Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne na Nna—Olee Ihe Unu Chọrọ Ka Ụmụ Unu Bụrụ n’Ọdịnihu?

Ndị Nne na Nna—Olee Ihe Unu Chọrọ Ka Ụmụ Unu Bụrụ n’Ọdịnihu?

Ndị Nne na Nna—Olee Ihe Unu Chọrọ Ka Ụmụ Unu Bụrụ n’Ọdịnihu?

“Ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ . . . ka ha too aha Jehova.”—Abụ Ọma 148:12, 13.

1. Nchegbu dị aṅaa ka ndị nne na nna na-enwe banyere ụmụ ha?

OLEE nne na nna na-adịghị enwe nchegbu banyere ọdịnihu nke ụmụ ha? Ozugbo a mụrụ nwatakịrị—ma ọ bụ ọbụna tupu a mụọ ya—nne na nna ya na-amalite inwe nchegbu banyere ọdịmma ya. Ahụ́ ọ̀ ga-esi ya ike? Ọ̀ ga-eto nke ọma? Ka nwata ahụ na-eto, ha na-enwe nchegbu ndị ọzọ. Ndị nne na nna na-achọ nnọọ ka ụmụ ha nweta ihe kasị mma.—1 Samuel 1:11, 27, 28; Abụ Ọma 127:3-5.

2. N’ihi gịnị ka ndị nne na nna taa ji achọsi ike ka ụmụ ha bie ndụ dị mma mgbe ha toro?

2 Otú ọ dị, n’ụwa taa, ọ na-esiri ndị nne na nna ike inye ụmụ ha ihe ndị kasị mma. Ọtụtụ nne na nna ezutewo ọtụtụ ihe isi ike—agha, ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nsogbu ego, nsogbu ahụ́ ike, nchekasị, na ihe ndị ọzọ. Dị ka o kwesịrị ịdị, ha anaghị achọ ma ọlị ka ụmụ ha gabiga ihe ndị ha onwe ha gabigara. Ná mba ndị bara ọgaranya, ndị nne na nna pụrụ ịhụ ka ụmụ ndị enyi ha na ndị ikwu ha na-enwe ihe ịga nke ọma n’ọrụ ha, ihe eyiekwa ka ọ̀ na-agaziri ha ná ndụ. N’ihi ya, ha na-eche na ha ga-emerịrị ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji hụ na mgbe ụmụ ha tolitere, na ha ga-ebikwa ndụ dịtụ mma ma na-eju afọ dị ka ibe ha.—Eklisiastis 3:13.

Ịhọrọ Ndụ Dị Mma

3. Gịnị ka Ndị Kraịst họrọwooro ime?

3 Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, Ndị Kraịst ahọrọwo ịrara ndụ ha nye Jehova. Ha aṅawo ntị n’okwu Jizọs bụ́: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya kwa ụbọchị, nọgidekwa na-eso m.” (Luk 9:23; 14:27) N’ezie, ibi ndụ dị ka Onye Kraịst chọrọ ịchụ onwe onye n’àjà. Ma, nke a apụtaghị ịbụ ogbenye ọnụ ntụ na ibi ndụ ahụhụ. Kama nke ahụ, ọ bụ ndụ obi ụtọ na nke na-eju afọ—ezigbo ndụ—n’ihi na ọ gụnyere inye ihe, dịkwa ka Jizọs kwuru, “a na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

4. Gịnị ka Jizọs gbara ụmụazụ ya ume ime?

4 Ihe siiri ndị biri ndụ n’oge Jizọs ike nke ukwuu. Tụkwasị n’ịkpata ihe e ji ebi ndụ, ha diri ọchịchị aka ike nke ndị Rom na ibu dị arọ nke ndị bu okpukpe n’isi n’oge ha boro ha. (Matiu 23:2-4) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị nụrụ banyere Jizọs ji obi ụtọ hapụ ihe ndị ha na-eme—ọbụna ọrụ ha na-arụ—ma ghọọ ụmụazụ ya. (Matiu 4:18-22; 9:9; Ndị Kọlọsi 4:14) Ndị ahụ na-eso ụzọ, hà nọ na-etinye ọdịnihu ha n’ihe ize ndụ? Rịba ama ihe Jizọs kwuru: “Onye ọ bụla nke hapụwokwara ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị nke ahụ ọtụtụ ugboro, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.” (Matiu 19:29) Jizọs mesiri ụmụazụ ya obi ike na Nna ha nke eluigwe maara mkpa ha. N’ihi ya, ọ gbara ha ume, sị: “Nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:31-33.

5. Olee ihe ndị nne na nna ụfọdụ na-eche banyere ihe mmesi obi ike Jizọs nyere na Chineke ga-elekọta ndị ohu ya?

5 Otu ihe ahụ na-emekwa taa. Jehova maara mkpa anyị, ndị na-edebe ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha, karịsịa ndị nọ n’ozi oge nile, kwesịkwara inwe obi ike na ọ ga-elekọta ha. (Malakaị 3:6, 16; 1 Pita 5:7) Otú ọ dị, ndị nne na nna ụfọdụ adịghị ama ihe ha ga-eme eme n’akụkụ a. Ọ ga-amasị ha ịhụ ka ụmụ ha na-enwe ọganihu n’ozi Jehova, ikekwe mesịa banye n’ozi oge nile. N’aka nke ọzọ, n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba na otú o si esi ike inweta ọrụ n’ụwa taa, ha na-eche na ọ dị mkpa ka ndị na-eto eto buru ụzọ gụọ akwụkwọ nke ọma, ka ha wee ruo eru inweta ọrụ dị mma ma ọ bụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, nwee ihe ha ga-ebido aka ma ọ rawa ahụ́. Nye ndị nne na nna dị otú ahụ, agụmakwụkwọ dị mma bụ ịga ụlọ akwụkwọ ka elu.

Ịkwadebe Maka Ọdịnihu

6. Gịnị ka e bu n’uche mgbe e ji okwu bụ́ “agụmakwụkwọ ka elu” mee ihe n’isiokwu a?

6 Usoro agụmakwụkwọ na-adịgasị iche site n’otu mba gaa n’ọzọ. Dị ka ihe atụ, na Nigeria, ọ na-ewe afọ 12 iji nweta agụmakwụkwọ bụ́ isi n’ụlọ akwụkwọ gọọmenti nwe. Nke ahụ gasịa, ụmụ akwụkwọ pụrụ ịhọrọ ịga mahadum ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ ọzọ ka elu ruo afọ anọ ma ọ bụ karịa, iji nweta akara ugo mmụta bụ́ bachelor. Mgbe ha nwetasịworo akara ugo mmụta bụ́ bachelor, ụfọdụ pụrụ ịgụkwu akwụkwọ n’ihe ọmụmụ ọgwụ, iwu, injinia, na ihe ndị ọzọ. Ọ bụ agụmakwụkwọ mahadum ndị dị otú a ka e bu n’uche mgbe ọ bụla e ji okwu bụ́ “agụmakwụkwọ ka elu” mee ihe n’isiokwu a. N’aka nke ọzọ, e nwere ụlọ akwụkwọ ndị na-akụzi aka ọrụ, bụ́ ndị na-akụzi ihe ruo nwa oge ma na-enye asambodo ma ọ bụ diplọma maka ọrụ ụfọdụ.

7. Nrụgide dị aṅaa ka ụmụ akwụkwọ na-enwe na kọleji?

7 Ihe na-ewu ebe nile taa bụ ụlọ akwụkwọ kọleji ịkwadebe ụmụ akwụkwọ ha maka agụmakwụkwọ ka elu. Iji mezuo nke a, ọtụtụ ụlọ akwụkwọ na-elekwasị anya n’ihe ọmụmụ ndị ga-eme ka ụmụ akwụkwọ mee nnọọ nke ọma n’ule e ji abanye mahadum kama ilekwasị anya n’ihe ọmụmụ ndị ga-enyere ha aka inweta ọrụ. Ụmụ kọleji taa na-abụ ndị ndị nkụzi, ndị ndụmọdụ, na ụmụ akwụkwọ ibe ha na-arụgide nke ukwuu ka ha gbalịa ịbanye na mahadum ndị kasị mma, bụ́ ebe ha pụrụ inweta akara ugo mmụta pụrụ ime ka ha nwee ike inweta ọrụ na-enye ezigbo ego.

8. Olee nhọrọ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eche ihu?

8 Gịnịzi ka nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-eme? N’ezie, ha chọrọ ka ụmụ ha mee nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ma mụta nkà ndị ga-enyere ha aka ịkpata ihe ha ga-eji bie ndụ n’ọdịnihu. (Ilu 22:29) Ma, hà kwesịrị nnọọ ikwe ka ụmụ ha bụrụ ndị mmụọ asọmpi maka ịkpata ego na inwe ihe ịga nke ọma na-achịkwa? Ụdị ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka ha na-esetịpụrụ ụmụ ha, site n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’omume? Ụfọdụ nne na nna na-agbasi nnọọ mbọ ike ma na-echekwa ego iji wee nwee ike iziga ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ ndị ka elu mgbe oge ruru. Ndị ọzọ dị njikere ịbanye n’ụgwọ iji mezuo nke a. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ego ka mkpebi dị otú ahụ na-efu. Gịnị ka ịchụso agụmakwụkwọ ka elu na-efu taa?—Luk 14:28-33.

Ihe Ịchụso Agụmakwụkwọ Ka Elu Na-efu

9. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ego agụmakwụkwọ ka elu na-efu?

9 Mgbe anyị chere banyere ihe ihe na-efu, obi anyị na-agbagakarị n’ego e mefuru. Ná mba ụfọdụ, ọ bụ gọọmenti na-ahụ maka agụmakwụkwọ ka elu, ụmụ akwụkwọ ruru eru inweta ya adịghịkwa akwụ ụgwọ akwụkwọ. Otú ọ dị, n’ọtụtụ ebe, agụmakwụkwọ ka elu dị oké ọnụ, ego ọ na-efu na-arịwanyekwa elu. Otu isiokwu dị na magazin bụ́ New York Times kwuru, sị: “A na-elebu agụmakwụkwọ ka elu anya dị ka ihe na-emeghe ohere dị iche iche. N’ụbọchị ndị a, ọ bụ ihe e ji amata ọdịiche dị n’etiti ndị aka ji akụ̀ na ndị na-enwechaghị ego.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, agụmakwụkwọ ka elu nke bụ́ ịgba na-aghọwanye nke nanị aka ndị ọgaranya na-eru, bụ́ ndị na-eziga ụmụ ha inweta agụmakwụkwọ dị otú a ka ụmụ ha wee bụrụkwa ndị ọgaranya na ndị a ma ama n’ụwa a. Nne na nna bụ́ Ndị Kraịst, hà kwesịrị ịhọtara ụmụ ha ihe mgbaru ọsọ dị otú ahụ?—Ndị Filipaị 3:7, 8; Jems 4:4.

10. Olee ihe jikọrọ agụmakwụkwọ dị elu na ịkwalite usoro ihe dị ugbu a?

10 Ọbụna n’ebe ndị a na-agụ akwụkwọ ka elu n’efu, ọ pụrụ inwe ụfọdụ ihe ndị ọ na-efu. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal na-akọ na n’otu mba dị na Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia, gọọmenti ha hiwere “ụdị agụmakwụkwọ nke na-eme ka ụmụ akwụkwọ ndị ụbụrụ kasị aghọ nkọ banye na mahadum ndị kasị mma.” Ndị a gụnyere mahadum ndị na-ewu ewu n’ụwa—Oxford na Cambridge ndị dị n’England, nakwa mahadum ndị kasị ede ude na United States, na ndị ọzọ. N’ihi gịnị ka gọọmenti mba ahụ ji hiwe ụdị agụmakwụkwọ dị otú ahụ na-efu ọtụtụ ihe? “Ọ bụ iji kwalite akụ̀ na ụba mba ahụ,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. E nwere ike ọ dịghị ego ụmụ akwụkwọ ga-akwụ n’agụmakwụkwọ dị otú ahụ, ma ihe ọ ga-efu ha bụ na ha ga-etinye ndụ ha nile n’ịgbalị ịkwalite usoro ihe dị ugbu a. Ọ bụ ezie na ụdị ndụ dị otú ahụ bụ ihe a na-achọsi ike n’ụwa, ọ̀ bụ ihe ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-achọ maka ụmụ ha?—Jọn 15:19; 1 Jọn 2:15-17.

11. Gịnị ka akụkọ a na-anụ na-egosi banyere ịṅụbiga mmanya ókè na ịkwa iko nke ụmụ akwụkwọ mahadum?

11 Ihe ọzọ a ga-atụle bụ ụdị ebe ndị a na-anọ agụ akwụkwọ a. E ji àgwà ọjọọ ndị dị ka ịṅụ ọgwụ ọjọọ, omume rụrụ arụ, ịghọ aghụghọ n’ule, ịbanye n’òtù nzuzo, na ọtụtụ omume ọjọọ ndị ọzọ, mara mahadum na ụlọ akwụkwọ ka elu ndị ọzọ. Tụlee ihe banyere ịṅụbiga mmanya ókè. Mgbe magazin bụ́ New Scientist na-akọ banyere mmadụ ịṅụgide mmanya ruo mgbe o gbuwere ya egbuwe, o kwuru, sị: “Ihe dị ka pasent iri anọ na anọ nke [ụmụ akwụkwọ mahadum nọ na United States] na-aṅụra mmanya anya ọ dịkarịa ala otu ugbo n’ime izu abụọ.” Ọtụtụ ndị na-eto eto nọ n’Australia, Britain, Russia, na n’ebe ndị ọzọ nwere otu nsogbu ahụ. Mgbe a bịara n’ihe banyere ịkwa iko, ihe na-ewuziri ụmụ akwụkwọ bụ ihe a na-akpọ “nnabiri,” nke bụ́, dị ka magazin bụ́ Newsweek si kọọ, “mmekọahụ a na-enwe otu ugbo—isusu ọnụ ma ọ bụ ịkwa iko—n’etiti mmadụ abụọ ndị nwedịrị ike ha agaghị achọ ịhụ ibe ha ọzọ.” Nnyocha e mere na-egosi na pasent 60 ruo pasent 80 nke ụmụ akwụkwọ na-etinye aka n’ụdị omume a. “Ọ bụrụ na ị bụ nwa akwụkwọ na-eme ka ibe ya,” ka otu onye na-eme nnyocha kwuru, “ị ga-eme ya.”—1 Ndị Kọrint 5:11; 6:9, 10.

12. Nrụgide ndị dị aṅaa ka ụmụ akwụkwọ mahadum na-enwe?

12 Ọ bụghị nanị na ebe ndị a na-anọ agụ akwụkwọ dị ize ndụ, a na-enwekwa nrụgide ndị ihe omume ụlọ akwụkwọ na ule na-eweta. Dị ka o kwesịrị, ọ dị mkpa ka ụmụ akwụkwọ na-amụ ihe ma na-eme ihe omume e nyere ha n’ụlọ akwụkwọ iji gafee n’ule. Ọ pụkwara ịdị mkpa ka ụfọdụ na-arụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, otu ọrụ nwa oge ka ha na-aga akwụkwọ. Ihe a nile na-amịkọrọ nnọọ oge na ume ha. Oleezi oge na ume ga-afọdụrụ ha maka ihe omume ime mmụọ? Mgbe nrụgide kara nkụ, gịnị ga-ata ahụhụ ya? À ka ga-ebute ihe ime mmụọ ụzọ, ka à ga-ewezụga ha n’ụsọ? (Matiu 6:33) Bible na-agba Ndị Kraịst ume, sị: “Nọrọsienụ ike na nche ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụpụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị adapụwo n’okwukwe n’ihi ịnwa itinye oge ha na ume ha n’imezu ihe ndị a chọrọ ha n’aka ma ọ bụ n’ihi itinye aka n’omume ndị megidere Akwụkwọ Nsọ mgbe ha na-aga mahadum!

13. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịtụle?

13 N’ezie, ọ bụghị nanị n’ụlọ akwụkwọ ndị ka elu ma ọ bụ na mahadum ka e nwere omume rụrụ arụ, àgwà ọjọọ, na nrụgide. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ntorobịa n’ụwa na-ele àgwà nile dị otú ahụ anya dị ka ihe ha na agụmakwụkwọ so aga, ọ dịghịkwa ihe ha ji ha kpọrọ. Nne na nna bụ́ Ndị Kraịst hà kwesịrị ilezi anya debe ụmụ ha n’ụdị ebe ndị dị otú ahụ ruo afọ anọ ma ọ bụ karịa? (Ilu 22:3; 2 Timoti 2:22) Uru ndị na-eto eto pụrụ irite na ya ò ruru iji n’ihi ya tinye ha n’ihe ize ndụ. Nke kasị mkpa, gịnị ka a na-akụziri ndị na-eto eto na ọ bụ ihe ha kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ ha? * (Ndị Filipaị 1:10; 1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Ndị nne na nna aghaghị iji ekpere tụlee ajụjụ ndị a nke ọma. Ha kwesịkwara ịtụle ihe ize ndụ dị n’iziga ụmụ ha akwụkwọ n’obodo ma ọ bụ ná mba ọzọ.

Olee Ihe Ndị Ọzọ A Pụrụ Iji Dochie Anya Agụmakwụkwọ Ka Elu?

14, 15. (a) N’agbanyeghị echiche ọtụtụ ndị nwere, ndụmọdụ dị aṅaa nke Bible metụtakwara anyị taa? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ndị na-eto eto pụrụ ịjụ onwe ha?

14 Taa, echiche ọtụtụ ndị nwere bụ na nanị ihe ga-eme ka ndị na-eto eto nwee ihe ịga nke ọma bụ ịga mahadum. Ma, kama ịchụsowe ihe ndị na-ewu ewu, Ndị Kraịst na-aṅa ntị na ndụmọdụ Bible bụ́: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a, kama bụrụnụ ndị e nwoghara site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.” (Ndị Rom 12:2) Gịnị ka Chineke chọrọ ka ndị ya, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, na-eme n’ụbọchị ikpeazụ nke oge ọgwụgwụ a? Pọl gbara Timoti ume, sị: “Nọgide na-enwe uche ziri ezi n’ihe nile, hụjuo anya, rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma, jee ozi gị n’ụzọ zuru ezu.” N’ezie, okwu ndị ahụ metụtakwara anyị nile taa.—2 Timoti 4:5.

15 Kama inwe mmụọ nke ịchụso ihe onwunwe nke ụwa, ọ dị mkpa ka anyị nile “nọgide na-enwe uche ziri ezi”—na-elekwasị anya n’ihe ime mmụọ. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-anwa ike m nile iji ‘na-eje ozi m n’ụzọ zuru ezu’ ka m wee ruo eruo ịbụ onye ozi nke Okwu Chineke? Atụmatụ dị aṅaa ka m na-eme iji jee ozi m n’ụzọ “zuru ezu”? Èchewo m echiche iwere ozi oge nile dị ka ọrụ m ná ndụ?’ Ajụjụ ndị a siri ike, karịsịa mgbe ị hụrụ ndị ọzọ na-eto eto ka ha na-achụso ihe ndị ga-adịrị nanị ha onwe ha mma, ‘na-achọrọ onwe ha ihe ukwu’ bụ́ nke ha chere na ọ ga-eme ka ọdịnihu ha ka mma. (Jeremaịa 45:5) Ya mere, nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eji amamihe esi mgbe ụmụ ha bụ ụmụ ọhụrụ enye ha ọzụzụ ime mmụọ ma mee ka ha na-anọ n’ebe ndị e ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe.—Ilu 22:6; Eklisiastis 12:1; 2 Timoti 3:14, 15.

16. Olee otú ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst pụrụ isi jiri amamihe mee ka ụmụ ha na-anọ n’ebe ndị a na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe?

16 “Mama m na-eleru anya ịmata ụdị ndị anyị na ha na-akpakọrịta,” ka otu nwa okorobịa kasị okenye n’ime ụmụ okorobịa atọ si n’otu ezinụlọ, bụ́ ndị mama ha jeworo ozi oge nile ruo ọtụtụ afọ, kwuru. “Anyị adịghị eso ụmụ akwụkwọ ibe anyị akpakọrịta kama ọ bụ nanị ndị nọ n’ọgbakọ, bụ́ ndị na-eji ihe mmụọ akpọrọ ihe, ka anyị na ha na-akpakọrịta. Ọ na-akpọkwa ndị nọ n’ozi oge nile—ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị Betel, na ndị ọsụ ụzọ—ka ha bịa n’ụlọ anyị ka anyị na ha nọrịa. Ige ntị n’ahụmahụ ha na ịhụ ọṅụ ha na-enwe, nyere aka kụnye n’ime obi anyị ọchịchọ ịbanye n’ozi oge nile.” Lee ka o si bụrụ ihe na-enye ọṅụ ịhụ ka ụmụ nwoke atọ ahụ nile banyere n’ozi oge nile—otu na-eje ozi na Betel, nke ọzọ gara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, nke ọzọ na-asụkwa ụzọ!

17. Nduzi dị aṅaa ka ndị nne na nna pụrụ inye ndị na-eto eto n’ihe metụtara ịhọrọ ihe ndị ha ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ na ọrụ ha ga-arụ? (Lee igbe dị na peeji nke 29.)

17 E wezụga ime ka ha na-anọ n’ebe ndị a na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe,ndị nne na nna kwesịkwara ịmalite nnọọ n’ezi oge na-enye ụmụ ha nduzi kwesịrị ekwesị banyere ụdị ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ na ọrụ aka ha ga-ahọrọ. Nwa okorobịa ọzọ nke na-eje ozi ugbu a na Betel na-ekwu, sị: “Ma papa m ma mama m rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ tupu ha alụọ di na nwunye ma ka na-arụkwa ya ka ha lụchara, ha nwakwara ike ha nile ịkụnye mmụọ ịsụ ụzọ n’ime ezinụlọ anyị dum. Mgbe ọ bụla anyị na-ahọrọ ihe anyị ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ na-eme mkpebi ndị ga-emetụta ọdịnihu anyị, ha na-agba anyị ume mgbe nile ime nhọrọ ndị ga-enye anyị ezigbo ohere ịchọta ọrụ nwa oge ma na-asụ ụzọ.” Kama ịhọrọ ihe ọmụmụ ndị na-eduga na mahadum, ndị nne na nna na ụmụ ha kwesịrị ịtụle ihe ọmụmụ ndị pụrụ inyere ụmụ ha aka ijere Chineke ozi. *

18. Olee ọrụ ndị na-eto eto pụrụ ilebara anya?

18 Nnyocha e mere na-egosi na n’ọtụtụ mba, e nwere mkpa dị ukwu, ọ bụghị maka ndị gụrụ akwụkwọ na mahadum, kama maka ndị nwere aka ọrụ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today na-akọ na “ọ gaghị adị mkpa ka pasent iri asaa nke ndị ọrụ a ga-enwe n’afọ iri na-abịanụ nwee akara ugo mmụta mahadum were afọ anọ, kama nke ahụ, a ga-achọ asambodo ndị e nwetara na kọleji ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ bụ́ ebe a na-amụ aka ọrụ.” Ọtụtụ n’ime ụlọ akwụkwọ ndị dị otú ahụ na-amụ ihe ọmụmụ ndị na-ewe oge dị mkpirikpi n’ihe ndị dị ka otú e si arụ ọrụ ọfịs, ịrụzi ụgbọala, ịrụzi kọmputa, ịrụzi paịpụ mmiri, idozi isi, na ọtụtụ ọrụ aka ndị ọzọ. Ọrụ ndị a hà dị mkpa? Eenụnụ! Ikekwe ha adịghị adọrọ mmasị ruo n’ókè ụfọdụ ndị pụrụ ịtụ anya ya, ma ha na-enye ndị ọrụ ha bụ́ isi bụ ijere Jehova ozi ihe ndị ha ji ebi ndụ na ohere dị ha mkpa.—2 Ndị Tesalonaịka 3:8.

19. Olee ụzọ kasị mma isi nwee ọṅụ na afọ ojuju ná ndụ?

19 Bible na-arịọ, sị: “Ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ . . . ka ha too aha Jehova; n’ihi na e mewo ka aha Ya dị elu, nanị ya: ebube Ya dị n’elu ụwa na eluigwe.” (Abụ Ọma 148:12, 13) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ijere Jehova ozi oge nile bụ ụzọ kasị mma isi nwee ọṅụ na afọ ojuju ná ndụ ma e jiri ya tụnyere ihe ọ bụla ụwa pụrụ inye. Echefula mmesi obi ike nke dị na Bible bụ́: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—Ilu 10:22.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Maka ahụmahụ nke ndị ji agụmakwụkwọ ime mmụọ kpọrọ ihe karịa agụmakwụkwọ mahadum, lee Ụlọ Nche nke November 1, 1982, peeji nke 3-6; October 15, 1979, peeji nke 15-20; Teta! (Bekee) June 8, 1978, peeji nke 15; na August 8, 1974, peeji nke 3-7.

^ par. 17 Lee Teta! October 8, 1998, “Ịchọ Ndụ Nwere Nchebe,” peeji nke 4-6, na akwụkwọ bụ́ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị, “Ọrụ Dị Aṅaa Ka M Kwesịrị Ịhọrọ?” peeji nke 174-179.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Na gịnị ka Ndị Kraịst tụkwasịrị obi maka ọdịnihu dị mma?

• Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eche ihu n’ihe banyere ọdịnihu nke ụmụ ha?

• Gịnị ka anyị na-aghaghị ichebara echiche mgbe anyị na-atụle ihe agụmakwụkwọ ka elu ga-efu?

• Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka iji ozi Jehova mere aka ọrụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 29]

Uru Dị Aṅaa Ka Agụmakwụkwọ Ka Elu Bara?

Ọtụtụ ndị na-abanye mahadum na-atụ anya inweta akara ugo mmụta nke ga-eme ka ha nwee ike inweta ọrụ ndị na-enye ezigbo ego na ịnọgide na ha. Otú ọ dị, akụkọ e nwetara n’aka gọọmenti na-egosi na ọ bụ nanị otu ụzọ n’ime ụzọ anọ nke ndị gara mahadum na-enweta akara ugo mmụta n’ime afọ isii—nke ahụ abụghị akụkọ na-agba ume. Ọbụna ole na ole ahụ na-enweta akara ugo mmụta, hà ji n’aka na ọ ga-eme ka ha nweta ezigbo ọrụ? Lee ihe nnyocha ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya na-egosi.

“Ịga [mahadum] Harvard ma ọ bụ nke Duke agaghị eme ka mmadụ jiri n’aka na ya ga-enweta ọrụ ka mma ozugbo nakwa na a ga na-akwụ ya ụgwọ buru ibu karị. . . . Ụlọ ọrụ dị iche iche amachaghị banyere onye na-eto eto nke na-achọ ọrụ. Akara ugo mmụta e nwetara na mahadum na-ede ude pụrụ ịdọrọ mmasị ha. Ma nke ahụ gasịa, ebe okwu dịzi abụrụ ihe mmadụ ga-emeli na ihe ọ na-agaghị emeli.”—magazin bụ́ Newsweek, November 1, 1999.

“Ọ bụ ezie na ọrụ ndị e nwere taa chọrọ nkà ndị dị elu karịa ọrụ ndị e nwere n’oge gara aga . . . , nkà ndị a chọrọ maka ọrụ ndị a bụ ezigbo nkà e nwetara n’ụlọ akwụkwọ kọleji n’ihe ọmụmụ ndị dị ka—mgbakọ na mwepụ, ịgụ ihe, na ide ihe mmadụ ga-agụtali . . . , ọ bụghị nkà a mụtara na mahadum. . . . Ọ dịghị ụmụ akwụkwọ mkpa ịga mahadum iji nweta ezigbo ọrụ, ma, ọ dị ha mkpa inweta nkà ndị a na-enweta na kọleji.”—magazin bụ́ American Educator, Spring 2004.

“Ihe ka ọtụtụ na mahadum e nwere amaghị ihe a na-achọ ma a bịa n’ịkwadebe ụmụ akwụkwọ maka ịghọ ndị ọrụ mgbe ha gụsịrị akwụkwọ na mahadum. Ụlọ akwụkwọ ndị na-akụzi ọrụ aka. . . na-ewuzi ewu. Ndị na-abanye na ha jiri pasent iri anọ na asatọ rịa elu site n’afọ 1996 ruo afọ 2000. . . . Ka ọ dịgodị, diplọma ndị ahụ na-ewe oké ego na oge dị ukwuu enwechaghịzi nnọọ ihe ha bụ ugbu a.”—Time, January 24, 2005.

“Atụmatụ Ngalaba Na-ahụ Maka Ọrụ na United States mere maka afọ 2005 kọwara ihe na-emenụ bụ́ nke na-awụ ibobo n’ahụ́, na-ekwu na ọ dịkarịa ala otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị ji afọ anọ gaa mahadum agaghị achọta ọrụ kwesịrị akara ugo mmụta ha.”—The Futurist, July/August 2000.

N’iburu ihe a nile n’uche, ọtụtụ ndị nkụzi ejighịzi nnọọ n’aka uru dị n’agụmakwụkwọ ka elu taa. “Anyị na-azụ ndị mmadụ maka ihe mgbaru ọsọ na-ekwesịghị ekwesị,” ka akwụkwọ bụ́ Futurist kwara n’arịrị. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, rịba ama ihe Bible na-ekwu banyere Chineke: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.”—Aịsaịa 48:17, 18.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ha hapụrụ nchụso onwe onye ha ma sowe Jizọs

[Foto dị na peeji nke 31]

Nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eji amamihe esi mgbe ụmụ ha bụ ụmụ ọhụrụ na-eme ka ha na-anọ n’ebe ndị e ji nnọọ ihe ime mmụọ akpọrọ ihe