Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Jehova Agbasaa “n’Ala Ugo”

Okwu Jehova Agbasaa “n’Ala Ugo”

Okwu Jehova Agbasaa “n’Ala Ugo”

“ALA Ugo.” Nke ahụ bụ ihe ndị Albania na-akpọ obodo ha n’asụsụ ha. Obodo a nke chere Oké Osimiri Adriatic ihu dị n’Ala Dịịrị Banye na Mmiri nke Balkan, n’agbata Gris na ebe bụbu Yugoslavia. Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ echiche banyere ebe ndị Albania si, ihe ka ukwuu ná ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwetara na ndị Albania na asụsụ ha si n’Illyria oge ochie, bụ́ ndị omenala ha malitere laa azụ n’afọ 2000 T.O.A., dị ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica, si kwuo.

Ihe ndị e kere eke bụ́ ndị mere ka Albania maa mma gụnyere ugwu ndị ọnụ ha pịrị apị bụ́ ndị dị ná mgbago mgbago ebe ugwu na ogologo ụsọ mmiri ndị nwere ájá ọcha dị n’Adriatic n’ebe ndịda. Otú ọ dị, ihe kasị maa mma o nwere bụ ndị bi n’ime ya. Ha bụ ndị nwere ịhụnanya ma na-ele ọbịa, ndị na-emesapụ ihu ma na-ekwu otú ọ dị ha n’obi, ndị na-amụta ihe ngwa ngwa na ndị na-emegharị nnọọ ahụ́ mgbe ha na-ekwu okwu.

Nleta nke Onye Ozi Ala Ọzọ A Ma Ama

O doro anya na àgwà ọma nke ndị ahụ na ịma mma nke obodo ha dọtara mmasị nke otu onye njem pụrụ iche letara ebe ahụ ọtụtụ narị afọ gara aga. N’ihe dị ka afọ 56 O.A., Pọl onyeozi, bụ́ onye merela njem ọtụtụ ugboro, dere, sị: “Ruo Ilirikọm, ekwusawo m ozi ọma banyere Kraịst ahụ nke ọma.” (Ndị Rom 15:19) Ebe ndịda Ilirikọm bụ ebe ugwu Albania nke oge a. Pọl nọ na Kọrint, Gris, nke dị n’ebe ndịda nke Ilirikọm, mgbe o dere ihe ahụ. Ikwu na ya ekwusawo ozi ọma nke ọma “ruo Ilirikọm” na-egosi na o ruru n’ókè Ilirikọm ma ọ bụ banye nnọọ n’ime ya. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ ga-abụ na o kwusara ozi ọma n’ebe bụ ebe ndịda Albania ugbu a. N’ihi ya, a pụrụ ikwu na Pọl bụ onye mbụ a maara rụrụ ọrụ nkwusa Alaeze n’Albania.

Ọtụtụ narị afọ gafere. Alaeze ukwu dị iche iche bilitere ma daa. Mba dị iche iche chịrị obere akụkụ a nke Europe ruo mgbe Albania ghọrọ mba kwụụrụ onwe ya n’afọ 1912. Afọ iri ka e mesịrị, a nụkwara okwu banyere Alaeze Jehova ọzọ n’Albania.

Mmalite Na-akpali Mmasị nke Nkwusa Ozi Ọma n’Ebe ahụ n’Oge Anyị A

N’ime afọ iri sochiri 1920, ndị Albania ole na ole bi na United States bụ́ ndị so ná Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, laghachiri Albania iji gwa ndị ọzọ ihe ndị ha mụtara. Nasho Idrizi bụ otu n’ime ha. Ụfọdụ ndị nabatakwara ha n’ụzọ dị mma. Iji nyere ọtụtụ ndị na-enwewanye mmasị aka, n’afọ 1924 e kenyere alaka ụlọ ọrụ Romania ọrụ ilekọta ọrụ nkwusa n’Albania.

Thanas Duli (Athan Doulis) so ná ndị ahụ mụrụ banyere Jehova n’Albania n’ime afọ ndị ahụ. O chetara, sị: “N’afọ 1925 e nwere ọgbakọ atọ a haziri ahazi n’Albania, tinyere Ndị Mmụta Bible na ndị nwere mmasị nọgasị n’akụkụ nile nke ala a. Ịhụnanya ha nwere n’etiti onwe ha mere ka ha dị nnọọ iche n’ebe . . . ndị gbara ha gburugburu nọ!” *

Ọ na-esi nnọọ ike ime njem n’ihi na e nweghị ezigbo ụzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nakweere ihe ịma aka ahụ. Dị ka ihe atụ, e mere Areti Pina baptizim n’ụsọ oké osimiri na Vlorë n’afọ 1928 mgbe ọ dị afọ 18. Ọ na-eji Bible n’aka na-arịgo ma na-arịda ugwu ndị ahụ ọnụ ha pịrị apị na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ọ nọ n’otu ọgbakọ na-anụ ọkụ n’obi e nwere na Vlorë n’oge na-adịghị anya ka afọ 1930 gasịrị.

Ka ọ na-erule afọ 1930, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ dị na Atens, Gris, na-eduzi ọrụ nkwusa n’Albania. N’afọ 1932 otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị si Gris letara Albania iji gbaa ụmụnna nọ ebe ahụ ume ma wusie ha ike. Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-amụ eziokwu Bible n’oge ahụ nwere olileanya ịga eluigwe. N’ihi na a maara ha dị ka ndị na-adị ọcha na ndị na-akwụwa aka ọtọ, a na-akwanyere ha ùgwù n’ebe nile. Ọrụ ụmụnna ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi rụrụ, mịpụtara ọtụtụ mkpụrụ. Na nke ọ bụla n’afọ 1935 na 1936, e nyefere ihe dị ka puku akwụkwọ isii na narị ise ndị e ji amụ Bible n’Albania.

Otu ụbọchị, n’etiti obodo Vlorë, Nasho Idrizi ji ígwè gramafon kpọọ otu n’ime okwu ndị J. F. Rutherford kwuru. Ndị mmadụ mechisịrị ụlọ ahịa ha ma bịa gee ntị ka Nwanna Idrizi na-atụgharị ya n’asụsụ Albanian. A gọziri ịnụ ọkụ n’obi nke ndị nkụzi Bible mbụ ahụ ike na-adịghị agwụ. Ka ọ na-erule afọ 1940, e nwere Ndịàmà 50 n’Albania.

Mba Na-ekweghị na Chineke

N’afọ 1939, ndị ọchịchị Fascist nke Ịtali bichiri obodo ahụ. A kagburu aha Ndịàmà Jehova dị ka okpukpe iwu kwadoro ma machibido ọrụ nkwusa ha iwu. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, ndị agha Germany wakporo mba ahụ. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, ọchịagha a na-akwanyere ùgwù, bụ́ Enver Hoxha, banyere n’ọchịchị. Òtù Ọchịchị Kọmụnist ya meriri ná ntụli aka elu e mere n’afọ 1946, ọ ghọkwara praịm minista. A bịakwara kpọwa afọ ndị sochirinụ oge ntọhapụ, ma nye ndị Jehova, ọ bụ oge mkpagbu.

Nke nta nke nta, gọọmenti malitere imegide okpukpe. N’ihi nnọpụiche ha dị ka Ndị Kraịst, Ndịàmà Jehova nọ n’Albania jụrụ iji ngwá agha eme ihe na isonye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Aịsaịa 2:2-4; Jọn 15:17-19) A tụbara ọtụtụ n’ụlọ mkpọrọ, n’enyeghị ha nri ma ọ bụ ihe ndị bụ́ isi dị mkpa ná ndụ. Ọtụtụ mgbe, ụmụnna ha ndị nwanyị bụ́ ndị a na-atụghị mkpọrọ saara ha uwe ha ma siere ha nri.

Ha Atụghị Ụjọ n’Oge Mkpagbu

N’agbata afọ 1940 na 1945, Frosina Xheka, bụ́ onye na-eto eto mgbe ahụ, nke bi n’obere obodo dịdebere Përmet, nụrụ ihe ụmụnne ya ndị nwoke tọrọ ya na-amụta n’aka Onyeàmà na-arụzi akpụkpọ ụkwụ bụ́ Nasho Dori. * Ndị ọchịchị nọ na-emesi Ndịàmà Jehova ike, ma okwukwe Frosina siri ike, nke ahụ kpasukwara ndị mụrụ ya iwe. “Ha ga-ezo akpụkpọ ụkwụ m ma tie m ihe ma m gaa nzukọ Ndị Kraịst. Ha gbalịrị ime ndokwa ka m lụọ onye na-ekweghị ekwe. Mgbe m jụrụ, ha chụpụrụ m n’ụlọ. Snow nọ na-ada n’ụbọchị ahụ. Nasho Dori rịọrọ Nwanna Gole Flloko nke nọ n’obodo Gjirokastër ka o nyere m aka. Ha haziri ka m binyere ezinụlọ ya. Ụmụnne m nwoke nọrọ afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ha. Mgbe a tọhapụrụ ha, akwagara m Vlorë iji ma soro ha biri.

“Ndị uwe ojii gbalịrị ịmanye m itinye aka n’ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ajụrụ m. Ha jidere m, kpọba m n’otu ọnụ ụlọ ma gbaa m gburugburu. Otu n’ime ha yiri m egwu, sị: ‘Ị̀ ma ihe anyị nwere ike ime gị?’ Azara m ya, sị: ‘Nanị ihe unu nwere ike ime m bụ ihe Jehova kwere ka unu mee.’ O ji iwe zaghachi m, sị: ‘Isi adịghị gị mma! Ngwa si ebe a pụọ!’”

E ji otu ụdị mmụọ iguzosi ike n’ihe ahụ mara ụmụnna ndị Albania n’afọ ndị ahụ nile. Ka ọ na-erule 1957, e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ́ ndị nkwusa Alaeze 75. Obere oge ka 1960 gasịrị, isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova mere ndokwa ka John Marks, bụ́ onye Albania bi na United States, gaa Tiranë iji nye aka hazie ọrụ Ndị Kraịst n’ebe ahụ. * Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, e zigara Luçi Xheka, Mihal Sveci, Leonidha Pope, na ụmụnna ndị ọzọ nwere ibu ọrụ n’ogige ọrụ mmanye.

A Malite Inwetụ Olileanya

Ruo afọ 1967 a nọ na-ele okpukpe nile anya ọjọọ n’Albania. E mechaziri megidewe ha. E kweghị ka onye ndú okpukpe Katọlik, Ọtọdọks, ma ọ bụ nke Alakụba ọ bụla duzie ememe okpukpe. E mechiri ụlọ chọọchị na ụlọ okpukpe Alakụba dị iche iche ma ọ bụ jiri ha mere ebe a na-eme egwuregwu, ebe ndebe ihe mgbe ochie, ma ọ bụ ụlọ ahịa. Ọ dịghị onye e kwere ka o nwee Bible. Ọ dịghị onye e kwere ka o gosipụta na ya kweere na Chineke.

Ime nkwusa na izukọta ọnụ fọrọ nke nta ka ọ ghara ikwe omume. Ndịàmà n’otu n’otu mere ihe nile ha pụrụ ime iji fee Jehova, n’agbanyeghị na ha nọcha iche iche. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ atọ malite na 1960, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà dalatara ruo mmadụ ole na ole. N’agbanyeghị nke ahụ, ha siri ike n’ụzọ ime mmụọ.

Afọ ole na ole tupu 1990, ọchịchị Albania gbanwetụrụ. Nri na uwe kọrọ ụkọ. Obi adịghị ndị mmadụ ụtọ. Mgbanwe a nọ na-eme n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe nile rutere Albania n’ihe dị ka afọ 1990. Ka ha nọsịrị n’okpuru ọchịchị aka ike ruo afọ 45, ọchịchị ọhụrụ kwere ka okpukpe nwere onwe ya ọzọ.

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova nyere ntụziaka ka alaka ụlọ ọrụ ndị dị n’Austria na Gris malite ịkpọtụrụ ụmụnna ndị Albania n’egbughị oge. Ụmụnna na-asụ Grik bụ́ ndị maara ka e si asụ Albanian wetara akwụkwọ ụfọdụ ndị e ji amụ Bible a sụgharịrị ọhụrụ na Tiranë na Berat. Ọṅụ juru ụmụnna ndị ebe ahụ bụ́ ndị a chụsasịburu achụsasị obi ka ha hụrụ Ndịàmà si mba ọzọ bịa nke mbụ ya kemgbe ọtụtụ afọ.

Ndị Ọsụ Ụzọ Na-anụ Ọkụ n’Obi Si Esi Bịa Ebute Ụzọ n’Ọrụ Ahụ

Ná mmalite afọ 1992, Òtù Na-achị Isi mere ndokwa ka Michael na Linda DiGregorio, bụ́ di na nwunye bụ́ ndị Albania na-eje ozi ala ọzọ, gafee Albania. Ha kpọtụụrụ ụmụnna ndị ebe ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị merela agadi, nyere ha aka ịbịakọta ọnụ ọzọ dị ka ndị so n’ezinụlọ ime mmụọ zuru ụwa ọnụ. Otu ìgwè nke ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ma ọ bụ ndị nkwusa oge nile, na-arụsi ọrụ ike bụ́ ndị dị mmadụ 16 si Ịtali bịarute na November, ha na ndị ọsụ ụzọ anọ bụ́ ndị Gris. Iji nyere ha aka ịmụta asụsụ ndị ebe ahụ, a haziri otu usoro nkụzi asụsụ.

Ihe siiri ndị ọsụ ụzọ a si mba ọzọ bịa ike. A naghị eji ọkụ eletrik n’aka. N’oge oyi, ebe nile na-ajụ oyi ma dị mmiri mmiri. Ndị mmadụ na-akwụ n’ahịrị ruo ọtụtụ awa iji nweta nri na ihe ndị ọzọ dị mkpa ná ndụ. Ma, ihe kachasị nye ụmụnna ahụ nsogbu bụ otú ha ga-esi nweta ụlọ ndị ga-aba ọtụtụ ndị nwere mmasị bụ́ ndị nọ na-abata n’eziokwu ahụ!

Ndị ọsụ ụzọ na-agbalị ịmụ asụsụ Albanian chọpụtara na asụsụ bụ nanị ihe ha ga-eji nweta ihe ha chọrọ. Onye nkụzi Bible nke nwere ahụmahụ gwara ha, sị: “Ọ dịghị anyị mkpa ịma otú e si eji ngwaa eme ihe nke ọma iji jiri obi anyị nile mụmụọrọ ụmụnna anyị ọnụ ọchị ma ọ bụ iji makụọ ha. Ndị Albania ga-anabata ịhụnanya sitere unu n’obi, ọ bụghị ụtọasụsụ magburu onwe ya. Unu enyela onwe unu nsogbu, ha ga-aghọta ihe unu na-ekwu.”

Mgbe ha mụsịrị asụsụ ahụ otu ugboro, ndị ọsụ ụzọ ahụ malitere ọrụ na Berat, Durres, Gjirokastër, Shkodër, Tiranë, na Vlorë. N’oge na-adịghị anya, ọgbakọ malitere ipu ka ero n’obodo ndị ahụ. Areti Pina, bụ́ onye dị afọ 80 na ụma mgbe ahụ nakwa onye ahụ́ na-esighị ike, ka nọ na Vlorë. E zigara ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche abụọ ebe ahụ ije soro Areti na-eme nkwusa. O juru ndị mmadụ anya na ndị si esi bịa na-asụ Albanian: “Ndị ozi ala ọzọ nke òtù okpukpe ndị ọzọ na-amanye anyị ịmụ Bekee ma ọ bụ asụsụ Italian ma ọ bụrụ na anyị achọọ ịmụta ihe ọ bụla n’aka ha. Ọ ga-abụrịrị na unu hụrụ anyị n’anya ma nwee ihe dị mkpa ịgwa anyị, n’ihi na unu amụtala nnọọ asụsụ Albanian!” Areti ji ikwesị ntụkwasị obi jesịa ozi elu ala ya na January 1994, ọ rụsiri nnọọ ọrụ nkwusa ahụ ike ruo n’ọnwa ikpeazụ ọ dịrị ndụ. A gọziri ịnụ ọkụ n’obi ya na ndị ọsụ ụzọ ndị ahụ gosiri. E guzobeghachiri ọgbakọ na Vlorë n’afọ 1995. Taa, e nwere ọgbakọ atọ ndị na-eme nke ọma bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme nkwusa n’obodo ahụ nwere ọdụ ụgbọ mmiri.

N’ebe nile ná mba ahụ, agụụ ji ndị mmadụ n’ụzọ ime mmụọ, ha akpọchaghịkwa okpukpe asị. Ha gụchapụrụ akwụkwọ nile dabeere na Bible ha natara Ndịàmà. Ọtụtụ ndị na-eto eto malitere ịmụ ihe ma nwee ọganihu ngwa ngwa.

A nọgidere “na-eme [ihe karịrị ọgbakọ na ìgwè 90 e nwere ná mba ahụ] ka ha sie ike n’okwukwe ma na-aba ụba n’ọnụ ọgụgụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.” (Ọrụ 16:5) Puku Ndịàmà atọ, narị ise na iri na atọ nọ n’Albania ka nwere ọtụtụ ọrụ ịrụ. Na March 2005, puku mmadụ iri, otu narị na iri anọ na anọ bịara Ncheta ọnwụ Kraịst. Nkwusa e meere ndị obodo ahụ na-ele ọbịa emewo ka a malitere ihe karịrị puku mmadụ isii ọmụmụ Bible. O doro anya na ọtụtụ puku mmadụ ga na-erite uru site na Bible Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ e wepụtara n’oge na-adịbeghị anya n’asụsụ Albanian. N’ezie, okwu Jehova na-agbasa “n’Ala Ugo” ma na-ewetara Jehova otuto.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Maka akụkọ ndụ Thanas Duli, lee Ụlọ Nche (Bekee), December 1, 1968.

^ par. 17 Maka akụkọ ndụ Nasho Dori, lee Ụlọ Nche, January 1, 1996.

^ par. 19 Maka akụkọ ndụ nwunye John Marks, bụ́ Helen, lee Ụlọ Nche, January 1, 2002.

[Igbe dị na peeji nke 20]

ESEMOKWU AGBỤRỤ AKWỤSỊ NA KOSOVO!

Kosovo ghọrọ aha a kpụ n’ọnụ ka a na-achọ ịbanye na narị afọ nke iri abụọ na otu mgbe ịzọ ala na mkpọrọmasị agbụrụ dugara n’agha ma mee ka ndị mba ụwa gbatara ha ọsọ enyemaka.

N’oge a na-alụ agha na Balkan, ọtụtụ Ndịàmà gbagara n’obodo ndị dị nso. Mgbe agha ahụ kwụsịlatara, ntakịrị ìgwè n’etiti ha lọghachiri Kosovo, dịrị njikere ịmaliteghachi ọrụ. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche si Albania na Ịtali kwetara ịkwaga Kosovo iji nyere nde mmadụ abụọ, narị puku atọ na iri puku ise bi n’ebe ahụ aka. Ọgbakọ anọ na ìgwè isii na-arụsi ọrụ ike nke nwere ngụkọta nke otu narị ndị nkwusa na iri atọ na-ejere Jehova ozi n’ókèala a.

E nwere ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na Priština n’oge opupu ihe ubi nke afọ 2003, narị mmadụ abụọ na iri ise na abụọ bịakwara. N’ime ndị bịaranụ, e nwere ndị Albania, Germany, Gypsy, Ịtali, na ndị Serbia. Ná ngwụsị nke okwu baptizim, ọkà okwu kwuru ya jụrụ ajụjụ abụọ. Mmadụ atọ biliri ọtọ ịza ee: onye Albania, onye Gypsy, na onye Serbia.

Aka zowere ka mmiri mgbe ndị na-ege ntị nụrụ ka mmadụ atọ a na-aga ime baptizim jikọtara olu zaa: “Va!,” “Da!,” na “Po!” n’olu dara ụda. Ha makụrụ onwe ha. Ha amatawo ihe ngwọta nke nnukwu nsogbu obodo ha nweworo.

[Map dị na peeji 17]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Oké Osimiri Mediterenian

ỊTALI

ALBANIA

GRIS

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndịàmà na-eto eto na-eṅomi ịnụ ọkụ n’obi nke ndị merela agadi

[Foto dị na peeji nke 18]

Areti Pina ji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi malite n’afọ 1928 ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1994

[Foto dị na peeji nke 19]

Ebe ìgwè mbụ nke ndị si mba ọzọ bịa na-amụ asụsụ

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 16]

Ugo: © Brian K. Wheeler/VIREO