Olee Ụdị Mmụta Pụrụ Ime Ka I Nwee Ihe Ịga nke Ọma ná Ndụ?
Olee Ụdị Mmụta Pụrụ Ime Ka I Nwee Ihe Ịga nke Ọma ná Ndụ?
Ọ̀ DỊTỤLA mgbe i nwere ọtụtụ nsogbu nke na ọ dị gị ka mmiri na-ekwo ekwo ọ̀ na-eri gị? Cheedị nnọọ nnukwu ahụhụ ị ga-ata ma ọ bụrụ na ị nagidelighị otu ma ọ bụ abụọ n’ime nsogbu ndị ahụ nke ọma! Ọ nweghị onye a mụrụ ya amara otú e si edozi nsogbu nile nke ọma ma na-eme ezi mkpebi mgbe nile. Ọ bụ ya mere mmụta ji dị mkpa. Olee ebe ị pụrụ inweta mmụta nke ga-akwadebe gị ịnagide nsogbu nke ndụ?
Ọtụtụ ndị, ma ụmụaka ma ndị okenye, na-ekwu na agụmakwụkwọ dị oké mkpa. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwudị na ha “kwenyesiri ike na i nweghị ike inweta [ezigbo] ọrụ ma ọ bụrụ na ị gaghị mahadum.” N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụ mmadụ nwere ọtụtụ mkpa ndị ihe onwunwe na-agaghị egboli. Dị ka ihe atụ, agụmakwụkwọ dị elu ọ̀ ga-eme ka ị bụrụ ezigbo nne ma ọ bụ nna, ezigbo di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ ezigbo enyi? N’ezie, ndị a na-akwanyere ùgwù maka ihe ha ji ọgụgụ isi ha rụzuo pụrụ ịzụlite àgwà ndị na-adịghị mma, nwee nsogbu n’ezinụlọ ha, ma ọ bụ ọbụna mesịa gbuo onwe ha.
Ụfọdụ na-atụ anya ka okpukpe duzie ha ma nye ha ọzụzụ ma mesịa nwee mwute n’ihi enwetaghị enyemaka dị ha mkpa iji nagide nsogbu nke ndụ. Dị ka ihe atụ, Emilia * bụ́ onye Mexico, kwuru, sị: “Afọ 15 gara aga, echere m na mụ na di m agaghịzi ebikọli. Anyị na-arụ ụka mgbe nile. Apụghị m ịkwụsị ya ịṅụ mmanya. Mgbe mgbe, ana m ahapụ ụmụ anyị bụ́ ndị ka dị obere gaa na-achọgharị di m. Ike gwụrụ m. Ugboro ugboro, agara m chọọchị ịchọ ihe pụrụ inyere m aka igbo mkpa m. Ọ bụ ezie na ha na-agụ Bible mgbe ụfọdụ, ọ dịtụghị mgbe ha nyere m ndụmọdụ metụtara nnọọ nsogbu m; ọ dịghịkwa onye bịakwutere m ịgwa m ihe m ga-eme. Ịnọ n’ụlọ chọọchị ruo oge ụfọdụ na ikpeghachi ụfọdụ ekpere ejughị m afọ.” Ike pụrụ ịgwụ ndị ọzọ mgbe ha hụrụ na ndị ndú ime mmụọ ha adịghị ebi ndụ kwesịrị nṅomi. N’ihi ya, ọtụtụ adịghịzi atụkwasị okpukpe obi dị ka ebe ha ga-esi mụta ihe ma ọ bụ nweta ọzụzụ dị ha mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma.
Ya mere, ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị, ‘Olee ụdị mmụta m kwesịrị inweta iji mee ka m nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ?’ Ezi Iso Ụzọ Kraịst ọ̀ pụrụ ịza ajụjụ a dị mkpa? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 A gbanwere aha.