkwa ka a na-agba anyị ume ime tupu ya abịa ná njedebe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Jizọs ji ọbịbịa ya tụnyere ọbịbịa nke onye ohi

[Foto dị na peeji nke 24]

Mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ dị nso

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ka anyị kpebisie ike iji ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu nọgide na-eme nkwusa