“Ndị Na-arịda n’Oké Osimiri n’Ụgbọ”
“Ndị Na-arịda n’Oké Osimiri n’Ụgbọ”
E NWERE otu ihe e ji ọla nchara kpụọ nke chere ọdụ ụgbọ mmiri Gloucester, Massachusetts, U.S.A., ihu, ọ bụ otu onyeisi ụgbọ mmiri nke na-achọ ịkwọrọ ụgbọ ya gafee ebili mmiri. Ihe ahụ a kpụrụ akpụ bụ ihe e ji echeta ọtụtụ puku ndị ikom Gloucester na-egbu azụ bụ́ ndị a maara nwụrụ n’oké osimiri. E dere okwu ndị a dị n’Abụ Ọma 107:23, 24 n’ala ala ya nakwa ná mbadamba ihe dịdebere ya: “Ndị na-arịda n’oké osimiri n’ụgbọ, bụ́ ndị na-eje ozi n’ọtụtụ mmiri; ndị ahụ ahụwo ọrụ nile nke Jehova, na oké ọrụ Ya nile n’ime mmiri nke miri emi.”
Igbu azụ n’ebe ndị gbalitere elu n’ala oké osimiri Atlantic bụ́ ebe azụ jupụtara dị ize ndụ. N’afọ ndị gara aga, ihe ruru puku ndị ikom ise, narị atọ na iri isii na asatọ bụ́ ndị Gloucester, bụ́ obodo nwere ihe dị ka puku mmadụ iri atọ ugbu a, nwụrụ ka ha na-egbu azụ n’ime oké osimiri. Ihe ncheta ahụ kwuru, sị: “Ihe gburu ụfọdụ n’ime ha bụ oké ifufe na oké ebili mmiri ndị ifufe si n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ugwu kpatara. Ụfọdụ nwụrụ mgbe mmiri bupụrụ obere ụgbọ ha nọ na ya site ná nnukwu ụgbọ mmiri butere ha n’ebe ahụ a na-egbu azụ. Ụfọdụ ụgbọ mmiri kụbara n’ebili mmiri ma kpuo. Ndị ọzọ bụ ndị ụgbọ mmiri kụgburu n’ụzọ ụgbọ mmiri si aga.”
Ihe ncheta ahụ bụ ihe akaebe nye ọrụ ike na ihe ize ndụ ndị na-egbu azụ cheworo ihu kemgbe ọtụtụ narị afọ. Cheedị banyere anya mmiri na-aghaghị ịgbawo ndị ahụ di ha, nna ha, ụmụnne ha nwoke, na ụmụ ha ndị nwoke nwụnahụrụ n’ihi na ha enweghị olileanya. Ma, Jehova Chineke adịghị echefu ndị inyom di ha nwụrụ, ụmụ mgbei, ma ọ bụ ndị nwụrụ n’oké osimiri. Jọn onyeozi rụtụrụ aka n’ihe a gaje ime n’ọdịnihu, sị: “Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.” (Mkpughe 20:13) Mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ‘ndị rịdara n’oké osimiri n’ụgbọ’ ga-ahụ oké “ọrụ nile nke Jehova” n’ezie.