Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Rite Uru Site ná Mmụta Kasị Mma E Nwere!

Rite Uru Site ná Mmụta Kasị Mma E Nwere!

Rite Uru Site ná Mmụta Kasị Mma E Nwere!

BIBLE na-akọwa Jehova Chineke dị ka Onye kere ihe nile, gụnyere ụmụ mmadụ. (Jenesis 1:27; Mkpughe 4:11) Dị ka Onye Nkụzi Ukwu, o nyere di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ, bụ́ Adam na Iv, ọzụzụ ma kwadebe ha ibi ndụ n’ubi Iden mara mma. Ọ bụ nzube ya ịnọgide na-azụ ha ma na-elekọta ha ruo mgbe ebighị ebi. (Jenesis 1:28, 29; 2:15-17; Aịsaịa 30:20, 21) Lee nnọọ atụmanya magburu onwe ya nke ahụ bụ!

Otú ọ dị, ọ dị mwute na di na nwunye mbụ ahụ tụfuru ihe nile. Nnupụisi ha mere ka omume na ahụ́ ike agbụrụ mmadụ malite ịjọ njọ. (Jenesis 3:17-19; Ndị Rom 5:12) Bible na-ekwu banyere ọgbọ ndị biri ndụ obere oge ka e kesịrị mmadụ, sị: “Jehova wee hụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.”—Jenesis 6:5.

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ anọ na narị ise agafeela kemgbe Jehova kwusịrị na ihe na-agụkarị ụmụ mmadụ ime bụ ihe ọjọọ, ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ akakwala njọ ugbu a karịa ka ọ dịtụrụla. Ọtụtụ na-agha ụgha n’emeghị ihere, na-ezu ohi ma ọ bụ na-awakpo ndị ọzọ. Nsogbu na-arịwanye elu kwa ụbọchị, ebe mmadụ ichebara ibe ya echiche na-adalata. Ọ̀ bụ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya, tinyere mmekọrịta n’ime ezinụlọ, anọghị nnọọ ná nsogbu? N’agbanyeghị nke ahụ, a pụghị ịta Chineke ụta maka ọnọdụ ndị e nwere taa, ọ kwụsịbeghịkwa inwe nchegbu banyere nsogbu ndị e nwere taa. Jehova anọgidewo na-egosi mmasị n’ọdịmma nke ụmụ mmadụ, ọ dịkwa njikere izi ndị na-achọ ka o duzie ha ihe ka ha wee nwee obi ụtọ ná ndụ. Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, o zitere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, n’ụwa ma gosi na Ya nwere mmasị inye ndị chọrọ inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ ọzụzụ. Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè n’izi ndị mmadụ ihe n’ihi na Onye Nkụzi Ukwu ahụ eziwo ya ihe ruo ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ.

Ezi Iso Ụzọ Kraịst Bụ Ọzụzụ

Jizọs Kraịst guzobere ezi Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ ụzọ ndụ nke dabeere n’ịhụnanya. N’ezi Iso Ụzọ Kraịst a, echiche na omume nile aghaghị ikwekọ n’uche Chineke iji wetara aha ya otuto na nsọpụrụ. (Matiu 22:37-39; Ndị Hibru 10:7) Nna Jizọs, bụ́ Jehova, kwadoro ya ka ọ na-akụzi ụzọ nke ndụ a. Na Jọn 8:29, anyị na-agụ banyere nkwado Chineke kwadoro Jizọs, sị: “Onye ahụ nke zitere m nọnyekwaara m; ọ gbahapụghị m ka m nọrọ nanị m, n’ihi na m na-eme ihe dị ya mma mgbe nile.” Ee, Nna Jizọs kwadoro ya ma duzie ya n’oge nile o jere ozi. E nyere ụmụazụ Jizọs nke oge ochie nduzi ga-enyere ha aka mgbe ha chere ihe ịma aka ihu. Jehova ji Ọkpara ya zie ha ihe. Mgbaso ha gbasoro ozizi na ihe nlereanya Jizọs mere ka ha ghọọ ndị ka mma. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị na-eso ụzọ ya nke taa.—Lee igbe bụ́ “Mmetụta Jizọs na Ozizi Ya Nwere,” nke dị na peeji nke 6.

Otu ihe mere ezi Iso Ụzọ Kraịst ji dị iche bụ na ọ na-eme ka e nweta mmụta nke na-emetụta uche na obi iji gbanwee ihe ndị mmadụ bụ n’ime. (Ndị Efesọs 4:23, 24) Otu ihe atụ bụ ihe Jizọs kụziri banyere mmadụ ikwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye ya: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Akwala iko.’ Ma asị m unu na onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya.” (Matiu 5:27, 28) Jizọs ji ihe a o kwuru kụziere ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị ime ka obi ha dị ọcha, nakwa na echiche na ọchịchọ na-ezighị ezi pụrụ itinye mmadụ ná nnukwu nsogbu, ọbụna ma ọ bụrụ na onye ahụ emezubeghị ha. Ọ̀ bụ na echiche ọjọọ enweghị ike ime ka mmadụ mee ihe ndị ga-emejọ Chineke na ihe ga-ewute ndị ọzọ?

Ya mere, Bible nyere ndụmọdụ a: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a, kama bụrụnụ ndị e nwoghara site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.” (Ndị Rom 12:2) Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Mmụta ọ̀ pụrụ ime ka uche mmadụ dị ọhụrụ n’ezie?’ Ime ka uche dị ọhụrụ na-agụnye ime ka o chewe ihe ọzọ site n’itinye ụkpụrụ na ntụziaka ndị sitere n’Okwu Chineke n’ime ya. Mmadụ pụrụ ime nke a site n’ịnara ọzụzụ Chineke na-enye site n’Okwu ya.

Ndị A Kpaliri Ime Mgbanwe

“Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Ndị Hibru 4:12) Ọ ka na-akpa ike dị egwu n’ahụ́ ndị mmadụ, si otú a na-egosi na oge ya adịghị agafe agafe. Ọ pụrụ ịkpali mmadụ ịgbanwe ụzọ ya, ịnabata ezi Iso Ụzọ Kraịst ma ghọkwuo ezigbo mmadụ. Ihe atụ ndị na-esonụ na-egosi uru mmụta Bible bara.

Emilia, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, na-ekwu, sị: “Nanị itinye mgbalị n’onwe m emelighị ka ọnọdụ ezinụlọ m ka mma. Mgbe m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, aghọtara m na olileanya dị, amalitekwara m ịgbanwe àgwà m. Amụtara m inwekwu ndidi na ịghara ịdị na-ewe iwe ọkụ. Ka oge na-aga, di m sonyeere m n’ọmụmụ ihe ahụ. Ọ dịghịrị ya mfe ịkwụsị ịṅụ mmanya, ma o jisiri ike kwụsị ya. Nke a gbanwere alụmdi na nwunye anyị. Ugbu a, anyị bụ Ndị Kraịst nwere obi ụtọ, anyị na-akụnyekwa ụkpụrụ ọma Bible n’ime ụmụ anyị.”—Deuterọnọmi 6:7.

Mmụta a na-enweta n’ezi Iso Ụzọ Kraịst pụrụ ime ka mmadụ kwụsị ime omume ọjọọ na ibi ndụ rụrụ arụ. Manuel * chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Mgbe ọ dị afọ 13, ọ gbapụrụ n’ụlọ ma malite ịṅụ wii wii. Ka oge na-aga, ọ malitere ịṅụ ọgwụ ike bụ́ heroin. O so ma ndị nwoke ma ndị nwanyị nwee mmekọahụ iji nweta ego na ebe ọ ga-ehi ụra. Mgbe ụfọdụ, Manuel na-enweta ihe o ji ebi ndụ site n’ịpụnara ndị mmadụ ihe. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọgwụ ọjọọ na-achịkwa ihe nile ọ na-eme. Ihe ike ọ na-eme mere ka ọ gaa mkpọrọ ugboro ugboro. Otu oge, ọ nọrọ afọ anọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ nọkwa ebe ahụ malite ịtụ mgbere ngwá agha. Mgbe Manuel lụrụ nwanyị, ọ nọgidere na-ata ahụhụ n’ihi ụdị ndụ ọ na-ebi. Ọ na-ekwu, sị: “Anyị mesịrị biri n’ebe bụbu ụlọ ọkụkọ. Aka m na-echeta mgbe nwunye m na-eji okwute emere ekwu. Ọnọdụ anyị dị nnọọ njọ nke na ndị ikwu m gwara nwunye m ka ọ hapụ m.”

Gịnị gbanwere ndụ ya? Manuel na-aza, sị: “Otu onye m mabu ama bịara n’ụlọ anyị na-agwa anyị banyere Bible. Nanị ihe m ji kwere ka ọ na-abịa bụ iji gosi ya na e nweghị Chineke nke nwere mmasị n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Eweere m onwe m dị ka ihe atụ na-egosi nke ahụ. Ọ tụrụ m n’anya na Onyeàmà ahụ nwere ndidi na ọnụ ọma, n’ihi ya, ekwetara m ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime ha maara ụdị ndụ m na-ebi, ha kelere m dị ka enyi ha. Ha mere ka ọ dị m ka m̀ bụ onye òtù ha. Nke a kasiri m nnọọ obi. Ọ kpaliri m ruo n’ókè na m kpebiri ịhapụ ọgwụ ọjọọ ma nweta ezigbo ọrụ. Ọnwa anọ ka m malitesịrị ọmụmụ Bible m, eruru m eru isonye n’ọrụ nkwusa, mgbe ọnwa anọ ọzọ gasịkwara, e mere m baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.”

Olee uru ezi Iso Ụzọ Kraịst bawooro Manuel na ezinụlọ ya? “E wezụga ihe ndị m mụtara na Bible, agaarala m anwụfu kemgbe. Ibi ụdị ndụ Jizọs kụziri ka anyị na-ebi nyeghachiri m ezinụlọ m. Ụmụ m abụọ agaghị ata ụdị ahụhụ m tara mgbe m bụ nwa okorobịa. Ana m enwe obi ụtọ ma na-ekele Jehova maka ezi mmekọrịta mụ na nwunye m na-enwe ugbu a. Ụfọdụ ndị mabu m ajaala m mma ma gwa m na ndụ m na-ebi ugbu a kasị mma.”

Ná ndụ Ndị Kraịst, ịdị ọcha n’omume na ịdị ọcha n’anụ ahụ́ na-aga ụkwụ na ụkwụ. John, bụ́ onye bi n’ebe ọtụtụ ndị dara ogbenye na South Africa, bịara ghọta nke ahụ. Ọ na-akọwa, sị: “Mgbe ụfọdụ, nwa anyị nwanyị agaghị asa ahụ́ ruo otu izu, ọ dịghịkwa onye n’ime anyị chọrọ ịma.” Nwunye ya kwetara na ụlọ ha anaghị adị ọcha. Ma mgbe ha nwetara ọzụzụ Ndị Kraịst, ọnọdụ ha gbanwere. John kwụsịrị iso òtù ndị ohi ụgbọala na-akpa ma malite ilebakwuru ezinụlọ ya anya. “Anyị mụtara na dị ka Ndị Kraịst, anyị kwesịrị idebe ahụ́ anyị na uwe anyị ọcha. Ihe e dekọrọ na 1 Pita 1:16 masịrị m, bụ́ ebe na-agba anyị ume ịdị nsọ n’ihi na Jehova Chineke dị nsọ. Ugbu a, anyị na-agbalịkwa ime ka obere ụlọ anyị na-adị ọcha.”

Ị Pụrụ Inweta Mmụta Kasị Mma

E nwere ọtụtụ ahụmahụ yiri ndị ahụ dị n’elu. N’ihi ihe ha mụtara na Bible, ọtụtụ puku mmadụ amụtala imeziwanye ndụ ha. N’ihi ime ihe n’eziokwu na ịdị uchu, ndị were ha n’ọrụ anaghị eji ha egwuri egwu. Ha aghọọla ezigbo ndị agbata obi na ndị enyi, bụrụ ndị na-eji ọdịmma mmadụ ibe ha akpọrọ ihe. Ha kpebisiri ike izere omume ọjọọ na ọchịchọ anụ ahụ́ iji nwee ike ilekọtakwu onwe ha n’ụzọ anụ ahụ́, n’uche na n’ụzọ mmetụta uche. Kama imefusị ego ha n’ihe ọjọọ, ha na-eji ya eme ihe ga-abara ha na ezinụlọ ha uru. (1 Ndị Kọrint 6:9-11; Ndị Kọlọsi 3:18-23) Obi abụọ adịghị ya na ihe na-esi n’itinye ihe Jehova kwuru na Bible n’ọrụ apụta na-egosi na ibi ndụ kwekọrọ n’ezi Iso Ụzọ Kraịst bụ ụzọ ndụ kasị mma, ọ na-emekwa ka mmadụ nweta ụdị mmụta kasị mma. Bible na-ekwu banyere onye na-ebi ndụ kwekọrọ n’iwu Chineke, sị: “Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.”—Abụ Ọma 1:3.

Ọ bụ ihe na-agba ume ịmata na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, dị njikere izi anyị ihe. Ọ na-ekwu banyere onwe ya, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:17) Ee, Jehova egosila anyị ụzọ ahụ site n’ihe nlereanya na ozizi nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Ozizi ya mere ka ndụ ọtụtụ ndị maara ya mgbe ọ nọ n’ụwa kakwuo mma, ọ na-emekwa otu ihe ahụ ná ndụ ọtụtụ ndị ọzọ na-ebi ndụ kwekọrọ n’ozizi ya taa. Gịnị ma i wepụta oge iji mụkwuo banyere ozizi ndị a? Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka inweta mmụta dị otú ahụ bara uru.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 A gbanwere aha ụfọdụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Mmetụta Jizọs na Ozizi Ya Nwere

Zakịọs ji ọkwá ya dị ka onyeisi ndị ọnaụtụ baa ọgaranya site n’ịnapụ na ịpụnara ndị nkịtị ego. Ma ọ gbanwere ụzọ ndụ ya site n’itinye ozizi Jizọs n’ọrụ.—Luk 19:1-10.

Sọl onye Tasọs kwụsịrị ịkpagbu Ndị Kraịst ma bụrụ Onye Kraịst, ghọọ Pọl onyeozi.—Ọrụ 22:6-21; Ndị Filipaị 3:4-9.

Ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Kọrint bụbu ‘ndị na-akwa iko, ndị na-ekpere arụsị, ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị ikom na-edina ndị ikom, ndị ohi, ndị anyaukwu, ndị aṅụrụma, ndị na-ekwujọ mmadụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe.’ Ma, mgbe ha mụtara banyere ezi Iso Ụzọ Kraịst, ‘a sachara ha, doo ha nsọ ma kpọọ ha ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.’—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

[Foto dị na peeji nke 7]

Bible pụrụ igosi gị otú ị ga-esi nwee ihe ịga nke ọma